Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dg akụkụ 8 p. 17-19
  • Nzube Chineke Na-agaru ná Mmezu Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzube Chineke Na-agaru ná Mmezu Ya
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eze Ọhụrụ nke Ụwa
  • Ndị Ga-eso Chịa
  • Ịchịisi n’Adabereghị na Chineke Ga-akwụsị
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Alaeze Chineke—Ịchịisi Ọhụrụ Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Alaeze Chineke Na-achị
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
dg akụkụ 8 p. 17-19

Akụkụ nke 8

Nzube Chineke Na-agaru ná Mmezu Ya

1, 2. Olee otú Chineke siworo na-eme ndokwa iwepụ ahụhụ?

ỊCHỊISI nke ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ na-enupụ isi anọgidewo na-akpụtọ ezinụlọ nke mmadụ kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ma, Chineke elegharabeghị ahụhụ anyị na-ata anya. Kama nke ahụ, n’ọtụtụ narị afọ ndị ahụ, ọ nọwo na-eme ndokwa ịnapụta ụmụ mmadụ ná njide nke mmebi iwu na ahụhụ.

2 N’oge nnupụisi ahụ n’Iden, Chineke malitere ikpughe nzube ya iguzobe ọchịchị nke ga-eme ka ụwa a bụrụ ebe obibi bụ paradaịs maka ụmụ mmadụ. (Jenesis 3:15) E mesịa, dị ka ọnụ bụ isi na-ekwuru Chineke, Jisọs mere ọchịchị nke a na-abịa nke Chineke, isiokwu nke ozizi ihe ya. Ọ sịrị na ọ ga-abụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ.​—⁠Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10; 12:⁠21.

3. Gịnị ka Jisọs kpọrọ ọchịchị na-abịanụ maka ụwa, n’ihi gịnịkwa?

3 Jisọs kpọrọ ọchịchị ahụ na-abịanụ nke Chineke, “alaeze eluigwe,” ebe ọ bụ na ọ ga-achị site n’eluigwe. (Matiu 4:17) Ọ kpọkwara ya “alaeze Chineke,” ebe ọ bụ na Chineke ga-abụ Onye o sitere n’aka ya. (Luk 17:20) Eri ọtụtụ narị afọ Chineke nyere ndị ikom na-edere ya ihe ike ka ha detuo amụma dị iche iche banyere ndị ga-emejupụta ọchịchị ahụ na ihe ọ ga-arụzu.

Eze Ọhụrụ nke Ụwa

4, 5. Olee otú Chineke si gosi na Jisọs bụ Eze ya ọ kwadoro?

4 Ọ bụ Jisọs bụ onye mezuru ọtụtụ amụma banyere onye ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke, ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. O gosipụtara onwe ya ịbụ onye Chineke họpụtara ịbụ Onye Ọchịchị nke ọchịchị eluigwe ahụ n’elu ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe ọ nwụsịkwara, Chineke kpọlitere Jisọs n’ọnwụ baa ná ndụ n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke dị ike nke na-adịghị anwụ anwụ. E nwere ọtụtụ ndị akaebe nke mbilite n’ọnwụ ya.​—⁠Ọrụ 4:10; 9:1-⁠9; Ndị Rom 1:1-⁠4; 1 Ndị Kọrint 15:​3-⁠8.

5 Jisọs wee “nọdụ n’aka nri Chineke.” (Ndị Hibru 10:12) N’ebe ahụ o cheere oge mgbe Chineke ga-enye ya ike ime ihe dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke. Nke a mezuru amụmụ nke Abụ Ọma 110:⁠1, ebe Chineke gwara ya: “Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe m ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị dịịrị ụkwụ gị abụọ.”

6. Olee otú Jisọs si gosi na ya ruru eru ịbụ Eze nke Alaeze Chineke?

6 Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs gosiri na ya ruru eru maka ọkwá dị otú ahụ. N’agbanyeghị mkpagbu, ọ họọrọ ijigide nguzosi ike ya n’ezi ihe nye Chineke. Site n’ime otú ahụ, o gosiri na Setan ghara ụgha mgbe ọ sịrị na ọ dịghị mmadụ ọ bụla ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’okpuru ule. Jisọs, bụ́ mmadụ zuru oké, ‘Adam nke abụọ,’ gosiri na Chineke ehieghị ụzọ n’ike ụmụ mmadụ zuru okè.​—⁠1 Ndị Kọrint 15:​22, 45; Matiu 4:​1-⁠11.

7, 8. Ihe ọma ndị dị aṅaa ka Jisọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa, gịnịkwa ka o gosipụtara?

7 Olee onye ọchịchị o bụla rụpụtara ezi ihe ruo otú Jisọs mere n’afọ ole na ole nke ozi ya? N’ịbụ onye mmụọ nsọ Chineke nyere ike, Jisọs gwọrọ ndị ọrịa, ndị ngwụrọ, ndị ìsì, ndị ntị chiri, ndị ogbi. Ọbụna na ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ! O gosiri n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta ihe ọ ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ mgbe ọ banyere n’ike Alaeze.​—⁠Matiu 15:​30, 31; Luk 7:​11-⁠16.

8 Jisọs mere ihe ọma dị ukwuu mgbe ọ nọ n’ụwa nke na onye na-eso ụzọ ya bụ Jọn sịrị: “Ma ọtụtụ ihe ọzọ nke Jisọs mere dịkwa, nke, ma ọ bụrụ na e dere ha n’akwụkwọ n’otu n’otu, ọ dị m ka ọbụna ụwa onwe ya agaghị anagide akwụkwọ a ga-ede.”​—⁠Jọn 21:⁠25.a

9. N’ihi gịnị ka ndị nwere obi eziokwu ji bịakwute Jisọs?

9 Jisọs nwere obi ọma ma dị ebere, na-enwe ịhụnanya dị ukwuu maka ndị mmadụ. O nyeere ndị ogbenye na ndị a zọdara n’ala aka, ma ọ kpaghị ókè n’ebe ndị nwere akụ na ụba ma ọ bụ ọkwá nọ. Ndị nwere obi eziokwu zara òkù ịhụnanya Jisọs mgbe ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:​28-30) Ndị na-atụ egwu Chineke bịakwutere ya ma lepụ anya maka ịchịisi ya.​—⁠Jọn 12:⁠19.

Ndị Ga-eso Chịa

10, 11. Òle ndị ga-esonyere Jisọs n’ịchị ụwa?

10 Dị nnọọ ka ọchịchị mmadụ na-enwe ndị na-eso n’òtù nduzi ya, otú ahụ ka ọ dị Alaeze eluigwe nke Chineke. Ndị ọzọ, ma e wezụga Jisọs, ga-ekere òkè n’ịchị ụwa, n’ihi na Jisọs kwere ndị ha na ya na-akpachi anya nkwa na ha ga-eso ya chịa achị dị ka eze n’elu ihe a kpọrọ mmadụ.​—⁠Jọn 14:⁠2, 3; Mkpughe 5:10; 20:⁠6.

11 N’ihi nke a, a kpọlitekọkwara Jisọs na ọnụ ọgụgụ a kara aka nke ụmụ mmadụ gaa ná ndụ eluigwe. Ha mejupụtara Alaeze Chineke nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi ebighị ebi. (2 Ndị Kọrint 4:14; Mkpughe 14:​1-⁠3) Ya mere eri ọtụtụ afọ, Jehova atọwo ntọala maka ọchịchị nke ga-ewetara ezinụlọ nke mmadụ ngọzi ebighị ebi.

Ịchịisi n’Adabereghị na Chineke Ga-akwụsị

12, 13. Gịnị ka Alaeze Chineke dị njikere ime ugbu a?

12 Na narị afọ nke a Chineke etinyewo aka kpọmkwem n’otú ihe si aga n’ụwa. Dị ka Akụkụ nke 9 nke akwụkwọ nta a ga-akọwa, amụma Bible na-egosi na e guzobere Alaeze Chineke nke dị n’okpuru Kraịst na 1914, na ọ dịkwa njikere ugbu a ichipịa usoro ihe nile nke Setan. Alaeze ahụ dị njikere inwe “ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro [Kraịst].”​—⁠Abụ Ọma 110:⁠2.

13 N’akụkụ nke a, amụma ahụ dị na Daniel 2:44 na-asị: “N’ụbọchị eze ndị ahụ [dị ugbu a], Chineke nke eluigwe ga-eguzobe otu alaeze [n’eluigwe], nke a gaghị ebibi ebibi mgbe ọ bụla, agaghịkwa ahapụrụ ndị ọzọ ọchịchị ya [agaghị enyekwa ọchịchị mmadụ ohere ọzọ ma ọlị]. Ọ [Alaeze Chineke] ga-etipịasị alaeze ndị a nile ma mee ka ha gwụsịa, ọ ga-eguzokwa ruo mgbe ebighị ebi.”​—⁠Revised Standard Version.

14. Gịnị bụ uru ụfọdụ ga-abịa n’ihi ọgwụgwụ nke ọchịchị mmadụ?

14 Mgbe e wepụsịrị ịchịisi nile na-adabereghị n’ebe Chineke nọ, ọchịchị Alaeze Chineke n’elu ụwa ga-abịaru ozuzu ya. Ebe ọ bụ na Alaeze ahụ ga-achị site n’eluigwe, ụmụ mmadụ apụghị imerụ ya ma ọlị. Ikike ịchịisi ga-adị n’ebe ọ dị site ná mmalite, n’eluigwe, n’aka Chineke. Ebe ọ bụkwa na ịchịisi nke Chineke ga-achịkwa ụwa nile, ọ dịghị onye ọ bụla a ga-eduhie ọzọ site n’okpukpe ụgha ma ọ bụ nkà ihe ọmụma na echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụmụ mmadụ, ndị na-adịghị enye afọ ojuju. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ihe ndị ahụ a ga-ekwe ka ọ dịrị.​—⁠Matiu 7:​15-23; Mkpughe, isi nke 17 ruo 19.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa zuru ezu nke ndụ Jisọs, lee akwụkwọ ahụ bụ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, bụ́ nke Watchtower Society bipụtara na 1991.

[Foto dị na peeji nke 18]

Mgbe ọ nọ n’ụwa Jisọs gwọrọ ndị ọrịa ma kpọlite ndị nwụrụ anwụ iji gosi ihe ọ ga-eme n’ụwa ọhụrụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 19]

Alaeze eluigwe nke Chineke ga-echipịasị ụdị nile nke ọchịchị ndị na-adabereghị n’ebe ọ nọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya