Isi 110
Ije Ozi Ya n’Ụlọ Nsọ ahụ Agwụsịa
JISỌS na-abịa nke ikpeazụ ya n’ụlọ nsọ ahụ. N’ezie, ọ na-eweta ije ozi ihu ọha ya n’elu ụwa ná ngwụsị, ma e wezụga ihe omume ndị metụtara ọnwụnwa na ogbugbu ya, bụ́ nke dị mkpụrụ ụbọchị atọ n’ihu. Ugbu a, ọ nọgidere na-akatọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii.
Ugbo atọ ọzọ, o kwupụtara, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ!” Na nke mbụ, ọ kpọsara ahụhụ n’isi ha n’ihi na ha na-eme “ka azụ iko na efere dị ọcha, ma n’ime ha jupụtara site n’ịpụnara mmadụ ihe na ejideghị onwe [onye].” Ya mere o nyere ndụmọdụ, sị: “Buru ụzọ mee ka ime iko na efere dị ọcha, ka azụ ha wee ghọọkwa ọcha.”
Ọzọ, ọ kpọsara ahụhụ n’isi ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii maka inwe obi rụrụ arụ na nke rere ure nke ha na-agbalị izochi site n’iyikwasị ụdị nke nsọpụrụ Chineke. O kwuru sị, “Unu yiri ili e teworo nzu, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe ọma n’ìhè, ma n’ime ha jupụtara n’ọkpụkpụ nke ndị nwurụ anwụ, na adịghị ọcha nile.”
N’ikpeazụ, ihu abụọ ha pụtara ìhè ná njikere ha dị iwu ili maka ndị amụma ma chọọ ha mma iji dọrọ uche gaa n’ebe ọrụ obi ebere ha dị. Ma, dị ka Jisọs kpughere, ha “bụ ụmụ nke ndị gburu ndị amụma.” N’ezie, onye ọ bụla nke nwara ikpughe ihu abụọ ha nọ n’ihe ize ndụ!
N’ịga n’ihu, Jisọs kwupụtara okwu ya ndị ka sie ike nke ọmụma ikpe. O kwuru sị, “Unu agwọ, ụmụ ajụala, olee otú unu ga-esi gbanahụ ikpe nke Gehena?” (NW) Gehena bụ ndagwurugwu e ji eme ihe dị ka ebe mkpofu ahịhịa na Jerusalem. Ya mere Jisọs na-ekwu na n’ihi ịnọgide n’ajọ ụzọ ha, ndị odeakwụkwọ ahụ na ndị Farisii ga-ata ahụhụ mbibi ebighị ebi.
Banyere ndị ahụ o zipụrụ dị ka ndị nnọchianya ya, Jisọs na-ekwu, sị: “Ụfọdụ n’ime ha ka unu ga-egbu ma kpọgbuo, ụfọdụ n’ime ha ka unu ga-apịakwa ihe n’ụlọ nzukọ unu, kpagbuokwa ha site n’obodo ruo n’obodo; ka ọbara ndị ezi omume nile a wụsịworo n’elu ụwa wee dịkwasị unu, site n’ọbara Ebel onye ezi omume ruo n’ọbara Zekaraịa nwa Barakaịa [onye a kpọrọ Jehọịada na 2 Ihe Emere], onye unu gburu n’agbata ebe nsọ na ebe ịchụ àjà. N’ezie asị m unu, Ihe ndị a nile ga-abịakwasị ọgbọ a.”—NW.
N’ihi na Zekaraịa katọrọ ndị ndú Israel, “ha wee kekọta onwe ha imegide ya, were nkume tụgbuo ya, n’ihi ihe eze nyere n’iwu, n’ogige ụlọ Jehova.” Ma, dị ka Jisọs buru n’amụma, Israel ga-akwụ ụgwọ mwụfu ọbara nile dị otú ahụ nke ndị ezi omume bụ́ nke ha wụfuru. Mgbe e mesịrị, ha kwụrụ ụgwọ ahụ na 37 afọ n’ọdịnihu, n’afọ 70 O.A., mgbe ndị agha Rom bibiri Jerusalem, ihe karịrị otu nde ndị Juu wee laa n’iyi.
Ka Jisọs na-atụle ọnọdụ nke a na-atụ egwu, obi adịghị ya mma. “Jerusalem, Jerusalem,” ka o kwupụtara ọzọ, “ọtụtụ mgbe ole ka m chọrọ ịchịkọ ụmụ gị, ọbụna dị ka nnekwu ọkụkọ na-achịkọ ụmụ ya n’okpuru nku ya abụọ, ma unu achọghị! Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.”
Mgbe ahụ Jisọs kwukwara, sị: “Unu agaghị ahụ m ọzọ site n’ugbu a ma ọlị, ruo mgbe unu ga-asị, Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị [“Jehova,” NW]!” Ụbọchị ahụ ga-abụ n’ọnụnọ Kraịst mgbe ọ ga-abanye n’Alaeze eluigwe ya, ndị mmadụ ga-ejikwa anya nke okwukwe hụ ya.
Ugbu a Jisọs gara n’otu ebe ọ ga-anọ nwee ike ikiri ebe ndebe ụtụ nke dị n’ụlọ nsọ ahụ nakwa ìgwè mmadụ ndị na-atụnye ego n’ime ha. Ndị ọgaranya na-atụbanye ọtụtụ mkpụrụ ego. Ma mgbe ahụ otu nwanyị di ya nwụrụ nke bụ ogbenye bịara ma tụbanye obere mkpụrụ ego abụọ ndị na-enweghị uru dị ukwuu.
Ka ọ kpọkọtara ndị na-eso ụzọ ya, Jisọs kwuru, sị: “N’ezie asị m unu, Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karịa ndị nile na-atụba n’ime ebe ụtụ ahụ.” Ọ ghaghị ijuworị ha anya otú nke a pụru isi dị otú ahụ. Ya mere Jisọs kọwara, sị: “Ha nile sitere n’inwebiga akụ ókè ha tụba; ma nwanyị ahụ sitere n’ụkọ ya tụba ka ihe nile nke o nwere hà, bụ́ ihe dum o ji biri.” Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, Jisọs si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ na nke ikpeazụ ya.
N’ihi ịbụ ndị ịdị ukwuu na ịma mma nke ụlọ nsọ ahụ tụrụ n’anya, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya kwupụtara, sị: “Onye ozizi, lee aha nkume na aha owuwu ụlọ ndị a bụ!” N’ezie, e kwuwo na nkume ndị ahụ dị ihe karịrị 35 amaụkwụ n’ogologo, ihe karịrị amaụkwụ 15 n’obosara, nakwa ihe karịrị amaụkwụ 10 n’ịdị elu!
Jisọs zaghachiri sị, “Ị̀ hụrụ oké owuwu ụlọ ndị a? A gaghị ahapụ otu nkume ma ọlị n’ebe a n’elu nkume ibe ya, nke a na-agaghị akwatu n’ala.”
Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, Jisọs na ndị ozi ya gafere ndagwurugwu Kidrọn ma rịgoo n’Ugwu Olive. Site n’ebe ahụ ha pụrụ ilepụ anya gaa n’ụlọ nsọ ahụ dị ebube. Matiu 23:25–24:3; Mak 12:41–13:3; Luk 21:1-6; 2 Ihe Emere 24:20-22.
▪ Gịnị ka Jisọs mere mgbe ọ gara n’ụlọ nsọ ahụ na nke ikpeazụ ya?
▪ Olee otú ihu abụọ nke ndị odeakwụkwọ na nke ndị Farisii si pụta ìhè?
▪ Gịnị ka ‘ikpe nke Gehena’ pụtara?
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji kwuo na nwanyị ahụ di ya nwụrụ tụnyere ihe karịa ndị ọgaranya ahụ?