Isi nke 8
N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?
1, 2. Olee otú ndị mmadụ si emeghachikarị omume banyere nhụjuanya mmadụ?
MGBE e nwere ọdachi, na-ebibi ihe onwunwe ma na-egbu ndị mmadụ, ọtụtụ ndị apụghị ịghọta ihe mere ajọ ihe ndị dị otú ahụ ji eme. Ọ̀tụ̀tụ̀, obi ọjọọ, na arụrụala nke mpụ na ime ihe ike na-enye ndị ọzọ nsogbu n’obi. Gị onwe gị kwa pụrụ ịjụwo sị, ‘N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị?’
2 N’ihi na ha achọtabeghị azịza ọ bụla na-eju afọ nye ajụjụ a, ọtụtụ enwekwaghị okwukwe na Chineke. Ha na-eche na o nweghị mmasị n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Ndị ọzọ na-anakwere nhụjuanya dị ka akụkụ nke ndụ na-enwe obi ilu ma na-ata Chineke ụta maka ihe ọjọọ nile na-eme n’etiti ọha mmadụ. Ọ bụrụ na i nwetụwo mmetụta ndị dị otú ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-enwe mmasị n’ihe Bible kwuru n’okwu ndị a.
NHỤJUANYA ESITEGHỊ N’AKA CHINEKE
3, 4. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ihe ọjọọ na nhụjuanya esiteghị n’aka Jehova?
3 Bible na-emesi anyị obi ike na nhụjuanya anyị na-ahụ gburugburu anyị abụghị Jehova Chineke na-akpata ha. Dị ka ihe atụ, Jemes onye na-eso ụzọ bụ́ onye Kraịst dere, sị: “Ka onye ọ bụla ghara ịsị, mgbe a na-anwa ya, A na-esite n’aka Chineke anwa m: n’ihi na Chineke bụ Onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa Ya, Ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla.” (Jemes 1:13) Ebe ọ dị otú ahụ, Chineke apụghị ịkpatawo ọtụtụ ihe isi ike na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. Ọ dịghị ewetara ndị mmadụ ule iji mee ka ha kwesị ekwesị maka ndụ n’eluigwe, ọ dịghịkwa eme ka ụmụ mmadụ taa ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ e chere na ha mere n’oge gara aga ha biri ndụ.—Ndị Rom 6:7.
4 Ọzọkwa, ọ bụ ezie na e mewo ọtụtụ oké ihe ọjọọ n’aha Chineke ma ọ bụ nke Kraịst, ọ dịghị ihe dị n’ime Bible na-enye echiche na nke ọ bụla n’ime ha nwere mgbe ọ kwadoro omume ndị dị otú ahụ. Chineke na Kraịst enweghị ihe ọ bụla jikọrọ ha na ndị na-azọrọ na ha na-ejere ha ozi ma na-egwu wayo, na-aghọkwa aghụghọ, na-egbu mmadụ, na-akwakọrọkwa ihe ndị ọzọ, na-emekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-akpata nhụjuanya ụmụ mmadụ. N’ezie, “ihe arụ n’anya Jehova ka ụzọ onye na-emebi iwu bụ.” Chineke “dị anya n’ebe ndị na-emebi iwu nọ.”—Ilu 15:9, 29.
5. Gịnị bụ àgwà ụfọdụ nke Jehova, oleekwa mmetụta ya banyere ihe ndị o kere?
5 Bible na-akọwa Jehova dị ka “onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” (Jemes 5:11) Ọ na-akpọsa na “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya.” (Abụ Ọma 37:28; Aịsaịa 61:8) Ọ bụghị onye na-achọ imegwara ihe. Ọ na-eji ọmịiko na-elekọta ihe ndị o kere ma na-enye ha nile ihe kasị mma maka ọdịmma ha. (Ọrụ 14:16, 17) Jehova emewo nke ahụ kemgbe mmalite nke ndụ n’elu ụwa.
MMALITE ZURU OKÈ
6. Olee otú akụkọ mgbe ochie ụfọdụ si ezo aka n’akụkọ ihe mere eme mbụ nke ihe a kpọrọ mmadụ?
6 Ịhụ na inwe mmetụta nke ahụ mgbu na nhụjuanya amarawo anyị nile ahụ. N’ihi ya ọ pụrụ isi ike iche echiche banyere oge nhụjuanya na-agaghị adị, ma ọ bụ otú ahụ ka ọnọdụ dị ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ọbụna akụkọ mgbe ochie nke mba ụfọdụ na-ezo aka ná mmalite obi ụtọ dị otú ahụ. N’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme ndị Gris, a kpọrọ nke mbụ ‘n’Ọgbọ Ise nke Mmadụ’ “Ọgbọ Ọma.” N’ime ya ụmụ mmadụ biri ndụ obi ụtọ, na-enwere onwe ha pụọ ná ndọgbu n’ọrụ, ahụ mgbu, na ahụ ndọlị nile nke ịka nká. Ndị China na-asị na n’oge ọchịchị Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu Edo Edo (Huang-Ti) dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, ndị mmadụ biri n’udo, na-anụ ụtọ inwe nkwekọ ọbụna ha na ọnọdụ ihu igwe na anụ ndị bi n’ọhịa. Ndị Peasia, Ijipt, Tibet, Peru, na ndị Mexico, ha nile nwechara akụkọ mgbe ochie banyere oge obi ụtọ na izu okè ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ.
7. N’ihi gịnị ka Chineke ji kee ụwa na ụmụ mmadụ?
7 Akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke mba dị iche iche na-eme nanị nkwupụtaghachi nke ihe ndekọ kasị ochie nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, bụ́ Bible. Ọ na-eme ka anyị mara na Chineke debere mmadụ abụọ mbụ, Adam na Iv, na paradaịs a kpọrọ ogige Iden ma nye ha iwu, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28) Nne na nna anyị mbụ nụrụ ụtọ izu okè ma nwee atụmanya nke ịhụ ụwa dum ka ọ ghọrọ paradaịs nke ezinụlọ mmadụ zuru okè bi na ya n’udo na obi ụtọ na-adịgide adịgide. Nke ahụ bụ nzube Chineke n’ike ụwa na ụmụ mmadụ.—Aịsaịa 45:18.
ỊMA AKA OBI ỌJỌỌ
8. À tụrụ anya ka Adam na Iv rube isi n’iwu dị aṅaa, ma gịnị mere?
8 Iji nọgide n’ihu ọma Chineke, Adam na Iv gaje izere iri site “n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 2:16, 17) A sị na ha rubere isi n’iwu Jehova, a garaghị enwe nhụjuanya ọ bụla imebi ndụ mmadụ. Site n’irube isi n’iwu Chineke, ha gaara egosipụtawo ịhụnanya ha maka Jehova na nnọgidesi ike n’ihe ha nye ya. (1 Jọn 5:3) Ma dị ka anyị mụtara n’Isi nke 6, ihe agaghị otú ahụ. N’ịbụ onye Setan gbara ume, Iv riri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ. E mesịa, Adam kerekwaara òkè ná mkpụrụ ahụ a machibidoro iwu.
9. Ihe iseokwu dị aṅaa metụtara Jehova ka Setan welitere?
9 Ị̀ na-ahụ otú ihe merenụ dịruru ná njọ? Setan na-ekwugide ọnọdụ Jehova dị ka Onye Kachasị Elu. Site n’ịsị, “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ,” Ekwensu kwuru ihe megidere okwu Chineke bụ́, “Ị ghaghị ịnwụ.” Okwu ndị ọzọ Setan kwuru nyere echiche nke na Jehova na-ezonarị Adam na Iv ihe ọmụma banyere ohere nke ịdị ka Chineke, si otú ahụ ghara inwe mkpa maka Ya ikpebi ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ya mere ịma aka Setan gbaghara izi ezi na iru eru nke ọnọdụ Jehova dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala.—Jenesis 2:17; 3:1-6.
10. Echiche dịgasị aṅaa ka Setan ji aghụghọ nye banyere ụmụ mmadụ?
10 Setan Ekwensu jikwa aghụghọ nye echiche nke na ndị mmadụ ga-anọgide na-erubere Jehova isi ọ bụrụhaala na irubere Chineke isi na-ewetara ha uru. Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a gbaghara iguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ. Setan mara aka na ọ dịghị mmadụ ga-eji ọchịchọ obi ya nọgidesie ike n’ihe nye Chineke. E kpughere nzọrọ obi ọjọọ nke a nke Setan nke ọma n’ihe ndekọ Bible banyere Job, ohu Jehova nke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ onye gabigara oké ule n’otu oge tupu afọ 1600 T.O.A. Mgbe ị gụrụ isiakwụkwọ abụọ mbụ nke akwụkwọ Job, ị pụrụ inweta nghọta nke ihe kpatara nhụjuanya mmadụ na ihe mere Chineke ji kwere ka ọ dịrị.
11. Job bụ nwoke dị aṅaa, ma ebubo dị aṅaa ka Setan boro?
11 Job, “nwoke zuru okè, ziekwa ezi,” batara n’okpuru mwakpo Setan. Nke mbụ, Setan nyere echiche nke na Job bu ihe ọjọọ n’obi site n’iwelite ajụjụ bụ́, “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?” Mgbe ahụ, Ekwensu ji aghụghọ kwutọọ ma Chineke ma Job site n’ibo ebubo na Jehova azụrụwo nnọgidesi ike n’ihe Job azụrụ site n’ichebe na ịgọzi ya. “Ma otú ọ dị,” ka Setan mara Jehova aka, “biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.”—Job 1:8-11.
12. (a) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka a pụrụ ịza nanị ma ọ bụrụ na Chineke ekwere ka Setan nwalee Job? (b) Gịnị ka ule Job rụpụtara?
12 Job ọ̀ na-efe Jehova nanị n’ihi ihe ọma nile ọ natara n’aka Chineke? Iguzosi ike n’ezi ihe Job ọ̀ pụrụ iguzogide ule? N’akụkụ nke ya, Jehova ò nwere obi ike zuru ezu n’ohu ya nke inye ya ohere ka a nwalee ya? A pụrụ ịza ajụjụ ndị a ma ọ bụrụ na Jehova ga-enye Setan ohere ka o wetara Job ule ndị siri oké ike. Ụzọ ikwesị ntụkwasị obi Job gbasoro n’okpuru ule ahụ Chineke nyere ohere ya, dị ka a kọrọ ya n’akwụkwọ Job, ghọrọ ihe mwepụ n’ụta zuru ezu nke ezi omume Jehova na iguzosi ike n’ezi ihe mmadụ.—Job 42:1, 2, 12.
13. Olee otú ihe mere n’Iden na nke mere Job si gụnye anyị?
13 Otú ọ dị, ihe mere n’ogige Iden na ihe mere nwoke ahụ bụ Job nwere ihe ka omimi ha pụtara. Ihe iseokwu ndị Setan welitere gụnyere ihe nile a kpọrọ mmadụ, tinyere anyị taa. E kwutọrọ aha Chineke, a makwara ọkaaka ya aka. A gbaghara izi ezi nke ihe Chineke kere, bụ́ mmadụ. Ọ dị mkpa ka e dozie ihe iseokwu ndị a.
ỤZỌ ISI DOZIE IHE ISEOKWU NDỊ AHỤ
14. Mgbe ajọ ihe ịma aka chere ya ihu, gịnị ka onye e boro ebubo pụrụ ime?
14 Iji maa atụ, ka anyị were na ị bụ nna nke nwere ọtụtụ ụmụ n’ezinụlọ obi ụtọ. Ka e were ya na otu n’ime ndị agbata obi gị na-agbasa okwu ụgha, na-ebo gị ebubo ịbụ ajọ nna. Gịnị ma ọ bụrụ na onye agbata obi gị ahụ na-asị na ụmụ gị ahụghị gị n’anya, na ha na-anọnyere gị nanị n’ihi na ha amaghị ihe ha ga-eme, na ha ga-apụkwa ma ọ dị onye gosiri ha ụzọ. ‘Ara ọgbụgba!’ ka ị pụrụ ikwu. Ee, ma olee otú ị ga-esi nwapụta ya? Ndị nne na nna ụfọdụ pụrụ imeghachi omume n’ọnụma. E wezụga ịkpatakwu nsogbu, nzaghachi ime ihe ike dị otú ahụ ga-enye ụgha ndị ahụ nkwado. Ụzọ na-eju afọ isi dozie nsogbu dị otú ahụ ga-abụ inye ohere ka onye na-ebo gị ebubo nwapụta nzọrọ ya na ka ụmụ gị gosipụta na ha hụrụ gị n’anya n’ezie.
15. Olee ụzọ Jehova họọrọ isi hụ maka ihe ịma aka Setan?
15 Jehova dị ka nna ahụ na-ahụ n’anya. A pụrụ iji Adam na Iv tụnyere ụmụ ahụ, Setan kwekọkwara n’ọnọdụ nke onye agbata obi ahụ na-agha ụgha. N’amamihe Chineke ebibighị Setan, Adam, na Iv ozugbo kama kwere ka ndị mmebi iwu a nọgide na-adị ndụ ruo oge ụfọdụ. Nke a nyere nne na nna anyị mbụ ohere ịmalite ezinụlọ mmadụ, o nyewokwa Ekwensu ohere ịnwapụta ma nzọrọ ya ọ̀ bụ eziokwu ka e wee nwee ike dozie ihe iseokwu ndị ahụ. Otú ọ dị, site ná mmalite, Chineke maara na mmadụ ụfọdụ ga-anọgidesi ike n’ihe nye ya wee si otú ahụ nwapụta Setan ịbụ onye ụgha. Lee aha ekele anyị nwere na Jehova anọgidewo na-agọzi ma na-enyere ndị hụrụ ya n’anya aka!—2 Ihe Emere 16:9; Ilu 15:3.
GỊNỊ KA A NWAPỤTAWORO?
16. Olee otú ụwa siworo bata n’aka Setan?
16 N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ, Setan enwerewo nnọọ onwe ya iji atụmatụ ya nile nke ịchịisi n’elu ihe a kpọrọ mmadụ mee ihe. Gụnyere ihe ndị ọzọ, ọ kpawo ike n’elu ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile, kwalitekwa okpukpe ndị ji aghụghọ na-adọrọ ofufe nye ya kama ịbụ nye Jehova. Otú a Ekwensu aghọwo “chi nke oge a,” a kpọkwara ya “onye isi ụwa nke a.” (2 Ndị Kọrint 4:4; Jọn 12:31) N’ezie, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Nke a ọ̀ pụtara na Setan anwapụtawo nzọrọ ya na ọ pụrụ ịdọrọ ihe nile a kpọrọ mmadụ pụọ n’ebe Jehova Chineke nọ? Ee e ma ọlị! Ọ bụ ezie na o nyere Setan ohere ka ọ nọgide na-adị, Jehova agawo n’ihu imezu nzube nke ya. Mgbe ahụ, gịnị ka Bible naekpughe banyere nkwere Chineke kwere ka ajọ omume dịrị?
17. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere ihe kpatara ajọ omume na nhụjuanya?
17 Ajọ omume na nhụjuanya abụghị Jehova na-akpata ha. Ebe Setan bụ onye isi ụwa nke a na chi nke oge a, ọ bụ ya na ndị nọ n’akụkụ nke ya na-akpata ọnọdụ dị ugbu a n’etiti ọha mmadụ na nhụsianya nile ihe a kpọrọ mmadụ hụsiworo. Ọ dịghị onye pụrụ izi ezi ikwu na ọ bụ Chineke na-akpata ihe isi ike dị otú ahụ.—Ndị Rom 9:14.
18. Gịnị ka Jehova ikwere ka ajọ omume na nhụjuanya dịrị nwapụtaworo banyere echiche nke nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ?
18 Nkwere Jehova kwere ka ajọ omume na nhụjuanya dịrị anwapụtawo na nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ ewetabeghị ụwa ka mma. N’ụzọ a na-apụghị ịgọnarị agọnarị, e jiwo ọdachi na-adịghị agwụ agwụ kaa akụkọ ihe mere eme akara. Ihe kpatara nke a bụ na ụmụ mmadụ ahọrọwo ịgbaso ụzọ nnwere onwe nke ha, gosikwa na ha enweghị ezi nkwanye ùgwù ọ bụla maka okwu na uche Chineke. Mgbe ndị Jehova n’oge ochie na ndị ndú ha ji ekwesịghị ntụkwasị obi gbasoo “ụzọ ọha mmadụ” ma jụ okwu ya, ihe ndị ọ rụpụtara bụ ọdachi. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Jeremaịa, Chineke gwara ha, sị: “Ihere emewo ndị maara ihe, ha atụwo ụjọ, e wee jide ha: lee, okwu Jehova ka ha jụworo; ọ̀ bụkwa aha amamihe gịnị ka ha nwere?” (Jeremaịa 8:5, 6, 9) Ebe ha daworo ada n’ịgbaso ụkpụrụ Jehova, ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya adịwo ka ụgbọ mmiri nke na-enweghị ihe e ji anyagharị ya, nke osimiri na-adịghị jụụ na-akwagharị.
19. Ihe nnwapụta dị aṅaa ka e nwere na Setan apụghị ichigharị ụmụ mmadụ nile ihu megide Chineke?
19 Nkwere Chineke kwere ka ajọ omume na nhụjuanya dịrị anwapụtawokwa na Setan enwebeghị ike ichigharị ihe nile a kpọrọ mmadụ ihu pụọ n’ebe Jehova nọ. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na e nwewo mgbe nile ụmụ mmadụ ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’agbanyeghị ọnwụnwa ma ọ bụ ihe isi ike ndị a tụkwasịrị ha. Na narị afọ ndị na-agafe, ike Jehova apụtawo ìhè n’ihi ndị ohu ya, a kpọsawokwa aha ya n’elu ụwa nile. (Ọpụpụ 9:16; 1 Samuel 12:22) Ndị Hibru isi 11 na-agwa anyị banyere ogologo ahịrị nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi, gụnyere Ebel, Inọk, Noa, Abraham, na Mosis. Ndị Hibru 12:1 na-akpọ ha “oké ìgwè ndị àmà.” Ha bụ ihe atụ nke okwukwe kwụrụ chịm na Jehova. N’oge ndị a kwa, ọtụtụ enyewo ndụ ha n’iguzosi ike n’ezi ihe a na-apụghị imebi emebi nye Chineke. Site n’okwukwe na ịhụnanya ha, ndị dị otú ahụ na-anwapụta n’ụzọ a na-apụghị ịgbagha agbagha na Setan apụghị ichigharị mmadụ nile ihu megide Chineke.
20. Jehova ikwere ka ajọ omume na nhụjuanya dịgide anwapụtawo gịnị banyere Chineke na ihe a kpọrọ mmadụ?
20 Nke ikpeazụ, nkwere Jehova kwere ka ajọ omume na nhụjuanya dịgide enyewo ihe nnwapụta nke na nanị Jehova, Onye Okike anyị, nwere ikike na iru eru ịchị isi n’elu ihe a kpọrọ mmadụ maka ngọzi na obi ụtọ ebighị ebi ha. Ruo ọtụtụ narị afọ, ihe a kpọrọ mmadụ anwalewo ọtụtụ ụdị ọchịchị. Ma gịnị ka a rụpụtaworo? Nsogbu na ọgba aghara ndị dị mgbagwoju anya bụ́ ndị na-eche mba dị iche iche ihu taa bụ ihe àmà zuru ezu nke na n’eziokwu, dị ka Bible na-egosipụta, “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Nanị Jehova pụrụ ime ihe iji napụta anyị ma mezuo nzube mbụ ya. Olee otú ọ ga-esi mee nke a, olee mgbekwa?
21. Gịnị ka a ga-eme Setan, ònyekwa ka a ga-eji mezuo nke a?
21 Ozugbo Adam na Iv dabasịrị n’atụmatụ Setan, Chineke mara ọkwa nzube Ya banyere ụzọ nke mgbapụta. Nke a bụ ihe Jehova kpọsara banyere Setan: “Iro ka M ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Mkpọsa ahụ mere ka e jide n’aka na a gaghị enye Ekwensu ohere ịrụ arụrụala ya ruo mgbe ebighị ebi. Dị ka Eze nke Alaeze Mesaịa ahụ, Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Jisọs Kraịst, ‘ga-echifịa Setan n’isi.’ Ee, “ọsọ ọsọ,” Jisọs ga-azọpịa onye nnupụisi ahụ bụ́ Setan!—Ndị Rom 16:20.
GỊNỊ KA Ị GA-EME?
22. (a) Ajụjụ dịgasị aṅaa ka ị na-aghaghị iche ihu? (b) Ọ bụ ezie na Setan na-awụkwasị ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke iwe ya, gịnị ka ha pụrụ ijide n’aka?
22 N’ịmara ihe iseokwu ndị na-aga n’ihu, n’akụkụ ònye ka ị ga-eguzo? Ị̀ ga-anwapụta site n’omume gị na ị bụ onye ji ịnọgidesi ike n’ihe na-akwado Jehova? Ebe Setan maara na oge ya dị mkpụmkpụ, ọ ga-eme ihe nile o nwere ike ime iji wụkwasị ndị chọrọ iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke iwe ya. (Mkpughe 12:12) Ma ị pụrụ ilegara Chineke anya maka enyemaka n’ihi na “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:9) Ọ gaghị ekwe ka a nwaa gị gabiga ihe ị pụrụ ịnagide, ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka i wee nwee ike ịnagide ọnwụnwa dị iche iche.—1 Ndị Kọrint 10:13.
23. Gịnị ka anyị pụrụ iji obi ike lega anya n’ihu maka ya?
23 N’obi ike, ka anyị lega anya n’ihu n’oge mgbe Eze ahụ bụ́ Jisọs Kraịst ga-eme ihe megide Setan na ndị nile na-eso ya. (Mkpughe 20:1-3) Jisọs ga-ewepụsị ndị nile so na-akpata ahụhụ na ọgba aghara ndị ihe a kpọrọ mmadụ nweworo. Ruo mgbe ahụ, otu ụdị nhụjuanya na-eweta ihe mgbu karịsịa bụ ọnwụ nke ndị anyị hụrụ n’anya. Gụọ isiakwụkwọ nke na-esonụ iji chọpụta ihe na-eme ha.
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
Olee otú anyị si mara na Jehova adịghị akpata nhụjuanya ụmụ mmadụ?
Ihe iseokwu dịgasị aṅaa ka Setan welitere n’Iden, e meekwa ka ha doo anya n’oge Job?
Nkwere Chineke kwere ka nhụjuanya dịrị ọ̀ nwapụtawo gịnị?