Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 100
  • Ihe Atụ nke Ego Pound Ndị ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Atụ nke Ego Pound Ndị ahụ
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Atụ Maịna Iri
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Mụta Ihe n’Ihe Atụ Maịna Iri Ahụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Ilu nke Talent
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Jizọs Ejiri Ihe Atụ Talent Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ịdị Uchu n’Ọrụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 100

Isi 100

Ihe Atụ nke Ego Pound Ndị ahụ

ỌPỤRỤ ịbụ na Jisọs ka nọ n’ụlọ Zakịọs, bụ́ ebe ọ kwụsịtụrụ mgbe ọ na-aga Jerusalem. Ndị na-eso ụzọ ya chere na mgbe ha ruru Jerusalem, ọ ga-akpọsa na ya bụ Mesaịa ahụ, wee guzobe Alaeze ya. Iji gbanwee echiche nke a na iji gosi na Alaeze ahụ ka dị n’oge dị anya n’ọdịnihu, Jisọs nyere otu ihe atụ.

Ọ kọrọ sị, “Otu nwoke a mazuuru aha ya gara ala dị anya, ịnara alaeze nye onwe ya, na ịlaghachi.” Jisọs bụ ‘nwoke ahụ a mazuru aha ya,’ ọ bụkwa eluigwe bụ ‘ala ahụ dị anya.’ Mgbe Jisọs rutere ebe ahụ, Nna ya ga-enye ya ike ịbụ eze.

Otú ọ dị, tupu ọpụpụ ya, nwoke ahụ a mazuuru aha ya kpọrọ ndị ohu iri wee nye nke ọ bụla n’ime ha otu pound ọla ọcha, na-asị: “Zụọnụ ahịa ruo mgbe m ga-abịa.” Ná mmezu nke mbụ ya, ndị ohu iri ahụ nọchitere anya ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị mbụ. Ná mmezu nke sara mbara karị, ha sere onyinyo ndị nile gaje iso ya ketakọọ Alaeze eluigwe ahụ.

Pound ọla ọcha ndị ahụ bụ ego bara uru nke ukwuu, nke ọ bụla n’ime ha rukwara ụgwọ ọnwa atọ a na-akwụ onye ọrụ ubi. Ma gịnị ka pound ndị ahụ nọchiri anya ha? Oleekwa ụdị ahịa ndị ohu ahụ ga-eji ha zụọ?

Pound ndị ahụ nọchiri anya ihe onwunwe ndị na-eso ụzọ ahụ e jiri mmụọ nsọ mụọ pụrụ iji mee ihe inwetakwu ndị nketa nke Alaeze eluigwe ruo ọbịbịa nke Jisọs dị ka Eze n’ime Alaeze ahụ e kwere ná nkwa. Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ wee mee ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya, o nyere ha pound ndị ahụ iji mekwuo ndị na-eso ụzọ, wee si otú a na-atụkwasị ihe ná ndị òtù nke Alaeze eluigwe ahụ.

Jisọs gara n’ihu ịkọ sị, “Ma ndị obodo ya kpọrọ [nwoke ahụ a mazuuru aha ya] asị, ha wee zie ndị ozi gaa n’azụ ya, sị, Anyị achọghị ka nwoke a bụrụ eze anyị.” Ndị obodo ya bụ ndị Israel, ma ọ bụ ndị Juu, n’agụnyeghị ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe Jisọs hapụsịrị jee n’eluigwe, site n’ịkpagbu ndị na-eso ụzọ ya, ndị Juu ndị ahụ mere ka a mara na ha achọghị ka ọ bụrụ eze ha. N’ụzọ dị otú a, ha na-akpa àgwà ka ndị obodo ahụ ndị zipụrụ ndị ozi.

