ISI NKE 25
Ndị Na-eme Ihe Ọjọọ Hà Nwere Ike Ịgbanwe?
Ọ́ GAGHỊ abụ ihe magburu onwe ya ma a sị na mmadụ nile na-eme ihe ọma?— Ma ọ dịghị onye na-eme ihe ọma mgbe nile. Ị̀ ma ihe mere anyị nile na-eji eme ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ, ọbụna mgbe anyị chọrọ ime ihe ọma?— Ọ bụ n’ihi na anyị nile ketara mmehie mgbe a mụrụ anyị. Ma ụfọdụ ndị na-eme ọtụtụ ihe jọgburu onwe ha. Ha na-akpọ ndị ọzọ asị, marakwa ụma na-emerụ ha ahụ́. Ì chere na ha pụrụ ịgbanwe ma mụta ime ihe ọma?—
Lee nwa okorobịa ahụ nke nọ na-eche uwe elu nke ndị nọ na-atụ Stivin nkume nche. Aha Hibru ya bụ Sọl, ma aha ndị Rom na-akpọ ya bụ Pọl. Obi dị ya ụtọ na a na-egbu Stivin, bụ́ onye na-eso ụzọ Onye Ozizi Ukwu ahụ. Ka anyị lee ihe mere Sọl ji na-eme ihe ọjọọ dị otú ahụ.
Sọl so n’òtù okpukpe ndị Juu a na-akpọ ndị Farisii. Ndị Farisii nwere Okwu Chineke, ma ha ji ihe ndị ndú okpukpe ha ụfọdụ na-akụzi kpọrọ ihe karị. Nke a mere ka Sọl na-eme ihe ọjọọ.
Mgbe e jidere Stivin na Jeruselem, Sọl nọ ebe ahụ. A kpụgara Stivin n’ụlọikpe, ụfọdụ n’ime ndị ọkàikpe nọ n’ebe ahụ bụ ndị Farisii. Ọ bụ ezie na ha kwuru ihe ọjọọ dị iche iche banyere Stivin, egwu atụghị ya. O ji obi ike kwuo okwu ma gbaara ndị ọkàikpe ahụ àmà nke ọma banyere Jehova Chineke na Jizọs.
Ma ndị ọkàikpe ahụ enweghị mmasị n’ihe ha nụrụ. Ha amataworị ọtụtụ ihe banyere Jizọs. N’ezie, ntakịrị oge tupu mgbe ahụ, ha mere ndokwa ka e gbuo Jizọs! Ma mgbe ha gbusịrị ya, Jehova mere ka Jizọs laghachi n’eluigwe. Ugbu a, kama ịgbanwe omume ha, ndị ọkàikpe ahụ na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs.
Ndị ọkàikpe ahụ jidere Stivin kpụrụ ya gaa n’azụ obodo. Ha tituru ya n’ala, ha tụọkwa ya okwute. Dịkwa ka ị pụrụ ịhụ n’ihe osise a, Sọl nọ ebe ahụ na-ekiri ihe na-emenụ. Ọ na-eche na igbu Stivin ziri ezi.
Gịnị mere Sọl ji chee na igbu Stivin ziri ezi?
Ị̀ ma ihe mere Sọl ji chee otú ahụ?— Kemgbe a mụrụ ya, Sọl bụ onye Farisii, o kwenyekwara na ihe ndị Farisii na-akụzi ziri ezi. O weere ndị ikom ahụ dị ka ndị bụ́ ezi ihe nlereanya, ya mere, o ṅomiri ha.—Ọrụ 7:54-60.
Mgbe e gbusịrị Stivin, gịnị ka Sọl mere?— Leenụ, ọ gbara mbọ igbuchapụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị fọdụrụnụ! Ọ na-aga kpọmkwem n’ụlọ ha akpụpụta ma ndị nwoke ma ndị nwanyị. Mgbe ahụ, ọ na-eme ka a tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ si na Jeruselem gbapụ, ma ha akwụsịghị ime nkwusa banyere Jizọs.—Ọrụ 8:1-4.
Nke a mere ka Sọl kpọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị ọbụna karị. Ya mere, ọ gakwuuru Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Keifas wee nata ikike ịga jide Ndị Kraịst nọ n’obodo Damaskọs. Sọl chọrọ ịkpụta ha Jeruselem dị ka ndị mkpọrọ nakwa ka e nye ha ntaramahụhụ. Ma mgbe ọ nọ na-aga Damaskọs, otu ihe ijuanya mere.
Ònye na-agwa Sọl okwu, gịnịkwa ka O zipụrụ Sọl ime?
Ìhè si n’eluigwe nwuo, otu olu sịkwara: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Ọ bụ Jizọs si n’eluigwe na-ekwu okwu! Ìhè ahụ nwusiri ike nke na o mere ka Sọl kpuo ìsì, ndị ha na Sọl so, dukwaara ya ruo Damaskọs.
Ụbọchị atọ ka nke a mesịrị, Jizọs pụtara n’ọhụụ nye otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, onye aha ya bụ Ananaịas. Jizọs gwara Ananaịas ka ọ gaa leta Sọl ma mee ka ọ hụwa ụzọ ma gwa ya okwu. Mgbe Ananaịas gwara ya okwu, Sọl nakweere eziokwu banyere Jizọs. Ọ malitere ịhụ ụzọ ọzọ. Ụzọ ndụ ya dum gbanwere, ọ ghọkwara ohu Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi.—Ọrụ 9:1-22.
Ị̀ hụla ihe mere Sọl ji na-eme ihe ọjọọ?— Ọ bụ n’ihi na a kụziere ya ihe ndị na-ezighị ezi. Ọ na-eso ndị ikom na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye Chineke. O sokwa n’ìgwè mmadụ ndị na-ebute echiche mmadụ ụzọ karịa Okwu Chineke. Ma gịnị mere Sọl ji gbanwee ndụ ya wee malite ime ihe ọma n’agbanyeghị na ndị Farisii ndị ọzọ nọgidere na-alụso Chineke ọgụ?— Ọ bụ n’ihi na Sọl akpọghị eziokwu asị n’ezie. Ya mere mgbe e gosiri ya ihe ziri ezi, ọ dị njikere ime ya.
Ị̀ ma onye Sọl mesịrị ghọọ?— Ee, a bịara mara ya dị ka Pọl onyeozi, onyeozi Jizọs. Chetakwa na Pọl dere ọtụtụ akwụkwọ n’ime Bible karịa onye ọ bụla ọzọ.
E nwere ọtụtụ ndị dị ka Sọl, ndị nwere ike ịgbanwe. Ma ọ naghị adị mfe n’ihi na e nwere onye na-agbalịsi ike ime ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ. Ị̀ ma onye ọ bụ?— Jizọs kwuru banyere ya mgbe o mere ka Sọl hụ ya, n’oge ahụ ọ nọ na-aga Damaskọs. Jizọs si n’eluigwe gwa Sọl okwu n’ebe ahụ, sị: ‘M na-ezipụ gị ka ị gaa meghee anya ndị mmadụ, chigharịa ha site n’ọchịchịrị gaa n’ìhè, nakwa site n’ikike Setan gakwuru Chineke.’—Ọrụ 26:17, 18.
Ee, ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-agbalị ime ka mmadụ nile na-eme ihe ọjọọ. Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ime ihe ziri ezi?— Ọ na-esiri anyị nile ike. Setan na-eme ka o siere anyị ike. Ma e nwere ihe ọzọ mere ọ na-ejighị adị mfe ime ihe ziri ezi mgbe nile. Ị̀ ma ihe ọ bụ?— Ọ bụ n’ihi na anyị ketara mmehie mgbe a mụrụ anyị.
Ọ bụ mmehie a na-eme ka ọ dịkwuoro anyị mfe ọtụtụ mgbe ime ihe na-ezighị ezi karịa ime ihe ziri ezi. Ya mere, gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mee?— Ee, anyị aghaghị ịdị na-agbalịsi ike ime ihe ziri ezi. Mgbe anyị mere nke ahụ, anyị pụrụ ijide n’aka na Jizọs, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, ga-enyere anyị aka.
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ bịara nwee ịhụnanya n’ebe ndị meburu ihe ọjọọ ma gbanwee nọ. Ọ maara otú o siruuru ha ike ịgbanwe. Dị ka ihe atụ, e nwere ụmụ nwanyị ndị sooro ọtụtụ ụmụ nwoke nwee mmekọahụ. N’ezie, nke a dị njọ. Bible na-akpọ ụmụ nwanyị ndị a ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị akwụna.
Gịnị mere Jizọs ji gbaghara nwanyị a mere ihe ọjọọ mmehie ya?
N’otu oge, otu onye n’ime ụmụ nwanyị dị otú a nụrụ banyere Jizọs, ọ bịakwara ebe Jizọs nọ n’ụlọ otu onye Farisii. Ọ wụsara mmanụ n’ụkwụ Jizọs ma were ntutu isi ya hichapụ anya mmiri ya n’ụkwụ Jizọs. O nwere mwute dị ukwuu n’ihi mmehie ya, ya mere Jizọs gbaghaara ya. Ma ndị Farisii echeghị na e kwesịrị ịgbaghara ya.—Luk 7:36-50.
Ị̀ ma ihe Jizọs gwara ụfọdụ n’ime ndị Farisii ahụ?— Ọ sịrị ha: “Ụmụ nwanyị akwụna bu unu ụzọ na-abanye n’alaeze Chineke.” (Matiu 21:31) Jizọs kwuru nke a n’ihi na ndị akwụna ahụ nwere okwukwe n’ebe ọ nọ, gbanweekwa ụzọ ọjọọ ha. Ma ndị Farisii ahụ nọgidere na-eme ihe ọjọọ megide ndị na-eso ụzọ Jizọs.
Ya mere, mgbe Bible gosiri na ihe anyị na-eme dị njọ, anyị kwesịrị ịdị njikere ime mgbanwe. Mgbe anyị mụtakwara ihe Jehova chọrọ ka anyị mee, anyị kwesịrị inwe ọchịchọ siri ike ime ya. Mgbe ahụ Jehova ga-enwe obi ụtọ n’ebe anyị nọ, ọ ga-enyekwa anyị ndụ ebighị ebi.
Iji nyere anyị aka izere ime ihe ọjọọ, ka anyị gụkọọ ọnụ Abụ Ọma 119:9-11; Ilu 3:5-7; nakwa 12:15.