Akara Aka Ò Kwesịrị Ịchị Ndụ Gị?
NÁ NDEPUTA ahụ, nanị onye na-ekweghị n’akara aka bụ Jisọs Kraịst. Gịnị bụ echiche ya?
Akụkọ ndụ Jisọs ndị ahụ e dere na narị afọ mbụ (akwụkwọ Bible ndị ahụ bụ Matiu, Mak, Luk, na Jọn) na-eme ka ọ pụta ìhè na o kwere na ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ịgbanwe ọdịnihu ha, nke pụtara nnọọ ihe ga-eme ha.
Dị ka ihe atụ, Jisọs kwuru na Chineke ‘ga-enye ndị na-arịọ ya ezi ihe’ na ọ bụkwa “onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, . . . ka a ga-azọpụta.” N’otu aka ahụkwa, mgbe ndị bi na Jerusalem jụrụ ịdọ aka ná ntị nke gaara azọpụtaworị ndụ ha, Jisọs ekwughị na ọ bụ akara aka ka ụta dịịrị maka mmeghachi omume ha. Kama nke ahụ, ọ’sịrị: “Unu achọghị.”—Matiu 7:7-11; 23:37, 38; 24:13.
Anyị pụkwara ịchọpụta ụzọ Jisọs si ele ihe anya site n’ihe o kwuru banyere otu ajọ ihe ọghọm nke mere na Jerusalem, na-asị: “Mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị ụlọ elu dị na Sailoam dakwasịrị ha, wee gbuo ha, ùnu na-eche na ndị ahụ bụ ndị ji ụgwọ karịa mmadụ nile ndị bi na Jerusalem? Asị m unu, Ee e.” (Luk 13:4, 5) Rịba ama na Jisọs ekwughị na ọ bụ akara aka kpatara ọnwụ mmadụ 18 ndị ahụ, o kwughịkwa na ha nwụrụ n’ihi na ha bụ ndị ajọ omume karịa ndị ọzọ. Kama nke ahụ, n’ụzọ na-adịghị ka ndị Farisii nke oge ya, ndị gbalịrị ime ka ikwere n’akara aka kwekọọ n’ikwere ná nnwere onwe nke mmadụ ime nhọrọ, Jisọs kuziri na mmadụ pụrụ ịgbanwe ọdịnihu nke onwe ya.
Ndị na-eso ụzọ Jisọs kuzikwara na nzọpụta bụ ihe nhọrọ nke mmadụ nile pụrụ inweta. Pọl onyeozi dere, sị: “Ị makwaara na i sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọputa.” Pita onyeozi kwukwara, sị: “Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike, ka unu wee were ya na-eto eto ruo nzọputa.” (2 Timoti 3:15; 1 Pita 2:2; leekwa Ọrụ Ndị Ozi 10:34, 35; 17:26, 27.) Akwụkwọ Hastings bụ Encyclopoedia of Religion and Ethics mere ka ọ pụta ìhè na ndị dere ihe n’ime narị afọ nke abụọ na nke atọ, dị ka Justin, Origen, na Irenaeus, ‘amaghị ihe ọ bụla banyere ọdịnihu a kara aka n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe; ha kuziri mmadụ inwere onwe ya ime ihe ọ bụla ọ họọrọ ime.’
Ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị, gụnyere ọtụtụ ndị Juu ndị gbara ha gburugburu kwere n’ụdị dị iche iche nke akara aka, gịnị mere Jisọs na ndị Kraịst oge gboo ekweghị na ọdịnihu mmadụ bụ ihe e bu ụzọ kaa aka n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe? Otu ihe kpatara ya bụ na echiche ahụ jupụtara ná nsogbu. Iji kpọtụ abụọ aha: Ikwere n’akara aka megidere àgwà nile nke Jehova Chineke; ihe ndị bụ eziokwu a ma ama na-egosipụta na ọ bụghị eziokwu. Ọzọkwa, ọ pụrụ itinye ndụ gị nke ugbu a na nke ọdịnihu n’ihe ize ndụ. Ilebakwu anya nke ọma n’okwu ahụ ga-egosi gị ụzọ o si bụrụ otú ahụ.
