Isi 102
Mbanye Mmeri Kraịst Banyere na Jerusalem
N’ỤTỤTỤ echi ya bụ Sunday, Nisan 9, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Betani, wee chee ihu ịgabiga Ugwu Olive na-aga Jerusalem. N’oge na-adịghị anya, ha bịaruru nso Betfagi, nke dị n’Ugwu Olive. Jisọs gwara mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị:
“Gaanụ n’obodo nta nke dị na ncherịta ihu, ngwa ngwa unu ga-ahụ ịnyịnya ibu e libeworo, ya na nwa ịnyịnya ibu: tọpụnụ ha, sekpụtara m ha. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla asị unu ihe ọ bụla, unu ga-asị, Ha dị Onyenwe anyị mkpa; ngwa ngwa ọ ga-ezita ha.”
Ọ bụ ezie na ná mmalite, ndị na-eso ụzọ ahụ aghọtaghị na ndụmọdụ ndị a nwere ihe ọ bụla kekọtara ha na mmezu nke amụma Bible, ha mesịrị ghọta na ọ dị otú ahụ. Zekaraịa onye amụma buru amụma na Eze nke Chineke kwere ná nkwa ga-anọkwasị n’elu ịnyịnya ibu wee bata na Jerusalem, ee, “ọbụna na nwa ịnyịnya, bụ́ nwa ịnyịnya ibu.” N’otu aka ahụ, Eze Solomọn nọkwasịkwara n’elu nwa ịnyịnya ibu wee bịa maka otite mmanụ ya.
Mgbe ndị na-eso ụzọ ahụ banyere Betfagi wee sekpụrụ nwa ịnyịnya ibu ahụ na nne ya, ụfọdụ n’ime ndị guzo gburugburu sịrị: “Ùnu na-eme gịnị?” Ma mgbe a gwara ha na anụ ụlọ ndị ahụ bụ maka Onyenwe anyị, ndị ikom ahụ kwere ka ndị na-eso ụzọ ahụ kpụjere ha Jisọs. Ndị na-eso ụzọ ahụ chịkwasịrị uwe elu ha n’elu nne ịnyịnya ibu ahụ na nwa ya, ma Jisọs rịkwasịrị n’elu nwa ịnyịnya ibu ahụ.
Ka Jisọs nọkwasịrị n’elu ya na-aga Jerusalem, ìgwè mmadụ na-eso ya mụbara. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị mmadụ tụsara uwe ha n’okporo ụzọ, ebe ndị ọzọ gbujitere alaka osisi dị iche iche wee gbasaa ha n’okporo ụzọ. Ha na-eti mkpu sị, “Onye a gọziri agọzi ka eze nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] bụ: udo dị n’eluigwe, otuto dịkwa n’ebe kachasị ihe nile elu”!
Ụfọdụ ndị Farisii so n’ìgwè mmadụ ahụ were iwe n’ihi okwu ndị a ma mee mkpesa gwa Jisọs, sị: “Onye Ozizi, baara ndị na-eso ụzọ gị mba.” Ma Jisọs zaghachiri, sị: “Asị m unu na, ọ bụrụ na ndị a ekpuchie ọnụ ha, nkume ga-eti mkpu.”
Ka Jisọs na-abịaru Jerusalem nso, ọ hụrụ obodo ahụ wee malite ịkwara ya akwá, na-asị: “Ọ bụrụ na ị maara n’ụbọchị a, ọbụna gị onwe gị, ihe ga-eweta udo! Ma ugbu a e zonahụrụ ha n’anya gị.” N’ihi nnupụisi o leziri anya na-enupụ, Jerusalem aghaghị ịkwụ ụgwọ dịịrị ya, dị ka Jisọs buru n’amụma, sị:
“Ndị iro gị [bụ́ ndị Rom ahụ nọ n’okpuru Ọchịagha Taịtọs] ga-egwu ékpè na ị́gà imegide gị, nọgidekwa gị gburugburu, jigidekwa gị n’akụkụ nile, tụdaakwa gị n’ala, na ụmụ gị bi n’ime gị; ha agaghị ahapụkwa n’ime gị otu nkume n’elu nkume ibe ya.” Mbibi nke a nke Jerusalem bụ́ nke Jisọs buru n’amụma mere n’ezie mgbe 37 afọ gasịrị, n’afọ 70 O.A.
Nanị izu ole na ole tupu mgbe ahụ, ọtụtụ ndị nọ n’ìgwè mmadụ ahụ ahụwo ka Jisọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. Ugbu a, ndị a nọgidere na-akọrọ ndị ọzọ banyere ọrụ ebube ahụ. Ya mere, mgbe Jisọs banyere Jerusalem, ọgba aghara bilitere n’ime obodo ahụ dum. Ndị mmadụ ahụ na-achọ ịmara, “Ònye bụ nwoke a?” Ìgwè mmadụ ahụ nọgidekwara na-akọ, sị: “Nwoke a bụ onye amụma ahụ, Jisọs, nke si na Nazaret nke Galili bịa.” Mgbe ha hụrụ ihe na-emenụ, ndị Farisii ahụ kwara arịrị n’ihi na mgbalị ha adịghị arụpụta ihe ọ bụla, n’ihi na, dị ka ha kwuru: “Ụwa ejesowo ya n’azụ.”
Dị ka ọ na-eme mgbe ọ bụla o jere Jerusalem, Jisọs gara n’ụlọ ukwu izi ihe. N’ebe ahụ, ndị ìsì na ndị ngwụrọ na-abịakwute ya, ọ na-agwọkwa ha! Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ hụrụ ọrụ ebube ndị Jisọs na-arụ, mgbe ha nụkwara ka ụmụntakịrị ndị nọ n’ụlọ ukwu ahụ na-eti mkpu, sị “Hosanna dịrị Nwa Devid!” iwe were ha. Ha wee sị, “Ị̀ na-anụ okwu ụmụ ndị a na-ekwu?”
Jisọs zaghachiri sị, “Ee: Ọ́ dịghị mgbe ọ bụla unu gụrụ, I si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara mee ka ọjịja zuo okè?”
Jisọs gara n’ihu izi ihe, wee legharịa anya hụ ihe nile nọ n’ụlọ nsọ ahụ. N’oge na-adịghị anya, chi ejie. O wee pụọ, ya na mmadụ 12 ahụ, wee gaa njem ihe dị ka maịlụ abụọ gaa Betani. N’ebe ahụ ka ọ nọrọ n’anyasị Sunday, ma eleghị anya n’ụlọ enyi ya nwoke bụ Lazarọs. Matiu 21:1-11, 14-17; Mak 11:1-11; Luk 19:29-44; Jọn 12:12-19; Zekaraịa 9:9.
▪ Ọ̀ bụ ole mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si banye na Jerusalem dị ka Eze?
▪ Ruo ókè ha aṅaa ka ọ dị mkpa na ìgwè mmadụ nyere Jisọs otuto?
▪ Mmetụta dị aṅaa ka Jisọs nwere mgbe o kiriri Jerusalem, oleekwa amụma o buru?
▪ Gịnị mere mgbe Jisọs gara n’ụlọ nsọ ahụ?