Isi 104
A Nụrụ Olu Chineke nke Ugbo Atọ
MGBE ọ nọ n’ụlọ ukwu ahụ, Jisọs anọwo na-enwe ihe mgbu n’ihi ọnwụ nke ọ na-aghaghị iche ihu n’oge na-adịghị anya. Nchegbu bụ isi o nwere bụ otú nke a ga-esi metụta ùgwù nke Nna ya, ya mere o kpere ekpere, sị: “Nna, nye aha gị otuto.”
Mgbe ahụ, otu olu dị ike sitere n’eluigwe daa, na-ekwu, sị: “Enyere m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.”
Nke a bụụrụ ìgwè mmadụ guzo ya gburugburu ihe ijuanya. Ụfọdụ malitere ịsị, “Mmụọ ozi agwawo ya okwu.” Ndị ọzọ kwuru na ọ bụ égbè eluigwe dara. Ma, n’ezie, ọ bụ Jehova Chineke bụ onye kwuru okwu! Otú ọ dị, nke a abụghị nke mbụ a nụrụ olu Chineke n’ihe metụtara Jisọs.
N’oge Jisọs mere baptism afọ atọ na ọkara tupu mgbe ahụ, Jọn Onye Na-eme Baptism nụrụ ka Chineke kwuru banyere Jisọs, sị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” Mgbe ahụ, n’otu oge mgbe e mesịrị ememe Ngabiga nke afọ gara aga, mgbe e nwoghara Jisọs n’ihu ha, Jemes, Jọn, na Pita nụrụ ka Chineke kwupụtara, sị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu ya.” Ugbu a kwa, na nke ugbo atọ ya na Nisan 10, bụ́ ụbọchị anọ tupu ọnwụ Jisọs, ụmụ mmadụ na-anụkwa olu Chineke ọzọ. Ma na nke ugbu a, Jehova kwuru okwu n’ụzọ ìgwè mmadụ ahụ nụrụ!
Jisọs na-akọwa, sị: “Ọ bụghị n’ihi m ka olu a daworo, kama ọ bụ n’ihi unu.” Ọ na-enye ihe àmà nke na-egosi na Jisọs bụ Ọkpara Chineke n’ezie, bụ́ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Jisọs gara n’ihu ikwu sị, “Ugbu a ka ikpe ụwa nke a dị: ugbu a ka a ga-achụpụ onye isi ụwa nke a.” Nke a pụtara na ụzọ ndụ ikwesị ntụkwasị obi nke Jisọs na-emesi ya ike na Setan Ekwensu, bụ́ onye isi ụwa nke a, kwesịrị ka ‘a chụpụ ya,’ gbuo ya.
N’izo aka n’ihe ga-esi n’ọnwụ ya nke na-abịaru nso pụta, Jisọs na-asị: “Mụ onwe m, ọ bụrụ na e welie m elu site n’ala, m ga-adọrọkwa mmadụ nile nye onwe m.” Ọnwụ ya adịghị ụzọ ọ bụla o si bụrụ mmeri, n’ihi na site na ya, ọ ga-adọrọ ndị ọzọ nye onwe ya ka ha wee nweta ndụ ebighị ebi.
Ma ìgwè mmadụ ahụ mere mkpesa, sị: “Anyị onwe anyị nụrụ site n’iwu anyị na Kraịst anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi: gị onwe gị sikwa aṅaa sị, A ghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu? Ònye bụ Nwa nke mmadụ a?”
N’agbanyeghị ihe àmà nile e nwere, gụnyere ịnụ olu Chineke n’onwe ya, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ekwenyeghị na Jisọs bụ ezi Nwa nke mmadụ, bụ́ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ma, dị ka o mere n’ọnwa isii tupu oge a n’Ememe Ụlọ Ikwuu, Jisọs kwukwara okwu banyere onwe ya ọzọ dị ka “ìhè ahụ” wee gbaa ndị na-ege ya ntị ume, sị: “Mgbe unu na-enwe ìhè ahụ, kwerenụ n’ìhè ahụ, ka unu wee ghọọ ụmụ ìhè.” Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, Jisọs pụrụ wee zoo, nke ihe àmà gosiri na ọ bụ n’ihi na ndụ ya nọ n’ihe ize ndụ.
