Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • rq ihe ọmụmụ 4 p. 8-9
  • Ònye Bụ Ekwensu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Ekwensu?
  • Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-eche Nche, Setan Chọrọ Iripịa Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Setan
    Teta!—2013
  • Mara Onye Iro Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ònye Bụ Setan? Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?
    Teta!—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
rq ihe ọmụmụ 4 p. 8-9

Ihe Ọmụmụ nke 4

Ònye Bụ Ekwensu?

Setan bụ́ Ekwensu—Olee ebe o si bịa? (1, 2)

Olee otú Setan si eduhie ndị mmadụ? (3-7)

N’ihi gịnị ka i ji kwesị iguzogide Ekwensu? (7)

1. Okwu ahụ bụ́ “ekwensu” pụtara onye na-ekwu ajọ okwu ụgha banyere onye ọzọ. “Setan” pụtara onye iro ma ọ bụ onye mmegide. Aha ndị a ka e nyere onye iro bụ́ isi nke Chineke. Na mbụ, ọ bụ mmụọ ozi zuru okè n’eluigwe n’ebe Chineke nọ. Otú ọ dị, o mesịrị chebiga echiche ókè banyere onwe ya ma chọọ ofufe ahụ nke dịịrị nanị Chineke.—Matiu 4:8-10.

2. Mmụọ ozi a, bụ́ Setan, ji agwọ gwa Iv okwu. Site n’ịgwa ya okwu ụgha, o nwetara ya inupụrụ Chineke isi. Setan si otú a maa ihe a na-akpọ “ọbụbụeze” Chineke, ma ọ bụ ọnọdụ dị ka Onye Kachasị Ihe Nile Elu, aka. Setan rụrụ ụka ma Chineke ọ̀ na-achị n’ụzọ kwesịrị ekwesị na n’ọdịmma kasịnụ nke ndị Ọ na-achị. Setan welitekwara obi abụọ ma ọ̀ dị mmadụ ọ bụla pụrụ iguzosi ike n’ihe nye Chineke. Site n’ime nke a, Setan mere onwe ya onye iro Chineke. Ọ bụ n’ihi ya ka e ji malite ịkpọ ya Setan bụ́ Ekwensu.—Jenesis 3:1-5; Job 1:8-11; Mkpughe 12:9.

3. Setan na-anwa ịghọgbuta ndị mmadụ ife ya ofufe. (2 Ndị Kọrint 11:3, 14) Otu ụzọ o si eduhie ndị mmadụ bụ site n’okpukpe ụgha. Ọ bụrụ na okpukpe na-akụzi ụgha dị iche iche banyere Chineke, n’ezie ọ na-ejere nzube Setan ozi. (Jọn 8:44) Ndị bụ́ ndị òtù okpukpe ụgha pụrụ iji ezi obi kwere na ha na-efe ezi Chineke ahụ ofufe. Ma ha na-efe Setan n’ezie. Ọ bụ ‘chi nke ụwa nke a.’—2 Ndị Kọrint 4:4.

4. Mgbaasị bụ ụzọ ọzọ Setan si eweta ndị mmadụ n’okpuru ike ya. Ha pụrụ ịkpọku ndị mmụọ ichebe ha, imerụ ndị ọzọ ahụ, ịkọ ọdịnihu, ma ọ bụ ịrụ ọrụ ebube. Setan bụ ike ọjọọ nọ n’azụ ihe omume ndị a nile. Iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị agaghị enwe ihe ọ bụla jikọrọ anyị na mgbaasị.—Deuterọnọmi 18:10-12; Ọrụ 19:18, 19.

5. Setan na-eduhiekwa ndị mmadụ site na nganga nke agbụrụ gabigara -ókè na ofufe nke nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche. Ụfọdụ na-eche na mba ma ọ bụ agbụrụ ha ka ndị ọzọ mma. Ma nke a abụghị eziokwu. (Ọrụ 10:34, 35) Ndị ọzọ na-elega­ra nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche anya idozi nsogbu ụmụ mmadụ. Site n’ime nke a, ha na-ajụ Alaeze Chineke. Ọ bụ nanị ihe ngwọta e nwere maka nsogbu anyị.—Daniel 2:44.

6. Ụzọ ọzọ Setan ji eduhie ndị mmadụ bụ site n’iji ọchịchọ mmehie nwaa ha. Jehova na-agwa anyị ka anyị zere omume mmehie dị iche iche n’ihi na ọ maara na ha ga-emerụ anyị ahụ. (Ndị Galetia 6:7, 8) Ụfọdụ ndị pụrụ ịchọ ka i sonyere ha n’omume ndị dị otú ahụ. Ma, cheta, ọ bụ Setan n’ezie bụ onye na-achọ ka i mee ihe ndị a.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 15:33.

7. Setan pụrụ iji mkpagbu ma ọ bụ mmegide mee ka ị hapụ Jehova. Ụfọdụ n’ime ndị ị hụrụ n’anya pụrụ iwe oké iwe n’ihi na ị na-amụ Bible. Ndị ọzọ pụrụ ịkwa gị emo. Ma ònye ka ndụ gị dabeere na ya? Setan chọrọ iyi gị egwu ka i wee kwụsị ịmụ banyere Jehova. Ekwela ka Setan merie! (Matiu 10:34-39; 1 Pita 5:8, 9) Site n’iguzogide Ekwensu, ị pụrụ ime Jehova obi ụtọ ma gosi na ị na-ebuli ọbụbụeze Ya elu.—Ilu 27:11.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Okpukpe ụgha, mgbaasị, na ịhụ mba n’anya na-eduhie ndị mmadụ

[Foto dị na peeji nke 9]

Guzogide Setan site n’ịnọgide na-amụ banyere Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya