Isi 124
E Nyefere Ya n’Aka Ha, E Wee Duru Ya Pụọ
MGBE Paịlet, n’ịbụ onye ịdị nwayọọ dị ùgwù nke Jisọs ahụ a na-ata ahụhụ metụrụ n’ahụ, nwara ọzọ ịtọhapụ ya, ndị isi nchụàjà ahụ malitere iwe iwe ọbụna karị. Ha ekpebisiwo ike ịhụ na ọ dịghị ihe gbochiri ha imezu nzube ọjọọ ha. Ya mere ha maliteghachiri iti mkpu ha, sị: “Kpọgbuo ya! Kpọgbuo ya!”—NW.
Paịlet zaghachiri, sị, “Unu onwe unu kpọrọ ya ma kpọgbuo ya.” (NW) (N’ụzọ megidere ihe ndị ahụ ha kwuru na mbụ, ọ pụrụ ịbụ na ndị Juu ahụ nwere ikike igbu ndị omempụ bụ́ ndị dara iwu siri ike n’ihe banyere okpukpe.) Ya mere, ya dịkarịa ala na nke ugbo ise ya, Paịlet kwupụtara na ikpe amaghị Jisọs, na-asị: “Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla o mere.”—NW.
Mgbe ha hụrụ na ebubo ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ahụ ha boro ya enweghị ike ịrụpụta ihe ọ bụla, ndị Juu ahụ laghahiri n’ebubo ahụ metụtara okpukpe nke bụ nkwulu Chineke, bụ́ nke ha jiworo mee ihe na hour ole na ole tupu mgbe ahụ n’oge a na-ekpe Jisọs ikpe n’ihu nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ. Ha sịrị, “Anyị onwe anyị nwere iwu, ma dị ka iwu ahụ si dị o kwesịrị ịnwụ ọnwụ, n’ihi na o mere onwe ya ọkpara Chineke.”
Ebubo nke a bụ ihe ọhụrụ ná ntị Paịlet, o mekwara ka ọ tụọ egwu karị. Ka ọ na-erule ugbu a, ọ ghọtawo na Jisọs abụghị mmadụ efu, ọbụna dị ka nrọ nwunye ya na ike ọdịdị mmadụ kwesịrị ịrịba ama Jisọs nwere na-egosi. Ma ọ̀ bụ “ọkpara Chineke”? Paịlet maara na Jisọs si Galili bịa. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ dịwo ndụ tupu mgbe ahụ? N’ịkpọrọ ya banyeghachi n’ime obíeze, Paịlet jụrụ, sị: “Olee ebe gị onwe gị si bịa?”
Jisọs nọgidere n’ekwughị okwu. Tupu mgbe ahụ, ọ gwawo Paịlet na ya bụ eze kama na Alaeze ya esiteghị n’ụwa nke a. Ọ dịghị nkọwa ọzọ ga-aba uru ugbu a. Otú ọ dị, ọjụjụ ọ jụrụ ịzaghachi wutere Paịlet, o wee jiri oké iwe tikwasị Jisọs mkpu, sị: “Ị́ dịghị ekwunyere m okwu? Ọ̀ bụ na ị maghị na m nwere ikike ịtọhapụ gị, na m nwekwara ikike ịkpọgbu gị?”—NW.
Jisọs ji nkwanye ùgwù zaghachi, sị, “Ị gaghị enwe ike ọ bụla imegide m, ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya rịị.” Ọ na-ekwu banyere onyinye ahụ Chineke nyere ụmụ mmadụ na-achị achị ike ilekọta ihe ndị a na-eme n’ụwa. Jisọs kwukwara, sị: “N’ihi nke a onye raara m nye n’aka gị nwere mmehie karị.” N’eziokwu, onye isi nchụàjà bụ Kaịafas na ndị ya na ha so gbakọọ izu na Judas Iskarịọt nwechara ibu ọrụ dị ukwuu karịa nke Paịlet n’ihi mmeso ikpe na-ezighị ezi e mesoro Jisọs.
N’ịbụ onye ihe banyere Jisọs metụrụ n’ahụ ọbụna karị, n’ịtụkwa egwu na ọ pụrụ ịbụ na Jisọs si n’eluigwe bịa, Paịlet maliteghachiri mgbalị ọ na-eme ịtọhapụ ya. Otú ọ dị, ndị Juu zaghachiri Paịlet n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù. Ha kwughachiri okwu ebubo ahụ metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, jiri akọ na-eyi ya egwu, sị: “Ọ bụrụ na ị hapụ onye a, ị bụghị enyi Siza: onye ọ bụla nke na-eme onwe ya eze na-ekwu okwu imegide Siza.”
