Isi 122
Site n’Ihu Paịlet Jee na nke Herọd Lọghachikwa
Ọ BỤ ezie na Jisọs emeghị mgbalị ọ bụla izochiri Paịlet eziokwu ahụ nke bụ na ya bụ eze, ọ kọwara na Alaeze ya abụghịrị Rom ihe iyi egwu ọ bụla. “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a,” ka Jisọs na-ekwu. “Ọ bụrụ na alaeze m sitere n’ụwa nke a, ndị na-ejere m ozi ga-alụ ọgụ, ka a ghara ịrara m nye n’aka ndị Juu: ma ugbu a alaeze m esighị n’ebe a pụta.” Otú a, Jisọs nakweere ugbo atọ na ya nwere Alaeze, ọ bụ ezie na ọ bụghị nke sitere n’elu ala.
Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Paịlet rụgidere ya gaa n’ihu sị: “Gị onwe gị [ị̀] bụkwa eze?” Ya bụ, ị̀ bụ eze, ọ bụ ezie na Alaeze gị esiteghị n’ụwa nke a.
Jisọs mere ka Paịlet mara na nkwubi okwu ya ahụ ziri ezi, na-aza, sị: “Gị onwe gị na-asị na mụ onwe m bụ eze. A mụwo mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka m wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke sitere n’eziokwu ahụ na-anụ olu m.”
Ee, ọnụnọ Jisọs nọ n’elu ala bụ iji gbaara “eziokwu ahụ” àmà, karịsịa, eziokwu banyere Alaeze ya. Jisọs dị njikere ikwesị ntụkwasị obi nye eziokwu ahụ ọbụna ma a sị na ọ ga-eme ka ọ tụfuo ndụ ya. Ọ bụ ezie na Paịlet jụrụ, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” o chereghị ka a kọwaara ya gaa n’ihu. Ọ nụwo ihe zuru ezu iji kpebie ikpe ahụ.
Paịlet jekwurughachiri ìgwè mmadụ ahụ na-echere n’èzí nke obíeze ahụ. O doro anya na Jisọs guzo n’akụkụ ya, o wee gwa ndị isi nchụàjà na ndị ahụ so ha, sị: “Ahụghị m ihe kwesịrị ahụhụ mmehie n’ahụ nwoke a.”
N’ịbụ ndị mkpebi ahụ kpasuru iwe, ìgwè mmadụ ahụ malitere ikwusi ike, sị: “Ọ na-akwali ndị Juu, na-ezi ihe n’ebe nile dị na Judia dum, na-amalitekwa site na Galili ruo ebe a.”
Ọ ghaghị ịbụ na ịnụ ọkụ n’obi ndị Juu nke ezi uche na-adịghị ya tụrụ Paịlet n’anya. Ya mere, ka ndị isi nchụàjà na ndị okenye ahụ nọgidere na-eti mkpu, Paịlet chighakwuuru Jisọs wee jụọ ya, sị: “Ị́ nụghị ka ọtụtụ ihe ha na-agba àmà megide gị hà?” N’agbanyeghị nke ahụ, Jisọs emeghị mgbalị ọ bụla ịzaghachi. Ọnụnọ ọ nọrọ jụụ n’agbanyeghị ebubo ụgha nile ndị ahụ bụụrụ Paịlet ihe ịtụnanya.
Mgbe ọ nụrụ na Jisọs bụ onye Galili, Paịlet hụrụ ụzọ ọ ga-esi gbụpụ onwe ya n’ihe banyere ya. Onye na-achị Galili, bụ́ Herọd Antipas (nwa Herọd Onye Ukwu ahụ), nọ na Jerusalem maka Ememe Ngabiga ahụ, ya mere, Paịlet zijeere ya Jisọs. Tupu mgbe ahụ, Herọd Antipas mere ka e bepụ isi Jọn Onye Na-eme Baptism, egwu jidekwara Herọd mgbe ọ nụrụ banyere ọrụ ebube ndị Jisọs na-arụ, na-atụ egwu na Jisọs bụ n’ezie Jọn, nke e meworo ka o si n’ọnwụ bilie.
