Isi 116
Ịkwadebe Ndị Ozi ahụ Maka Ọpụpụ Ya
NRI ememe ncheta ahụ agasịwo, ma Jisọs na ndị ozi ya ka nọ n’ime ụlọ ahụ dị n’elu. Ọ bụ ezie na Jisọs gaje ịla n’oge na-adịghị anya, ọ ka nwere ọtụtụ ihe ọ ga-ekwu. Ọ kasiri ha obi sị, “Ka obi unu ghara ịlọ mmiri: kwerenụ na Chineke.” Ma o kwukwara sị, “Kwerekwanụ na mụ.”
“N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị,” ka Jisọs gara n’ihu ikwu. “Ana m aga idoziri unu ebe . . . ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe mụ onwe m nọ. Ebe mụ onwe m na-ala, unu matakwara ụzọ ya.” Ndị ozi ahụ aghọtaghị na Jisọs na-ekwu okwu banyere ịla n’eluigwe, ya mere, Tọmas jụrụ, sị: “Onyenwe anyị, anyị amataghị ebe ị na-ala; ànyị si aṅaa mata ụzọ ya?”
“Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ,” ka Jisọs na-aza. Ee, ọ bụ nanị site n’ịnakwere ya na iṅomi ụzọ ndụ ya ka onye ọ bụla pụrụ ịbanye n’ụlọ eluigwe nke Nna ahụ n’ihi na, dị ka Jisọs kwuru: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na mụ.”
Filip rịọrọ, sị, “Onyenwe anyị, gosi anyị Nna ahụ, ọ ga-ezukwara anyị.” O yiri ka Filip ọ̀ chọrọ ka Jisọs gosipụta Chineke n’ụzọ anya anya na-ahụ, dị ka e mere n’oge ochie n’ọhụụ ndị ahụ Mosis, Elaịja, na Aịsaịa hụrụ. Ma, n’ezie, ndị ozi ahụ nwere ihe dị mma nke ukwuu karịa ụdị ọhụụ ndị ahụ, dị ka Jisọs kwuru, sị: “Ogologo oge dị otú a ka mụ na gị nọ, ma ị mataghị m, Filip? Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.”
Jisọs na-egosipụta ọdịdị nke Nna ya n’ụzọ zuru okè nke na iso ya bikọọ na ilegide ya anya yiri nnọọ ịhụ Nna ahụ anya n’ezie. Otú o sina dị, Nna ahụ ka Ọkpara ahụ ukwuu, dị ka Jisọs kwetara, sị: “Okwu mụ onwe m na-agwa unu ekwughị m n’onwe m.” N’ụzọ ziri ezi, Jisọs nyere Nna ya nke eluigwe otuto nile maka ihe ndị ọ na-ezi.
Lee nnọọ ihe agbamume ọ na-aghaghị ịbụworị nye ndị ozi ahụ ịnụ ka Jisọs na-agwa ha ugbu a, sị: “Onye na-ekwere na mụ, ọrụ mụ onwe m na-arụ ka onye ahụ ga-arụkwa; ọrụ ka ndị a ukwuu ka ọ ga-arụkwa”! Ihe Jisọs na-ekwu abụghị na ndị na-eso ụzọ ya ga-enwe ike ọrụ ebube ndị dị ukwuu karịa nke o nwere. Ee e, kama ihe ọ na-ekwu pụtara na ha ga-eje ozi ahụ ruo ogologo oge karị, gazuokwa ókèala dị ukwuu karị, ruokwa ebe ọtụtụ ndị nọ karị.
Jisọs agaghị agbakụta ndị na-eso ụzọ ya azụ mgbe ọ hapụsịrị ha. O kwere nkwa sị, “Ihe ọ bụla unu ga-arịọkwa n’aha m, ihe ahụ ka m ga-eme.” N’ịga n’ihu, ọ sịrị: “Mụ onwe m ga-ekpekwara Nna m, ọ ga-enyekwa unu onye nkasi obi [“inyeaka,” NW] ọzọ, ka ọ nọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu.” Mgbe oge gasịrị, mgbe ọ lagosịrị n’eluigwe, Jisọs wụpụrụ mmụọ nsọ ahụ, bụ́ onye inyeaka nke ọzọ ahụ, n’isi ndị na-eso ụzọ ya.
Ọpụpụ Jisọs adịla nso, dị ka ọ sịrị: “Ọ fọdụrụ nwa oge, ụwa ahụkwaghị m ọzọ.” Jisọs gaje ịbụ mmụọ nke ọ na-adịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịhụ ya anya. Ma ọzọkwa, Jisọs kwere ndị ozi ya na-ekwesị ntụkwasị obi nkwa, sị: “Ma unu onwe unu na-ahụ m: unu onwe unu ga-adịkwa ndụ, n’ihi na mụ onwe m na-adị ndụ.” Ee, ọ bụghị nanị na Jisọs ga-apụta n’ihu ha n’ọdịdị mmadụ mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, kama mgbe oge ya ruru, ọ ga-akpọlitekwa ha gaa ná ndụ, ha na ya ga-anọkọ n’eluigwe dị ka ndị bụ mmụọ.
Ugbu a, Jisọs kwupụtara ụkpụrụ ahụ dị mfe, sị: “Onye nwere ihe m nyere n’iwu, nke na-edebekwa ha, ọ bụ onye ahụ na-ahụ m n’anya: onye na-ahụ m n’anya, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, mụ onwe m ga-ahụkwa ya n’anya, werekwa onwe m gosi ya.”
Mgbe o kwuru nke a, onyeozi ahụ bụ Judas, onye ahụ a na-akpọkwa Tadiọs naara ya okwu n’ọnụ wee sị: “Onyenwe anyị, gịnị pụtaworo na ị gaje iwere onwe gị gosi anyị, ma ọ bụghị ụwa?”
Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m: Nna m ga-ahụkwa ya n’anya . . . Onye na-adịghị ahụ m n’anya adịghị edebe okwu m nile.” N’adịghị ka ndị na-eso ụzọ ya ndị na-erube isi, ụwa na-elefuru ozizi nile nke Kraịst anya. Ya mere, ọ dịghị ewere onwe ya gosi ha.
N’oge ije ozi elu ala ya, Jisọs eziwo ndị ozi ya ọtụtụ ihe. Olee ụzọ ha ga-esi chetachaa ha nile, karịsịa ebe ọ bụ na ruokwa ugbu a, ha aghọtabeghị ihe dị ukwuu? Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jisọs kwere nkwa, sị: “Onye nkasi obi [“inyeaka,” NW] ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, onye Nna m ga-ezite n’aha m, onye ahụ ga-ezi unu ihe nile, meekwa ka unu cheta okwu nile mụ onwe m gwara unu.”
N’ịkasikwa ha obi ọzọ, Jisọs sịrị: “Udo ka m hapụụrụ unu; udo nke m ka m na-enye unu: . . . Ka obi unu ghara ịlọ mmiri.” Ọ bụ eziokwu na Jisọs na-ahapụ ha, ma ọ kọwara, sị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-aṅụrịworị ọṅụ, n’ihi na ana m agakwuru Nna m: n’ihi na Nna m ka mụ onwe m ukwuu.”
Oge fọdụụrụ Jisọs iji nọnyere ha dị nnọọ nta. Ọ sịrị, “Ọ dịghị ọtụtụ okwu mụ na unu ga-ekwu ọzọ site n’ugbu a, n’ihi na onye isi nke ụwa nke a na-abịa: ọ dịghịkwa ihe ọ bụla o nwere n’ime m.” Setan bụ Ekwensu, onye ahụ nke nwere ike ịbanye n’ime Judas wee were ọnọdụ n’ime ya, bụ onye isi nke ụwa nke a. Ma ọ dịghị adịghị ike ọ bụla nke mmehie dị n’ime Jisọs nke Setan pụrụ iji mee ihe iji dọpụ ya site n’ijere Chineke ozi.
Ịnọ ná Mmekọrịta Chiri Anya
Mgbe oriri ememe ncheta ahụ gasịrị, Jisọs anọwo jiri okwu ndị sitere n’ala ala obi ya na-agba ndị ozi ya ume n’ụzọ a na-emeghị nkwadebe maka ya. Ọ pụrụ ịbụ na ọ gafewo etiti abalị. Ya mere Jisọs gbara ha ume, sị: “Bilienụ, ka anyị si n’ebe a pụọ.” Otú ọ dị, tupu ha pụọ, Jisọs, n’ịbụ onye ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ kpaliri, gara n’ihu ikwu okwu, na-enye ihe atụ na-akpali akpali.
Ọ malitere site n’ịsị, “Mụ onwe m bụ ezi osisi vine, Nna m bụkwa onye ọrụ ubi.” Onye Ọrụ Ubi Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke, kụrụ mkpụrụ vine ihe atụ nke a mgbe o jiri mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ na baptism ya n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke afọ 29 O.A. Ma Jisọs gara n’ihu igosi na vine ahụ nọchiri anya ihe karịrị nanị ya onwe ya, na-ekwu, sị: “Alaka ọ bụla n’ime m nke na-adịghị amị mkpụrụ, o wepụ ya: alaka ọ bụla nke na-amị mkpụrụ, ọ na-emekwa ya ka ọ dị ọcha, ka o wee mịa mkpụrụ karị. . . . Dị ka alaka na-apụghị ịmị mkpụrụ n’onwe ya, ọ bụrụ na ọ nọgideghị n’osisi vine; otú a ka unu onwe unu na-apụghị, ọ bụrụ na unu anọgideghị n’ime m. Mụ onwe m bụ osisi vine ahụ, unu onwe unu bụ alaka nke m.”
Na Pentikọst, mgbe 51 ụbọchị gasịrị, ndị ozi ahụ na ndị ọzọ ghọrọ alaka nke vine ahụ mgbe a wụkwasịrị ha mmụọ nsọ. N’ikpeazụ, 144,000 mmadụ ghọrọ alaka dị iche iche nke osisi vine ihe atụ ahụ. Ndị a na ógwè osisi vine ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, mejupụtara osisi vine ihe atụ ahụ nke na-amịpụta mkpụrụ nke Alaeze Chineke.
Jisọs na-akọwa ihe na-enye aka n’ịmịpụta mkpụrụ, sị: “Onye na-anọgide n’ime m, mụ onwe m kwa n’ime ya, onye ahụ na-amị mkpụrụ hie nne: n’ihi na unu apụghị ime ihe ọ bụla ma mụ anọghị ya.” Otú ọ dị, Jisọs sịrị na ọ bụrụ na mmadụ amịpụtaghị mkpụrụ, “a tụpụ ya n’èzí dị ka alaka, ọ kpọnwụọkwa; ha ewee chịkọta ha, tụba ha n’ọkụ, e wee rechapụ ha ọkụ.” N’aka nke ọzọ, Jisọs na-ekwe nkwa, sị: “Ọ bụrụ na unu na-anọgide n’ime m, ọ bụrụkwa na okwu m na-anọgide n’ime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu na-achọ, a ga-emekwara unu ya.”
Jisọs gara n’ihu ịgwa ndị ozi ya, sị: “N’ime nke a ka a na-enye Nna m otuto, ka unu na-amị mkpụrụ hie nne; unu ga-abụkwa ndị na-eso ụzọ m.” Mkpụrụ nke Chineke na-atụ anya ya n’aka alaka ndị ahụ bụ ha igosipụta àgwà ndị yiri nke Kraịst, karịsịa ịhụnanya. Karịsịa, ebe ọ bụ na Kraịst bụ onye na-ekwusa Alaeze Chineke, mkpụrụ ahụ a chọrọ n’aka ha gụnyekwara ọrụ ha nke ime ndị na-eso ụzọ dị ka ya onwe ya mere.
Jisọs gbara ume ugbu a, sị, “Nọgidenụ n’ime ịhụnanya m.” Ma, olee ụzọ ndị ozi ya ga-esi mee nke a? Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m.” N’ịga n’ihu, Jisọs kọwara, sị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka m hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karịa nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.”
N’ime hour ole na ole, Jisọs gaje igosipụta ịhụnanya nke a na-enweghị atụ site n’ịtọgbọ ndụ ya n’ihi ndị ozi ya, nakwa ndị ọzọ nile gaje itinye okwukwe na ya. Ihe nlereanya ya kwesịrị ịkpali ndị na-eso ụzọ ya inwe otu ụdị ịhụnanya ahụ nke ịchụ onwe onye n’àjà n’ebe ibe ha nọ. A ga-eji ịhụnanya nke a mara ha, dị ka Jisọs kwuwororịị n’oge gara aga, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”
N’ime ka a mara ndị bụ enyi ya, Jisọs sịrị: “Unu onwe unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu emee ihe mụ onwe m na-enye unu n’iwu. Akpọkwaghị m unu ndị ohu ọzọ site n’ugbu a; n’ihi na ohu adịghị amata ihe onyenwe ya na-eme: ma akpọwo m unu ndị enyi; n’ihi na ihe nile m nụrụ site n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.”
Lee nnọọ mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke a bụ inwe—ịbụ ezi ndị enyi Jisọs! Ma iji wee nọgide na-enwe ezi mmekọrịta nke a, ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ‘ịnọgide na-amịpụta mkpụrụ.’ Jisọs sịrị na ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, “ihe ọ bụla unu ga-arịọ Nna m n’aha m, [ọ ga-enye] unu ya.” N’ezie, nke ahụ bụ oké nkwụghachi ụgwọ maka ịmị mkpụrụ Alaeze! Mgbe ọ gbasịrị ndị ozi ahụ ume ọzọ ka ha “hụrịta ibe [ha] n’anya,” Jisọs kọwara na ụwa ga-akpọ ha asị. Ma ọ kasiri ha obi, sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo mụ onwe m asị mgbe ọ kakpọghị unu asị.” Jisọs gara n’ihi ịkọwa ihe mere ụwa ji kpọọ ndị na-eso ụzọ ya asị, na-asị: “N’ihi na unu esiteghị n’ụwa, kama mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.”
N’ịga n’ihu n’ịkọwa ihe kpatara ụwa ji akpọ ha asị, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ihe ndị a nile ka ha ga-eme unu n’ihi aha m, n’ihi na ha amataghị onye [Jehova Chineke] zitere m.” Ya mere, ọrụ ebube nile nke Jisọs na-ama ndị ahụ kpọrọ ya asị ikpe, dị ka ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụrụ na arụghị m ọrụ n’etiti ha nke onye ọzọ na-arụghị, ha agaghị enweworị mmehie: ma ugbu a ha ahụwo kpọọkwa mụ na Nna m asị.” Jisọs sịrị na akwụkwọ nsọ siri otú a wee mezuo: “Ha kpọrọ m asị n’efu.”
Dị ka o meworo tupu mgbe ahụ, Jisọs kasikwara ha obi ọzọ site n’ikwe nkwa izite onye inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke bụ ike ọrụ nke Chineke. “Onye ahụ ga-agbara m àmà: unu onwe unu na-agbakwa àmà.”
Inyekwu Ndụmọdụ Mgbe Ọ Na-ahapụ Ha
Jisọs na ndị ozi ahụ adịwo njikere ịhapụ ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu. Ọ gara n’ihu ikwu, sị, “Okwu ndị a ka m gwaworo unu ka e wee ghara ime ka unu ma n’ọnyà.” Mgbe ahụ o nyere ndụmọdụ ahụ dị mkpa, nke bụ: “Ha ga-achụpụ unu n’ime ụlọ nzukọ: ee, oge hour na-abịa, ka ọ ga-abụ na onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ọ na-ejere Chineke ozi.”
Ihe àmà gosiri na ịdọ aka ná ntị nke a nyere ndị ozi ahụ nsogbu nke ukwuu. Ọ bụ ezie na Jisọs ekwuworị na mbụ na ụwa gaje ịkpọ ha asị, o kwughị na a gaje igbu ha egbu. Jisọs kọwara, sị, “Agwaghị m unu okwu ndị a site na mbụ, n’ihi na mụ na unu nọrịị.” Ma, lee nnọọ ka o si dị mma ibu ụzọ jiri ihe ọmụma nke a kwadebe ha tupu ọ hapụ ha!
Jisọs gara n’ihu sị, “Ma ugbu a ana m alakwuru onye zitere m; ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime unu na-ajụ m, Olee ebe ị na-ala?” Tupu mgbe ahụ n’anyasị ahụ, ha ajụwo banyere ebe ọ na-eje, ma ugbu a, ihe o kwuru mere ka ha maa jijiji nke na ha ajụkwaghị ya ajụjụ ọzọ banyere nke a. Dị ka Jisọs kwuru: “N’ihi na m gwawo unu okwu ndị a, ihe mwute ejupụtawo obi unu.” Ọ na-ewute ndị ozi ahụ, ọ bụghị nanị n’ihi na ha anụwo na ha gaje ịta ahụhụ mkpagbu dị egwu, bụrụkwa ndị e gburu, kama n’ihi na Onyenwe ha na-ahapụ ha.
Ya mere, Jisọs kọwara, sị: “Ọ bụ ihe baara unu uru ka mụ onwe m laa: n’ihi na a sị na alaghị m, onye nkasi obi [“inyeaka,” NW] ahụ agaghị abịakwute unu; ma ọ bụrụ na alaa m, m ga-ezite ya nye unu.” Dị ka mmadụ, Jisọs pụrụ ịnọ nanị n’otu ebe n’otu mgbe, ma mgbe o ruru n’eluigwe, ọ ga-enwe ike izite onye inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ Chineke, nye ndị na-eso ụzọ ya n’ebe ọ bụla ha pụrụ ịnọ n’elu ala. Ya mere, ọlịla Jisọs ga-aba uru.
Jisọs kwuru na mmụọ nsọ ahụ “ga-atụkwa ụwa mmehie, na ezi omume, na ikpe, n’anya.” A ga-ekpughe mmehie nke ụwa, bụ́ ntinye ọ na-etinyeghị okwukwe n’ebe Ọkpara Chineke nọ. Tụkwasị na nke ahụ, a ga-enye ihe àmà pụtara ìhè banyere ezi omume nke Jisọs site ná nlakwuru ọ ga-alakwuru Nna ahụ. Ọdịda Setan na ụwa ajọ omume ya dara n’imebi nguzosi ike Jisọs bụkwa ihe àmà doro anya na a mawo onye isi ụwa nke a ikpe.
Jisọs gara n’ihu ikwu, sị, “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ ịgwa unu, ma unu apụghị iburu ha ugbu a.” Ya mere Jisọs kwere nkwa na mgbe ya wụpụrụ mmụọ nsọ ahụ, nke bụ ike ọrụ nke Chineke, ọ ga-eduru ha gaa n’ịghọta ihe ndị a n’ụzọ kwekọrọ n’ikike ha nwere ịghọta ha nke ọma.
Ndị ozi ahụ aghọtaghị n’ụzọ bụ isi na Jisọs gaje ịnwụ, mesịakwa gosi ha onwe ya mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ. Ya mere, ha jụrịtara onwe ha, sị: “Gịnị bụ okwu a nke ọ na-agwa anyị, sị, Ọ fọdụrụ nwa oge, unu adịghị ahụkwa m ọzọ; ọzọkwa, ọ fọdụrụ nwa oge, unu ga-ahụkwa m: na, N’ihi na ana m alakwuru Nna m?”
Jisọs hụtara na ha na-achọ ịjụ ya ajụjụ, ya mere ọ kọwara, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, na unu onwe unu ga-eti mkpu akwá, kwaakwa akwá ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ: ọ ga-ewute unu onwe unu, ma mwute unu ga-aghọ ọṅụ.” Ka oge na-aga n’ụbọchị ahụ n’oge ehihie mgbe e gburu Jisọs, ndị ndú okpukpe ụwa ṅụrịrị ọṅụ, ma ndị ozi ahụ nwere mwute. Otú ọ dị, mwute ha ghọrọ ọṅụ mgbe Jisọs si n’ọnwụ bilie! Ọṅụ ha gakwara n’ihu mgbe o nyere ha ike na Pentikọst ịbụ ndịàmà ya site n’ịwụkwasị ha mmụọ nsọ Chineke!
N’iji ọnọdụ ndị ozi ahụ tụnyere nke nwanyị ime na-eme, Jisọs sịrị: “Nwanyị, mgbe ọ bụla ime na-eme ya, o nwere ihe mwute, n’ihi na oge hour ya abịawo.” Ma, Jisọs mere ka a mata na ọ dịghị echetakwa ihe mwute ya ozugbo ọ mụpụtara nwa ya, ọ gbakwara ndị na-eso ụzọ ya ume, sị: “Ya mere unu onwe unu na-enwekwa ihe mwute ugbu a: ma m ga-ahụ unu ọzọ [mgbe m bilitere n’ọnwụ], obi unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-anara unu ọṅụ unu.”
Ruo ugbu a, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ndị ozi ahụ rịọrọ ihe ọ bụla n’aha Jisọs. Ma ọ sịrị ugbu a: “Ọ bụrụ na unu ga-arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye unu ya n’aha m. . . . N’ihi na Nna m onwe ya na-ahụ unu n’anya, n’ihi na unu onwe unu hụworo m n’anya, kwerekwa na mụ onwe m siri n’ebe Nna m nọ pụta. Esiri m ná Nna m pụta, abịawokwa m n’ụwa: ọzọ, ana m ahapụ ụwa, na-agakwurukwa Nna m.”
Okwu Jisọs bụ oké ihe agbamume nye ndị ozi ahụ. Ha sịrị, “Nke a ka anyị ji kwere na i siri n’ebe Chineke nọ pụta.”
Jisọs jụrụ, sị, “Ọ̀ bụ ugbu a ka unu kwere? Lee, oge hour na-abịa, ọ bịawokwa, ka unu ga-agbasa, onye ọ bụla ọ laa na nke ya, unu ga-ahapụkwa nanị m.” Ọ bụ ezie na nke a yiri ihe na-apụghị ime eme, o mere tupu anyasị ahụ agabiga!
Jisọs mechiri okwu ya, na-asị, “Okwu ndị a ka m gwaworo unu, ka unu wee nwee udo n’ime m. N’ụwa unu na-enwe mkpagbu: ma nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.” Jisọs meriri ụwa site n’iji ikwesị ntụkwasị obi mezuo uche Chineke n’agbanyeghị ihe nile Setan na ụwa ya mere iji mebie nguzosi ike nke Jisọs.
Ekpere Mmechi n’Ọnụ Ụlọ ahụ Dị n’Elu
N’ịbụ onye ịhụnanya dị omimi o nwere n’ahụ ndị ozi ya kpaliri, Jisọs anọwo na-akwadebe ha maka ọpụpụ ya n’isi nso. Ugbu a, mgbe o nyesịworo ha ndụmọdụ, kasiekwa ha obi ruo ogologo oge, o weliri anya ya n’eluigwe wee rịọ Nna ya arịrịọ, sị: “Nye ọkpara gị otuto, ka ọkpara gị wee nye gị otuto: dị ka i nyere ya ike n’ebe mmadụ nile nọ, ka ihe ọ bụla i nyeworo ya, ka o wee nye ha ndụ ebighị ebi.”
Lee nnọọ isiokwu na-akpali akpali Jisọs na-ewebata n’ebe a—ndụ ebighị ebi! Ebe e nyeworo ya “ike n’ebe mmadụ nile nọ,” Jisọs pụrụ inye ihe nile a kpọrọ mmadụ ndị na-anwụ anwụ abamuru nke àjà mgbapụta ya. Ma ọ bụ nanị ndị Nna ya nwapụtaworo ka ọ na-enye “ndụ ebighị ebi.” N’ịga n’ihu n’isiokwu a metụtara ndụ ebighị ebi, Jisọs gara n’ihu n’ekpere ya, sị:
“Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” Ee, nzọpụta dabeere n’anyị ịnara ihe ọmụma banyere ma Chineke ma Ọkpara ya. Ma a chọrọ ihe karịrị nanị ihe ọmụma e bu n’isi.
Mmadụ aghaghị ịmara ha n’ụzọ chiri anya, na-ewulite ezi mmekọrịta enyi na enyi n’etiti ya na ha. Mmadụ aghaghị iche echiche dị ka ha si eche n’okwu dị iche iche, hụkwa ihe dị iche iche otú ha si ahụ ha. Karịsịakwa ihe nile, mmadụ aghaghị ịgbalịsi ike iṅomi àgwà ha ndị na-enweghị atụ n’imeso ndị ọzọ ihe.
Jisọs gara n’ihu n’ekpere ya, sị: “Mụ onwe m nyere gị otuto n’elu ụwa, ebe m rụzuru ọrụ i nyeworo m ka m rụọ.” Ebe o siworo otú a rụzuo ọrụ e kenyere ya ruo ugbu a, na-enwekwa obi ike na ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ọdịnihu, ọ rịọrọ arịrịọ, sị: “Nna, gị onwe gị werekwa otuto nke m nwere n’ebe ị nọ mgbe ụwa akadịghị nye m otuto ugbu a n’ebe gị onwe gị nọ.” Ee, ugbu a, ọ na-arịọ ka a kpọghachi ya n’ebube eluigwe o nwere na mbụ site n’ịkpọlite ya n’ọnwụ.
N’ịchịkọta ọrụ bụ isi ọ rụrụ n’elu ala, Jisọs sịrị: “Emere m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i nyere m site n’ụwa: gị onwe gị nwere ha, i weerekwa ha nye m; ha edebewokwa okwu gị.” Jisọs jiri aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe n’ije ozi ya, gosikwa otú kwesịrị ekwesị e si akpọpụta ya, ma o mere ihe karịrị nke ahụ iji mee ka aha Chineke pụta ìhè nye ndị ozi ya. Ọ mụbakwara ihe ọmụma na nghọta ha nwere banyere Jehova, ụdị onye ọ bụ, na nzube ya nile.
N’igosi na Jehova bụ Onye ka ya onwe ya ukwuu, Onye ya onwe ya na-eje ozi n’okpuru ya, Jisọs ji obi umeala kwupụta, sị: “Okwu i nyere m ka m nyeworo ha; ha onwe ha wee nara ha, marakwa n’ezie na esi m n’ebe ị nọ pụta, ha kwerekwa na gị onwe gị zitere m.”
N’igosi ọdịiche dị n’etiti ndị na-eso ụzọ ya na ihe fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ, Jisọs gara n’ihu ikpe ekpere, sị: “Ọ bụghị ụwa ka m na-ekpe ekpere banyere ya, kama ana m ekpe ekpere banyere ndị i nyeworo m . . . Mgbe mụ na ha nọrịị, mụ onwe m na-edebe ha . . . echekwara m ha, ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ha lara n’iyi, ma ọ bụghị nwa nke ịla n’iyi ahụ,” bụ́ Judas Iskarịọt. Ka ọ dị mgbe ahụ, Judas nọ na njem ọjọọ ya ịrara Jisọs nye. Otú a, Judas na-emezu Akwụkwọ nsọ n’amaghị ama.
“Ụwa kpọkwara ha asị,” ka Jisọs gara n’ihu ikwu n’ekpere. “Ekpeghị m ekpere ka i wepụ ha n’ụwa, kama ka i debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ. Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” Ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ n’ime ụwa, bụ́ usoro ọha ụmụ mmadụ nke Setan na-achị, ma ha dị iche n’ebe ya na ajọ omume ya dị, ha aghaghị ịnọgidekwa otú ahụ.
Jisọs gara n’ihu ịsị, “Were eziokwu doo ha nsọ: okwu gị bụ eziokwu.” N’ebe a, Jisọs kpọrọ Akwụkwọ Nsọ Hibru ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee, nke o si na ya hota okwu ọtụtụ ugbo, “eziokwu.” Ma ihe o ziri ndị na-eso ụzọ ya na ihe ha mesịrị dee n’okpuru ike mmụọ nsọ dị ka Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụkwa “eziokwu.” Eziokwu nke a pụrụ ido mmadụ nsọ, gbanwee ndụ ya kpam kpam, meekwa ka ọ bụrụ onye dị iche pụọ n’ụwa.
Ugbu a, Jisọs kpere ekpere, ‘ọ bụghị nanị banyere ndị a, kamakwa banyere ndị kweere na [ya] site n’okwu ha.’ Ya mere, Jisọs na-ekpe ekpere banyere ndị gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ nakwa ndị gaje ịghọ ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu, bụ́ ndị a ka gaje ịchịkọbata ‘n’otu ìgwè atụrụ.’ Gịnị ka ọ rịọrọ arịrịọ ya banyere ndị a nile?
“Ka ha nile wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị dị n’ime m, dị ka mụ onwe m dịkwa n’ime gị, Nna, . . . ka ha wee bụrụ otu, dị ka anyị onwe anyị bụ otu.” Jisọs na Nna ya abụghị otu onye n’ụzọ nkịtị, ma ha na-enwe nkwekọrịta n’ihe nile. Jisọs kpere ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya nwee otu ụdị ịdị n’otu ahụ “ka ụwa wee mara na gị onwe gị zitere m, na ị hụkwara ha n’anya, dị ka ị hụrụ m n’anya.”
Ugbu a, Jisọs rịọrọ Nna ya nke eluigwe arịrịọ n’isi ndị ahụ gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ. N’ihi gịnị? “Ka, ebe mụ onwe m nọ, ka mụ na ndị ahụ nọọkwa; ka ha wee hụ otuto m, nke i nyeworo m: n’ihi na ị hụrụ m n’anya mgbe a katọghị ntọala ụwa,” ya bụ, tupu Adam na Iv atụrụ ime nwa mbụ ha. Ogologo oge tupu mgbe ahụ, Chineke hụrụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’anya, bụ́ onye ghọrọ Jisọs Kraịst.
N’imechi ekpere ya, Jisọs kwusikwara ya ike ọzọ, sị: “Emekwara m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka ha mara ya; ka ịhụnanya i ji hụ m wee dị n’ime ha, mụ onwe m kwa n’ime ha.” Nye ndị ozi ahụ, ịmụta aha Chineke agụnyewo ịmara ịhụnanya Chineke n’onwe ha kpọmkwem. Jọn 14:1–17:26; 13:27, 35, 36; 10:16; Luk 22:3, 4; Ọpụpụ 24:10; 1 Ndị Eze 19:9-13; Aịsaịa 6:1-5; Ndị Galetia 6:16; Abụ Ọma 35:19; 69:4; Ilu 8:22, 30.
▪ Olee ebe Jisọs na-aga, azịza dịkwa aṅaa ka Tọmas nwetara n’ihe banyere ụzọ e si eje ebe ahụ?
▪ Site n’arịrịọ ya, gịnị ka o yiri ka Filip ọ̀ chọrọ ka Jisọs nye?
▪ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na onye hụworo Jisọs ahụwokwa Nna ahụ?
▪ Olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-esi rụọ ọrụ dị ukwuu karịa otú ọ rụrụ?
▪ N’echiche dị aṅaa ka Setan na-enweghị ihe ọ bụla n’ime Jisọs?
▪ Olee mgbe Jehova kụrụ osisi vine ihe atụ ahụ, oleekwa mgbe ndị ọzọ ghọrọ akụkụ nke vine ahụ, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
▪ N’ikpeazụ, alaka ole ka osisi vine ihe atụ ahụ mesịrị nwee?
▪ Mkpụrụ dị aṅaa ka Chineke na-achọ n’alaka ndị ahụ?
▪ Olee otú anyị pụrụ isi ghọọ ndị enyi nke Jisọs?
▪ N’ihi gịnị ka ụwa ji akpọ ndị na-eso ụzọ Jisọs asị?
▪ Okwu ịdọ aka ná ntị dị aṅaa nke Jisọs kwuru nyere ndị ozi ya nsogbu?
▪ N’ihi gịnị ka ndị ozi ahụ na-ejighị jụọ Jisọs ajụjụ banyere ebe ọ na-eje?
▪ Gịnị ka ndị ozi ahụ na-aghọtaghị n’ụzọ bụ isi?
▪ Olee otú Jisọs si mee ihe atụ iji gosi na ọnọdụ ndị ozi ahụ ga-agbanwe site ná mwute gaa n’ọṅụ?
▪ Gịnị ka Jisọs sịrị na ndị ozi ahụ gaje ime n’oge na-adịghị anya?
▪ Olee otú Jisọs si merie ụwa?
▪ N’echiche dị aṅaa ka e nyeworo Jisọs “ike n’ebe mmadụ nile nọ”?
▪ Gịnị ka ọ pụtara bụ ịnara ihe ọmụma nke Chineke na nke Ọkpara ya?
▪ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jisọs si mee ka aha Chineke pụta ìhè?
▪ Gịnị bụ “eziokwu,” oleekwa ụzọ o si ‘edo onye Kraịst nsọ’?
▪ Olee ụzọ Chineke, Ọkpara ya, na ndị nile na-efe ezi ofufe si bụrụ otu?
▪ Olee mgbe a ‘tọrọ ntọala ụwa’?