N’agbanyeghị oké ihe nke a pụtara, Paịlet kpọpụtara Jisọs n’èzí ọzọ. O kwukwara ọzọ, sị, “Lee, Eze unu!”
“Kpọpụ ya! Kpọpụ ya! Kpọgbuo ya!”—NW.
N’amakwaghị ihe ọ ga-eme, Paịlet jụrụ, sị, “M̀ ga-akpọgbu eze unu?”—NW.
Ndị Juu atawo ahụhụ n’okpuru ọchịchị ndị Rom. N’eziokwu ha kpọrọ ọchịchị ndị Rom na-achị ha asị! N’agbanyeghị nke ahụ, ndị isi nchụàjà ahụ ji ihu abụọ kwuo, sị: “Anyị enweghị eze ma ọ bụghị Siza.”—NW.
N’ịtụ egwu banyere ọnọdụ ọchịchị ya na ùgwù o nwere, Paịlet mesịrị mee ihe ndị Juu ahụ nọgidere na-arịọ ka o mee. O nyefere Jisọs n’aka ha. Ndị agha yipụrụ Jisọs uwe odo odo ahụ ma yikwasị ya uwe elu ya. Ka e duuru Jisọs na-apụ ije kpọgbuo ya, a manyere ya ibu osisi ịta ahụhụ nke onwe ya.
Ka ọ dị ugbu a, chi abọchaala nnọọ nke ọma na Friday, Nisan 14; ma eleghị anya ọ na-achọ iru elekere anya iri na abụọ nke ehihie. Jisọs amụwo anya kemgbe isi ụtụtụ Thursday, o nwetawokwa ọtụtụ ahụhụ ihe mgbu. O kwere nghọta na ike gwụsịrị ya ngwa ngwa n’ihi ịdị arọ nke osisi ịta ahụhụ ahụ. Ya mere e jidere otu onye na-agafe n’ụzọ, bụ́ Saịmọn onye Saịrini nke dị n’Africa, ka o butere ya osisi ahụ. Ka ha nọgidere na-aga n’ihu, ọtụtụ ndị mmadụ, gụnyere ndị inyom sonyere, na-enwe oké mwute, na-akwakwara Jisọs ákwá.
N’ichigharịkwuru ndị inyom ahụ, Jisọs sịrị: “Ụmụ nwanyị Jerusalem, unu akwalara m ákwá, kama na-akwaranụ onwe unu na ụmụ unu. N’ihi na lee, ụbọchị na-abịa, mgbe ha ga-asị, Ngọzi [“Obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị inyom àgà, na afọ nke na-amụghị nwa, na ara nke na-azụghị nwa. . . . N’ihi na a sị na ha na-eme ihe ndị a mgbe osisi dị ndụ, gịnị ka a ga-eme mgbe ọ kpọrọ nkụ?”
Jisọs na-ezo aka n’osisi nke mba ndị Juu, nke ka dịtụ ndụ n’ihi ọnụnọ Jisọs na onwunwe e nwere ihe fọdụrụ ná ndị kwere na ya. Ma mgbe e wepụsịrị ndị a site ná mba ahụ, ọ bụ nanị osisi nke nwụworo anwụ n’ụzọ ime mmụọ ga-afọdụ, ee, òtù mba nke kpọworo nkụ. Oo, lee nnọọ ihe ga-akpata ịkwa ákwá a ga-enwe mgbe ndị agha Rom, ndị na-eje ozi dị ka ndị na-emezu ihe Chineke kpere n’ikpe, ga-ebibi mba ndị Juu ahụ! Jọn 19:6-17; 18:31; Luk 23:24-31; Matiu 27:31, 32; Mak 15:20, 21.
▪ Ebubo dị aṅaa ka ndị ndú okpukpe ahụ boro Jisọs mgbe ebubo ha ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụpụtaghị ihe ọ bụla?
▪ Ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka egwu ji tụọ Paịlet karị?
▪ Olee ndị nwere mmehie ka ukwuu n’ihi ihe mere Jisọs?
▪ N’ikpeazụ, olee ụzọ ndị nchụàjà si mee ka Paịlet nyefee Jisọs n’aka ha ka e jee gbuo ya?
▪ Gịnị ka Jisọs gwara ndị inyom ahụ na-akwara ya ákwá, gịnịkwa ka o bu n’uche site n’izo aka n’osisi ahụ dị ka nke “dị ndụ” e mesịakwa dị ka nke “kpọrọ nkụ”?