Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/15 p. 22-24
  • “Ma Ọ Na-agakwa Aga!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ma Ọ Na-agakwa Aga!”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozizi Ndị Chọọchị ahụ Megidere
  • Ọ Bụghị Akwụkwọ Nduzi Nkà Mmụta Sayensị
  • A Mara Galileo Ikpe Imegide Okwukwe
  • Akwụkwọ A Na-ekwu Ihe Na-ezighị Ezi Banyere ya
    Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Sayensị na Okpukpe Mmalite nke Esemokwu Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Sayensị Na Bible Hà Na-emegiderịta Onwe Ha n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Sayensị na Okpukpe—Ọgụ Dị n’Etiti Ha
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/15 p. 22-24

“Ma Ọ Na-agakwa Aga!”

“BIBLE na-akụzi ụzọ e si aga eluigwe, ma ọ bụghị ụzọ eluigwe si na-arụ ọrụ,” ka onye Itali ahụ bụ ọkà mmụta sayensị na onye na-emepụta ihe n’ime narị afọ nke iri na isii, bụ́ Galileo Galilei kwuru. Nkwenkwe ndị yiri nke ahụ tinyere esemokwu n’etiti ya na Chọọchị Roman Katọlik, nke yiri egwu ịta ya ahụhụ na ịtụ ya mkpọrọ. Mgbe 350 afọ gasịrị, chọọchị ahụ tụleghachiri mmeso o mesoro Galileo. A kpọwo ihe weere ọnọdụ n’oge Galileo “esemokwu n’etiti ọkà mmụta sayensị na-enweghị ezi nnwapụta na ịrapagidesi ike n’ihe a chọrọ ka e kwere n’ajụghị ase.”

Taa, ndị na-achọ eziokwu pụrụ ịmụta ihe site n’ahụmahụ Galileo. Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka e ji nwee esemokwu dị otú ahụ ma ọlị? Ileba anya n’echiche ọkà mmụta sayensị ndị a nakweere n’oge ya ga-aza ajụjụ ahụ.

N’etiti narị afọ nke 16, e chere na ụwa bụ etiti nke eluigwe na ala dum. E weere ya na ụwa mbara igwe dị iche iche na-agbagharị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ gburugburu n’enweghị ntụpọ ọ bụla. Ọ bụ ezie na e jighị usoro ọkà mmụta sayensị ọ bụla nwapụta ha, e ji okwukwe nakwere echiche ndị a dị ka ihe bụ eziokwu. N’ezie, ọkà mmụta sayensị ya na “echiche ya nile dị omimi” enweghị nkewa ọ bụla n’ebe okpukpe dị n’oge ahụ.

Ọ bụ n’ime ụwa dị otú ahụ ka a mụnyere Galileo n’otu ezinụlọ a na-akwanyere ùgwù na Pisa n’afọ 1564. Nna ya chọrọ ka ọ mụọ ihe banyere ọgwụ na ahụ ike, ma nwa okoro nta ahụ nke uche ya nwere ọchịchọ ịmata ihe malitere inwe oké mmasị na nkà mmụta mathematics. Mgbe oge na-aga, dị ka onye prọfesọ nke nkà mmụta sayensị, ọ chọpụtara ụkpụrụ ụfọdụ ndị metụtara eziokwu ahụ nke bụ na ihe ga-adịgide n’ebe ọ dị ọ gwụlakwa ma e metụrụ ya aka. Mgbe nkọwa nke ígwè telescope ndị mbụ nke ndị Dutch rutere ya aka, o meziwanyere ihe nke ukwuu n’ọdịdị ya wee mepụta ígwè ọrụ ka mma nke ya. O chere ya ihu n’eluigwe, wee bipụta ihe ọ mụtara n’akwụkwọ mbụ ya, bụ́ Sidereus Nuncius (Onye Ozi nke Jupụtara na Kpakpando), na-eme ka ọgbọ nke ya mara ọnwa anọ ndị e nwere na Jupiter. Na 1611, a kpọtara ya na Rom, ebe o chere ihe ndị ọ chọpụtara n’ihu òtù ndị Jesuit bụ Collegio Romano (Òtù Ndị Ụkọchukwu nke Rom). Ha nyere ya nsọpụrụ site n’inwe otu nzukọ nke ha nọ na ya nakwere ihe ndị ọ chọpụtara.

Ozizi Ndị Chọọchị ahụ Megidere

Dị ka ihe na-agba àmà ihe ọjọọ, tupu Galileo ahapụ Rom, otu onye Jesuit dị oké ike, bụ́ Cardinal Bellarmine, guzobere òtù na-eme nnyocha ka ha leba anya n’ozizi Galileo. Galileo kwenyere na ọ bụ iwu ndị ụmụ mmadụ pụrụ ịmụta site n’ihe ọmụmụ na-achịkwa okike ihe. Chọọchị Katọlik megidere echiche nke a.

