Isi nke 7
Ihe Chineke Meworo Iji Zọpụta Ihe A Kpọrọ Mmadụ
1, 2. (a) Olee otú otu ọchịagha bụ́ onye Rom nke na-achị narị ndị agha si ghọta onye Ọkpara Chineke bụ? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka Jisọs nwụọ?
OTU ehihie n’oge opupu ihe ubi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, otu ọchịagha bụ́ onye Rom nke narị ndị agha kiriri ndị ikom atọ ka ha ji nwayọọ nwụọ ọnwụ ihe mgbu. Onye agha ahụ rịbara otu n’ime ha ama karịsịa—Jisọs Kraịst. A kpọgidewo Jisọs n’elu osisi. Urukpuru eluigwe n’ehihie gbachiri ka oge ọnwụ ya ruru. Mgbe ọ nwụrụ, ala mara jijiji nke ukwuu, onye agha ahụ wee tie mkpu, sị: “N’ezie Nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”—Mak 15:39.
2 Ọkpara Chineke! Onye agha ahụ kwuziri ekwuzi. Ọ ka kiripụrụ ihe omume kasị mkpa nke metụrụla n’elu ụwa. N’oge ndị bu ụzọ, Chineke n’onwe ya akpọwo Jisọs Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. (Matiu 3:17; 17:5) N’ihi gịnị ka Jehova jiworo kwere ka Ọkpara ya nwụọ? N’ihi na nke a bụ ụzọ Chineke isi zọpụta ihe a kpọrọ mmadụ site ná mmehie na ọnwụ.
ỊBỤ ONYE A HỌỌRỌ MAKA NZUBE PỤRỤ ICHE
3. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịhọrọ Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya maka nzube pụrụ iche metụta ihe a kpọrọ mmadụ?
3 Dị ka anyị mụtaworo na mbụ n’akwụkwọ a, Jisọs dịburu adị tupu ọ ghọọ mmadụ. A na-akpọ ya “Ọkpara Chineke mụrụ nanị Ya” n’ihi na Jehova kere ya n’onwe ya. Chineke mesịrị jiri Jisọs mee ka ihe nile ọzọ dịrị. (Jọn 3:18; Ndị Kọlọsi 1:16) Ihe na-atọ Jisọs ụtọ dị n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. (Ilu 8:30, 31) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji họrọ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya iji mezuo nzube pụrụ iche mgbe ihe a kpọrọ mmadụ dabara n’amamikpe nke ọnwụ!
4, 5. Tupu Jisọs abịa n’elu ụwa, gịnị ka Bible kpughere banyere Mkpụrụ Mesaịa ahụ?
4 Mgbe ọ na-ama Adam, Iv, na Setan ikpe n’ogige Iden, Chineke kwuru banyere Onye Nnapụta ọdịnihu ahụ dị ka otu “mkpụrụ.” Mkpụrụ, ma ọ bụ nwa nke a, ga-abịa imeghasị ajọ ihe nile Setan Ekwensu, “agwọ ochie ahụ,” wetaworo. N’ezie, Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-echipịa Setan na ndị nile na-agbaso ya!—Jenesis 3:15; 1 Jọn 3:8; Mkpughe 12:9.
5 Na narị afọ ndị na-agafe, Chineke ji nwayọọ nwayọọ kpughekwuo ihe ọmụma banyere Mkpụrụ ahụ, nke a na-akpọkwa Mesaịa. Dị ka e gosiri na chaatị dị na peji nke 37, ọtụtụ amụma nyere nkọwa banyere ọtụtụ akụkụ nke ndụ ya n’elu ụwa. Dị ka ihe atụ, ọ ga-anagide mmeso dị oké njọ iji mezuo òkè ya ná nzube Chineke.—Aịsaịa 53:3-5.
IHE MERE MESAỊA AHỤ GA-EJI NWỤỌ
6. Dị ka Daniel 9:24-26 kwuru, gịnị ka Mesaịa ahụ ga-arụzu, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
6 Amụma e dekọrọ na Daniel 9:24-26 kwuru na Mesaịa ahụ—Onye E Tere Mmanụ nke Chineke—ga-emezu otu nzube dị ukwuu. Ọ ga-abịa n’elu ụwa “ime ka njehie bie, na ime ka mmehie gwụsịa, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume . . . bata” ruo mgbe ebighị ebi. Mesaịa ahụ ga-ewepụ amamikpe nke ọnwụ n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi. Ma olee otú ọ ga-esi mee nke a? Amụma ahụ na-akọwa na a “ga-ebipụ,” ma ọ bụ gbuo ya.
7. N’ihi gịnị ka ndị Juu ji na-achụ àjà ụmụ anụmanụ, gịnịkwa ka ndị a mere ihe atụ ya?
7 Ndị Israel oge ochie maara nke ọma echiche nke ikpuchi ajọ omume. N’ofufe ha n’okpuru Iwu ahụ Chineke nyere ha site n’aka Mosis, ha chụrụ àjà anụmanụ mgbe mgbe. Ndị a chetaara ndị Israel na ọ dị ihe dị ụmụ mmadụ mkpa iji kpuchie, ma ọ bụ techie, mmehie ha. Pọl onyeozi chịkọtara ụkpụrụ ahụ n’ụzọ dị otú a: “Ọ bụrụkwa na mwụsị ọbara adịghị mgbaghara mmehie adịghị.” (Ndị Hibru 9:22) Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mosis na ihe ndị ọ chọrọ, dị ka àjà dị iche iche. (Ndị Rom 10:4; Ndị Kọlọsi 2:16, 17) Ha makwaara na àjà anụmanụ apụghị iweta mgbaghara na-adịgide adịgide na nke zuru ezu maka mmehie. Kama, onyinye àjà ndị a sere onyinyo àjà ka baa uru nke ukwuu—nke Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst ahụ. (Ndị Hibru 10:4, 10; tụlee Ndị Galetia 3:24.) Ma, ị pụrụ ịjụ, ‘Ọ̀ dị mkpa n’ezie ka Mesaịa ahụ nwụọ?’
8, 9. Olee ihe ndị dị oké ọnụ Adam na Iv tụfuru, oleekwa otú ihe ndị ha mere si metụta ụmụ ha?
8 Ee, ọ dị mkpa ka Mesaịa ahụ nwụọ ma ọ bụrụ na a ga-azọpụta ihe a kpọrọ mmadụ. Iji ghọta ihe kpatara ya, anyị aghaghị iwere uche laa azụ n’ogige Iden ma nwaa ịghọta ịdị ukwuu nke ihe Adam na Iv tụfuru mgbe ha nupụrụ isi megide Chineke. E debebuwo ndụ agwụghị agwụ n’ihu ha! Dị ka ụmụ Chineke, ha na ya kpọmkwem nwekwara mmekọrịta. Ma mgbe ha jụrụ ịchịisi Jehova, ha tụfuru ihe ahụ dum ma wetara agbụrụ mmadụ mmehie na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.
9 Ọ bụ dị ka a ga-asị na nne na nna anyị mbụ mefusịrị nnukwute akụ̀, na-asụbanye onwe ha ná nnukwute olulu nke iji ụgwọ. Adam na Iv hapụụrụ ụmụ ha ụgwọ ahụ. N’ihi na a mụghị anyị n’izu okè na n’enweghị mmehie, anyị dum na-emehie, na-anwụkwa anwụ. Mgbe anyị dara ọrịa ma ọ bụ kwuo ihe na-emerụ ahụ nke ọ ga-adị anyị ka ya bụrụ na anyị ekwughị ya, anyị na-enwe mmetụta nke ụgwọ ahụ anyị ketara eketa—ezughị okè mmadụ. (Ndị Rom 7:21-25) Nanị olileanya anyị nwere dabeere n’inwetaghachi ihe Adam tụfuru. Otú ọ dị, anyị apụghị ịrụta ndụ zuru okè nke mmadụ n’ọrụ. Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ nile na-ezughị okè na-eme mmehie, anyị nile na-arụta ọnwụ, ọ bụghị ndụ.—Ndị Rom 6:23.
10. Gịnị dị mkpa iji zụtaghachi ihe Adam tụfuru?
10 Ma, ọ̀ dị ihe a pụrụ inye ná mgbanwerịta maka ndụ ahụ nke Adam tụfuru? Ụkpụrụ ezi ikpe nke Chineke chọrọ ịha nhata, “ndụ laara ndụ.” (Ọpụpụ 21:23) Ya mere a ghaghị inye ndụ iji kwụọ ụgwọ ndụ ahụ a tụfuru. Ọ bụghị nnọọ ndụ ọ bụla ga-ezu. Abụ Ọma 49:7, 8 na-ekwu banyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla ga-agbapụta nwanne ya ma ọlị, ọ gaghị enye Chineke ihe mgbapụta ya: (n’ihi na mgbapụta mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ ahịa, ọ ga-arakwa ya aka ruo mgbe ebighị ebi).” Ọnọdụ ahụ ọ̀ bụ nke olileanya na-adịghị ya n’ihi nke ahụ? Ee e, ma ọlị.
11. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ihe mgbapụta” pụtara na Hibru? (b) Nanị ònye pụrụ ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ, n’ihi gịnịkwa?
11 N’asụsụ Hibru, okwu ahụ bụ́ “ihe mgbapụta” na-apụta ego a kwụrụ iji gbapụta onye e ji eji, ọ na-enyekwa echiche nke ịha nhata. Nanị nwoke nke nwere ndụ mmadụ zuru okè pụrụ inye ihe hà ka ihe Adam tụfuru. Mgbe Adam gasịrị, nanị nwoke zuru okè a mụrụ n’elu ụwa bụ Jisọs Kraịst. N’ihi ya, Bible na-akpọ Jisọs “Adam ikpeazụ” ma na-emesi anyị obi ike na Kraịst “nyere Onwe ya ka Ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile.” (1 Ndị Kọrint 15:45; 1 Timoti 2:5, 6) Ọ bụ ezie na Adam bufeere ụmụ ya ọnwụ, ihe Jisọs na-ekenye bụ ndụ agwụghị agwụ. Ndị Kọrint nke Mbụ 15:22 na-akọwa: “Dị ka ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam, ọ bụkwa otú a ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst ahụ.” Mgbe ahụ, n’izi ezi, a na-akpọ Jisọs “Nna Nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi.”—Aịsaịa 9:6, 7.
ỤZỌ E SI KWỤỌ ỤGWỌ IHE MGBAPỤTA AHỤ
12. Olee mgbe Jisọs ghọrọ Mesaịa, ụzọ ndụ dịkwa aṅaa ka ọ gbasoziri?
12 N’oge mgbụsị akwụkwọ nke 29 O.A., Jisọs gakwuuru onye ikwu ya bụ́ Jọn ka o mee ya baptism wee si otú ahụ wepụta onwe ya ime ihe Chineke na-achọ. N’oge ahụ Jehova ji mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ. Jisọs si otú ahụ ghọọ Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst, onye Chineke tere mmanụ. (Matiu 3:16, 17) Mgbe ahụ Jisọs banyere n’ozi ya were afọ atọ na ọkara. Ọ gazuru ala nna ya nile, na-ekwusa banyere Alaeze Chineke ma na-achịkọta ụmụazụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ma, dị ka e bu ụzọ kwuo, n’isi nso a malitere imegide ya.—Abụ Ọma 118:22; Ọrụ 4:8-11.
13. Ihe omume dịgasị aṅaa dugara n’ọnwụ Jisọs dị ka onye na-eguzosi ike n’ezi ihe?
13 Jisọs ji obi ike kpughee ihu abụọ nke ndị ndú okpukpe, ha chọkwara igbu ya. Ha mesịrị kpaa nkata ọjọọ nke gụnyere nraranye, njide na-ekwesịghị ekwesị, ikpe ikpe na-ekwekọghị n’usoro iwu, na ebubo ụgha nke ikpu mba ihu. A kụrụ Jisọs ihe, bụọ ya asọ, kwaa ya emo, pịakwa ya ụtarị nke a haziri ịdọkasị anụ ahụ ya. Onye ọchịchị bụ́ onye Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet maziri ya ikpe ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. A kpọgidere ya n’elu polu osisi ma kwụba ya n’ebe ahụ n’ụzọ kwụ ọtọ. Iku ume nke ọ bụla bụ nke ihe mgbu, o wekwara ọtụtụ hour tupu ọ nwụọ. N’oge nhụjuanya ahụ dum, Jisọs nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke n’ụzọ zuru okè.
14. N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka Ọkpara ya taa ahụhụ ma nwụọ?
14 Otú a, ọ bụ na Nisan 14, 33 O.A., ka Jisọs nyere ndụ ya dị ka “ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mak 10:45; 1 Timoti 2:5, 6) Site n’eluigwe, Jehova pụrụ ịhụ ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya tara ahụhụ ma nwụọ. N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ajọ ihe dị otú a mee? O mere otú ahụ n’ihi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Jisọs sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọnwụ Jisọs na-akụzikwara anyị na Jehova bụ Chineke nke ezi ikpe zuru okè. (Deuterọnọmi 32:4) Ụfọdụ pụrụ inwe ijuanya banyere ihe mere Chineke na-ewezụgaghị ụkpụrụ ezi ikpe ya nke chọrọ ka ndụ laara ndụ n’ụsọ ma leghara ụgwọ nke ụzọ mmehie Adam anya. Ihe kpatara ya bụ na Jehova na-arapagide mgbe nile n’iwu ya ma na-ejigide ha, ọbụna ná mfu dị ukwuu nye ya onwe ya.
15. Ebe ọ gaara abụwo ihe ikpe na-ezighị ezi ikwe ka ịdị adị Jisọs gwụsịa kpam kpam, gịnị ka Jehova mere?
15 Ezi ikpe Jehova chọkwara ka ọnwụ Jisọs rụpụta ihe obi ụtọ. E kwuwerị, ezi ikpe ọ̀ ga-adị n’ikwere ka Jisọs kwesịrị ntụkwasị obi nọọ ebighị ebi n’ụra nke ọnwụ? Ee e ma ọlị! Akwụkwọ Nsọ Hibru ebuwo amụma na onye ebere Chineke agaghị anọgide n’ili. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 13:35) O hiri ụra ọnwụ ihe dị ka ụbọchị atọ, Jehova Chineke wee kpọlitezie ya gaa ná ndụ dị ka mmụọ e kere eke nke dị ike.—1 Pita 3:18.
16. Gịnị ka Jisọs mere mgbe ọ laghachiri eluigwe?
16 N’ọnwụ ya, Jisọs nyefere ndụ mmadụ ya ruo mgbe nile. Mgbe e weliri ya gaa ná ndụ n’eluigwe, ọ ghọrọ mmụọ na-enye ndụ. Ọzọkwa, mgbe Jisọs rịgoro n’ebe kasị nsọ n’eluigwe na ụwa, e jikọghachiri ya na Nna ya ọ hụrụ n’anya, o wee chezie n’ihu Ya uru nke ndụ mmadụ ya zuru okè. (Ndị Hibru 9:23-28) A pụziri iji uru nke ndụ ahụ dị oké ọnụ ahịa mee ihe n’isi ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Gịnị ka nke ahụ na-apụtara gị?
IHE MGBAPỤTA KRAỊST NA GỊ
17. Olee otú anyị pụrụ isi nwetara onwe anyị mgbaghara ná ndabere nke àjà mgbapụta Kraịst?
17 Tụlee ụzọ atọ àjà mgbapụta Kraịst si abara gị uru ọbụna ugbu a. Nke mbụ, ọ na-eweta mgbaghara nke mmehie. Site n’okwukwe n’ọbara Jisọs a wụfuru, anyị nwere “mgbapụta anyị,” ee, “mgbaghara nke ndahie nile anyị.” (Ndị Efesọs 1:7) Ya mere ọbụna a sị na anyị emewo mmehie dị oké njọ, anyị pụrụ ịrịọ Chineke mgbaghara n’aha Jisọs. Ọ bụrụ na anyị echegharịa n’eziokwu, Jehova na-eji uru àjà mgbapụta nke Ọkpara ya eme ihe n’ihi anyị. Chineke na-agbaghara anyị, na-enye anyị ngọzi nke akọ na uche dị mma, kama inye ntaramahụhụ nke ọnwụ anyị kpatara site n’imehie.—Ọrụ 3:19; 1 Pita 3:21.
18. N’ụzọ dị aṅaa ka àjà Jisọs na-enye anyị olileanya?
18 Nke abụọ, àjà mgbapụta Kraịst na-enye anyị ihe ndabere nke olileanya ọdịnihu anyị. N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ na “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ” ga-alanarị ajọ ọgwụgwụ na-abịanụ nke usoro ihe a. N’ihi gịnị ka ha ga-eji lanarị mgbe Chineke na-ebibi ọtụtụ ndị ọzọ? Otu mmụọ ozi gwara Jọn na oké ìgwè mmadụ ahụ “sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ,” bụ́ Jisọs Kraịst. (Mkpughe 7:9, 14) Ọ bụrụhaala na anyị na-egosipụta okwukwe n’ọbara Jisọs Kraịst a wụfuru ma na-ebi ndụ kwekọrọ n’ihe nile Chineke chọrọ, anyị gaadị ọcha n’anya Chineke ma nwee olileanya ndụ ebighị ebi.
19. Olee otú àjà Kraịst si anwapụta na ya na Nna ya hụrụ gị n’anya?
19 Nke atọ, àjà mgbapụta ahụ bụ nke kasị elu n’ihe nnwapụta nke ịhụnanya Jehova. Ọnwụ Kraịst gụnyere ngosipụta abụọ kasị ukwuu nke ịhụnanya n’akụkọ ihe mere eme nke eluigwe na ụwa: (1) ịhụnanya Chineke n’izite Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị; (2) ịhụnanya Jisọs n’inyefe onwe ya n’afọ ofufo dị ka ihe mgbapụta. (Jọn 15:13; Ndị Rom 5:8) Ọ bụrụ na anyị egosipụta okwukwe n’ezie, ịhụnanya a na-adịrị onye ọ bụla n’ime anyị. Pọl onyeozi sịrị: “Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi m.”—Ndị Galetia 2:20; Ndị Hibru 2:9; 1 Jọn 4:9, 10.
20. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs?
20 Ya mere, ka anyị gosi obi ekele maka ịhụnanya Chineke na Kraịst gosipụtara site n’inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs. Ime otú ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:36) Ma, mgbapụta anyị abụghị ihe kasị mkpa kpatara ndụ na ọnwụ Jisọs n’elu ụwa. Ee e, nchegbu ya bụ́ isi bụ ihe iseokwu ka nnọọ ukwuu, nke metụtara eluigwe na ụwa. Dị ka anyị ga-ahụ n’isiakwụkwọ na-eso, ihe iseokwu ahụ metụtara anyị dum ebe ọ na-egosi ihe mere Chineke jiworo kwere ka ajọ omume na nhụjuanya dịgide ogologo oge otú a n’ụwa a.
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Jisọs nwụọ iji zọpụta ihe a kpọrọ mmadụ?
Olee otú e si kwụọ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ?
N’ụzọ dịgasị aṅaa ka i si erite uru site n’ihe mgbapụta ahụ?
[Foto dị na peeji nke 67]