Akwụkwọ A Na-ekwu Ihe Na-ezighị Ezi Banyere ya
“Ozizi nke ngagharị ụzọ abụọ nke ụwa na-agagharị gburugburu njedebe ya na gburugburu anyanwụ bụ ụgha, na-emegidekwa Akwụkwọ Nsọ n’akụkụ nile.” Otú a ka Ọgbakọ Mmachibido Akwụkwọ nke Chọọchị Roman Katọlik kwuru n’otu iwu ike na 1616.1 Bible ọ̀ na-emegide eziokwu sayensị n’ezie? Ka è kwuwo ihe na-ezighị ezi banyere ya?
N’OGE oyi nke 1609/1610, Galileo Galilei chere ígwè e ji ahụ ihe dị anya o mepụtara ọhụrụ ihu n’igwe ma chọpụta ọnwa anọ na-agba gburugburu mbara ụwa bụ́ Jupiter. Ihe ọ hụrụ kụghasara ihe ọha kweere n’oge ahụ na ihe nile dị na mbara igwe aghaghị ịdị na-agba gburugburu ụwa. Na mbụ, na 1543, onye Poland na-enyocha mbara igwe bụ́ Nicolaus Copernicus echepụtawo na mbara ụwa nile na-agba anyanwụ gburugburu. Galileo gosipụtara na nke a bụ eziokwu sayensị.
Ma, nye ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik, nke a bụ ozizi nduhie. Ọ dịwo anya chọọchị na-ezi na ụwa bụ etiti nke eluigwe na ala.2 Echiche a dabeere ná nkọwa nkịtị nke akụkụ akwụkwọ nsọ nke sere onyinyo ụwa dị ka nke a kwụnyere “na ntọala ya nile, nke a na-apụghị ịkwagharị akwagharị ruo ebighị ebi.” (Psalm 104:5, The Jerusalem Bible) N’ịbụ onye a kpọrọ ka ọ bịa Rom, Galileo guzoro n’ihu nnọkọ Njụta Okwukwe. N’ịbụ onye a jụgharịsịrị ọnụ, a manyere ya ịgọnarị ihe ọ chọpụtara, o bikwara ndụ ya fọrọ afọ dị ka onye e ji eji n’ụlọ ya.
Na 1992, ihe dị ka afọ 350 ka Galileo nwụsịrị, Chọọchị Katọlik mesịrị kweta na ihe o kwuru bụdị eziokwu.3 Ma ọ bụrụ na Galileo kwuru eziokwu, mgbe ahụ Bible ọ̀ ghara ụgha?
Ịchọta Ihe Akụkụ Bible Na-ekwu n’Ezie
Galileo kwere na Bible bụ eziokwu. Mgbe nchọpụta sayensị ya megidere nkọwa na-ewu ewu nke amaokwu ụfọdụ nke Bible, o kwubiri na ndị ọkà mmụta okpukpe adịghị aghọta ihe akụkụ okwu ndị ahụ na-ekwu n’ezie. E kwuwerị, “eziokwu abụọ apụghị imegide onwe ha ma ọlị,” ka o dere.4 O kwuru na okwu a kapịrị ọnụ nke sayensị adịghị emegide okwu Bible ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị. Ma ndị ọkà mmụta ekwenyeghị ma ọlị. Ha gbara isi akwara na a ga-ewere okwu nile nke Bible banyere ụwa n’ụzọ nkịtị. N’ihi ya, ọ bụghị nanị na ha jụrụ nchọpụta Galileo kamakwa ha aghọtaghị ihe okwu Akwụkwọ Nsọ ndị dị otú ahụ na-ekwu n’ezie.
N’ezie, ezi echiche kwesịrị ịgwa anyị na mgbe Bible na-ezo aka “n’elu nkuku anọ nke ụwa,” ọ pụtaghị na ndị dere Bible ghọtara na ụwa nwere akụkụ anọ n’ụzọ nkịtị. (Mkpughe 7:1) E dere Bible n’asụsụ ndị nkịtị, ọtụtụ mgbe na-eji atụmatụ okwu ndị doro anya eme ihe. Ya mere mgbe ọ na-ekwu banyere ụwa ịbụ nke nwere “nkuku anọ,” “ntọala” siri ike, “ụkwụ,” na “nkume nkuku,” Bible adịghị enye nkọwa sayensị banyere ụwa; o doro anya na ọ na-ekwu n’ụzọ ihe atụ, dị ka anyị na-eme ọtụtụ mgbe n’okwu kwa ụbọchị.a—Aịsaịa 51:13; Job 38:6.
N’akwụkwọ ya bụ́ Galileo Galilei, onye ndekọ akụkọ ndụ bụ́ L. Geymonat rịbara ama, sị: “Ndị ọkà mmụta okpukpe uche ha mechiri emechi bụ́ ndị chọrọ ịkpara sayensị ókè ná ndabere nke echiche Bible agaghị eme ihe ọ bụla ma ọ bụghị iwetara Bible n’onwe ya aha ọjọọ.”5 Nke ahụ ka ha mere. N’ezie, ọ bụ nkọwa Bible nke ndị ọkà mmụta okpukpe—ọ bụghị Bible n’onwe ya—tinyeere sayensị ihe mgbochi ndị na-enweghị isi.
N’otu aka ahụ, ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi nke taa na-agbagọ Bible mgbe ha siri ọnwụ na e kere ụwa n’ụbọchị isii ndị dịcha hour 24. (Jenesis 1:3-31) Echiche dị otú ahụ ekwekọghị ma na sayensị ma na Bible. N’ime Bible, dị ka n’okwu a na-ekwu kwa ụbọchị, okwu ahụ bụ́ “ụbọchị” bụ okwu na-adaba n’ọtụtụ ihe, na-akọwa ọ̀tụ̀tụ̀ oge ogologo ha dị iche iche. Na Jenesis 2:4, e zoro aka n’ụbọchị isii nile nke okike dị ka otu “ụbọchị” na-emetụtazu ihe nile. Okwu Hibru a sụgharịrị “ụbọchị” n’ime Bible pụrụ ịpụta nanị “ogologo oge.”6 Ya mere, e nweghị ihe dị na Bible mere a ga-eji sie ọnwụ na ụbọchị nke ọ bụla nke okike dị hour 24. Site n’ịkụzi ihe dị iche, ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi na-ekwu ihe na-ezighị ezi banyere Bible.—Leekwa 2 Pita 3:8.
N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ọkà mmụta okpukpe agbagọwo Bible ọtụtụ mgbe. Tụlee ụzọ ụfọdụ ndị ọzọ okpukpe dị iche iche nke Krisendọm siworo kwuo ihe na-ezighị ezi banyere ihe Bible na-ekwu.
Nke Okpukpe Kwuru Ihe Na-ezighị Ezi Banyere Ya
Omume nke ndị na-asị na ha na-agbaso Bible na-akpụtọkarị aha akwụkwọ ha na-azọrọ na ha na-asọpụrụ. Ndị sị na ha bụ ndị Kraịst awụfuwo ọbara ibe ha n’aha Chineke. Ma, Bible na-adụ ụmụazụ Kraịst ọdụ ka ha ‘hụrịta ibe ha n’anya.’—Jọn 13:34, 35; Matiu 26:52.
Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-agba ìgwè atụrụ ha akpụkpọ, na-aghọnarị ha ego ha tara ahụhụ kpata—ihe na-ekwekọtụghị ná ntụziaka Akwụkwọ Nsọ: “N’efu ka unu natara, nyenụ n’efu.”—Matiu 10:8; 1 Pita 5:2, 3.
N’ụzọ doro anya, a pụghị iji okwu na omume nke ndị na-ehota ya nanị ma ọ bụ na-azọrọ na ha na-ebi ndụ kwekọrọ na ya kpee Bible ikpe. N’ihi ya onye uche ya ghere oghe pụrụ ịchọ ịchọpụtara onwe ya isi ihe dị na Bible na ihe mere o ji bụrụ akwụkwọ dị nnọọ ịrịba ama.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka ihe atụ, ọbụna ndị na-enyocha mbara igwe taa na-ewerekarị okwu n’ụzọ nkịtị ga-ekwu banyere “ọwụwa” na “ọdịda” anyanwụ, kpakpando, na mkpọkọta kpakpando—ọ bụ ezie na, n’ikwu eziokwu, ndị a na-eyi ka ha na-agagharị n’ihi ụwa ịgba gburugburu.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ígwè abụọ e ji ahụ ihe dị anya nke Galileo
[Foto dị na peeji nke 5]
Galileo n’ihu ndị njụta okwukwe ya