Ọbụna ụfọdụ ndị na-enyocha mbara igwe megidere echiche Galileo. Ha kwenyere na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme ka ígwè telescope mee ka ihe dị adị n’ezie pụtawanye ìhè, na ihe ahụ o mepụtara bụkwa adịgboroja. Ọbụna na otu onye ụkọchukwu tụrụ aro na kpakpando ndị ahụ a hụrụ bụ ndị a rụnyere n’ime enyo lens nke ígwè ahụ! Mgbe Galileo chọpụtara ugwu ndị dị n’ọnwa, na-akwado echiche ahụ nke bụ na ala mbara igwe dị iche iche adịghị gburugburu n’ụzọ zuru okè, onye ụkọchukwu bụ Clavius megidere echiche ahụ, na-ekwu na e ji crystal kpuchite ọnwa, nke bụ na ọ bụrụgodị na mmadụ pụrụ ịhụ ụzọ gabiga ruo n’ugwu ndị ahụ, ọ ka bụkwa ihe dị gburugburu n’ụzọ zuru okè! “Nke a,” ka Galileo kwuru ná nzaghachi, “bụ nanị nchepụta echiche efu.”

Oké mmasị Galileo nwere ịgụ site ‘n’Akwụkwọ nke Ihe Okike,’ dị ka ọ kpọrọ ihe ọmụmụ nke okike ihe, dujere ya n’ihe odide nke onye Poland bụ ọkà nnyocha mbara igwe, bụ́ Nicolaus Copernicus. Na 1543, Copernicus ebipụtawo otu akwụkwọ nke na-ekwu na ụwa na-agba anyanwụ gburugburu. Galileo kwadoro na nke a bụ eziokwu. Otú ọ dị, nke a mere ka Galileo guzoo imegide nkà mmụta sayensị, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na òtù okpukpe nke dị n’oge ya.

Ọ bụ ezie na Chọọchị Katọlik na-eji nkà nnyocha mbara igwe nke Copernicus eme ihe n’ịka ụbọchị dị iche iche akara, dị ka Ista, a nakwerezubeghị echiche nile nke Copernicus. Òtù ndị isi chọọchị kwadoro echiche nke Aristotle nke bụ na ụwa bụ etiti nke eluigwe na ala dum. Otú ọ dị, echiche ndị ọhụrụ nke Galileo mara ùgwù na ike ha aka.

Ọ bụ ezie na ndị ọkà mmụta sayensị kwụụrụ onwe ha gburugburu Europe rụsiri ọrụ ike iji kwadoo usoro nke Copernicus, o juru ha afọ nanị ikwu ihe banyere ya n’etiti ndị ọkà mmụta sayensị nanị. N’ihe ndabere nke ahụ, Chọọchị Katọlik hapụrụ ha aka. Galileo edeghị ihe n’asụsụ Latin, kama o ji asụsụ Italian nke ọha mmadụ na-agụ wee dee ihe, wee si otú a mee ka ọha mmadụ mara ihe ndị ọ chọpụtara. Ndị ụkọchukwu chere na ọ bụghị nanị ha onwe ha ka ọ na-ama aka, kama na ọ na-amakwa Okwu Chineke aka.

Ọ Bụghị Akwụkwọ Nduzi Nkà Mmụta Sayensị

N’eziokwu, ịchọpụta eziokwu ndị metụtara eluigwe na ala abụghị n’ezie ihe ịma aka nye Okwu Chineke. Ndị mmụta nke Okwu ahụ na-aghọta na Bible abụghị akwụkwọ nduzi nkà mmụta sayensị, ọ bụ ezie na ihe o kwuru ziri ezi mgbe o metụtara ihe banyere nkà mmụta sayensị. E dere ya maka mwulite ime mmụọ nke ndị kwere ekwe, ọ bụghị iji kụziere ha nkà mmụta physics ma ọ bụ nkà mmụta sayensị ndị ọzọ. (2 Timoti 3:16, 17) Galileo kwenyere na nke a. Ọ tụrụ aro na e nwere ụdị asụsụ abụọ: okwu ndị na-ekwu ihe a chọrọ kpọmkwem nke nkà mmụta sayensị na okwu ndị a na-eji eme ihe kwa ụbọchị nke ndị ahụ dere ihe n’okpuru ike mmụọ nsọ ji mee ihe. O dere, sị: “Ọ dị mkpa n’Akwụkwọ nsọ . . . ịkọwa ihe ndị a n’ụzọ ụmụ mmadụ nkịtị ga-aghọta ha, ikwu ọtụtụ ihe ndị yiri ka hà dị iche (n’ihe banyere ihe okwu ndị ahụ pụtara) site n’ihe bụcha nnọọ eziokwu.”

