Isi 132
N’aka Nri Chineke
MWỤPỤ nke mmụọ nsọ na Pentikọst bụ ihe àmà na Jisọs erutewo n’eluigwe. Ọhụụ nke e nyere onye na-eso ụzọ bụ Stifen n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị na-egosikwa na O rutewo n’ebe ahụ. Nwa mgbe nta tupu a tụọ ya nkume n’ihi iji okwukwe ya na-agba àmà, Stifen tiri mkpu, sị: “Lee, ana m ahụ eluigwe ka e megheworo ha, na Nwa nke mmadụ ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.”
Ka ọ nọ n’aka nri Chineke, Jisọs na-echere iwu ahụ nke sitere n’aka Nna ya, sị: “Gị nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị.” Ma ka ọ dịgodi ugbu a, ruo mgbe ọ ga-eme ihe megide ndị iro ya, gịnị ka Jisọs na-eme? Ọ na-achị ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, na-eduzi ha n’ọrụ nkwusa ha ma na-akwadebe ha ịghọ ndị ga-eso ya bụrụ eze n’Alaeze nke Nna ya site ná mbilite n’ọnwụ ha.
Dị ka ihe atụ, Jisọs họpụtara Sọl (onye e mesịrị jiri aha Rom ya bụ Pọl mara n’ụzọ ka ukwuu) iduzi ọrụ nke ime ndị na-eso ụzọ n’ala ndị ọzọ. Sọl na-anụ ọkụ n’obi maka Iwu Chineke, ma ndị ndú okpukpe ndị Juu duhiere ya. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, ọ bụghị nanị na Sọl kwadoro ogbugbu e gburu Stifen kama ọ natara ike n’aka onye isi nchụàjà bụ Kaịafas ịga Damaskọs ijide ma kpụrụ lọta na Jerusalem, ndị ikom ma ọ bụ ndị inyom ọ bụla ọ hụrụ n’ebe ahụ na-eso ụzọ Jisọs. Otú ọ dị, ka Sọl nọ n’ụzọ, ìhè ọkụ tiwapụtara gburugburu ya na mberede, o wee daakwa n’ala.
Olu nke sitere n’ebe a na-adịghị ahụ anya jụrụ sị, “Sọl, Sọl, gịnị mere ị na-esogbu m?” Sọl jụrụ sị, “Ị̀ bụ ònye, Onyenwe anyị?”
Nzaghachi o nwetara bụ, “Mụ onwe m bụ Jisọs, onye gị onwe gị na-esogbu.”
Jisọs gwara Sọl, bụ́ onye e ji ìhè ọkụ ahụ sitere n’ọrụ ebube mee ka o kpuo ìsì ka ọ banye n’ime Damaskọs ma chere ntụziaka. Mgbe ahụ Jisọs mere ka Ananaịas, bụ́ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, hụ ya n’ọhụụ. Banyere Sọl, Jisọs gwara Ananaịas, sị: “Onye ahụ bụ ihe ọrụ a họpụtara nye m, ka o buru aha m chee n’ihu mba ọzọ na ndị eze, na ụmụ Israel.”
N’ezie, site ná nkwado Jisọs, Sọl (onye a matara ugbu a dị ka Pọl) na ndị nkwusa ndị ọzọ nwere ihe ịga nke ọma dị ukwuu n’ọrụ nkwusa na izi ihe ha. N’ezie, ihe dị ka 25 afọ mgbe Jisọs zutesịrị ya n’ụzọ gara Damaskọs, Pọl dere na “ozi ọma ahụ” abụrụwo nke “e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.”
Mgbe ọtụtụ afọ ndị ọzọ gasịrị, Jisọs nyere onyeozi ọ hụrụ n’anya bụ Jọn usoro ọhụụ dị iche iche. Site n’ọhụụ ndị a nke Jọn kọwara n’akwụkwọ Mkpughe nke Bible, n’ezie ọ dịrị ndụ ịhụ nlọghachi Jisọs n’ike Alaeze. Jọn sịrị na ‘e sitere ná mmụọ nsọ’ buga ya n’oge dị n’ihu “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” Gịnị bụ ‘ụbọchị’ nke a?
