Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 103
  • Ije n’Ụlọ Nsọ ahụ Ọzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ije n’Ụlọ Nsọ ahụ Ọzọ
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha Ọzọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • “Oge Awa Abịawo!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Icheta Ụbọchị Ndị Ikpeazụ nke Jisọs n’Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jizọs Mere Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 103

Isi 103

Ije n’Ụlọ Nsọ ahụ Ọzọ

JISỌS na ndị na-eso ụzọ ya ka nọsịrị anyasị nke atọ ha na Betani kemgbe ha si Jeriko bịarute. Ugbu a, mgbe chi na-abọchaala na Monday, Nisan 10, ha anọworị n’ụzọ nke na-eche ihu na Jerusalem. Agụụ na-agụ Jisọs. Ya mere mgbe ọ hụrụ osisi fig nke akwụkwọ dị na ya, o jere ebe o guzo ile ma ọ dị mkpụrụ fig ụfọdụ dị na ya.

Akwụkwọ pupụtara n’osisi ahụ oké ngwa ngwa, ebe ọ bụ na oge fig ji amị bụ na June, ma ugbu a ka bụ nanị ọgwụgwụ March. Otú ọ dị, ihe àmà gosiri na Jisọs chere na ebe ọ bụ na akwụkwọ ndị ahụ pụtara n’oge, ọ pụkwara ịmị mkpụrụ fig n’oge. Ma ọ hụghị ihe ọ tụrụ anya ya. Akwụkwọ ndị ahụ mere ka osisi ahụ yie ihe ọ na-abụghị n’ezie. Mgbe ahụ, Jisọs bụrụ osisi ahụ ọnụ na-asị: “Onye ọ bụla erikwala mkpụrụ ọzọ si n’elu gị pụta ebighị ebi.” A hụrụ ihe si n’ọbụbụ ọnụ Jisọs bụrụ osisi fig ahụ pụta na ihe ọ pụtara n’ụtụtụ echi ya.

N’ịnọgide na-aga n’ihu, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya rutere Jerusalem n’oge na-adịghị anya. O jere n’ụlọ nsọ ahụ, bụ́ nke o jere leta n’ehihie nke ụbọchị bu ya ụzọ. Otú ọ dị, taa, o mere ihe a hụrụ anya, dị nnọọ ka o mere n’afọ atọ tupu mgbe ahụ, mgbe ọ bịara maka Ememe Ngabiga n’afọ 30 O.A. Jisọs chụpụsịrị ndị na-ere ahịa ma na-azụ ahịa n’ụlọ nsọ ahụ, wee kwatusịa table nke ndị na-agbanwe ego na oche nke ndị na-ere nduru. Ọbụna na o kweghị ka onye ọ bụla buru ihe ọ bụla pụọ n’ụlọ nsọ ahụ.

N’ịkatọ ndị ahụ na-agbanwe ego ma na-ere anụmanụ dị iche iche n’ụlọ nsọ ahụ, ọ sịrị: “É deghị ya n’akwụkwọ nsọ, sị, A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere mba nile? ma unu onwe unu emewo ya ọ́gbà ndị na-apụnara mmadụ ihe.” Ha bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe n’ihi na ha na-anara ọnụ ahịa gabigara ókè site n’aka ndị ahụ ọ na-adịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime karịa ịzụrụ anụmanụ ndị a chọrọ maka iji chụọ àjà n’aka ha. N’ihi ya, Jisọs lere azụmahịa dị otú a anya dị ka otu ụdị nke ịpụnara mmadụ ihe ma ọ bụ izu ohi.

Mgbe ndị isi nchụàjà, ndị odeakwụkwọ na ndị bụ isi n’etiti ndị ahụ nụrụ ihe Jisọs meworo, ha malitekwara ọzọ ịchọ ụzọ a ga-esi gbuo ya. Ha si otú a na-egosipụta na ha bụ ndị a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. Ma, ha amaghịkwanụ ụzọ ha ga-esi bibie Jisọs, ebe ọ bụ na ìgwè mmadụ nile nọgidere na-esogharị ya ịnụrụ ihe ọ na-ekwu.

