Isi 126
“N’ezie Nwoke a Bụ Ọkpara Chineke”
JISỌS anọbeghị ogologo oge n’elu osisi ahụ mgbe ọchịchịrị gbara na mberede n’etiti ehihie ruo hour atọ. Ọ bụghị ihe na-akpata chi ojiji n’ehihie kpatara nke a, ebe ọ bụ na ihe dị otú ahụ na-eme nanị mgbe ọnwa ọhụrụ na-apụta, ma ọnwa na-agbazu n’oge Ememe Ngabiga. Ọzọkwa, chi ojiji n’ehihie na-anọ nanị minit ole na ole. Ya mere, ọ bụ Chineke kpatara ọchịchịrị ahụ! Ma eleghị anya o mere ka ndị ahụ na-akwa Jisọs emo kwụsịtụ, ọbụna na-eme ka okwu mkparị ha kwụsị kpam kpam.
Ọ bụrụ na ihe omume ahụ na-eyi egwu mere tupu otu onye ahụ na-emebi iwu abaara enyi ya mba wee rịọ Jisọs ka o cheta ya, ọ pụrụ ịbụ otu n’ime ihe ndị so kpata nchegharị ya. Ma eleghị anya ọ bụ n’oge ọchịchịrị ahụ ka ndị inyom anọ, bụ́ nne Jisọs na nwanne ya nwanyị bụ Salomi, Meri Magdalini, na Meri, bụ́ nne nke onyeozi ahụ bụ Jemes nke nta, bịara nso osisi ịta ahụhụ ahụ. Jọn, bụ́ onyeozi ahụ Jisọs hụrụ n’anya sokwa ha nọrọ n’ebe ahụ.
Lee nnọọ ka e siworo ‘dụwaa’ obi nke nne Jisọs mgbe ọ nọ na-ele nwa ahụ nke o nyeworo ara, zụlitekwa, ka a kwụbara ya n’elu ebe ahụ n’ihe mgbu! Ma Jisọs chere echiche, ọ bụghị banyere ihe mgbu nke ya onwe ya, kama banyere ọdịmma nke nne ya. O jisiri ike felaa isi ya n’ebe Jọn nọ, wee gwa nne ya, sị: “Nwanyị, lee, nwa gị nwoke!” Mgbe ahụ, n’ifela isi ya n’ebe Meri nọ, ọ gwara Jọn, sị: “Lee, nne gị!”
Jisọs si otú a nyefee nlekọta nke nne ya, bụ́ onye ihe àmà gosiri ugbu a na ọ bụ nwanyị di ya nwụworo, n’aka onyeozi ahụ ọ hụrụ n’anya n’ụzọ pụrụ iche. O mere nke a n’ihi na ụmụ Meri ndị ọzọ etinyebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ ka ọ dị ugbu a. Otú a, o setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ime ndokwa, ọ bụghị nanị maka mkpa anụ ahụ nke nne ya, kamakwa maka mkpa ime mmụọ ya.
N’ihe dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs kwuru, sị: “Akpịrị na-akpọ m nkụ.” Jisọs nwere mmetụta nke bụ na, dị ka a pụrụ ikwu ya, Nna ya ewepụwo nchebe nile n’ebe ọ nọ ka e wee tinyezuo nguzosi ike ya n’ezi ihe n’ule. Ya mere o ji oké olu tie mkpu, sị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ nanị mụ? Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ ndị na-eguzo nso ebe ahụ tiri mkpu, sị: “Lee, ọ na-akpọ Elaịja.” Ozugbo ahụ, otu onye wee gbara ọsọ gaa nso, wee tụkwasị sponge nke e ji suru mmanya gbara ụka n’amị̀, wee nye ya ka ọ ṅụọ. Ma ndị ọzọ kwuru sị, “Hapụnụ ya! Ka anyị lee ma Elaịja ọ̀ ga-abịa kudata ya.”—NW.
Mgbe Jisọs naara mmanya ahụ gbara ụka, o tiri mkpu, sị: “Ọ gwụwo!” Ee, o mesịwo ihe nile Nna ya zitere ya n’elu ụwa ka o mee. N’ikpeazụ, ọ sịrị: “Nna, n’aka gị ka m na-enye mmụọ m idebe.” N’ụzọ dị otú a, Jisọs na-enyefe Chineke ike nke ndụ ya, na-enwe obi ike na Chineke ga-ewere ya nyeghachi ya ọzọ. Mgbe ahụ, o wee hulata isi ya nwụọ.
Ozugbo ahụ Jisọs kubiri ume, oké ala ọma jijiji mara, wee tiwasịa oké nkume dị iche iche. Ala ọma jijiji ahụ siri ike nke ukwuu nke na e tiwasịrị ili ndị dị ná mpụga nke Jerusalem, e wee tụpụtasịa ozu ndị dị na ha. Ndị na-agafe n’ụzọ, ndị hụrụ na a tụpụtasịrị ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ, banyere n’ime obodo wee kọọ nke a.
Ọzọkwa, kpọmkwem n’oge ahụ Jisọs nwụrụ, nnukwute ákwà mgbochi nke na-ekewa Ebe Nsọ site n’Ebe Kasị Nsọ n’ime ụlọ nsọ Chineke gbawara abụọ, site n’elu ruo n’ala. Ma eleghị anya, ákwà mgbochi nke a a chọrọ mma dị ihe dị ka 60 amaụkwụ n’elu, dịkwa arọ nke ukwuu! Ọrụ ebube nke a dị ịtụnanya abụghị nanị na o gosipụtara iwe Chineke megide ndị ahụ gburu Ọkpara Ya, kamakwa o gosiri na ịbanye n’Ebe Kasị Nsọ, bụ́ eluigwe n’onwe ya abụwo nke e mere ka o kwe omume ugbu a site n’ọnwụ Jisọs.
Otú ọ dị, mgbe ụmụ mmadụ nwere mmetụta ala ọma jijiji ahụ wee hụkwa ihe ndị na-emenụ, egwu tụrụ ha nke ukwuu. Onye ọchịagha ahụ nke na-elekọta ihe a na-eme n’ebe ahụ a nọ gbuo ha nyere Chineke otuto. O tiri mkpu sị, “N’ezie nwoke a bụ Ọkpara Chineke.” Ma eleghị anya ọ nọ ya mgbe a tụlere ihe banyere ịbụ Ọkpara Chineke n’oge a na-ekpe Jisọs ikpe n’ihu Paịlet. O dowokwa ya anya ugbu a na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ee, na ọ bụ n’ezie nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ mgbe ọ bụla.
Ihe ebube ndị a merenụ metụtakwara ndị ọzọ, ha wee malite ịlaghachi, na-eti aka n’obi, dị ka ngosipụta nke oké mwute na ihere ha nwere. Ọtụtụ ndị inyom na-eso ụzọ Jisọs, bụ́ ndị oké ihe omume ndị a metụtara nke ukwuu, nọ n’ebe dị anya na-ekiri ihe na-emenụ. Jọn onyeozi nọkwa n’ebe ahụ. Matiu 27:45-56; Mak 15:33-41; Luk 23:44-49; 2:34, 35; Jọn 19:25-30.
▪ N’ihi gịnị ka ọ na-apụghị ịbụ chi ojiji n’ehihie kpatara hour atọ nke ọchịchịrị ahụ?
▪ Nwa mgbe nta tupu ọnwụ ya, ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ ndị nwere ndị nne na nna meworo agadi?
▪ Gịnị bụ okwu abụọ ndị ikpeazụ Jisọs kwuru tupu ọ nwụọ?
▪ Gịnị ka ala ọma jijiji ahụ mezuru, gịnịkwa ka mgbawa nke ákwà mgbochi ụlọ nsọ ahụ gbawara gosipụtara?
▪ Mmetụta dị aṅaa ka ọrụ ebube ndị ahụ nwere n’ahụ onye ọchịagha ahụ na-elekọta ihe a na-eme n’ebe ahụ e gburu ha?