Iji nlezianya mụọ amụma Bible dị iche iche, gụnyere amụma Jisọs buru n’onwe ya banyere mgbe ikpeazụ, na-ekpughe na ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ malitere n’afọ ahụ dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme bụ́ 1914, ee, n’ime ọgbọ a! Ya mere ọ bụ na 1914 ka Jisọs lọghachitere n’ụzọ anya na-adịghị ahụ, n’emeghị ngosipụta ihu ọha, nanị ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi bụkwa ndị maara banyere nlọghachi ya. N’afọ ahụ, Jehova nyere Jisọs Iwu ka ọ gaa na-enwe mmeri n’etiti ndị iro ya!
N’irube isi n’iwu Nna ya, Jisọs kpochapụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, na-achụda ha n’ụwa. Mgbe ọ hụsịrị ka nke a weere ọnọdụ n’ọhụụ, Jọn nụrụ olu sitere n’eluigwe ka ọ na-ekwusa, sị: “Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi Kraịst ya.” Ee, na 1914, Kraịst malitere ịchị achị dị ka Eze!
Lee aha ozi ọma nke a bụ nye ndị na-efe Jehova n’eluigwe! A gbara ha ume, sị: “Ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha.” Ma gịnị bụ ọnọdụ nke ndị ahụ nọ n’elu ala? Olu ahụ si n’eluigwe gara n’ihu ikwu sị, “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”
Anyị nọ kpọmkwem na nwa oge nta ahụ ugbu a. A na-ekewa ụmụ mmadụ ugbu a ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke ma ọ bụ ịta ahụhụ mbibi. Eziokwu dị na ya bụ na a na-ekpebi ihe ga-abụ ọdịnihu gị ugbu a site n’ụzọ i si azaghachi n’ozi ọma ahụ nke Alaeze Chineke bụ́ nke a na-ekwusa n’ụwa nile n’okpuru nduzi Kraịst.
Mgbe e kewasịrị ndị mmadụ, Jisọs Kraịst ga-eje ozi dị ka Onye Nnọchianya nke Chineke iji si n’ụwa wepụ usoro ihe nile nke Setan na ndị nile na-akwado ya. Jisọs ga-emezu mwepụ nke a nke ajọ omume nile n’agha ahụ a kpọrọ Ha–Magedọn ma ọ bụ Amagedọn na Bible. Mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs, bụ́ Onye kachasị dị elu n’elu na ala ma e wezụga Jehova Chineke n’onwe ya, ga-ejide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, keekwa ha agbụ ruo otu puku afọ n’ime “abyss,” ya bụ, ọnọdụ yiri ọnwụ nke ha na-agaghị enwe ike ime ihe ọ bụla. Ọrụ 7:55-60; 8:1-3; 9:1-19; 16:6-10; Abụ Ọma 110:1, 2; Ndị Hibru 10:12, 13; 1 Pita 3:22; Luk 22:28-30; Ndị Kọlọsi 1:13, 23; Mkpughe 1:1, 10; 12:7-12; 16:14-16; 20:1-3; Matiu 24:14; 25:31-33.
▪ Mgbe Jisọs laghachisịrị n’eluigwe, ebee ka a hụrụ ya, gịnịkwa ka ọ na-echere?
▪ Òle ndị ka Jisọs na-achị mgbe ọ laghachisịrị n’eluigwe, oleekwa otú e si egosipụta ọchịchị ya?
▪ Olee mgbe ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ malitere, gịnịkwa weere ọnọdụ ná mmalite ya?
▪ Ọrụ nkewa dị aṅaa nke na-aga n’ihu taa na-emetụta anyị nile n’otu n’otu, ọ̀ bụkwa ná ndabere gịnị ka a na-eme nkewa ahụ?
▪ Mgbe a rụsịrị ọrụ nkewa ahụ, olee ihe omume ndị ga-esochi?