Olee otú ndị ohu iri ahụ si jiri pound ha mee ihe. Jisọs kọwara, sị: “O wee ruo, mgbe ọ laghachiri ọzọ, mgbe ọ natasịrị alaeze ya, na ọ sịrị ka a kpọọ ndị ohu ahụ, ndị o nyererịị ego ahụ, ka ha bịakwute ya, ka o wee mara ihe ha zụtararịị n’ahịa. Onye mbụ wee bịa n’ihu ya, sị, Onyenwe anyị, pound ise nke gị abawo uru [iri pound ise]. O wee sị ya, I mere nke ọma, ezi ohu: n’ihi na a hụrụ na i kwesịrị ka a tụkwasị gị obi n’ihe dịkarịsịrị nta, gị bụrụ onye na-achị obodo iri. Nke abụọ wee bịa, sị, Onyenwe anyị, pound ise nke gị abawo uru [iri pound abụọ na ise]. O wee sịkwa nwoke a, Gị onwe gị bụrụkwa onye isi nke obodo ise.”

Ohu ahụ nke ritere uru iri pound ise sere onyinyo nke otu òtù ndị na-eso ụzọ malite na Pentikọst nke afọ 33 O.A. ruo ugbu a, bụ́ nke gụnyere ndị ozi ahụ. Ohu ahụ nke ritere uru iri pound abụọ na ise na-esekwa onyinyo otu òtù n’otu oge ahụ, bụ́ ndị na-amụba ihe onwunwe nke eze ha n’elu ala, dị ka ohere na ikike ha nwere hà. Ìgwè mmadụ abụọ ndị a ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ, dịkwa ka ihe si na nke ahụ pụta, ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi na-aghọ ndị Kraịst. Itoolu n’ime ndị ohu ahụ nwere ihe ịga nke ọma n’ịzụ ahịa ha, wee mụbaakwa ihe onwunwe ha.

Jisọs gara n’ihu ịkọ, sị, “Ohu nke dị iche wee bịa, sị, Onyenwe anyị, lee pound ise nke gị, nke m debere n’ákwà: n’ihi na atụrụ m gị egwu, n’ihi na ị bụ onye aka ike: ị na-eweli ihe ị na-atọgbọghịrịị, ị na-ewekwa ihe ị na-aghaghịrịị. Ọ sị ya, M ga-esite n’ọnụ nke gị kpee gị ikpe, ajọ ohu. Ị maara na mụ onwe m bụ onye aka ike, na-eweli ihe m na-atọgbọghịrịị, na-ewekwa ihe m na-aghaghịrịị; n’ihi gịnịkwa ka ị na-ejighị were ego m nye ndị na-agbanwe ego, mụ onwe m ga-anarakwa ya na ụma mgbe m bịara? O wee sị ndị guzoro nso, Napụnụ ya pound ise ahụ, were ha nye onye nwere [iri pound ise] ahụ.”

Nye ajọ ohu ahụ, pound ndị ahụ nke ihe atụ ịpụ ya n’aka pụtara enwekwaghị ọnọdụ n’Alaeze eluigwe. Ee, ihe ùgwù nke ịchị obodo iri ma ọ bụ obodo ise, dị ka a pụrụ ikwu ya, si otú a funahụ ya. Rịbakwa ama na a kpọghị ohu ahụ onye ọjọọ n’ihi ihe ọjọọ ọ bụla o mere, kama nke ahụ, ọ bụ n’ihi na ọ rụghị ọrụ iji mụbaa ihe onwunwe nke alaeze nna ya ukwu.

Mgbe e nyere ohu nke mbụ ahụ pound nke ajọ ohu ahụ, e kwuru okwu mmegide ahụ bụ: “Onyenwe anyị, o nwere [iri pound ise].” Ma Jisọs zara, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ka a ga-enye; ma onye na-enweghị, ọbụna ihe o nwere ka a ga-anapụ ya. Otú ọ dị, ndị iro m ndị a, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kute ha n’ebe a, gbuo ha n’ihu m.” Luk 19:​11-27; Matiu 28:⁠19, 20.

▪ Gịnị kpaliri Jisọs ịkọ ihe atụ nke pound ndị ahụ?

▪ Ònye bụ nwoke ahụ nke a mazuru aha ya, oleekwa ebe bụ ala ahụ nke o jere?

▪ Olee ndị bụ ndị ohu ahụ, gịnịkwa ka pound ndị ahụ nọchiri anya ya?

▪ Olee ndị bụ ndị obodo ya, hà sikwa aṅaa gosi ịkpọasị ha?

▪ Gịnị mere e ji kpọọ otu onye ajọ ohu, gịnịkwa ka ọpụpụ pound ya pụrụ ya n’aka pụtara?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya