Akụkụ nke 10
Ụwa Ọhụrụ Dị Ebube nke Chineke Ga-eweta
1, 2. Gịnị ga-eme mgbe agha Amagedọn nke ga-eme ka ebe nile dị ọcha gasịrị?
MGBE agha Amagedọn nke Chineke ga-eji mee ka ebe nile dị ọcha gasịrị, gịnị ga-esochi? Mgbe ahụ usoro ihe ọhụrụ dị ebube ga-amalite. Ndị lanarịrị Amagedọn, ebe ha gosipụtaworo nguzosi ike ha n’okpuru ọchịchị Chineke, ga-abụ ndị e dubatara n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Lee oge ọhụrụ na-akpali akpali nke akụkọ ihe mere eme nke ahụ ga-abụ ka uru ndị dị ebube na-abịara ezinụlọ nke mmadụ site n’aka Chineke!
2 N’okpuru nduzi nke Alaeze Chineke, ndị ahụ lanarịrịnụ ga-amalite iwulite paradaịs. Ike ha ga-abụ nke e tinyere kpam kpam ná nchụso na-abụghị maka ọdịmma onwe onye, nke ga-abara ihe nile dị ndụ na mgbe ahụ uru. A ga-amalite ime ka ụwa ghọọ ebe obibi mara mma, nke udo, nke na-enye afọ ojuju maka ihe a kpọrọ mmadụ.
Ezi Omume Ga-anọchi Ajọ Omume
3. Ntụsara ahụ dị aṅaa ka a ga-enwe ozugbo Amagedọn gasịrị?
3 Ihe ndị a nile ga-ekwe mee site ná mbibi nke ụwa Setan. A gaghị enwe okpukpe ụgha, usoro ihe ọha mmadụ, ma ọ bụ ọchịchị, bụ́ ndị na-eweta nkewa. A gaghị enwekwa mkpọsa nke okwu nduhie Setan iji rafuo ụmụ mmadụ ọzọ; a ga-ebibikọ ndị nile na-akpọsa ya ha na usoro ihe Setan. Cheedị echiche: a ga-ekpochapụ mmetụta na-egbu egbu nke ụwa Setan! Lee ụdị ntụsara ahụ nke ahụ ga-abụ!
4. Kọwaa mgbanwe a ga-enwe n’izi ihe nke ga-ewere ọnọdụ.
4 Mgbe ahụ echiche ndị na-ebibi ihe nke ọchịchị mmadụ ga-abụ nke e ji ozizi na-ewuli elu nke sitere n’aka Chineke dochie. “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova.” (Aịsaịa 54:13) Site n’ozizi ihe nke a na-ewuli elu site n’afọ ruo n’afọ, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Ụmụ mmadụ agaghị amụta ihe dị njọ ọzọ, kama “ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi mụtaworo.” (Aịsaịa 26:9) Echiche na omume ndị na-ewuli elu ga-aghọ ihe a na-ahụ n’ebe nile.—Ọrụ 17:31; Ndị Filipaị 4:8.
5. Gịnị ga-eme mmebi iwu nile na ndị na-emebi iwu?
5 Ya mere, a gaghị enwekwa igbu mmadụ, ime ihe ike, idina mmadụ n’ike, izu ohi, ma ọ bụ imempụ. Ọ dịghị onye ọ bụla ga-ata ahụhụ n’ihi omume ọjọọ nke ndị ọzọ. Ilu 10:30 na-asị: “A gaghị ewezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi: ma ndị na-emebi iwu agaghị ebi n’ụwa.”
A Ga-eweghachi Ahụ Ike Zuru Okè
6, 7. (a) Ọnọdụ ọjọọ dị aṅaa nke dị adị n’ezie ka ọchịchị Alaeze ga-eweta ná njedebe? (b) Olee otú Jisọs si gosipụta nke a mgbe ọ nọ n’ụwa?
6 N’ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-eme ka mmetụta ọjọọ nile nke nnupụisi mbụ ahụ gharakwa ịdị irè. Dị ka ihe atụ, ọchịchị Alaeze ga-ewepụ ọrịa na ịka nká. Taa, ọbụna ọ bụrụ na i nwere ókè ụfọdụ nke ahụ ike, eziokwu a na-apụghị izere bụ na ka ị na-emewanye okenye, anya gị na-akwụsị ịhụ ụzọ nke ọma, eze gị na-erekasị, ikike ịnụ ihe gị na-ebelata, akpụkpọ ahụ gị na-adọlị, ike na-amalite ịgwụ akụkụ ahụ ndị dị n’ime ahụ gị, ruo mgbe ị ga-emesị nwụọ.
7 Otú ọ dị, mmetụta ndị ahụ jọgburu onwe ha anyị ketara n’aka nne na nna mbụ anyị ga-agabiga n’oge na-adịghị anya. Ì chetara ihe Jisọs gosipụtara banyere ahụ ike mgbe ọ nọ n’ụwa? Bible na-akọ, sị: “Ọtụtụ mmadụ wee bịakwute ya, chịrị ndị ngwụrọ, ndị ìsì, ndị ogbi, ndị ọrụsị, na ọtụtụ ndị ọrịa dị iche, tinyere onwe ha, ha wee tọgbọ ha n’ala n’ụkwụ ya; o wee mee ka ahụ ha dị ike: ya mere na o juru ìgwè mmadụ ahụ anya, mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu, na ndị ọrụsị ka ahụ ha dị mma, na ndị ngwụrọ ka ha na-eje ije, na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ.”—Matiu 15:30, 31.
8, 9. Kọwaa obi ụtọ nke ga-abịa n’ụwa ọhụrụ ahụ mgbe e weghachiri ahụ ike zuru okè.
8 Lee oké obi ụtọ ga-abịa n’ụwa ọhụrụ ahụ ka a na-ewepụ ọrịa anyị nile! Ahụhụ nke na-esite n’enweghị ezi ahụ ike agaghị emekpa anyị ahụ ọzọ. “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 33:24; 35:5, 6.
9 Ọ́ gaghị abụ ihe na-akpali akpali iteta kwa ụtụtụ ma chọpụta na i nwere ezi ahụ ike ugbu a? Ọ́ gaghị abụ ihe afọ ojuju nye ndị meworo okenye ịmara na e weghachiwo ha n’ikike nile nke ntorobịa, na ha ga-enwetakwa izu okè nke Adam na Iv nwere na mbụ? Nkwa Bible bụ: “Anụ ahụ ya ga-adị ọhụrụ karịa nke nwata; ọ na-alaghachi ruo ụbọchị okorobịa ya.” (Job 33:25) Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ ịtụfu enyo anya ndị ahụ, ihe ndị ahụ na-enye aka n’ịnụ ihe, mkpọrọ ndị ahụ ndị ụkwụ na-adịghị ji aga ije, ígwè ndị ahụ e ji ebu ndị ngwụrọ, na ọgwụ! A gaghị enwe mkpa ọzọ maka ụlọ ọgwụ, ndị dọkịta, na ndị na-agwọ ọrịa eze.
10. Gịnị ga-eme ọnwụ?
10 Ndị nwere ụdị ezi ahụ ike dị otú a agaghị achọ ịnwụ. Ha agaghịkwa anwụ, n’ihi na ihe a kpọrọ mmadụ agaghị anọ n’okpuru ezughị okè e ketara eketa na ọnwụ ọzọ. Kraịst ‘aghaghị ịbụ eze, ruo mgbe Chineke ga-edebeworị ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.’ “Onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi.”—1 Ndị Kọrịnt 15:25, 26; Ndị Rom 6:23; leekwa Aịsaịa 25:8.
11. Olee otú Mkpughe si kọwaa ná mkpirikpi, uru dị iche iche nke ụwa ọhụrụ ahụ?
11 N’ịchịkọta uru ndị ga-esi n’aka Chineke nke na-eche banyere anyị bịara ezinụlọ mmadụ n’ime Paradaịs, akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-asị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
Ndị Nwụrụ Anwụ Na-alọghachi ná Ndụ
12. Olee otú Jisọs si gosipụta ike Chineke nyere ya nke ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ?
12 Jisọs mere ihe karịrị ịgwọ ndị ọrịa na ịgwọ ndị ngwụrọ. O sikwa n’ili kpọghachite ndị mmadụ. O si otú a gosipụta ike dị ebube nke mbilite n’ọnwụ nke Chineke nyeworo ya. Ì chetara mgbe ahụ Jisọs bịara n’ụlọ otu nwoke onye nwa ya nwanyị nwụnahụrụ? Jisọs gwara nwa agbọghọ ahụ nwụrụ anwụ, sị: “Nwa agbọghọ nta, asị m gị, Bilie.” Gịnị si na nke a pụta? “Ngwa ngwa nwa aghọghọ nta ahụ wee bilie, jegharịakwa.” Ka ha hụrụ nke a, “ibubo wee nwụbiga ha nile ókè n’ahụ,” bụ́ ndị nọ n’ebe ahụ. Ha apụghị ịchịkwa obi ụtọ ha!—Mak 5:41, 42; leekwa Luk 7:11-16; Jọn 11:1-45.
13. Ụdị ndị dịgasị aṅaa ka a ga-akpọlite n’ọnwụ?
13 N’ụwa ọhụrụ, “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) N’oge ahụ Jisọs ga-eji ike Chineke nyere ya kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ihi na, dị ka ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25) O kwukwara, sị: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili [ná ncheta nke Chineke] ga-anụ olu ya [Jisọs], ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29.
14. N’ihi na ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ, olee ihe ndị a ga-eme ka ha ghara ịdịkwa?
14 A ga-enwe oké obi ụtọ n’ụwa nile mgbe ìgwè kwuru ìgwè nke ndị nwụrụ anwụ na-alọghachi ná ndụ ịbịa sonyere ndị ha hụrụ n’anya! A gaghị enwekwa ọzọ, ebe a na-ebipụta ọnwụ ndị mmadụ n’akwụkwọ iji wetara ndị fọrọ ndụ mwute. Kama nke ahụ, ihe a ga-enwe ga-adị nnọọ iche na nke ahụ: ịma ọkwa banyere ndị a ka si n’ọnwụ kpọlite ọhụrụ iji wetara ndị hụrụ ha n’anya ọṅụ. Ya mere agaghị enwekwa ememe ili ozu, ihe ndị e ji esu ozu ọkụ, ebe a na-esu ozu ọkụ, ma ọ bụ ebe ndị a na-eli ozu!
Ụwa nke Dị n’Udo n’Ezie
15. Olee otú a ga-esi nweta mmezu nke amụma Maịka n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu karịsịa?
15 A ga-enwe ezi udo n’akụkụ nile nke ndụ. Agha, ndị na-akwado agha, na imepụta ngwá agha ga-abụ ihe mgbe ochie. N’ihi gịnị? N’ihi na ọdịmma dị iche iche nke mba, ebo, na agbụrụ, bụ́ ndị na-akpata nkewa, ga-apụ n’anya. Mgbe ahụ, n’echiche zukarịsịrị ezu, “mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Maịka 4:3.
16. Olee otú Chineke ga-esi hụ na agha ga-aghọ ihe a na-apụghị ịlụ ọzọ?
16 Nke a ga-eyi oké ihe ijuanya n’ihi akụkọ ihe mere eme mmadụ nke ịkwafu ọbara n’agha a na-alụ kwa mgbe. Ma nke ahụ bụ n’ihi na ụmụ mmadụ nọ n’okpuru ọchịchị nke mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ. N’ụwa ọhụrụ ahụ, n’okpuru ọchịchị Alaeze, nke a bụ ihe ga-eme: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova . . . [Ọ] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; ọ na-esure ụgbọ ala nile [nke agha] n’ọkụ.”—Abụ Ọma 46:8, 9.
17, 18. N’ụwa ọhụrụ ahụ, mmekọrịta dị aṅaa ga-adị n’etiti mmadụ na anụmanụ?
17 Mmadụ na ụmụ anụ ga-adịkwa n’udo, dị ka ha dịrị n’Iden. (Jenesis 1:28; 2:19) Chineke na-asị: “Nyekwa ha, m ghaghị ime ọgbụgba ndụ n’ụbọchị ahụ banyere anụ ọhịa nke ubi nakwa ihe e kere eke nke na-efegharị n’eluigwe na ihe na-akpụ akpụ nke elu ala . . . M ga-emekwa ka ha dinaa ala ná ntụkwasị obi.”—Hosea 2:18, NW.
18 Ruo ókè hà aṅaa ka udo ahụ ga-agbasapụ ruo? “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha.” Ụmụ anụmanụ agaghị abụkwa ihe na-eyi egwu ọzọ n’ebe mmadụ ma ọ bụ onwe ha nọ. Ọbụna ọdụm “ga-atakwa okporo ọka dị ka ehi”!—Aịsaịa 11:6-9; 65:25.
Ụwa nke E Mere Ka Ọ Ghọọ Paradaịs
19. Gịnị ka a ga-eme ka ụwa ghọọ?
19 A ga-eme ka ụwa nile ghọọ ebe obibi paradaịs maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ ya mere Jisọs pụrụ iji kwe nwoke nke kwere na ya nkwa, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” Bible na-asị: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwu ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose. . . . N’ihi na n’ọzara ka mmiri na-agbawapụta, mmiri iyi kwa n’ala ihe na-adịghị.”—Luk 23:43, NW; Aịsaịa 35:1, 6.
20. N’ihi gịnị ka agụụ na-agaghị eji mekpaa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ ọzọ?
20 N’okpuru Alaeze Chineke, agụụ agaghị emekpa ọtụtụ nde ndị mmadụ ahụ ọzọ. “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” “Osisi ọhịa ga-amịkwa mkpụrụ ya, ala ga-emekwa ihe omume ya, ha ga-anọkwa n’elu ala ha ná ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 72:16; Ezekiel 34:27.
21. Gịnị ga-eme enweghị ebe obibi, nkịrịka ụlọ dị iche iche, na ógbè ebe obibi ndị dị njọ?
21 Ịda ogbenye, ndị na-enweghị ebe obibi, ndị bi ná nkịrịka ụlọ, ma ọ bụ ógbè ebe imempụ jupụtara agaghị adịkwa ọzọ. “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie.” “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Aịsaịa 65:21, 22; Maịka 4:4.
22. Olee otú Bible si akọwa ngọzi dị iche iche nke ọchịchị Chineke?
22 A ga-eji ihe ndị a nile nakwa ihe ndị ọzọ gọzie ụmụ mmadụ na Paradaịs. Abụ Ọma 145:16 na-asị: “Ị [Chineke] na-asaghe aka gị, ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” Ka a sịkwa ihe amụma Bible ji na-ekwupụta, sị: “Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. . . . Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:11, 29.
Imezi Ihe Ndị Gaworo Aga
23. Olee otú Alaeze Chineke ga-esi mezighachi ahụhụ ndị anyị nweworo?
23 Ọchịchị Alaeze Chineke ga-emezi mmejọ nile e mejọrọ ezinụlọ nke mmadụ kemgbe puku afọ isii gara aga. Ọṅụ a ga-enwe na mgbe ahụ ga-akarị ahụhụ ọ bụla nke ụmụ mmadụ taworo n’ebe ọ dị ukwuu. Ọ dịghị ncheta ọ bụla nke ahụhụ a tara na mbụ nke ga-enye ndụ nsogbu. Echiche na ọrụ ndị na-ewuli elu, ndị ga-abụ ndụ ụmụ mmadụ na-adị kwa ụbọchị ga-eji nwayọọ nwayọọ hichapụ ihe ncheta ndị ahụ na-egbu mgbu.
24, 25. (a) Gịnị ka Aịsaịa buru n’amụma na ọ ga-eme? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jiri n’aka na a ga-echefu ncheta nke ahụhụ ndị gara aga?
24 Chineke ahụ nke na-eche banyere anyị na-ekwupụta, sị: “M gaje ike eluigwe ọhụrụ [ọchịchị ọhụrụ nke eluigwe n’elu ihe a kpọrọ mmadụ] na ụwa ọhụrụ [òtù ụmụ mmadụ nke ezi omume]: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke mụ onwe m na-eke.” “Ụwa nile ezuwo ike, dị jụụ: ha etiwawo mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 14:7; 65:17, 18.
25 Ya mere site n’Alaeze ya, Chineke ga-atụgharị ọnọdụ ọjọọ nke dịgideworo eri ogologo oge. Ruo mgbe nile ebighị ebi ọ ga-egosi anyị ezi nlekọta ya site n’ịwụpụrụ anyị ngọzi dị iche iche nke ga-akwụ ụgwọ gabiga ókè maka mmerụ ahụ ọ bụla anyị nwetara ná ndụ mbụ anyị. Anyị agaghị na-echetakebe nsogbu ndị anyị nwere na mbụ na mgbe ahụ, ma ọ bụrụ na anyị echeta ya ma ọlị.
26. N’ihi gịnị ka Chineke ga-eji kwụọ anyị ụgwọ maka ahụhụ ọ bụla gaworo aga?
26 Nke ahụ bụ otú Chineke ga-esi kwụọ ụgwọ maka ahụhụ ọ pụrụ ịbụ na anyị ediwo n’ụwa nke a. Ọ maara na ọ bụghị n’ihi ihe anyị mere ka e ji mụọ anyị dị ka ndị na-ezughị okè, n’ihi na anyị ketara ezughị okè site n’aka nne na nna mbụ anyị. Ọ bụghị n’ihi ihe anyị metere ka e ji mụnye anyị n’ime ụwa Setan, n’ihi na a sị na Adam na Iv kwesịrịrịị ntụkwasị obi, a gaara amụ anyị n’ime paradaịs kama nke ahụ. Ya mere site n’obi ebere dị ukwuu, Chineke ga-akwụ ụgwọ gabiga ókè maka ọnọdụ ọjọọ gaworo aga nke e bokwasịrị anyị.
27. Amụma ndị dị aṅaa ga-ahụ mmezu ha dị ebube n’ụwa ọhụrụ ahụ?
27 N’ụwa ọhụrụ ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ ga-enweta inwe onwe ahụ e buru amụma ya ná Ndị Rom 8:21, 22, sị: “N’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke. N’ihi na anyị matara na ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” Ndị nọ mgbe ahụ ga-ahụ mmezu zuru ezu nke ekpere ahụ bụ: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Ọnọdụ ndị ahụ dị ebube nke Paradaịs elu ala ga-egosipụta ọnọdụ ndị e nwere n’eluigwe.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
N’ụwa ọhụrụ ahụ, ndị meworo okenye ga-alọghachi n’ike nke ntorobịa
[Foto dị na peeji nke 24]
A ga-ewepụ ọrịa na ọrụsị nile n’ụwa ọhụrụ ahụ
[Foto dị na peeji nke 25]
N’ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ bịa ná ndụ
[Foto dị na peeji nke 26]
“Ha agaghị amụtakwa agha ọzọ”
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ ga-anọ n’udo zuru ezu na Paradaịs
[Foto dị na peeji nke 27]
‘Chineke ga-emeghe aka ya were ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya’
[Foto dị na peeji nke 28]
Alaeze Chineke ga-akwụ ụgwọ gabiga ókè maka ahụhụ nile ndị anyị tachiworo obi na ha