Ugbu a, Herọd nwere ọṅụ dị ukwuu n’olileanya nke ịhụ Jisọs. Nke a abụghị n’ihi na o nwere nchegbu banyere ọdịmma Jisọs ma ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ime ezi mgbalị ọ bụla ịmata ma ebubo ndị ahụ e boro ya hà bụ eziokwu ma ọ bụ na ha abụghị. Kama nke ahụ, ọ bụ nanị ọchịchọ na olileanya efu ịhụ Jisọs mgbe ọ na-arụ ọrụ ebube kpaliri ya.
Otú ọ dị, Jisọs jụrụ ajụ imere Herọd ihe ahụ ọ chọrọ. N’eziokwu, ka Herọd na-ajụ ya ajụjụ, ọ zaghachighị okwu ọ bụla. N’ịbụ onye na-enwetaghị ihe ọ chọrọ, Herọd na ndị agha na-eche ya nche kwara Jisọs emo. Ha yikwasịrị ya uwe dị ọcha wee na-akwa ya emo. Ha wee zighachiri ya Paịlet. N’ihi nke a, Herọd na Paịlet, ndị bụbu ndị iro, ghọrọ ezi ndị enyi.
Mgbe Jisọs lọghachiri, Paịlet kpọkọtara ndị isi nchụàjà, ndị ọchịchị ndị Juu, na ìgwè mmadụ ahụ wee sị: “Unu kuteere m nwoke a, dị ka onye na-eduhie ndị Juu: ma lee, mụ onwe m kpere ya ikpe n’ihu unu, ma ahụghị m ihe ọ bụla n’ahụ nwoke a kwesịrị ahụhụ mmehie n’ihe nile unu ji bo ya ebubo: ee e, ọbụna Herọd ahụghị: n’ihi na o zighachiri ya nye anyị; leekwa, ọ dịghị ihe ọ bụla kwesịrị ọnwụ ka o meworo. Ya mere, m ga-adọ ya aka ná ntị, wee hapụ ya.”
Otú a, Paịlet kwupụtara ugbo abụọ na ọ dịghị ikpe mara Jisọs. Ọ chọsiri ike ịtọhapụ ya n’ihi na ọ chọpụtara na ọ bụ nanị n’ihi anyaukwu ka ndị nchụàjà ahụ nyefeworo ya n’aka ya. Ma, ka Paịlet gara n’ihu ịnwa ịtọhapụ Jisọs, ọ natara ihe mkpali ọzọ siri ike karị ime otú ahụ. Mgbe ọ na-anọdụ n’elu oche ikpe ya, nwunye ya ziteere ya ozi, na-agwa ya, sị: “Aka gị adịla n’okwu onye ezi omume ahụ: n’ihi na ahụjuru m ọtụtụ ihe anya ná nrọ [nke ihe àmà gosiri na o sitere n’aka Chineke] taa n’ihi ya.”
Ma, olee ụzọ Paịlet pụrụ isi tọhapụ nwoke nke a na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla, dị ka ọ maara na ya kwesịrị ime? Jọn 18:36-38; Luk 23:4-16; Matiu 27:12-14, 18, 19; 14:1, 2; Mak 15:2-5.
▪ Olee ụzọ Jisọs si zaa ajụjụ ahụ metụtara ọbụbụeze ya?
▪ Gịnị bụ “eziokwu ahụ” nke Jisọs tinyere ndụ elu ala ya ịgbara àmà?
▪ Gịnị bụ mkpebi Paịlet, olee ụzọ ndị ahụ si meghachi omume, gịnịkwa ka Paịlet mere banyere Jisọs?
▪ Ònye bụ Herọd Antipas, n’ihi gịnịkwa ka o ji nwebiga ọṅụ ókè ịhụ Jisọs, gịnịkwa ka o mere banyere ya?
▪ N’ihi gịnị ka Paịlet ji chọsie ike ịtọhapụ Jisọs?