Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 6/1 p. 8-9
  • Jisọs Emezuo Ihe Nile Chineke Chọrọ Ya n’Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jisọs Emezuo Ihe Nile Chineke Chọrọ Ya n’Aka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jisọs Emesịa Ihe Nile Chineke Na-achọ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Emee Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs ma Rụchaa Ọrụ Chineke Nyere Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Mgbe Ihe Ọmụma Chineke Jupụtara Ụwa
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Olee Ndị A Ga-akpọlite n’Ọnwụ? Ebee Ka Ha Ga-ebi?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 6/1 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Jisọs Emezuo Ihe Nile Chineke Chọrọ Ya n’Aka

MGBE Eze Onye Agha ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, wepụsịrị Setan na ụwa ajọ omume ya, lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ! Ọchịchị Puku Afọ udo nke Jisọs emesịa malite!

N’okpuru nduzi nke Jisọs na ndị eze ibe ya, ndị lanarịrị Amagedọn ga-ekpochapụsị ihe ndị agha ezi omume ahụ bibiri. O yikarịrị ka ndị nlanarị ahụ bi n’ụwa hà ga-amụ ụmụ ruo oge ụfọdụ, ndị a ga-ekerekwa òkè n’ọrụ na-enye obi ụtọ nke ime ka ụwa ghọọ ogige ntụrụndụ magburu onwe ya.

Ka oge na-aga Jisọs ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị nọ n’ili ịbịa biri na Paradaịs nke a mara mma. Ọ ga-eme nke a iji mezuo ihe ahụ o kwere ná nkwa: “Oge hour na-abịa, mgbe ndị nile dị n’ili . . . ga-apụtakwa.”

Otu n’ime ndị Jisọs ga-akpọlite n’ọnwụ bụ onye ahụ na-emebi iwu na mbụ, onye nwụrụ n’akụkụ ya n’elu osisi ịta ahụhụ. Cheta na Jisọs kwere ya nkwa, sị: “N’ezie asị m gị taa, Ị ga-eso m nọrọ na Paradaịs.” (NW) Ee e, a gaghị akpọrọ nwoke ahụ gaa n’eluigwe ịga soro Jisọs chịa achị dị ka eze, Jisọs agaghịkwanụ aghọ mmadụ ma soro ya biri na Paradaịs elu ala. Kama nke ahụ, Jisọs na onye ahụ na-emebibu iwu ga-anọ n’echiche nke bụ na Ọ ga-akpọlite ya bịa ná ndụ na Paradaịs ma hụ na e mezuru ihe nile bụ mkpa ya ma nke anụ ahụ ma nke ime mmụọ, dị ka ihe osise dị na peji nke a na-egosi.

Chee echiche banyere ya! N’okpuru nlezianya ịhụnanya Jisọs, ezinụlọ nke ihe a kpọrọ mmadụ—ndị lanarịrị Amagedọn, ụmụ ha, na ọtụtụ puku nde ndị e si n’ọnwụ kpọlite, ndị na-erubere ya isi—ga-etoru izu okè mmadụ. Site n’aka Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, onye na-achị achị, Jehova ga-esoro ụmụ mmadụ bikọọ n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka olu ahụ nke Jọn nụrụ site n’eluigwe na-asị, “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” Ọ dịghị onye ọ bụla bi n’ụwa nke ga-ahụju anya ma ọ bụ rịa ọrịa.

Ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ Jisọs, ọnọdụ ahụ ga-adị nnọọ otú Chineke si zube ya na mbụ mgbe ọ gwara mmadụ abụọ mbụ bụ Adam na Iv ka ha mụọ ọmụmụ ma jupụta ụwa. Ee, ụwa ga-ejupụta n’agbụrụ ezi omume nke ụmụ mmadụ zuru okè. Nke a bụ n’ihi na uru nile nke àjà mgbapụta Jisọs ga-abụworị nke e ji mee ihe nye mmadụ nile. Ọnwụ n’ihi mmehie Adam agaghị adịkwa ọzọ!

Otú a, Jisọs ga-emezuworị ihe nile Jehova gwara ya ka o mee. Ya mere, ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, ọ ga-enyefe Alaeze ahụ na ezinụlọ mmadụ zuru okè n’aka Nna ya. Mgbe ahụ, Chineke ga-atọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’abyss nke ọnọdụ arụghị ọrụ ọ bụla nke yiri ọnwụ. N’ihi gịnị?

Ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-adị ndụ n’ime Paradaịs ga-abụ ndị e si n’ọnwụ kpọlite, ndị ọ na-adịbeghị mgbe ọ bụla a nwara okwukwe ha. Tupu ha anwụọ, ọ dịghị mgbe ha matara ihe ndị bụ nkwa Chineke, ha si otú a ghara igosipụta okwukwe ha n’ebe nkwa ndị ahụ dị. Mgbe a kpọlitesịkwara ha n’ọnwụ ma kụziere ha eziokwu Bible, ọ dịịrị ha mfe n’ime Paradaịs ijere Chineke ozi, n’enweghị ihe mmegide ọ bụla. Ma ọ bụrụ na e nyere Setan ohere ịnwa ịkwụsị ha ịnọgide na-ejere Chineke ozi, hà ga-abụ ndị na-eguzosi ike n’ihe n’okpuru ule? Iji zaa ajụjụ nke a, a ga-atọhapụ Setan.

Mkpughe nke e nyere Jọn na-egosipụta na mgbe Ọchịchị Puku Afọ Jisọs gasịrị, Setan ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ichigharị ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ a na-amaghị otú ha ga-aha pụọ n’ijere Chineke ozi. Ma mgbe ahụ, mgbe ule ikpeazụ ahụ gwụsịrị, Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ndị nile o nwere ihe ịga nke ọma n’iduhie ga-abụ ndị e bibiri ruo mgbe ebighị ebi. N’aka nke ọzọ, ndị nlanarị nile a nwaworo n’ụzọ zuru ezu, bụ́ ndị ahụ na-eguzosi ike n’ihe, ga-adịrị ndụ gaa n’ihu inweta ngọzi nile nke Nna eluigwe ha ruo mgbe nile ebighị ebi.

N’ụzọ doro anya, Jisọs ejewo ozi, ọ ga-anọgidekwa na-eje ozi dị mkpa imezu nzube nile dị ebube nke Chineke. Lee ọdịnihu magburu onwe ya anyị pụrụ inweta n’ihi ihe nile ọ na-emezu dị ka Eze ukwu Chineke nke eluigwe. Ma, anyị apụghị ichefu ihe nile o mere mgbe ọ bụ mmadụ.

Jisọs ji ọchịchọ obi ya bịa n’ụwa ma kụziere anyị banyere Nna ya. Karịa nke a, o gosipụtara ihe ilereanya nke àgwà Chineke ndị dị oké ọnụ ahịa. A na-akpali obi anyị mgbe anyị na-atụle obi ike ya nke kasị ukwuu na ịbụ dimkpa ya, na amamihe ya nke na-enweghị atụ, ikike dị ukwuu o nwere dị ka onye ozizi, idu ndú ya n’atụghị egwu, na ọmịiko na obi ebere ya. Mgbe anyị na-echeta otú o si taa ahụhụ na-enweghị atụ mgbe ọ na-akwụ ụgwọ mgbapụta ahụ, bụ́ nke ọ bụ site na nanị ya ka anyị pụrụ inweta ndụ, n’ezie a na-akpali obi anyị inye ya ekele!

N’ezie, lee nnọọ ụdị nwoke nke anyị hụworo n’ihe ọmụmụ nke a nke ndụ Jisọs! Ịdị ukwuu ya pụtara ìhè ma bụrụ nke hibigara nne ókè. A na-akpali anyị ikwughachi okwu ndị ahụ nke onye ọchịchị Rom bụ Pọntiọs Paịlet kwuru: “Lee, Nwoke ahụ!”

Site n’anyị ịnabata onyinye o nyere àjà mgbapụta ahụ, a pụrụ iwepụrụ anyị ibu arọ nke mmehie na ọnwụ anyị ketara n’aka Adam, Jisọs pụkwara ịghọrọ anyị “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi.” Ndị nile ga-enweta ndụ ebighị ebi aghaghị ịnara ihe ọmụma, ọ bụghị nanị banyere Chineke kamakwa banyere Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọ bụ olileanya anyị na ọgụgụ ihe na ọmụmụ ihe gị nke usoro isiokwu nke a banyere ndụ na ije ozi Jisọs ga-enyeworo gị aka ịnara ụdị ihe ọmụma dị otú a nke na-enye ndụ! 1 Jọn 2:17; 1:7; Jọn 5:28, 29; 3:16; 17:3; 19:5; Luk 23:43; Jenesis 1:28; 1 Ndị Kọrint 15:24-28; Mkpughe 20:1-3, 6-10; 21:3, 4; Aịsaịa 9:6.

◆ Gịnị ga-abụ ihe ùgwù obi ụtọ ga-adịrị ndị lanarịrị Amagedọn na ụmụ ha?

◆ Olee ndị ga-eso ndị lanarịrị Amagedọn na ụmụ ha biri na Paradaịs, n’echiche dịkwa aṅaa ka Jisọs ga-anọnyere ha?

◆ Gịnị ka ọnọdụ ga-adị ka ya ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, gịnịkwa ka Jisọs ga-eme mgbe ahụ?

◆ N’ihi gịnị ka a ga-eji tọhapụ Setan site n’abyss, gịnịkwa ga-emesị mee ya na ndị nile na-eso ya?

◆ Olee otú Jisọs pụrụ isi ghọọrọ anyị “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi”?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya