Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 12/15 p. 8-9
  • Site n’Ihu Paịlat Jee na nke Herọd, Lọghachikwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Site n’Ihu Paịlat Jee na nke Herọd, Lọghachikwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Site n’Ihu Paịlet Jee na nke Herọd Lọghachikwa
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Paịlet na Herọd Achọpụta na Aka Jizọs Dị Ọcha
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ònye Bụ Pọntiọs Paịlet?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Paịlet Akpọnye Ndị Juu Jizọs, Ha Akpọrọ Ya Gaa Igbu
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 12/15 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Site n’Ihu Paịlat Jee na nke Herọd, Lọghachikwa

MGBE ndị Juu boro Jisọs ebubo na o kwuru na ya bụ eze, Paịlat banyeghachiri n’obieze onye ọchịchị ahụ ije jụọ ya ajụjụ. Ọ bụ ezie na Jisọs emeghị mgbalị ọ bụla ịkpuchi eziokwu ahụ nke bụ na ya bụ eze, ọ kọwara na Alaeze ya abụghịrị Rom ihe iyi egwu ọ bụla.

Jisọs gwara Paịlat, si, “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a: ọ bụrụ na alaeze m sitere n’ụwa nke a, ndị na-ejere m ozi ga-alụ ọgụ, ka a ghara ịrara m nye n’aka ndị Juu: ma ugbu a alaeze m esighị n’ebe a pụta.” Otú a, Jisọs nakweere ugbo atọ na ya nwere Alaeze, ọ bụ ezie na ọ bụghị nke sitere n’elu ala.

Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Paịlat rụgidere ya gaa n’ihu sị: “Gị onwe gị [ị̀] bụkwa eze?” Ya bụ, ị̀ bụ eze, ọ bụ ezie na Alaeze gị esiteghị n’ụwa nke a.

Jisọs mere ka Paịlat mara na nkwubi okwu ya ahụ ziri ezi, na-aza, sị: “Gị onwe gị na-asị na mụ onwe m bụ eze. A mụwo mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka m wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke sitere n’eziokwu ahụ na-anụ olu m.”

Ee, ọnụnọ Jisọs nọ n’elu ala bụ iji gbaara “eziokwu ahụ” àmà, karịsịa, eziokwu banyere Alaeze ya. A kwadebewo Jisọs ikwesị ntụkwasị obi nye eziokwu ahụ ọbụna ma a sị na ọ ga-eme ka o tufuo ndụ ya. Ọ bụ ezie na Paịlat jụrụ, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” o chereghị ka a kọwaara ya. Ọ nụwo ihe zuru ezu iji kpebie ikpe ahụ.

Paịlat jekwurughachiri ìgwè mmadụ ahụ na-echere n’èzí nke obieze ahụ. O doro anya na Jisọs guzo n’akụkụ ya, o wee gwa ndị ịsị nchụàjà na ndị ahụ so ha, sị: “Ahụghị m ihe kwesịrị ahụhụ mmehie n’ahụ nwoke a.”

N’ịbụ ndị mkpebi ahụ kpasuru iwe, ìgwè mmadụ ahụ malitere ikwusi ike, sị: “Ọ na-akwali ndị Juu, na-ezi ihe n’ebe nile dị na Judia dum, na-amalitekwa site na Galili ruo ebe a.”

Ọ ghaghị ịbụ na ịnụ ọkụ n’obi ndị Juu nke ezi uche na-adịghị ya tụrụ Paịlat n’anya. Ya mere, ka ndị isi nchụàjà na ndị okenye ahụ nọgidere na-eti mkpụ, Paịlat chighakwuuru Jisọs wee jụọ ya, sị: “ị́ nụghị ka ọtụtụ ihe ha na-agba àmà megide gị hà?” N’agbanyeghị nke ahụ, Jisọs emeghị mgbalị ọ bụla ịzaghachị. Ọnụnọ ọ nọrọ jụụ n’agbanyeghị ebubo ụgha nile ndị ahụ bụụrụ Paịlat ihe ịtụnanya.

Mgbe ọ nụrụ na Jisọs bụ onye Galili, Paịlat hụrụ ụzọ ọ ga-esi gbụpụ onwe ya n’ihe banyere ya. Onye na-achị Galili, bụ Herọd Antipas (nwa Herọd Onye Ukwu ahụ), nọ na Jerusalem maka Ememe Ngabiga ahụ, ya mere, Paịlat zijeere ya Jisọs. Tupu mgbe ahụ, Herọd Antipas mere ka e bepụ isi Jọn Onye na-eme baptism, egwụ jidekwara Herọd mgbe ọ nụrụ banyere ọrụ ebube ndị Jisọs na-arụ, na-atụ egwu na Jisọs bụ n’ezie Jọn, onye e meworo ka o si n’ọnwụ bilie.

Ugbu a, Herọd nwere ọṅụ dị ukwuu n’olileanya nke ịhụ Jisos. Nke a abụghị n’ihi na o nwere nchegbu banyere ọdịmma Jisọs ma ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ime ezi mgbalị ọ bụla ịmata ma ebubo ndị ahụ e boro ya hà bụ eziokwu ma ọ bụ na ha abụghị. Kama nke ahụ, ọ bụ nanị ọchịchọ na olileanya efu ịhụ Jisọs mgbe ọ na-arụ ọrụ ebube kpaliri ya.

Otú ọ dị, Jịsọs jụrụ ajụ imere Herọd ihe ahụ ọ chọrọ. N’eziokwu, ka Herọd na-ajụ ya ajụjụ, ọ zaghachighị okwu ọ bụla. N’ịbụ onye na-enwetaghị ihe ọ chọrọ, Herọd na ndị agha na-eche ya nche kwara Jisọs emo. Ha yikwasịrị ya uwe dị ọcha wee na-akwa ya emo. Ha wee zighachiri ya Paịlat. N’ihi nke a, Herọd na Paịlat, ndị bụbu ndị iro, ghọrọ ezi ndị enyi.

Mgbe Jisọs lọghachiri, Paịlat kpọkọtara ndị isi nchụàjà, ndị ọchịchị ndị Juu, na ìgwè mmadụ ahụ wee sị: “Unu kuteere m nwoke a, dị ka onye na-eduhie ndị Juu: ma lee, mụ onwe m kpere ya ikpe n’ihu unu, ma ahụghị m ihe ọ bụla n’ahụ nwoke a kwesịrị ahụhụ mmehie n’ihe nile unu ji bo ya ebubo: ee e, ọbụna Herọd ahụghị: n’ihi na o zighachiri ya nye anyị; leekwa, ọ dịghị ihe ọ bụla kwesịrị ọnwụ ka o meworo. Ya mere, m ga-adọ ya aka ná nti, wee hapụ ya.”

Otú a, Paịlat kwupụtara ugbo abụọ na ọ dịghị ikpe mara Jisọs. Ọ chọsiri ike ịtọhapụ ya n’ihi na ọ chọpụtara na ọ bụ nanị n’ihi anyaukwu ka ndị nchụàjà ahụ nyefeworo ya n’aka ya. Ma, ka Paịlat gara n’ihu ịnwa ịtọhapụ Jisọs, ọ natara ihe mkpali ọzọ siri ke karị ime otú ahụ. Mgbe ọ na-anọdụ n’elu oche ikpe ya, nwunye ya ziteere ya ozi, na-agwa ya, sị: “Aka gị adịla n’okwu onye ezi omume ahụ: n’ihi na ahụjuru m ọtụtụ ihe anya ná nrọ [nke ihe àmà gosiri na o sitere n’aka Chineke] taa n’ihi ya.”

Ma, olee ụzọ Paịlat ga-esi tọhapụ nwoke nke a na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla, dị ka ọ maara na ya kwesịrị ime? Jọn 18:36-38; Luk 23:4-16; Matiu 27:12-14, 18, 19; 14:1, 2; Mak 15:2-5.

◆ Olee ụzọ Jisọs si zaa ajụjụ ahụ metụtara ọbụbụeze ya?

◆ Gịnị bụ “eziokwu ahụ” nke Jisọs tinyere ndụ elu ala ya n’ịgbara àmà?

◆ Gịnị bụ mkpebi Paịlat, olee ụzọ ndị mmadụ si meghachi omume, gịnịkwa ka Paịlat mere banyere Jisọs?

◆ Ònye bụ Herọd Antipas, n’ihi gịnịkwa ka o ji nwebiga ọṅụ ókè ịhụ Jisọs, gịnịkwa ka o mere banyere ya?

◆ N’ihi gịnị ka Paịlat ji chọsie ike ịtọhapụ Jisọs?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya