Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ—n’Ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Ọ Dịrị?
NÁ MMALITE akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ, e nweghị nnọọ anya mmiri ọ bụla nke iru újú ma ọ bụ nke ihe mgbu. Nhụjuanya ụmụ mmadụ adịghị. E nyere ihe a kpọrọ mmadụ mmalite zuru okè. “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”—Jenesis 1:31.
Ma ụfọdụ na-ekwu ihe megidere ya sị, ‘Akụkọ nke Adam na Iv n’ogige Iden bụ nanị akụkọ ifo.’ N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm na-ekwu nke a. Otú ọ dị, onye nwere ike dị ukwuu bụ́ Jisọs Kraịst n’onwe ya mesiri ya ike na ihe mere n’Iden bụ akụkọ ihe mere eme. (Matiu 19:4-6) Ọzọkwa, nanị ụzọ a ga-esi ghọta ihe mere Chineke jiworo kwere ka nhụjuanya ụmụ mmadụ dịrị bụ inyocha ihe ndị mere ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.
E nyere nwoke mbụ, bụ́ Adam, ọrụ na-enye afọ ojuju nke ilekọta ogige Iden. Ọzọ, Chineke setịpụrụ n’ihu ya ihe mgbaru ọsọ nke ịgbasawanye ebe obibi ya bụ́ Iden ka ọ ghọọ ogige obi ụtọ zuru ụwa ọnụ. (Jenesis 1:28; 2:15) Iji nyere Adam aka ịrụzu oké ọrụ nke a, Chineke nyere ya nwunye, bụ́ Iv, gwakwa ha ka ha mụọ ọmụmụ, baa ụba, buda ụwa n’okpuru ha. Ma ọ dị ihe ọzọ a chọrọ iji hụ na nzube Chineke maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ gara nke ọma. N’ịbụ onye e mere n’onyinyo Chineke, mmadụ nwere nnwere onwe ime nhọrọ; n’ihi ya, ọ dị mkpa na ọ dịghị mgbe uche mmadụ na uche Chineke ga-asọkọta isi. Ma ọ bụghị ya, a ga-enwe ọgba aghara n’eluigwe na ala, a gaghịkwa emezu nzube Chineke ime ka ụwa jupụta n’ezinụlọ mmadụ dị n’udo.
Ido onwe onye n’okpuru ịchịisi Chineke adịghị esite n’ọmụmụ. Ọ gaje ịbụ ngosipụta ịhụnanya nke nnwere onwe ime nhọrọ nke mmadụ. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ na mgbe Jisọs Kraịst chere ule siri ike ihu, o kpere ekpere, sị: “Nna, ọ bụrụ na ọ dị Gị mma, nara m iko a: otú ọ dị, ka e mee ihe Gị onwe gị na-achọ, ọ bụghị ihe Mụ onwe m na-achọ.”—Luk 22:42.
N’otu aka ahụ, ọ dịịrị Adam na Iv ịnwapụta ma hà ga-achọ ịnọ n’okpuru ịchịisi Chineke. N’ihi nke a, Jehova Chineke mere ndokwa maka ule dị mfe. A kpọrọ otu n’ime osisi ndị dị n’ogige ahụ “osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.” Ọ nọchitere anya ikike Chineke nwere ikpebi ụkpụrụ nile nke àgwà ziri ezi. N’okwu na-adịghị inyoghị inyoghị, Chineke machibidoro iri mkpụrụ sitere n’osisi a kpọmkwem iwu. Ọ bụrụ na Adam na Iv enupụ isi, ọ ga-akpatara ha ọnwụ.—Jenesis 2:9, 16, 17.
Mmalite nke Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ
Otu ụbọchị otu nwa mmụọ nke Chineke kara anya ịgbagha ụzọ Chineke si achị isi. Na-eji agwọ emere ọnụ na-ekwuru ya, ọ jụrụ Iv: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” (Jenesis 3:1) Otú a a kụrụ mkpụrụ inyo ihe enyo n’uche Iv banyere ma ụzọ Chineke si na-achị isi ò ziri ezi.a Ná nzaghachi Iv nyere azịza ziri ezi, bụ́ nke ọ mụtaworo n’ọnụ di ya. Otú ọ dị, mgbe ahụ mmụọ ahụ e kere eke kwuru ihe megidere nke Chineke ma ghaa ụgha banyere ihe nnupụisi ga-arụpụta, na-asị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.”—Jenesis 3:4, 5.
N’ụzọ dị mwute, e duhiere Iv gaa n’iche na nnupụisi ga-arụpụta, ọ bụghị nhụjuanya ụmụ mmadụ, kama ndụ ka mma. Ka ọ na-elekwu mkpụrụ osisi ahụ anya, otú ahụ ka ọ na-eyikwu ihe na-adọrọ anya, o wee malite iri ya. E mesịa, o mere ka Adam rie ya. N’ụzọ na-eweta ọdachi, Adam họọrọ ịnọgide na-enwe ihu ọma nwunye ya karịa nke Chineke.—Jenesis 3:6; 1 Timoti 2:13, 14.
Site n’ịkpalite nnupụisi ahụ, mmụọ ahụ e kere eke gbanwere onwe ya ịghọ onye na-emegide Chineke. E si otú a malite ịkpọ ya Setan, site n’okwu Hibru nke pụtara “onye mmegide.” Ọ ghakwara ụgha banyere Chineke, na-eme onwe ya onye nkwutọ. N’ihi ya, a na-akpọkwa ya Ekwensu, site n’okwu Grik pụtara “onye nkwutọ.”—Mkpughe 12:9.
Otú a, nhụjuanya ụmụ mmadụ malitere. Atọ n’ime ndị Chineke kere ejiwo onyinye ha nke nnwere onwe ime nhọrọ mejọọ ihe, na-ahọrọ ụzọ ndụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’ụzọ na-emegide Onye Okike ha. Ajụjụ bilitezịrị ugbu a bụ, Olee otú Chineke ga-esi hụ maka nnupụisi nke a n’ụzọ ikpe ziri ezi nke ga-emesi ndị ọzọ nile nwere ọgụgụ isi o kere obi ike, gụnyere ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi n’eluigwe na ụmụ Adam na Iv n’ọdịnihu?
Nzaghachi Amamihe nke Chineke
Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na ọ gaara aka mma ma ọ bụrụ na Chineke bibiri Setan, Adam, na Iv ozugbo ahụ. Ma nke ahụ agaraghị edozi ihe iseokwu ndị nnupụisi ahụ welitere. Setan agbaghawo ụzọ Chineke si na-achị isi, na-atụ aro na ọ pụrụ ịkara ụmụ mmadụ mma ma ha adabereghị n’ịchịisi Chineke. Ọzọ, ihe ịga nke ọma ya n’iwezụga mmadụ abụọ mbụ ahụ megide ịchịisi Chineke welitere ajụjụ ndị ọzọ. Ebe Adam na Iv mehiere, nke a ọ̀ pụtara na ọ dị ihe na-ezighị ezi n’ụzọ Chineke si kee mmadụ? Chineke ọ̀ pụrụ inwe onye ọ bụla n’elu ụwa nke ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya? Gịnịkwa banyere ụmụ mmụọ ozi nke Jehova ndị hụrụ nnupụisi Setan? Hà ga-ejigide izi ezi nke ọkaaka Ya? O doro anya na a chọrọ oge zuru ezu iji dozie ihe iseokwu ndị a. Ọ bụ ya mere Chineke ji nye Setan ohere ịdị adị ruo ụbọchị anyị.
Maka Adam na Iv, n’ụbọchị nnupụisi ha, Chineke mara ha ikpe ọnwụ. Ya mere usoro ịnwụ anwụ malitere. Ụmụ ha, ndị a tụụrụ ime ha mgbe Adam na Iv mehiesịrị, ketara mmehie na ọnwụ site n’aka nne na nna ha na-ezughị okè.—Ndị Rom 5:14.
Setan ji mmadụ abụọ mbụ ahụ malite n’akụkụ nke ya nke ihe iseokwu ahụ. O ji oge e nyere ya nwaa idebe ụmụ nile nke Adam n’okpuru nchịkwa ya. O nwewokwa ihe ịga nke ọma n’ịrafu ọtụtụ ndị mmụọ ozi n’isonye ná nnupụisi ya. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụ mmụọ ozi nke Chineke ejiwo ịnọgidesi ike n’ihe jigide izi ezi nke ịchịisi Jehova.—Jenesis 6:1, 2, Jud 6; Mkpughe 12:3, 9.
Ihe na-ese okwu bụ ịchịisi Chineke megide nke Setan, ihe iseokwu nke na-ekpo ekpo n’ụbọchị Job. Nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi nwapụtara site n’àgwà ya na ya họọrọ ịchịisi ezi omume nke Chineke karịa nnwere onwe nke Setan, dị ka ndị ikom na-atụ egwu Chineke ndị dị ka Ebel, Ịnọk, Noa, Abraham, Aịsak, Jekọb, na Josef mewororịị. Job ghọrọ isiokwu nke otu nkwurịta okwu weere ọnọdụ n’eluigwe n’ihu ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi nke Chineke. Ná nkwado nke ịchịisi ezi omume Ya, Chineke gwara Setan: “Ị̀ tụkwasịwo obi gị n’ahụ ohu m, bụ́ Job? na ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.”—Job 1:6-8.
N’ịjụ ịnakwere mmeri, Setan zọọrọ na Job na-ejere Chineke ozi nanị n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ebe ọ bụ na Chineke ejiwo ụba ihe onwunwe gọzie Job nke ukwuu. Ya mere Setan mara aka, sị: “Ma otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.” (Job 1:11) Ọbụna na Setan gara n’ihu, na-agbagha iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị nile Chineke kere eke. “Ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya,” ka ọ mara aka kwuo. (Job 2:4) Ịma aka nke a nke nkwutọ metụtara ọ bụghị nanị Job kama ndị nile na-efe Chineke ofufe n’ikwesị ntụkwasị obi n’eluigwe na n’elu ala. Setan na-enye echiche nke na ha ga-agbahapụ mmekọrịta ha na Jehova ma ọ bụrụ na ndụ ha nọ n’ihe isi ike.
Jehova Chineke nwere obi ike siri ike n’iguzosi ike n’ezi ihe nke Job. Inye ihe àmà nke ahụ, o kwere ka Setan wetara Job nhụjuanya ụmụ mmadụ. Site n’ikwesị ntụkwasị obi ya ọ bụghị nanị na Job gbaara isi onwe ya kama, nke ka mkpa, o jigidere izi ezi nke ọkaaka Jehova. E gosipụtara Ekwensu ịbụ onye ụgha.—Job 2:10; 42:7.
Otú ọ dị, ihe nlereanya kasị mma nke ikwesị ntụkwasị obi n’okpuru ule bụ Jisọs Kraịst. Chineke ebufewo ndụ nke Ọkpara nke a bụ mmụọ ozi site n’eluigwe gaa n’akpa nwa nwanyị na-amaghị nwoke. Ya mere Jisọs eketaghị mmehie na ezughị okè. Kama nke ahụ o tolitere ịbụ nwoke zuru okè, onye ya na nwoke mbụ hà nhata kpọmkwem tupu onye nke ahụ atụfuo izu okè ya. Setan mere Jisọs ihe bụ isi o lekwasịrị anya, na-ewetara ya ọtụtụ ọnwụnwa na ule, na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’ọnwụ dị ihere. Ma Setan dara ada n’imebi nguzosi ike n’ezi ihe nke Jisọs. N’ụzọ zuru ezu, Jisọs jigidere izi ezi nke ịchịisi Nna ya. Ọ nwapụtakwara na nwoke zuru okè bụ́ Adam enweghị ihe ngọpụ maka isonye ná nnupụisi Setan. Adam pụrụ ikwesịwo ntụkwasị obi n’ule ya dị nnọọ nta karị.
Gịnị Ọzọ Ka A Nwapụtaworo?
Ihe dị ka 6,000 afọ nke nhụjuanya ụmụ mmadụ agabigawo eri nnupụisi Adam na Iv. N’ime oge a Chineke enyewo ohere ka ihe a kpọrọ mmadụ nwalee ọtụtụ ụdị dị iche iche nke gọọmenti. Ihe ndekọ dị ụjọ nke nhụjuanya ụmụ mmadụ na-anwapụta na mmadụ enweghị ike ịchị onwe ya. N’ezie, ọgba aghara jupụtara n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Adabereghị na Chineke, dị ka Setan kpọsara, na-eweta ọdachi.
Ọ dịbeghị Jehova mkpa ịnwapụtara onwe ya ihe ọ bụla. Ọ maara na ụzọ o si achị isi ziri ezi, bụrụkwa nke kasị mma nye ihe ndị o kere eke. Otú ọ dị, iji zaa ajụjụ nile ahụ nnupụisi Setan welitere n’ụzọ na-eju afọ, o nyewo ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi ohere igosipụta nhọrọ ha nke ịchịisi ezi omume ya.
Ụgwọ ọrụ nile nke ịhụ Chineke n’anya na ikwesị ntụkwasị obi nye ya karịrị nke ukwuu nhụjuanya ọ bụla na-adịru nwa oge n’aka Ekwensu. Ọnọdụ nke Job na-eme ihe atụ nke a. Jehova Chineke gwọrọ Job ọrịa ahụ Ekwensu wetawooro ya. Ọzọkwa, Chineke “gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.” N’ikpeazụ, mgbe a gbatịkwuru ndụ ya ruo 140 afọ, “Job wee nwụọ, bụrụ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.”—Job 42:10-17.
Onye Kraịst so dee Bible bụ́ Jemes dọọrọ uche gaa na nke a, na-asị: “Unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere, na Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.”—Jemes 5:11.
Oge agwụwo ugbu a maka Setan na ụwa ya. N’isi nso Chineke ga-asụgharị nhụjuanya nile nke nnupụisi Setan wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ isi. Ọbụna ndị nwụrụ anwụ ka a ga-akpọlite. (Jọn 11:25) Mgbe ahụ, ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Job ga-enwe ohere nke inweta ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ụwa. Ngọzi ndị a maka ọdịnihu ndị Chineke ga-awụkwasị ndị na-ejere ya ozi ga-ewepụ ya n’ụta ruo mgbe nile ebighị ebi dị ka Ọkaaka ezi omume onye n’ezie “nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Otu ọkà iwu bụ́ onye na-ede akwụkwọ na narị afọ nke 20, Philip Mauro, bụ́ onye nyochara ajụjụ n’okwu ya bụ́ “Mmalite nke Ajọ Ihe,” kwubiri na nke a bụ “ihe kpatara nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ.”
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8]
CHI NDỊ OBI TARA MMIRI NKE ỤMỤ MMADỤ
A NA-EGOSIKARỊ chi dị iche iche nke oge ochie dị ka ndị akpịrị ọbara na-akpọ nkụ na ndị nwere oké agụụ maka mmekọahụ. Iji mee ka obi jụrụ ha, ndị mụrụ ụmụ ọbụna na-esure ụmụ ha n’ọkụ ná ndụ. (Deuterọnọmi 12:31) N’isi njedebe nke ọzọ, ndị ọkà ihe ọmụma na-ekpere arụsị kụziri na Chineke enweghị mmetụta ndị dị ka iwe ma ọ bụ ebere.
Echiche nke ndị ọkà ihe ọmụma ndị a bụ́ ndị sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ nwere mmetụta n’ahụ ndị sị na ha bụ ndị nke Chineke, bụ́ ndị Juu. Ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Juu bụ́ Philo, onye ya na Jisọs bikọrọ n’otu oge, kwuru na Chineke “enweghị mkpali mmetụta ọ bụla ma ọlị.”
Ọbụna ịrọ òtù ndị Juu na-adịghị ekwe ekwe nke ndị Farisii agbanarịghị mmetụta nke nkà ihe ọmụma ndị Gris. Ha nakweere ozizi Plato nke bụ́ na ihe mejupụtara mmadụ bụ mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke e kechigidere n’ime ahụ mmadụ. Ọzọkwa, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ bụ́ Josephus si kwuo, ndị Farisii kwetara na mkpụrụ obi nke ndị ajọ mmadụ “na-ata ahụhụ ebighị ebi.” Otú ọ dị, Bible adịghị enye ihe mgbakwasị ụkwụ ọ bụla maka echiche dị otú ahụ.—Jenesis 2:7; 3:19; Eklisiastis 9:5; Ezikiel 18:4.
Olee banyere ndị ụmụazụ Jisọs? Hà kwere ka nkà ihe ọmụma nke ndị ọgọ mmụọ nwee mmetụta n’ahụ ha? N’ịmata ihe ize ndụ nke a, Pọl onyeozi dọrọ ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8; leekwa 1 Timoti 6:20.
N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha ndị nlekọta ndị Kraịst na narị afọ nke abụọ na nke atọ leghaara ịdọ aka ná ntị ahụ anya wee kụzie na Chineke enweghị mmetụta. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu, sị: “N’ozuzu ya, a ghọtara àgwà dị iche iche nke Chineke dị ka e si kwupụta ha n’echiche ndị Juu na nkà ihe ọmụma nke oge ahụ . . . Echiche ahụ bụ́ na Chukwu Nna pụrụ inwe mmetụta ndị dị ka ebere . . . abụwo nke e lere anya n’ozuzu dị ka ihe a na-apụghị ịnabata ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo ná ngwụsị nke narị afọ nke iri abụọ.”
Otú a, Krisendọm nakweere ozizi ụgha nke chi obi tara mmiri onye na-ata ndị mmehie ahụhụ site n’ime ka ha dịrị ndụ na-ata ahụhụ ebighị ebi. N’aka nke ọzọ, Jehova Chineke kwuru hoo haa n’ime Okwu ya, bụ́ Bible, na “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ,” ọ bụghị ịdịrị ndụ na-ata ahụhụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:23.
[Ebe e Sigasị Nweta Foto]
N’elu: Acropolis Museum, Greece
Site n’ikike The British Museum
[Foto dị na peeji nke 7]
A ghaghị imezu nzube Chineke nke ime ka ụwa ghọọ paradaịs yiri Iden!