Ndụ na Ije Ozi jisọs
Inweta Ọn̄ụ ná Mmekọrịta Chiri Anya
MGBE oriri ememe ncheta ahu gasịrị, Jisọs anọwo jiri okwu ndị sitere n’ala ala obi ya na-agba ndị ozi ya ume n’ụzọ a na-emeghị oké nkwadebe maka ya. Ọ pụrụ ịbụ na ọ gafewo etiti abalị. Ya mere Jisọs gbara ha ume, si: “Bilienụ, ka anyị si n’ebe a pụọ.” Otú ọ dị, tupu ha apụọ, Jisọs, n’ịbụ onye ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ kpaliri, gara n’ihu ikwu okwu, na-eme ihe atụ na-akpali akpali.
Ọ malitere site n’ịsị: “Mụ onwe m bụ ezi osisi vine, Nna m bụkwa onye ọrụ ubi.” Oké Onye Ọrụ Ubi ahụ, bụ́ Jehova Chineke, kụrụ mkpụrụ vine ihe atụ nke a mgbe o jiri mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ n’oge o mere baptism ná mmalite oge ọkọchị nke afọ 29 O.A. Ma Jisọs gara n’ihu igosi na vine ahụ nọchiri anya ihe karịrị nanị ya onwe ya, na-ekwu, sị:
“Alaka ọ bụla n’ime m nke na-adịghị amị mkpụrụ, o wepụ ya: alaka ọ bụla nke na-amị mkpụrụ, ọ na-emekwa ya ka ọ dị ọcha, ka o wee mịa mkpụrụ karị. . . . Dị ka alaka na-apụghi ịmị mkpụrụ n’onwe ya, ọ bụrụ na ọ nọgideghị n’osisi vine; otú a ka unu onwe unu na-apụghị, ọ bụrụ na unu anọgideghị n’ime m. Mụ onwe m bụ osisi vine ahụ, unu onwe unu bụ alaka nke m.”
Na Pentikọst, mgbe 51 ụbọchị gasịrị, ndị ozi ahụ na ndị ọzọ ghọrọ alaka nke vine ahụ mgbe a wụkwasịrị ha mmụọ nsọ. N’ikpeazụ, 144,000 mmadụ mesịrị ghọọ alaka dị iche iche nke osisi vine ihe atụ ahụ. Ndị a na ógwè osisi vine ahụ, bú Jisọs Kraịst, mejupụtara osisi vine ihe atụ ahụ nke na-amịpụta mkpụrụ nke Alaeze Chineke.
Jisọs na-akọwa ihe na-enye aka n’ịmịpụta mkpụrụ, sị: “Onye na-anọgide n’ime m, mụ onwe m kwa n’ime ya, onye ahụ na-amị mkpụrụ hie nne: n’ihi na unu apụghi ime ihe ọ bụla ma mụ onwe m anọghi ya.” Otú ọ dị, Jisọs sịrị na ọ bụrụ na mmadụ amịpụtaghị mkpụrụ, “a tụpụ ya n’èzí dị ka alaka, ọ kpọnwụọkwa; ha wee chịkọta ha, tụba ha n’ọkụ, e wee rechapụ ha ọkụ.” N’aka nke ọzọ, Jisọs kwere nkwa, sị: “Ọ bụrụ na unu na-anọgide n’ime m, ọ bụrụkwa na okwu m na-anọgide n’ime unu, rịọnu ihe ọ bụla unu na-achọ, a ga-emekwara unu ya.”
Jisọs gara n’ihu igwa ndị ozi ya ihe na-enye Nna ya otuto, nke bụ, “ka unu na-amị mkpụrụ hie nne; unu ga-abukwa ndị na-eso uzọ m.” Mkpụrụ nke Chineke na-atụ anya ya n’aka alaka ndị ahụ bụ ha igosipụta àgwà ndị yiri nke Kraịst, karịsịa ịhụnanya. Karịsịa, ebe ọ bụ na Kraịst bụ onye na-ekwusa Alaeze Chineke, mkpuru ahụ a chọrọ n’aka ha gụnyekwara ọrụ ha nke ime ndị na-eso ụzọ dị ka ya onwe ya mere.
Jisọs gbara ume ugbu a, sị, “Nọgidenụ n’ime ịhụnanya m.” Ma, olee ụzọ ndị ozi ya ga-esi mee nke a? Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m.” N’ịga n’ihu, Jisọs kọwara, sị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka m hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karịa nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.”
N’ime hour ole na ole, Jisọs gaje igosipụta ịhụnanya nke a na-enweghị atụ site n’ịtọgbọ ndụ ya n’ihi ndị ozi ya, nakwa ndị ọzọ nile ndị gaje itinye okwukwe na ya. Ihe nlereanya ya kwesịrị ịkpali ndị na-eso ụzọ ya inwe otu ụdị ịhụnanya ahụ nke ịchụ onwe onye n’àjà n’ebe ibe ha nọ. A ga-eji ịhụnanya nke a mara ha, dị ka Jisọs kwuwororịị n’oge gara aga, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”
N’ime ka a mara ndị bụ enyi ya, Jisọs sịrị: “Unu onwe unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu emee ihe mụ onwe m na-enye unu n’iwu. Akpọkwaghị m unu ndị ohu ọzọ site n’ugbu a; n’ihi na ohu adịghị amata ihe onyenwe ya na-eme: ma akpọwo m unu ndị enyi; n’ihi na ihe nile m nụrụ site n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.”
Lee nnọọ mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke a bụ inwe—ịbu ndị ezi enyi nke Jisọs! Ma iji wee nọgide na-enwe ezi mmekọrịta nke a, ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ịnọgide na-amịpụta mkpụrụ.’ Jisọs sịrị na ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, “ihe ọ bụla unu ga-arịọ Nna m n’aha m, [ọ ga-enye] unu ya.” N’ezie, nke ahụ bụ oké nkwụghachi ụgwọ maka ịmị mkpụrụ Alaeze!
Mgbe ọ gbasịrị ndị ozi ahụ ume ọzọ ka ha “hụrịta ibe [ha] n’anya,” Jisọs kọwara na ụwa ga-akpọ ha asị. Ma ọ kasịrị ha obi, sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu maara na ọ kpọwo mụ onwe m asị mgbe ọ kakpọghị unu asị.” Jisọs gara n’ihu ịkọwa ihe mere ụwa ji kpọọ ndị na-eso ụzọ ya asị, na-asị: “N’ihi na unu [abụghị akụkụ nke ụwa, NW] kama mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.”
N’ịga n’ihu n’ịkọwa ihe kpatara ụwa ji akpọ ha asị, Jisọs gara n’ihu ikwu, sị: “Ihe ndị a nile ka ha ga-eme unu n’ihi aha m, n’ihi na ha amataghị onye zitere m [Jehova Chineke].” Ya mere, ọrụ ebube nile nke Jisọs na-ama ndị ahụ kpọrọ ya asị ikpe, dị ka ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụrụ na arụghị m ọrụ n’etiti ha nke onye ọzọ na-arụghị, ha agaghị enweworị mmehie: ma ugbu a ha ahụwo kpọọkwa mụ na Nna m asị.” Jisọs sịrị na akwụkwọ nsọ sịrị otú a wee mezuo: “Ha kpọrọ m asị n’efu.”
Dị ka o meworo tupu mgbe ahụ, Jisọs kasikwara ha obi ọzọ site n’ikwe nkwa izite ihe enyemaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, nke bụ ike ọrụ nke Chineke. “Onye ahụ ga-agbara m àmà: unu onwe unu na-agbakwa àmà.” Jọn 14:31-15:27; 13:3, 35; Ndị Galetia 6:16; Abụ Ọma 35:19; 69:4.
▪ Olee mgbe Jehova kụrụ osisi vine ihe atụ ahụ, ole mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ndị ọzọ si ghọọ akụkụ nke vine ahụ?
▪ N’ikpeazụ, alaka ole ka osisi vine ihe atụ ahụ mesịrị nwee?
▪ Mkpụrụ dị aṅaa ka Chineke na-achọ n’alaka ndị ahụ?
▪ Olee otú anyị pụrụ isi ghọọ ndị enyi nke Jisọs?
▪ N’ihi gịnị ka ụwa ji akpọ ndị na-eso ụzọ Jisọs asị?