E wezụgakwa ndị bụ ndị Juu site n’ọmụmụ, ndị Jentaịl abịawokwa maka Ememe Ngabiga ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, nke pụtara na a tọghatawo ha bịa n’okpukpe ndị Juu. Ụfọdụ ndị Grik, nke ihe àmà gosiri na ha bụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, bịakwutere Filip ugbu a wee rịọ ka ha hụ Jisọs. Filip jekwuuru Andru, ma eleghị anya ịjụta ya ma ò kwesịrị ekwesị inwe nzute dị otú ahụ. O doro anya na Jisọs ka nọ n’ụlọ nsọ ahụ, ebe ndị Grik ahụ pụrụ ịhụ ya.

Jisọs matara na ya ka nwere nanị ụbọchị ole na ole ịdị ndụ, ya mere o mere ihe atụ nke ọnọdụ ya n’ụzọ mara mma, sị: “Oge hour abịawo, ka e wee nye Nwa nke mmadụ otuto. N’ezie, n’ezie, asị m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka adaghị n’ala wee nwụọ, nanị ya onwe ya na-anọgide; ma ọ bụrụ na ọ nwụrụ, ọ mịa ọtụtụ mkpụrụ.”

Otu mkpụrụ ọka abaghị oké uru. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na a kụnye ya n’ala o wee “nwụọ,” na-abịaru ná njedebe nke ndụ ya dị ka otu mkpụrụ? Mgbe ahụ ọ na-epulite, mgbe oge ụfọdụ gasịkwara, ọ na-etopụta ịbụ ógwè ọka nke na-amịpụta ọtụtụ mkpụrụ ọka. N’otu aka ahụ, Jisọs bụ nanị otu onye zuru okè. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ n’ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ, ọ na-aghọ ụzọ a ga-esi nye ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndụ ebighị ebi, bụ́ ndị nwere otu ụdị mmụọ ahụ o nwere nke iji onwe ya chụọ àjà. Otú a, Jisọs na-asị: “Onye na-ahụ ndụ ya n’anya na-atụfu ya; onye na-akpọkwa ndụ ya asị n’ụwa nke a ga-edebe ya ruo ndụ ebighị ebi.”

O doro anya na Jisọs adịghị eche echiche banyere nanị onwe ya, n’ihi na ọ gara n’ihu ịkọwa, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ejere m ozi, ya soo m; ebe mụ onwe m nọkwa, n’ebe ahụ ka onye na-ejere m ozi ga-anọkwa: ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ejere m ozi, ya ka Nna m ga-asọpụrụ.” Lee nnọọ nkwụghachi ụgwọ dị ebube a na-enweta maka iso Jisọs na ijere ya ozi! Ọ bụ nkwụghachi ụgwọ nke ịbụ onye Nna ahụ nyere nsọpụrụ site n’ime ka o sonyere Kraịst n’Alaeze ahụ.

N’iche echiche banyere oké ịta ahụhụ na ọnwụ ihe mgbu nke na-echere ya, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ugbu a ka mkpụrụ obi m na-alọ mmiri; gịnị ka m ga-ekwukwa? Nna, zọpụta m n’oge hour nke a.” A sịkwa nnọọ na a pụrụ izere ihe ahụ na-eche ya ihu ezere! Ma, a pụghị, dị ka o na-ekwu, sị: “N’ihi nke a ka m bịaruru oge hour nke a.” Jisọs kwekọzuru ná ndokwa nile nke Chineke, gụnyere ọnwụ ịchụ àjà nke ya onwe ya. Matiu 21:​12, 13, 18, 19; Mak 11:​12-18; Luk 19:​45-48; Jọn 12:​20-⁠27.

▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji tụọ anya inweta mkpụrụ fig, ọ bụrịị eziokwu na oge ha ji amị erubeghị?

▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpọọ ndị ahụ na-ere ihe n’ụlọ nsọ “ndị na-apụnara mmadụ ihe”?

▪ N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si yie otu mkpụrụ ọka nke na-anwụ anwụ?

▪ Gịnị bụ echiche Jisọs banyere ahụhụ na ọnwụ nke na-echere ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya