Olee Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka?
“Ọ BỤRỤ na ọ dị ihe ọ bụla m pụrụ ime, biko mee ka m mara.” Nke a bụ ihe ọtụtụ n’ime anyị na-agwa enyi ma ọ bụ onye ikwu ahụ mmadụ nwụnahụrụ ọhụrụ. Oo, anyị ji ezi obi na-ekwu ya. Anyị ga-eme ihe ọ bụla iji nye aka. Ma onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ ọ̀ na-akpọ anyị ma sị: “Echewo m banyere ihe ị pụrụ ime iji nyere m aka”? Ọ dịghị otú a mgbe nile. N’ụzọ doro anya, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịmalite ime ihe ụfọdụ ma ọ bụrụ na anyị ga-enye aka n’ezie ma kasie onye na-eru újú obi.
Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru ná mgbe kwesịrị ya bụ.” (Ilu 15:23; 25:11) Amamihe dị n’ịmara ihe a ga-ekwu na ihe a na-agaghị ekwu, ihe a ga-eme na ihe a na-agaghị eme. E nwere n’ebe a aro ole na ole si n’Akwụkwọ Nsọ nke ụfọdụ ndị mmadụ nwụnahụworo chọpụtara dị ka ihe na-enye aka.
Ihe A Ga-eme . . .
Gee ntị: Bụrụ onye “na-anụ ihe ọsọ ọsọ,” ka Jemes 1:19 na-ekwu. Otu n’ime ihe ndị kasị mma ị pụrụ ime bụ isoro onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ kerịta ihe mgbu ya site n’ige ntị. Ụfọdụ ndị mmadụ nwụnahụrụ pụrụ inwe mkpa nke ikwu okwu banyere onye ha hụrụ n’anya nwụworo anwụ, banyere ihe mberede ahụ ma ọ bụ ọrịa nke kpatara ọnwụ ahụ, ma ọ bụ banyere mmetụta ha kemgbe onye ahụ nwụrụ. Ya mere jụọ: “Ị̀ ga-enwe mmasị ikwu okwu banyere ya?” Kwe ka ha kpebie. N’icheta mgbe nna ya nwụrụ, otu nwa okorobịa kwuru, sị: “O nyeere m aka n’ezie mgbe ndị ọzọ jụrụ m banyere ihe merenụ ma mgbe ahụ gee ntị nke ọma.” Jiri ndidi na ọmịiko gee ntị n’echeweghị na ọ bụ iwu na ị ga-enye azịza ma ọ bụ ihe ngwọta. Nye ha ohere ka ha kwupụta ihe nile ha chọrọ isoro gị kerịta.
Nye ihe mmesi obi ike: Mesie ha obi ike na ha mere ihe nile kwere omume (ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ị maara na ọ bụ eziokwu ma zie ezi). Mesighachi ha obi ike na mmetụta ha na-enwe—mwute, iwe, ikpe ọmụma, ma ọ bụ mmetụta ọzọ—apụghị ịbụ ma ọlị ihe a na-adịghị ahụkebe. Gwa ha banyere ndị ọzọ ị maara bụ́ ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịgbake site n’ọnwụ yiri nke a. “Okwu ọnụ ụtọ nile” dị otú ahụ bụ “ihe na-agwọ ọkpụkpụ,” ka Ilu 16:24 na-ekwu.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:11, 14.
Nọrọ nso: Mee ka gị onwe gị nọrọ nso, ọ bụghị nanị n’ime ụbọchị ole na ole ndị mbụ mgbe ọtụtụ ndị enyi na ndị ikwu nọ ya, kama ọbụna mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị mgbe ndị ọzọ laghachiworo n’usoro ime ihe. N’ụzọ dị otú a ị na-egosipụta onwe gị ịbụ “enyi na-ahụ n’anya,” ụdị ahụ na-eguzo n’akụkụ enyi n’oge “ahụhụ.” (Ilu 17:17) “Ndị enyi anyị jidere n’aka na uhuruchi anyị nile nwere usoro ihe ndị a ga-eme nke mere na nanị anyị anọghị ogologo oge dị ukwuu n’ụlọ,” ka Teresea na-akọwa, bụ́ onye nwa ya nwụrụ n’ihe mberede ụgbọ ala. “Nke ahụ nyeere anyị aka ịnagide mmetụta nke ịtọgbọrọ chakoo anyị nwere.” Ruo ọtụtụ afọ mgbe nke a gasịrị, ụbọchị ncheta dị iche iche, dị ka ụbọchị ncheta agbamakwụkwọ ma ọ bụ ụbọchị ọnwụ, pụrụ ịbụ oge nchegbu maka ndị dị ndụ. Gịnị ma ị kanye ụbọchị ndị ahụ akara na kalenda gị ka ọ ga-abụ mgbe oge ahụ ruru n’afọ, ị pụrụ ime onwe gị ka ị nọrọ nso, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, maka inye nkwado ọmịiko?
Bute ụzọ n’ime ihe ndị kwesịrị ekwesị: È nwere ozi ndị ọ dị mkpa ka e jee? Ọ̀ dị mkpa ka mmadụ lekọta ụmụntakịrị? Ọ̀ dị ndị enyi na ndị ikwu bịara nleta mkpa ịhụ ebe ha ga-anọ? Ndị mmadụ nwụnahụrụ n’oge na-adịghị anya na-anọkarị n’oké ihe mgbagwoju anya nke na ha adịghị ama ọbụna ihe ọ dị ha mkpa ime, ya fọdụkwa ịgwa ndị ọzọ otú ha pụrụ isi nye aka. Ya mere ọ bụrụ na ị ghọta na e nwere ihe bụ mkpa n’ezie, echela ka a gwa gị agwa; malite ime ihe. (1 Ndị Kọrint 10:24; tụlee 1 Jọn 3:17, 18.) Otu nwanyị di ya nwụworo chetara, sị: “Ọtụtụ ndị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ọ dị ihe m pụrụ ime, mee ka m mara.’ Ma otu enyi ajụghị. Ọ bakpuru n’ime ụlọ ihi ụra, sere ákwà a tọrọ n’elu àkwà, ma saa ákwà ndị ahụ metọrọ n’oge ọnwụ ya. Onye ọzọ buuru bọket, mmiri, na ihe ndị e ji asacha ihe ma sachapụ ihe a tọrọ n’ala ụlọ ebe di m gbọrọ ihe. Mgbe izu ole na ole gasịrị, otu n’ime ndị okenye ọgbakọ yi uwe ọrụ ya burukwa ngwá ọrụ ya bịa, wee sị, ‘M maara na a ghaghị inwe ihe ọ dị mkpa ka e dozie. Gịnị ka ọ bụ?’ Lee ka nwoke ahụ si dị oké ọnụ ahịa nye obi m maka idozi ọnụ ụzọ ahụ nke ihe e ji kụgide ya n’ibo ọnụ ụzọ fọdụziri otu na maka idozi ihe ọkụ eletrik!”—Tụlee Jemes 1:27.
Bụrụ onye na-ele ndị ọbịa nke ọma: “Unu echezọla ile ndị ọbịa nke ọma,” ka Bible na-echetara anyị. (Ndị Hibru 13:2) Anyị kwesịrị icheta ile ndị ọbịa nke ọma karịsịa nye ndị ahụ na-eru újú. Kama ịsị ha “bịa mgbe ọ bụla,” setịpụ oge na ụbọchị. Ọ bụrụ na ha ajụ, ike agwụla gị ngwa ngwa. Agbamume dị nro pụrụ ịdị mkpa. Ma eleghị anya ha jụrụ ịkpọ òkù gị n’ihi na ha na-atụ egwu ịda n’ịchịkwa mmetụta uche ha n’ihu ndị ọzọ. Ma ọ bụ ha pụrụ inwe mmetụta ikpe ọmụma isonyere n’ihe oriri ma ọ bụ mkpakọrịta n’oge dị otú a. Cheta nwanyị ahụ na-ele ndị ọbịa nke ọma bụ́ Lidia, onye a kpọtụrụ aha n’ime Bible. Mgbe a kpọsịrị ha òkù ịbịa n’ụlọ nwanyị ahụ, Luk kwuru sị, “O wee rụgide anyị.”—Ọrụ 16:15.
Nwee ndidi, nweekwa nghọta: Ya ejula gị anya gabiga ókè ihe onye mmadụ nwụnahụrụ pụrụ ikwu ná mbụ. Cheta, ha pụrụ ịdị na-ewe iwe ma na-enwe mmetụta ikpe ọmụma. Ọ bụrụ na ọ bụ n’ebe ị nọ ka e chere ntiwapụ nke mmetụta uche ihu, ọ ga-ewe nghọta na ndidi n’akụkụ gị ịghara iji iwe zaghachi. “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi,” ka Bible na-atụ aro ya.—Ndị Kọlọsi 3:12, 13.
Dee akwụkwọ ozi: A na-elegharakarị abamuru nke akwụkwọ ozi ọmịiko ma ọ bụ kaadị ọmịiko anya. Gịnị bụ abamuru ya? Cindy onye ọrịa cancer gburu nne ya na-aza, sị: “Otu enyi m detaara m akwụkwọ ozi mara mma. Nke ahụ nyeere m aka n’ezie n’ihi na m pụrụ ịgụghachi ya ọtụtụ ugbo.” A pụrụ iji “okwu ole na ole” dee ụdị akwụkwọ ozi ma ọ bụ kaadị agbamume dị otú ahụ, ma o kwesịrị ịbụ ihe dị n’obi gị. (Ndị Hibru 13:22) Ọ pụrụ ikwu na ị na-eche banyere ya na i nwekwara ncheta pụrụ iche banyere onye ahụ nwụrụ anwụ, ma ọ bụ ọ pụrụ igosi otú onye ahụ nwụrụ anwụ si nwee mmetụta ná ndụ gị.
Soro ha kpee ekpere: Elelịla abamuru nke ekpere i soro ndị mmadụ nwụnahụrụ kpee na ndị i kpere maka ha. Bible na-ekwu, sị: “Arịrịọ nke onye ezi omume dị ike nke ukwuu.” (Jemes 5:16) Dị ka ihe atụ, ịnụ ka ị na-ekpe ekpere maka ha pụrụ inyere ha aka ibelata mmetụta ndị na-ezighị ezi dị ka ikpe ọmụma.—Tụlee Jemes 5:13-15.
Ihe A Na-agaghị Eme . . .
Anọla ebe dị anya n’ihi na ị maghị ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ ihe ị ga-eme: ‘Eji m n’aka na ọ dị mkpa ka ha nọrọ nanị ha kpọmkwem ugbu a,’ ka anyị pụrụ ịgwa onwe anyị. Ma eleghị anya eziokwu bụ na anyị na-anọpụ ebe dị anya n’ihi na egwu na-atụ anyị ikwu ma ọ bụ ime ihe na-adịghị mma. Otú ọ dị, ịbụ onye ndị enyi, ndị ikwu, ma ọ bụ ndị kwere ekwe ibe ha zeere pụrụ nanị ime ka onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ nwee owu ọmụma, na-agbakwụnye ihe n’ihe mgbu ahụ. Cheta, okwu na omume ndị kasị mma na-abụkarị ndị kasị dị mfe. (Ndị Efesọs 4:32) Nanị ọnụnọ ị nọ ebe ahụ pụrụ ịbụ isi iyi nke agbamume. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 28:15.) N’icheta ụbọchị ada ya nwụrụ, Teresea na-ekwu, sị: “N’ime otu hour, kọrịdọ ụlọ ọgwụ ahụ ejupụtawo ná ndị enyi anyị; ndị okenye nile na ndị nwunye ha nọ n’ebe ahụ. Ụfọdụ n’ime ndị inyom ahụ bucha ihe e ji ekohị ntutu isi n’isi, ụfọdụ yi uwe ọrụ ha. Ha kwasara nnọọ ihe nile wee bịa. Ọtụtụ n’ime ha gwara anyị na ha amaghị ihe ha ga-ekwu, ma ọ dịghị ihe o mere n’ihi na ha nọ kpọmkwem n’ebe ahụ.”
Arụgidela ha ịkwụsị iru újú: ‘O zuola, o zuola, ebela ákwá,’ ka anyị pụrụ ịchọ ikwu. Ma ọ pụrụ ịka mma ikwe ka anya mmiri gbaa. “M chere na ọ dị mkpa ikwe ka ndị mmadụ nwụnahụrụ gosi mmetụta ha ma tọhapụ ha n’ezie,” ka Katherine na-ekwu, na-echeta ọnwụ di ya. Guzogide àgwà nke ịgwa ndị ọzọ ihe kwesịrị ịbụ mmetụta ha. Emekwala dị ka à ga-asị na ị na-ezo mmetụta gị iji chebe nke ha. Kama nke ahụ, ‘soro ndị na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá,’ ka Bible na-atụ aro ya.—Ndị Rom 12:15.
Adịla ngwa n’ịdụ ha ọdụ iwepụsị uwe ma ọ bụ ihe onwe onye ndị ọzọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ tupu ha adịrị njikere: Anyị pụrụ iche na ọ ga-aka mma ha iwepụsị ihe ndị na-akpali ncheta n’ihi na n’ụzọ ụfọdụ ha na-eme ka iru újú dịtee anya. Ma okwu ahụ bụ́ “Ihe pụọ n’anya, ọ pụọ n’obi” nwere ike ọ gaghị ekwekọ na nke a. Ọ pụrụ ịdị onye mmadụ nwụnahụrụ mkpa iji nwayọọ nwayọọ chefuo onye ahụ nwụrụ anwụ. Cheta nkọwa Bible banyere mmeghachi omume nke nna ochie ahụ bụ́ Jekọb mgbe e dubara ya n’ikwere na anụ ọhịa egbuwo nwa ya na-eto eto bụ́ Josef. Mgbe e chesịrị n’ihu Jekọb uwe ogologo Josef nke ọbara tetọrọ, o “ruuru nwa ya újú ọtụtụ ụbọchị. Ụmụ ya ndị ikom nile na ụmụ ya ndị inyom nile wee bilie ịkasi ya obi; ma ọ jụrụ, na a gaghị akasi ya obi.”—Jenesis 37:31-35.
Ekwula, ‘Ị pụrụ inweta nwa ọhụrụ ọzọ’: “M kpọrọ ndị mmadụ ịgwa m na m pụrụ inweta nwa ọzọ asị,” ka otu nne nwa ya nwụrụ na-echeta. Ha pụrụ ibu ihe dị mma n’obi, ma nye onye mụrụ nwa na-eru újú, okwu ndị pụtara na a pụrụ idochi nwa ahụ nwụrụ anwụ pụrụ ‘ịdụpu dị ka mma agha.’ (Ilu 12:18) Otu nwa apụghị ịnọchi anya ọzọ ma ọlị. N’ihi gịnị? N’ihi na nke ọ bụla pụrụ iche.
Ezerechala ịkpọtụ aha onye ahụ hapụrụ ahapụ: “Ọtụtụ ndị agaghị ọbụna akpọtụ aha nwa m nwoke bụ́ Jimmy ma ọ bụ kwuo okwu banyere ya,” ka otu nne na-echeta. “M ghaghị ikweta na o wutetụrụ m mgbe ndị ọzọ mere otú a.” Ya mere adịla agbanwe isiokwu ahụ mgbe a kpọtụrụ aha onye ahụ nwụrụ anwụ. Jụọ onye ahụ ma ọ̀ chọrọ ikwu okwu banyere onye ya ọ hụrụ n’anya. (Tụlee Job 1:18, 19 na 10:1.) Ụfọdụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-enwe ekele ịnụ ka ndị enyi na-ekwu okwu banyere àgwà ndị pụrụ iche mere ha ji wee hụ onye ahụ hapụrụ ahapụ n’anya.—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 9:36-39.
Adịbigala ngwa ókè ikwu sị, ‘Ọ dịchaghị njọ’: Ịnwa ịchọta ihe dị mma banyere ọnwụ ahụ abụghị mgbe nile ihe ‘na-agụgụ ndị dara mbà n’obi,’ bụ́ ndị na-eru újú. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) N’icheta mgbe nne ya nwụrụ, otu nwa agbọghọ kwuru, sị: “Ndị ọzọ ga-asị, ‘Ọ naghị ata ahụhụ’ ma ọ bụ, ‘Ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ nọ n’udo.’ Ma achọghị m ịnụ nke ahụ.” Ihe okwu ndị dị otú ahụ pụrụ ịpụtara ndị dị ndụ bụ na ha ekwesịghị inwe mwute ma ọ bụ na ọnwụ ahụ adịghị oké mkpa. Otú ọ dị, ha pụrụ ịdị na-enwe oké mwute n’ihi na ọ na-ewute ha na onye ha hụrụ n’anya anọghịzi.
Ọ pụrụ ịka mma ịghara ikwu sị, ‘M ma mmetụta ị na-enwe’: Ị̀ maara n’ezie? Dị ka ihe atụ, ọ̀ pụrụ ikwe gị omume ịmara mmetụta nne ma ọ bụ nna na-enwe mgbe nwatakịrị nwụrụ ma ọ bụrụ na ụdị ọnwụ dị otú ahụ adakwasịbeghị gị? Ọbụnakwa ma ọ bụrụ na o mewo, ghọta na ndị ọzọ agaghị enwe mmetụta kpọmkwem otú i si nwee. (Tụlee Abụ Ákwá 1:12.) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na o yiri ka ò kwesịrị ekwesị, a pụrụ inwe abamuru ụfọdụ ịkọ otú i si gbakee site n’ọnwụ nke onye ị hụrụ n’anya. Otu nwanyị ada ya nwụrụ hụrụ ya dị ka ihe na-emesi obi ike mgbe nne nke nwatakịrị nwanyị ọzọ nwụworonụ kọrọ otú o si lọghachi n’ọnọdụ ibi ndụ kwesịrị ekwesị. O kwuru, sị: “Nne nwatakịrị nwanyị ahụ nwụrụ anwụ ejighị ‘M maara mmetụta ị na-enwe’ malite akụkọ ya. Ọ gwara m nnọọ otú ihe dịịrị ya ma mee ka m jikọta ya na ọnọdụ nke m.”
Inyere onye mmadụ nwụnahụrụ aka chọrọ ọmịiko, nghọta, na ịhụnanya dị ukwuu n’akụkụ nke gị. Echela ka onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ bịakwute gị. Asịla nnọọ, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla m pụrụ ime . . .” Chọpụta “ihe ọ bụla” ahụ n’onwe gị, mgbe ahụ malite ime ihe kwesịrị ekwesị.
Ajụjụ ole na ole fọdụrụ: Gịnị banyere olileanya Bible nke mbilite n’ọnwụ? Gịnị ka ọ pụrụ ịpụta nye gị na onye ị hụrụ n’anya nwụworo anwụ? Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ọ bụ olileanya a pụrụ ịdabere na ya?
Ajụjụ Ndị A Ga-echere Echiche
N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-enye aka isoro onye mmadụ nwụnahụrụ kerịta ihe mgbu ya site n’ige ntị?
Olee ihe ụfọdụ anyị pụrụ ime iji kasie onye na-eru újú obi?
Gịnị ka anyị kwesịrị izere ịgwa ma ọ bụ ime onye na-eru újú?
Igbe dị na peeji nke 25]
Inyere Ụmụntakịrị Aka Ịnagide Ọnwụ
Mgbe ọnwụ dakwasịrị ezinụlọ, ọtụtụ mgbe ndị mụrụ ụmụ nakwa ndị ikwu ndị ọzọ na ndị enyi adịghị ama ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ mee iji nyere ụmụntakịrị aka ịnagide ihe meworonụ. Ma, ndị okenye dị ụmụntakịrị mkpa iji nagide ọnwụ. Tụlee ajụjụ ụfọdụ a na-ajụkarị banyere inyere ụmụntakịrị aka ịghọta ọnwụ.
Olee otú ị pụrụ isi kọwaara ụmụntakịrị ihe bụ ọnwụ? Ọ dị mkpa ịkọwa ihe n’okwu ndị dị mfe. Meekwa ka ọ bụrụ eziokwu. Alala azụ iji okwu ndị bụ ezie mee ihe, dị ka “ịnwụ anwụ” na “ọnwụ.” Dị ka ihe atụ, ị pụrụ isoro nwatakịrị nọdụ ala, kuru ya n’aka gị, ma kwuo, sị: “Ihe dị oké mwute emewo. Ọrịa ọtụtụ ndị na-adịghị arịa rịasiri Papa ike [ma ọ bụ ihe ọ bụla ị maara bụ́ eziokwu], o wee nwụọ. Ọ dịghị onye ọ bụla ọnwụ ya si n’aka. Ọnụnọ ọ na-anọghịzi ga-ewute anyị nke ukwuu n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ hụkwara anyị n’anya.” Otú ọ dị, ọ pụrụ inye aka ịkọwa na o yighị ka nwatakịrị ahụ ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ya nke dị ndụ ga-anwụ nanị n’ihi na onye ahụ na-arịa ọrịa mgbe ụfọdụ.
Gbaa ha ume ịjụ ajụjụ. ‘Gịnị bụ ịnwụ anwụ?’ ka ha pụrụ ịjụ. Ị pụrụ ịza n’ụzọ nke a: “‘Ịnwụ anwụ’ pụtara na ahụ kwụsịrị ịrụ ọrụ, ọ pụghịkwa ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị ọ na-emebu—ọ pụghị ikwu okwu, ịhụ ụzọ, ma ọ bụ ịnụ ihe, ọ pụghịkwa inwe mmetụta nke ihe ọ bụla.” Nne ma ọ bụ nna kwenyere ná nkwa Bible nke mbilite n’ọnwụ pụrụ iji ohere a mee ihe ịkọwa na Jehova Chineke na-echeta onye ahụ hapụrụ ahapụ, na ọ pụkwara ịkpọghachi ya ná ndụ n’ime Paradaịs elu ala ahụ dị n’ihu. (Luk 23:43; Jọn 5:28, 29)—Lee nkebi ahụ bụ́ “Olileanya E Ji n’Aka Maka Ndị Nwụrụ Anwụ.”
Ọ̀ dị ihe ọ bụla ị na-ekwesịghị ikwu? Ọ bụghị ihe na-enye aka ikwu na onye ahụ nwụrụ anwụ agawo ije dị anya. Egwu nke ịbụ onye a gbahapụworo bụ nchegbu bụ isi nke nwatakịrị, karịsịa mgbe nne ma ọ bụ nna nwụworo. Ịbụ onye a gwara na onye ahụ nwụrụ anwụ mere njem pụrụ nanị ime ka echiche nke nwatakịrị ịbụ onye a gbahapụrụ agbahapụ siwanye ike, ọ pụkwara iche, sị: ‘Nne m ochie hapụrụ, ọ sịghị ọbụna ka e mesịa!’ Leziekwa anya n’ebe ụmụntakịrị na-eto eto nọ, banyere ikwu na onye ahụ hapụrụ ahapụ ehiwo ụra. Ụmụntakịrị na-ewerekarị ihe n’ụzọ nkịtị. Ọ bụrụ na nwatakịrị ewere ọnwụ na ụra dị ka otu ihe, ọ pụrụ ịrụpụta ịtụ egwu ihi ụra n’abalị.
Ụmụntakịrị hà kwesịrị ije ememe ili ozu? Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịtụle mmetụta ụmụntakịrị. Ọ bụrụ na ha achọghị ịje, amanyela ha ma ọ bụ n’ụzọ ọ bụla mee ka ha nwee ikpe ọmụma maka ejeghị. Ọ bụrụ na ha chọrọ ije, kọwazuoro ha ihe ga-eme n’ebe ahụ, tinyere ma à ga-enwe igbe ozu na ma à ga-emeghe ya ma ọ bụ mechie ya. Kọwaakwa na ha ga-ahụ ọtụtụ ndị na-akwa ákwá n’ihi na ha nwere mwute. Ọzọ, kwee ka ha jụọ ajụjụ. Mesiekwa ha obi ike na ha pụrụ ịla ma ọ bụrụ na ọ dị ha mkpa ime otú ahụ.
Olee otú ụmụntakịrị si emeghachi omume mgbe mmadụ nwụrụ? Ọtụtụ mgbe ụmụntakịrị na-eche na ọ bụ ha kpatara ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. N’ihi na nwatakịrị pụrụ n’otu oge ma ọ bụ n’ọzọ iwesaworị onye ahụ nwụrụ anwụ iwe, nwatakịrị ahụ pụrụ ịmalite ikwere na ọ bụ echiche ma ọ bụ okwu iwe kpatara ọnwụ ahụ. Ọ pụrụ ịdị mkpa gị ikwu okwu nkasi obi ụfọdụ: ‘Echiche na okwu gị abụghị ihe na-eme ka ndị mmadụ rịa ọrịa, ha anaghịkwa eme ka ndị mmadụ nwụọ.’ Okwu mmesi obi ike ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị nwatakịrị mkpa mgbe mgbe.
Ì kwesịrị izochinahụ ụmụntakịrị iru újú gị? Ịkwa ákwá n’ihu ụmụntakịrị kwesịrị ekwesị ma zie ezi. E wepụkwa nke ahụ, ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume izochinahụ ụmụntakịrị mmetụta gị kpam kpam; ha na-aghọtakarị ihe, ha pụkwara ọtụtụ mgbe iji echiche ha mata na e nwere ihe na-adịchaghị mma. Ime ihe n’eziokwu banyere iru újú gị na-eme ka ha mara na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị iru újú na mgbe ụfọdụkwa igosi mmetụta gị.
[Foto dị na peeji nke 21]
Ọ bụrụ na ị ghọta mkpa ziri ezi, echela ka a gwa gị agwa—malite ime ihe kwesịrị ekwesị
[Foto dị na peeji nke 22]
Ọnụnọ gị n’ụlọ ọgwụ pụrụ ịgba onye mmadụ nwụnahụrụ ume