Ihe Ikwere n’Akara Aka Metụtara na Àgwà Nile nke Chineke
Laa azụ na narị afọ nke atọ T.O.A., onyeọkà ihe ọmụma bụ Zeno onye Citium kuziiri ụmụ akwụkwọ ya nọ n’Atens ka ha “nakwere mkpebi nke Akara Aka dị ka nke bụ ihe kasị mma n’ụzọ dị nzuzo.” Otú ọ dị, otu ụbọchị, mgbe Zeno nụsịrị na ikpe izu ohi mara ohu ya, Zeno chere ihu ihe nkuzi ya ahụ metụtara kpọmkwem. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Mgbe o tiri onye ohi ahụ ihe, ohu ahụ kwughachiri, si: “Ma ọ bụ ihe di n’akara aka m na m ga-ezu ohi.”
Ọ dị ihe ziri ezi n’ihe ohu Zeno kwuru. Ọ bụrụ na i kwere na a na-ebu ụzọ kpebie ihe ga-abụ ndụ mmadụ, mgbe ahụ, ịta mmadụ ụta n’ihi na ọ ghọrọ onye ohi yiri ịta mkpụrụ oroma ụta maka ipupụta osisi oroma. E kwuwerị, ma nwoke ahụ ma mkpụrụ ahụ topụtara dị ka ụkpụrụ a haziworo n’ime ha si dị. Ma, gịnị bụ nsogbu kasị elu nke ụdị echiche ahụ metụtara?
Ọ dị mma, ọ bụrụ na ihe ndị omempụ na-eme bụ nanị ịgbaso akara aka ha, mgbe ahụ, ọ bụ onye ahụ nke kpebiri ihe ga-abụ akara aka ha ka ụta dịịrị maka ihe ndị ha na-eme. Ònye ka ọ ga-abụ? Dị ka ndị kweere n’akara aka si kwuo, ọ bụ Chineke n’onwe ya. N’ijiri echiche nke a gakwuo n’ihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ di ukwuu, ọ ghaghị ịbụzinụ Chineke bụ Onye Mbụ Kpatara ajọ omume nile, ime ihe ike, na mmegbu nile mmadụ meworo mgbe ọ bụla. Ị̀ na-anakwere nke ahụ?
Otu ihe odide dị n’akwụkwọ akụkọ bụ Nederlands Theologisch Tijdschrift (Akwụkwọ Ọkà Mmụta Okpukpe ndị Netherlands) kwuru na echiche dị otú ahụ nke ikwere n’akara aka “na-egosipụta ọdịdị Chineke nke a na-apụghị ịkwado akwado, ma ọ dịghị ihe ọzọ nye ndị Kristian.” Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na o megidere ọdịdị nke Chineke nke ndị sitere n’ike mmụọ nsọ dee Bible gosipụtara. Dị ka ihe atụ, rịba ama okwu ndị a e hotara site n’akwụkwọ Abụ Ọma ahụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ: “Ọ bụghị Chineke nke mmebi iwu na-atọ ụtọ ka ị bụ.” “Onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi ya na-akpọ asị.” “Ọ [Eze Mesaịa ahụ Chineke họpụtaworo] ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.” (Abụ Ọma 5:4; 11:5; 72:14) N’ụzọ doro anya, ikwere n’akara aka na àgwà nile nke Chineke na-asọkọta isi.
Ikwere n’Akara Aka na Ihe Ndị Mere Eme
Ma gịnị banyere ọdachi ndị na-emere onwe ha? Ọ̀ bụ na ha abụghị ihe ndị e bu ụzọ kaa aka na ha aghaghị ime, wee si otú a bụrụ ihe a na-apụghị izere ezere?
Gịnị ka ihe ndị mere eme na-egosipụta? Rịba ama ihe sitere n’ihe ọmụmụ nke e mere banyere ihe ndị na-akpata ọdachi ndị na-emere onwe ha, dị ka akwụkwọ akụkọ ndị Netherlands bụ NRC Handelsblad si kọọ ya: “Ruo ugbu a, a na-ele ala ọma jijiji, iju mmiri, nzebiri ala, na oké ifufe anya . . . dị ka ihe mberede ndị na-eme site n’usoro okike. Otú ọ dị, ilebakwu anya nke ọma n’okwu ahụ na-egosi na mmadu itinye aka nke ukwuu n’usoro okike enwewo mmetụta dị ukwuu n’ikike gburugburu ebe obibi nwere ichebe onwe ya mgbe ihe ọdachi mere. N’ihi nke a, ọdachi ndị na-emere onwe ha na-egbu ọtụtụ mmadụ karịa ka ọ metụworo mgbe ọ bụla na mbụ.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
Iju mmiri ndị ahụ mere na Bangladesh nke e hotara n’isiokwu bu nke a ụzọ bụ otu ihe atụ. Ndị ọkà mmụta sayensị ekwuwo ugbu a na “mbibisị nke oké ọhịa dị ukwuu na Nepal, Ebe Ugwu India, na Bangladesh abụwo otu isi ihe so kpata iju mmiri ndị mekpaworo Bangladesh ahụ n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga.” (Magazin bụ Voice) Otu akụkọ ọzọ na-asị na ibibisị oké ọhịa emewo ka ọ̀tụ̀tụ̀ e ji enwe iju mmiri na Bangladesh mụbaa site n’ịbụ otu iju mmiri n’iri afọ ise ọ bụla gaa n’inwe otu n’afọ anọ ọ bụla. Ihe omume ndị ọzọ dị otú a nke ntinye aka ụmụ mmadụ n’akụkụ ụwa ndị ọzọ arụpụtawokwa ihe ndị dị njọ—oké ụkọ mmiri ozuzo, ọkụ nke na-agba n’oké ọhịa, na nzebiri nke ala. Ee, ihe omume ụmụ mmadụ—ọ bụghị akara aka nke dị omimi—na-akpatakarị ma ọ bụ na-eme ka ọdachi ndị na-emere onwe ha na-adị njọ karị.
Ebe ọ dị otú ahụ, ihe omume ụmụ mmadụ kwesịkwara ime ihe megidere nke a: ibelata ọdachi. Ọ̀ dị otú ahụ? N’ezie ọ dị otú ahụ. Tụlee ihe ndị a: Òtù UNICEF (United Nations Children’s Fund [òtù na-elekọta ọnọdụ mberede ụmụntakịrị]) kọrọ na ruo ọtụtụ afọ, ọtụtụ narị ụmụntakịrị ndị bi n’ime ime obodo Bangladesh na-ekpu ìsì. Ọ̀ bụ akara aka a na-apụghị ịgbanwe agbanwe kpatara nke a? Ọ dịghị ma ọlị. Mgbe ndị ọrụ UNICEF mere ka ndị inyom mụrụ ụmụ ndị bi n’ebe ahụ na-enye ezinụlọ ha, ọ bụghị nanị osikapa, kama ka ha na-enyekwa ha mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri, ọrịa anya ahụ malitere ibelata. Ka ọ dị ugbu a, mgbanwe usoro nri nke a azọpụtawo ọtụtụ narị ụmụntakịrị ndị Bangladesh pụọ n’ikpu ìsì.
N’otu aka ahụ, ndị na-adịghị ese sịga na-adị ndụ, ná nkezi, afọ atọ ma ọ bụ anọ karịa ndị na-ese sịga. Ndị na-anọ n’ime ụgbọ ala, ndị na-ekegide onwe ha belt oche moto na-enwe ihe ọghọm ndị dị njọ ole na ole karịa ndị na-adịghị eke ya. O doro anya na ọ bụ ihe ndị ị na-eme n’onwe gị—ọ bụghị akara aka—na-emetụta ndụ gị.
Ajọ Ihe Na-esi na Nkwenkwe n’Akara Aka Apụta
Dị ka e hotaworo, ikwere n’akara aka pụkwara igbubilata ndụ gị. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? N’ịtụle “ihe atụ dị iche iche nke ikwere n’akara aka ndị dị egwu karị,” akwụkwọ bụ The Encyclopedia of Religion kwuru, sị: “Site n’Agha Uwa nke Abụọ, anyị maara banyere mgbe dị iche iche ndị Japan ji ogbunigwe na-aga n’okpuru mmiri buso ndị ọzọ agha n’ụzọ ga-akpatara ha onwe ha ọnwụ, nakwa banyere ogbugbu onwe onye ndị e mere n’ogige ndị agha SS (Schutzstaffel) n’oge ọchịchị Hitler iji meghachi omume n’echiche nke akara aka (Schicksal) nke e kwuru na ọ dị elu karịa uru nke ndụ ndị mmadụ n’otu n’otu.” Otu ihe odide ahụ kwukwara na n’oge na-adịbeghị anya nke ukwuu, “mbuso agha ndị okpukpe kpaliri n’ụzọ ndị ga-akpatara ndị mere mbuso agha ahụ ọnwụ megide ebe dị iche iche e lere anya dị ka ihe iyi egwu megide okpukpe Alakụba . . . fọrọ nke nta ka ọ ghọọ ihe a na-anụ mgbe dum n’akụkọ ndị dị n’akwụkwọ akụkọ banyere Ebe Ọwụwa Anyanwụ Dị Nso.” Akụkọ ndị ahụ na-akọ na ọtụtụ puku ndị agha ka na-eto eto na-azọrọ ije banye n’ọgbọ agha, na-ekweresi ike na “ọ bụrụ na e deghị ya ede na mmadụ ga-anwụ, na ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme ya.”
Ma, ọbụna ndị nkuzi a na-enye nsọpụrụ n’okpukpe Alakụba adịghị ekwenyere omume dị otú ahụ nke itinye onwe onye n’ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, otu onye ji ọkwá caliph kwuru, sị: “Onye nọ n’ime ọkụ kwesịrị ịgbachi nkịtị ka uche Chineke mee; ma onye na-adababeghị n’ime ọkụ ekwesịghị ịtụba onwe ya n’ime ya.” Ọ bụ ihe mwute ịhụ na ọtụtụ ìgwè ndị agha emebeghị ihe kwekọrọ na ndụmọdụ nke onye caliph ahụ. N’ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ asatọ nke ibu agha, e gbuwo ihe e chere na o ruru 400,000 ndị Iran—nke karịrị ọnụ ọgụgụ ndị United States nwụrụ n’Agha Ụwa nke Abụọ! O doro anya na ikwere n’akara aka pụrụ igbubilata ndụ gị. Ọ pụrụ ọbụna itinye ndụ gị nke ọdịnihu n’ihe ize ndụ. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?
Ebe ọ bụ na onye kwere n’akara aka na-ekwere na ọdịnihu bụ ihe a kara aka n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe dị ka a na-apụghị ịgbanwe mgbe gaworo aga, ọ pụrụ ịdịrị ya mfe iguzobe usoro akparamagwa dị ize ndụ. Ọ̀ bụ usoro akparamagwa dị aṅaa? Akwụkwọ bụ Encyclopedia of Theology na-akọwa, sị: “Onye ahụ . . . na-enwe mmetụta nke onye na-enweghị ihe ọ bụla ọ pụrụ ime iji nyere onwe ya aka, onye na-adịghị mkpa, onye na-abaghị oké uru n’usoro ihe omume ọha mmadụ nke o yiri ka ọ̀ bụ na ọ pụghị isi na ya wepụga onwe ya. Nke a na-akpali adịghị uchu nke na-adabere ná nkọwa nkwenkwe ụgha nke bụ na ihe nile dabeere n’akara aka bụ ihe omimi nke nwekwara ike kasị elu.”
Gịnị mere adịghị uchu ji bụrụ oké ihe ize ndụ? Ọ na-edujekarị n’àgwà nkụda aka nke onye e meriri emeri. Nke a pụrụ igbochi onye ahụ kweere n’akara aka ịmalite ime ihe ọ bụla n’onwe ya ma ọ bụ ọbụna ịza ọkpụkpọ òkù dị ebube nke Chineke, bụ́: “Gee ntị, onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, bịanu ná mmiri ... Tọọnu ntị unu n’ala, bịakwute m, nurunu, mkpụrụ obi unu ewee di ndụ.” (Aịsaịa 55:1-3) Ọ bụrụ na ọ bụ ikwere n’akara aka na-akpata mmadụ ịghara ‘ịbịa’ na ‘ige ntị,’ ọ ga-eduje onye ahụ n’ịtụfu ohere ahụ nke ‘ịdị ndụ’ ebighị ebi n’ime Paradaịs ahụ na-abịanụ nke e weghachiri n’elu ala. Lee nnọọ oké mfù nke a ga-abụ!
Ya mere, olee ebe i guzo? Ọ bụrụ na i tolitere n’ógbè ebe ikwere n’akara aka bụ ihe ndabere bụ isi nke echiche ndị mmadụ, ọ pụrụ ịbụ na ị nakwerewo nkwenkwe ahụ n’ajụghị ajụjụ ọ bụla. Ma, ọ pụrụ ịbụ na ihe megidere echiche ahụ ndị a tụlere n’isiokwu nke a enyeworo gị aka ịhụ na, ruo n’ókè dị ukwuu, ndụ ị na-adị ugbu a na nke ị ga-adị n’ọdịnihu, dabeere n’ihe ndị i mere n’onwe gị.
Dị ka ị hụworo, ezi echiche, ihe ndị mere eme n’ezie, na, karịsịa ihe nile, Akwụkwọ Nsọ, na-egosi na i kwesịghị ikwe ka mmetụta nke àgwà ịbụ onye e meriri emeri n’ihi ikwere n’akara aka rikpuo gị. Kama nke ahụ, dị ka Jisọs gbara ume: “Gbalịsie ike . . . iji banye n’ụzọ ahụ nke dị warara.” (Luk 13:24, The Emphatic Diaglott, ihe e dere n’etiti ahịrị) Gịnị ka nke a pụtara? Otu onye na-akọwa Bible kọwara, sị: “Okwu ahụ [gbalịsie ike] bụ nke e nwetara site n’egwuregwu ndị Grik. N’ọgbụgba ọsọ ha dị iche iche . . . ha na-eme ndolị ma ọ bụ na-agbalisi ike, ma ọ bụ na-etinye ike ha nile iji nweta mmeri.” Kama ikwe ka mmetụta nke onye e meriri emeri rikpuo gị ná ndụ, Jisọs na-agba ume ka ị gbalịsie ike inweta mmeri!
Ya mere, tụpụsịa adịghị uchu nile nke sitere n’ikwere n’akara aka. Banye n’ọsọ ndụ ahụ dị ka Okwu Chineke gbara ume ka e mee, ekwekwala ka ikwere n’akara aka dọghachi gị azụ. (Lee 1 Ndị Kọrint 9:24-27.) Gbasikwuo ọsọ ahụ ike site n’ịzaghachi ngwa ngwa n’ọkpụkpọ òkù ahụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ: “Gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị.” Olee ụzọ ị pụrụ isi mee nhọrọ ahụ? “Ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu ya, na ịrapara n’ahụ ya.” Ime nke ahụ ga-eduje ná mmeri, n’ihi na Jehova ga-egosipụta onwe ya ịbụ “ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị.”—Deuterọnọmi 30:19, 20.
[Foto dị na peeji nke 7]
Mosis akuzighị akara aka kama Ọ gbara ume, sị: “Họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ.”