Enweghị okwukwe nke ndị Juu n’ebe Jisọs nọ mezuru okwu Aịsaịa banyere ‘anya ụmụ mmadụ ịbụ nke e mere ka ha kpuo ìsì, na obi ha ịbụ nke e mere ka ọ maa itiri nke mere na ha adịghị echigharị ka e wee gwọọ ha.’ Aịsaịa hụrụ ogige eluigwe nke Jehova n’ọhụụ, gụnyere Jisọs n’ebube nke o nwere tupu ọ ghọọ mmadụ n’akụkụ Jehova. Ma n’agbanyeghị nke a ndị Juu, ná mmezu nke ihe Aịsaịa dere, gbara isi akwara jụ ịnakwere ihe àmà ahụ nke na-egosi na Onye a bụ Onye Mgbapụta ahụ e kwere ná nkwa.
N’aka nke ọzọ, ọtụtụ, ọbụna n’etiti ndị na-achị achị (nke ihe àmà gosiri na ọ bụ ndị so n’ụlọ ikpe ukwu ndị Juu, bụ́ Sanhedrin) tinyere okwukwe n’ezie n’ebe Jisọs nọ. Nikọdimọs na Josef onye Arịmatịa bụ mmadụ abụọ n’ime ndị ọchịchị ndị a. Ma ka ọ dịgodi ugbu a, ndị ọchịchị ndị ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ekwupụtabeghị okwukwe ha nwere n’ihi egwu nke ịbụ ndị a chụpụrụ n’ọkwá ha n’ụlọ nzukọ ahụ. Lee nnọọ ihe dị ukwuu funahụrụ ndị dị otú ahụ!
Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Onye kwere na mụ, ọ bụghị na mụ ka o kwere, kama ọ bụ n’onye zitere m. Onye na-ahụ m na-ahụkwa onye zitere m. . . . Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anụ okwu m, ghara idebe ha, mụ onwe m agaghị ekpe ya ikpe: n’ihi na abịaghị m ka m kpee ụwa ikpe, kama ka m zọpụta ụwa. . . . Okwu nke m kwuru, okwu ahụ ga-ekpe ya ikpe n’ụbọchị ikpeazụ.”
Ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ dị kpaliri ya izite Jisọs ka e wee nwee ike ịzọpụta ndị tinyere okwukwe na ya. Ma à ga-azọpụta ndị mmadụ dabeere na ha irube isi n’ihe ndị Chineke gwara Jisọs ikwu. Ikpe ahụ ga-ewere ọnọdụ “n’ụbọchị ikpeazụ,” n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst.
Jisọs mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “Mụ onwe m ekwughị site n’onwe m; kama Nna nke zitere m, ya onwe ya enyewo m iwu, ihe m ga-ekwu, na otú m ga-ekwu ya. Amatakwara m na ihe o nyere n’iwu bụ ndụ ebighị ebi: ya mere ihe mụ onwe m na-ekwu, dị ka Nna m gwaworo m okwu, otú a ka m na-ekwu.” Jọn 12:28-50; 19:38, 39; Matiu 3:17; 17:5; Aịsaịa 6:1, 8-10.
▪ Olee ugbo atọ ndị a nụrụ olu Chineke n’ihe banyere Jisọs?
▪ Olee ụzọ Aịsaịa onye amụma si hụ ebube Jisọs?
▪ Olee ndị bụ ndị ọchịchị ahụ tinyere okwukwe na Jisọs, ma gịnị mere na ha ekwupụtaghị ya n’ihu ọha?
▪ Gịnị bụ ‘ụbọchị ikpeazụ,’ ọ bụkwa n’ihe ndabere dị aṅaa ka a ga-ekpe ndị mmadụ ikpe n’oge ahụ?