E nwere ihe atụ banyere nke a n’ihe odide Bible dị iche iche. Otu bụ Job 38:6, ebe Bible kwuru banyere ụwa inwe “ụkwụ” na “nkume nkuku.” Ụfọdụ ndị jiri nke a mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka ihe àmà nke na-egosi na ụwa bụ ihe na-adịgide n’otu ebe. E bughị n’uche ka okwu ndị ahụ bụrụ nkọwa nkà mmụta sayensị nke otú ụwa dị, kama nke ahụ, ha ji ụzọ ide abụ jiri okike nke ụwa tụnyere iwu ụlọ, ebe Jehova bụ Onye Ọkà Wuru Ya.

Dị ka onye odeakụkọ ihe mere eme banyere mmadụ, bụ́ L. Geymonat mere ka ọ pụta ìhè n’akwụkwọ ya bụ Galileo Galilei: “Ndị ọkà mmụta okpukpe ndị na-enweghị uche gbasapụrụ agbasapụ, bụ́ ndị chọrọ ịkpara nkà mmụta sayensị ókè n’ihe ndabere nke echiche dabeere na Bible, adịghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ bụghị ime ka a ghara ikwenye ihe Bible n’onwe ya kwuru.” N’ihi ịchọ ọdịmma onwe ha nanị, mmadụ ndị kwesiri olu ike mere kpọmkwem nke ahụ. E zijere otu akwụkwọ ozi n’Ọfis ahụ Dị Nsọ, na-akpọ òkù ka e nyochaa Galileo.

Na February 19, 1616, e chere ihe abụọ n’ihu ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik: (1) “anyanwụ bụ etiti nke eluigwe na ala dum” na (2) “ụwa abụghị etiti nke eluigwe na ala dum.” Na February 24, ha kpebiri na echiche ndị a dị nzuzu, bụrụkwa ndị na-emegide ozizi. E nyere Galileo iwu ka ọ ghara ijigide ma ọ bụ ịkụzi ozizi ndị ahụ.

E mechiri Galileo ọnụ. Ọ bụghị nanị na Chọọchị Katọlik na-emegide ya, kama ndị enyi ya enweghị ike ọ bụla inyere ya aka. Ihe o mere bụ nanị imikpu onwe ya n’ime nnyocha. E wezụga mgbanwe popu e nwere na 1623, ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị anụkwa ihe ọ bụla ọzọ banyere ya. Otú ọ dị, onye popu ọhụrụ ahụ, bụ́ Urban nke Asatọ, bụ onye mụrụ oké akwụkwọ na onye na-akwado Galileo. Ozi ruteere Galileo na popu ahụ agaghị emegide akwụkwọ ọhụrụ ọ na-achọ ide. Ọbụna na o sooro popu nwee mkparịta ụka. Mgbe ngosipụta nke a pụtara ìhè nke popu ji gosipụta na ya nwere obi ghere oghe gasịrị, Galileo malitere ọrụ n’akwụkwọ ahụ.

Ọ bụ ezie na e bipụtara akwụkwọ Galileo bụ Dialogue Concerning the Two Chief World Systems nke mbụ ya n’okpuru laịsensị ndị Katọlik na 1632, n’oge na-adịghị anya ịnụ ọkụ n’obi onye popu ahụ danyụrụ. Mgbe ọ gbara 70 afọ, a kpọrọ Galileo òkù ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ihu Njụta Okwukwe ahụ nke ugbo abụọ. Ebubo ahụ bụ na a na-enyo ya enyo ịbụ onye na-emegide okwukwe chọrọ ka e buru ụzọ kọwaa ihe mere chọọchị ji nye ya ikike ibipụta akwụkwọ ahụ, e kwukwara na Galileo ji ụzọ aghụghọ zochie mmachibido mbụ ahụ a machibidoro ozizi Copernicus. Ebe ọ bụ na akwụkwọ Dialogue ahụ tụlerịtara usoro nnyocha mbara igwe dị iche iche, gụnyere nke Copernicus, e kwuru na o mebiri mmachibido iwu ahụ.

Galileo zaghachiri site n’ikwu na akwụkwọ ya na-akatọ Copernicus. Nke ahụ bụ nzara ọnụ na-esighị ike, n’ihi na n’ime akwụkwọ ahụ, e kwuwo okwu siri ike iji kwadoo Copernicus. Ọzọkwa, n’ime akwụkwọ ahụ, e mere ka ọ bụrụ onye na-amaghị ihe ma ọlị bụ́ Simplicio, kwuru okwu ndị ahụ popu kwuru, wee si otú a na-akpasu Pope Urban nke Asatọ iwe.

A Mara Galileo Ikpe Imegide Okwukwe

A mara Galileo ikpe. Ebe ọ nọrịị n’ọrịa, bụrụkwa onye e yiri egwu ịta ya ahụhụ, ọ gwụlakwa ma o kwuru na ya ekwukwaghị ihe ahụ ya kwuru, o mere otú ahụ. O gbunyere ikpere n’ala wee ṅụọ iyi, sị: “Ana m eji ịṅụ iyi gọpụ . . . nkwuhie na okwu mmegide okwukwe ndị ahụ . . . agaghị m ekwukwa . . . ụdị ihe ndị ahụ pụrụ ime ka e nyoo m enyo n’ụzọ dị otú ahụ ọzọ.” Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na akụkọ ọha maara na-ekwu na mgbe o bilitere, o tiri aka n’ala wee tamuo, sị, “Eppur si muove! [Ma ọ na-agakwa aga!]”

Ahụhụ e nyere ya bụ ịtụ ya mkpọrọ na inye ya ọpịpịa ruo mgbe ọ nwụrụ, bụ́ nke weere ọnọdụ mgbe afọ itoolu gasịrị. Otu akwụkwọ ozi o dere na 1634 kwuru, sị: “Ọ bụghị echiche ọ bụla nke m malitere agha ahụ, kama ọ bụ n’ihi na ndị Jesuit enweghị mmasị n’ebe m nọ.”

Na 1822, e wepụrụ mmachibido iwu a machibidoro akwụkwọ ya ndị ahụ. Ma ọ gwụlakwa na 1979 ka Pope John Paul nke Abụọ mepeghachiri ajụjụ ahụ wee nakwere na Galileo abụwo onye ‘ụmụ mmadụ na òtù dị iche iche nke Chọọchị ahụ mere ka ọ taa ahụhụ nke ukwuu.’ N’akwụkwọ akụkọ ndị Vatican bụ L’Osservatore Romano, Mario D’Addio, bụ́ onye a ma ama nke so n’òtù ahụ pụrụ iche nke Pope John Paul nke Abụọ guzobere ịtụleghachi amamikpe ahụ a mara Galileo na 1633, kwuru, sị: “Ihe ahụ a kpọrọ imegide okwukwe nke Galileo eyighị ka ò nwere ntọala ọ bụla, ma n’ụzọ nkà mmụta okpukpe ma n’okpuru iwu chọọchị.” Dị ka D’Addio si kwuo, ụlọ ikpe Njụta Okwukwe ahụ gabigara ikike o nwere—ozizi nile nke Galileo emebighị ihe ọ bụla dị n’okwukwe. Akwụkwọ akụkọ Vatican ahụ nakweere na amamikpe a mara Galileo imegide okwukwe enweghị ihe ndabere.

Gịnị ka anyị na-amụta site n’ahụmahụ Galileo? Onye Kraịst kwesịrị ịghọta na Bible abụghị akwụkwọ ọgụgụ nkà mmụta sayensị. Mgbe o yiri ka ọ̀ bụ na e nweghị nkwekọrịta n’etiti Bible na nkà mmụta sayensị, ọ dịghị mkpa ka ọ gbalịa ime ka “enweghị nkwekọrịta” nke ọ bụla dịzie. E kwuwerị, okwukwe ndị Kraịst dabeere “n’okwu Kraịst,” ọ bụghị n’ikike nkà mmụta sayensị. (Ndị Rom 10:17) E wezụga nke ahụ, nkà mmụta sayensị anọgidewo na-agbanwe. Ozizi nke pụrụ iyi ka ọ̀ na-emegide Bible ma bụrụ nke ọha mmadụ nakweere taa pụrụ ịbụ nke a chọpụtara echi na o zighị ezi, wee jụ ya.

Ma n’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ndị ọkà mmụta sayensị na-ezo aka n’okwu banyere Galileo iji gosi otú okpukpe si agbalị ịbịanyụ nkà mmụta sayensị, ha ga-eme nke ọma icheta na òtù ndị na-eme nnyocha nke oge Galileo anakwereghị nchọpụta ndị ahụ o mere. N’ịbụ nke megidere echiche e nwere mgbe ahụ, Bible enweghị ọdịiche ọ bụla dị n’etiti ya na eziokwu ahụ. Ọ dịghị mkpa ịgbanwegharị okwu Chineke. Ọ bụ nkọwahie Chọọchị Katọlik kọwahiere Bible kpatara nsogbu ahụ.

Ezi nkwekọrịta na iwu dị n’usoro okike nke dị n’eluigwe na ala dum kwesịrị ịkpali onye ọ bụla inwe ekele dị ukwuu karị nye Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke. Galileo jụrụ, sị: “Ọrụ ahụ ọ̀ dị ala karịa Okwu ahụ?” Onyeozi ahụ na-aza, sị: “Ihe [Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke.”—Ndị Rom 1:20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya