Isi 133
Jisọs Emesịa Ihe Nile Chineke Na-achọ
MGBE Eze Onye Agha ahụ bụ Jisọs Kraịst wepụsịrị Setan na ụwa ajọ omume ya, lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ! Ọchịchị Puku Afọ nke udo nke Jisọs emesịa malite!
N’okpuru nduzi nke Jisọs na ndị eze ibe ya, ndị lanahụrụ Amagedọn ga-ekpochapụ ihe ndị agha ezi omume ahụ bibiri. O yikarịrị ka ndị nlanahụ ahụ bi n’ụwa ga-amụkwa ụmụ ruo oge ụfọdụ, ndị a ga-ekerekwa òkè n’ọrụ na-enye obi ụtọ nke ime ka ụwa ghọọ ogige ntụrụ ndụ magburu onwe ya.
Ka oge na-aga Jisọs ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị nọ n’ili ịbịa ṅụrịa na Paradaịs nke a mara mma. Ọ ga-eme nke a iji mezuo ihe ahụ o kwere ná nkwa: “Oge hour na-abịa, mgbe ndị nile dị n’ili . . . ga-apụtakwa.”
Otu n’ime ndị Jisọs ga-akpọlite n’ọnwụ bụ onye ahụ na-emebi iwu na mbụ, onye nwụrụ n’akụkụ ya n’elu osisi ịta ahụhụ. Cheta na Jisọs kwere ya nkwa, sị: “N’ezie asị m gị taa, Ị ga-eso m nọrọ na Paradaịs.” (NW) Ee e, a gaghị akpọrọ nwoke ahụ gaa n’eluigwe ịga soro Jisọs chịa achị dị ka eze, Jisọs agaghịkwanụ aghọ mmadụ ma soro ya bie na Paradaịs elu ala. Kama nke ahụ, Jisọs na onye ahụ na-emebi iwu na mbụ ga-anọ n’echiche nke na Ọ ga-akpọlite ya bịa ná ndụ na Paradaịs ma hụ na e mezuru ihe nile bụ mkpa ya, ma nke elu ahụ ma nke ime mmụọ dị ka ihe osise dị na peji na-eso na-egosi.
Chee echiche banyere ya! N’okpuru nlekọta ịhụnanya Jisọs, ezinụlọ nke ihe a kpọrọ mmadụ—ndị nlanahụ nke Amagedọn, ụmụ ha, na ọtụtụ puku nde ndị e si n’ọnwụ kpọlite, bụ́ ndị na-erubere ya isi—ga-eto iru izu okè mmadụ. Site n’aka Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, onye na-achị achị, Jehova ga-esoro ụmụ mmadụ bikọọ n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka olu ahụ nke Jọn nụrụ site n’eluigwe na-asị, “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa akwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” Ọ dịghị onye ọ bụla bi n’ụwa nke ga-ahụju anya ma ọ bụ rịa ọrịa.
Ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ Jisọs, ọnọdụ ga-adị nnọọ otú Chineke si zube ya na mbụ mgbe ọ gwara mmadụ abụọ mbụ bụ Adam na Iv ka ha mụọ ọmụmụ jupụta ụwa. Ee, ụwa ga-ejupụta n’agbụrụ ụmụ mmadụ ezi omume zuru okè. Nke a bụ n’ihi na uru nile nke àjà mgbapụta Jisọs ga-abụworị nke e ji mee ihe nye mmadụ nile. Ọnwụ n’ihi mmehie Adam agaghị adịkwa ọzọ!
Otú a, Jisọs ga-emezuworị ihe nile Jehova sịrị ka o mee. Ya mere, ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, ọ ga-enyefe Alaeze ahụ na ezinụlọ mmadụ zuru okè n’aka Nna ya. Mgbe ahụ, Chineke ga-atọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’abyss nke ọnọdụ emeghị ihe ọ bụla nke yiri ọnwụ. N’ihi gịnị?
Ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-adị ndụ n’ime Paradaịs ga-abụ ndị e si n’ọnwụ kpọlite, ndị ọ na-adịbeghị mgbe ọ bụla a nwara okwukwe ha. Tupu ọnwụ ha, ha amatabeghị ihe ndị bụ nkwa Chineke nke mekwara na ha apụghị itinye okwukwe na ha. Mgbe a kpọlitesịkwara ha n’ọnwụ ma kụziere ha eziokwu Bible, ọ dịịrị ha mfe n’ime Paradaịs, n’enweghị ihe mmegide ọ bụla, ijere Chineke ozi. Ma ọ bụrụ na e nyere Setan ohere ịnwa ịkwụsị ha ịnọgide na-ejere Chineke ozi, hà ga-abụ ndị na-eguzosi ike n’ihe n’okpuru ule? Iji zaa ajụjụ nke a, a ga-atọhapụ Setan.
Mkpughe nke e nyere Jọn na-egosipụta na mgbe Ọchịchị Puku Afọ Jisọs gasịrị, Setan ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ichigharị ọnụ ọgụgụ a na-akapịaghị ọnụ nke ụmụ mmadụ pụọ n’ijere Chineke ozi. Ma mgbe ahụ, mgbe ule ikpeazụ ahụ gwụsịrị, Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ndị nile o nwere ihe ịga nke ọma n’iduhie ga-abụ ndị e bibiri ruo mgbe ebighị ebi. N’aka nke ọzọ, ndị nile e nyeworo ọnwụnwa zuru ezu, bụ́ ndị ahụ na-eguzosi ike n’ihe lanahụworo ga-adịrị ndụ gaa n’ihu inweta ngọzi nile nke Nna eluigwe ha ruo mgbe nile ebighị ebi.
N’ụzọ doro anya, Jisọs ejewo ozi, ọ ga-anọgidekwa na-eje ozi dị mkpa n’imezu nzube nile dị ebube nke Chineke. Lee ọdịnihu magburu onwe ya anyị pụrụ ịṅụrị na ya n’ihi ihe nile ọ na-emezu dị ka Eze ukwu Chineke nke eluigwe. Ma, anyị apụghị ichefu ihe nile o mere mgbe ọ bụ mmadụ.
Jisọs ji ọchịchọ obi ya bịa n’ụwa ma kụziere anyị banyere Nna ya. Karịa nke a, o gosipụtara ihe ilereanya nke àgwà Chineke ndị dị oké ọnụ ahịa. A na-akpali obi anyị mgbe anyị na-atụle obi ike ya nke kasị ukwuu na ịbụ dimkpa ya, amamihe ya nke na-enweghị atụ, ikike dị ukwuu o nwere dị ka onye ozizi, idu ndú ya n’atụghị egwu, na ọmịiko ya na obi ebere. Mgbe anyị na-echeta otú o si taa ahụhụ na-enweghị atụ ka ọ na-akwụ ụgwọ mgbapụta ahụ, bụ́ nke nanị ya pụrụ inye anyị ndụ, n’ezie a na-akpali obi anyị inwe ekele maka ya!
N’ezie, lee ụdị nwoke nke anyị hụworo n’ihe ọmụmụ nke a nke ndụ Jisọs! Ịdị ukwuu ya pụtara ìhè ma bụrụ nke hibigara nne ókè. A na-akpali anyị ikwughachi okwu ndị ahụ nke onye ọchịchị Rom bụ Pọntiọs Paịlet, bụ́: “Lee, Nwoke ahụ!” Ee, n’ezie, “Nwoke ahụ” bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ!
Site n’anyị ịnabata onyinye o nyere àjà mgbapụta ahụ, a pụrụ iwepụ ibu arọ nke mmehie na ọnwụ anyị ketara n’aka Adam, Jisọs pụkwara ịghọrọ anyị “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi.” Ndị nile ga-enweta ndụ ebighị ebi aghaghị ịnara ihe ọmụma ọ bụghị nanị banyere Chineke kamakwa banyere Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Ka ọgụgụ ihe na ọmụmụ ihe gị site n’akwụkwọ nke a nyere gị aka ịnara ụdị ihe ọmụma dị otú ahụ nke na-enye ndụ! 1 Jọn 2:17; 1:7; Jọn 5:28, 29; 3:16; 17:3; 19:5; Luk 23:43; Genesis 1:28; 1 Ndị Kọrint 15:24-28; Mkpughe 20:1-3, 6-10; 21:3, 4; Aịsaịa 9:6.
▪ Gịnị ga-abụ ihe ùgwù obi ụtọ ga-adịrị ndị nlanahụ nke Amagedọn na ụmụ ha?
▪ Olee ndị ha na ndị nlanahụ nke Amagedọn na ụmụ ha ga-aṅụrịkọ ọṅụ na Paradaịs, n’echiche dịkwa aṅaa ka Jisọs ga-anọnyere ha?
▪ Gịnị ga-abụ ọnọdụ a ga-enwe ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, gịnịkwa ka Jisọs ga-eme na mgbe ahụ?
▪ N’ihi gịnị ka a ga-eji tọhapụ Setan site n’abyss, gịnịkwa ga-emesị mee ya na ndị nile na-eso ya?
▪ Olee otú Jisọs pụrụ isi ghọọrọ anyị “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi”?