Isi 115
Nrụrịta Ụka Ebilite
TUPU mgbe ahụ n’oge uhuruchi, Jisọs nyere ihe mmụta mara nnọọ mma banyere mmadụ iweda onwe ya n’ala ije ozi site n’ịsa ụkwụ ndị ozi ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ malitere Ememe Ncheta nke ọnwụ ya nke na-abịanụ. Ugbu a, karịsịa n’iburu n’uche ihe ahụ nke ka mesịrịnụ, otu ihe dị ịtụnanya mere. Ndị ozi ya malitere inwe oké nrụrịta ụka banyere onye nke ọ bụ ya yiri ka ọ̀ kasị ndị ọzọ ukwuu! Nke a yiri ka ọ̀ bụ esemokwu nke nọworo na-aga n’ihu tupu mgbe ahụ.
Cheta na mgbe e nwoghasịrị Jisọs n’elu ugwu, ndị ozi ahụ rụrịtara ụka banyere onye kasị ukwuu n’etiti ha. Karịsịa, Jemes na Jọn rịọrọ ka e nye ha ọnọdụ dị elu n’Alaeze ahụ, bụ́ nke kpatakwuru esemokwu n’etiti ndị ozi ahụ. Ugbu a, n’anyasị ikpeazụ ya na ha ga-anọ, lee nnọọ ka ọ na-aghaghị isiworị wute Jisọs ịhụ ka ha maliteghachiri ise okwu ọzọ! Gịnị ka o mere?
Kama ịbara ndị ozi ahụ mba maka omume ha, ọzọkwa Jisọs jiri ndidi soro ha tụgharịa uche, sị: “Ndị eze nke mba ọzọ na-eme ha dị ka ndị nwe ha; ndị na-achịkwa ha ka a na-akpọ ndị na-arụ ọrụ ọma. Ma unu onwe unu agaghị adị otú a: . . . N’ihi na ònye ka ibe ya ukwuu, onye na-anọdụ ná nri, ma ọ bụ onye na-eje ozi? Ọ́ bụghị onye na-anọdụ ná nrị?” Mgbe ahụ, n’ichetara ha ihe nlereanya nke ya onwe ya, ọ sịrị: “Ma mụ onwe m dị n’etiti unu ka onye na-eje ozi.”
N’agbanyeghị ezughị okè ha nile, ndị ozi ahụ anọgidewo na-eso Jisọs n’ule ya nile. Ya mere ọ sịrị: “Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m.” Ọgbụgba ndụ onwe onye nke a nke dị n’etiti Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-ejikọta ha na ya ikere òkè n’ọchịchị ya dị ka eze. Ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè, bụ́ 144,000 ka e mesịrị webata n’ọgbụgba ndụ nke a maka Alaeze.
Ọ bụ ezie na e chere ndị ozi ahụ olileanya nke a dị ebube n’ihu, bụ́ nke isoro Kraịst kere òkè n’ọchịchị Alaeze, ha ka dagodịrị mbà n’ime mmụọ ka ọ dị ugbu a. Jisọs sịrị, “A ga-eme ka unu onwe unu nile ma n’ọnyà n’ahụ m abalị taa.” Otú ọ dị, n’ịgwa Pita na Ya ekpewo ekpere n’isi ya, Jisọs gbara ya ume, sị: “Mgbe ị ga-echigharịworị, gị meekwa ka ụmụnna gị guzosie ike.”
Jisọs kọwara, sị: “Ụmụntakịrị, ọ fọdụrụ nwa oge mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m: dị ka m gwakwara ndị Juu, sị, Ebe mụ onwe m na-ala, unu onwe unu apụghị ịbịa; otú ahụ ka m na-asị unu ugbu a. Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka m hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”
Pita wee jụọ sị, “Onyenwe anyị, olee ebe ị na-ala?”
Jisọs zaghachiri sị, “Ebe m na-ala, ị pụghị iso m ugbu a; ma ị ga-eso m ma e mesịa.”
Pita jụrụ, sị, “Onyenwe anyị, n’ihi gịnị ka m na-apụghị iso gị ọbụna ugbu a?” Ọ sịkwara, “M ga-atọgbọ ndụ m n’ihi gị.”
“Ị̀ ga-atọgbọ ndụ gị n’ihi m?” ka Jisoṣ jụrụ. “N’ezie asị m gị, na taa, bụ́ n’abalị a, mgbe oké ọkụkụ akakwaghị ákwá ugbo abụọ, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.”
Pita siri ọnwụ, sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, m gaghị agọnahụ gị ma ọlị.” Ka ndị ozi ndị ọzọ sonyekwara n’ikwu otu ihe ahụ, Pita nyara isi, sị: “Ọ bụrụ na a ga-eme mmadụ nile ka ha ma n’ọnyà n’ahụ gị, a gaghị eme ka mụ onwe m ma n’ọnyà mgbe ọ bụla.”
N’izo aka n’oge ahụ mgbe o zipụrụ ndị ozi ya ịga njem nkwusa ozi ọma na Galili n’ejighị akpa ego na akpa ije, Jisọs jụrụ, sị: “Ọ̀ dị ihe kọrọ unu?”
Ha zaghachiri sị, “Ọ dịghị ihe kọrọ anyị.”
Ọ sịrị, “Ma ugbu a, onye nwere akpa ego, ya were ya, onye nwere akpa ije, ya werekwa ya: ma onye na-enweghị, ya ree uwe ya, zụta mma agha. N’ihi na asị m unu, na ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ aghaghị imezu n’ahụ m, Ọ bụkwa ná ndị na-emebi iwu ka a gụrụ ya: n’ihi na ihe dịịrị m nwere ọgwụgwụ.”
Jisọs na-ezo aka n’oge ahụ mgbe a ga-akpọgbukọta ya na ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ ndị na-emebi iwu. Ọ na-egosikwa na mgbe nke ahụ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya ga-eche oké mkpagbu ihu. Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee, mma agha abụọ dị n’ebe a.”
Ọ zara sị, “O zuwo.” Dị ka anyị gaje ịhụ, ojiji ha ji mma agha ndị ahụ ga-enye Jisọs ohere izi ha otu ihe ọzọ dị mkpa n’oge na-adịghị anya. Matiu 26:31-35; Mak 14:27-31; Luk 22:24-38; Jọn 13:31-38; Mkpughe 14:1-3.
▪ N’ihi gịnị ka nrụrịta ụka nke ndị ozi ahụ ji bụrụ ihe ịtụnanya otú a?
▪ Olee otú Jisọs si dozie nrụrịta ụka ahụ?
▪ Gịnị ka ọgbụgba ndụ ahụ Jisọs sooro ndị ozi ya banye na ya rụzuru?
▪ Iwu ọhụrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere, oleekwa otú ọ dịruru ná mkpa?
▪ Inwebiga obi ike ókè dị aṅaa ka Pita gosipụtara, gịnịkwa ka Jisọs kwuru?
▪ Gịnị mere ndụmọdụ Jisọs nyere banyere iji akpa ego na akpa ije ji dị iche na nke o nyere na mbụ?