AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LUK 19-20
Mụta Ihe n’Ihe Atụ Maịna Iri Ahụ
Olee ihe ihe ndị ahụ Jizọs ji mee ihe atụ Maịna ahụ nọchiri anya ya?
Nna ukwu ahụ nọchiri anya Jizọs
Ndị ohu ahụ nọchiri anya ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ
Ego ahụ nna ukwu ahụ nyere ndị ohu ya nọchiri anya ihe ùgwù ha nwere ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs
N’ihe atụ ahụ, a dọrọ aka ná ntị banyere ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ amalite ịkpa àgwà ka ajọ ohu ahụ. Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya jiri ihe niile ha nwere na-ekwusasi ozi ọma ike.
Olee otú m nwere ike isi na-eṅomi Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ikwusa ozi ọma?