Akwụkwọ Dị Irè Maka Ibi Ndụ n’Oge A
Akwụkwọ ndị na-enye okwu ndụmọdụ na-ewu nnọọ ewu n’ụwa nke taa. Ma oge ha na-agafekarị, ngwa ngwa kwa e dezigharịa ma ọ bụ dochie ha. Gịnị banyere Bible? E dezuru ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga. Ma, a gbakwụnyetụbeghị ihe ma ọ bụ tinye ihe n’ozi ya mbụ. Akwụkwọ dị otú ahụ ọ̀ pụrụ inwe nduzi dị irè maka ụbọchị anyị?
ỤFỌDỤ sị mba. “Ọ dịghị onye ga-akwado iji mbipụta 1924 nke akwụkwọ mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe mee ihe na klas mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe nke oge a,” ka Dr. Eli S. Chesen dere, na-akọwa ihe mere o ji chee na oge Bible agafewo.1 Dị ka o yiri, ezi uche dị n’arụmụka a. E kwuwerị, mmadụ amụtawo ihe dị ukwuu banyere ahụ ike uche na akparamàgwà mmadụ eri e desịrị Bible. Ya mere olee otú akwụkwọ ochie dị otú ahụ pụrụ isi baa uru maka ịdị ndụ n’oge a?
Ụkpụrụ Ndị Dịịrị Oge Nile
Ọ bụ ezie na oge agbanwewo, mkpa ndị bụ isi nke mmadụ ka bụ otu ihe ahụ. Ndị mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile enwewo mkpa maka ịhụnanya. Ha achọwo inwe obi ụtọ na ịdị ndụ nwere nzube. Okwu ndụmọdụ banyere ụzọ isi nagide nrụgide akụ̀ na ụba, ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye, na ụzọ isi kụnye omume ọma na ụkpụrụ akparamàgwà n’ime ụmụ ha adịwo ha mkpa. Bible nwere okwu ndụmọdụ ndị na-atụle mkpa ndị ahụ bụ isi.—Eklisiastis 3:12, 13; Ndị Rom 12:10; Ndị Kọlọsi 3:18-21; 1 Timoti 6:6-10.
Ndụmọdụ Bible na-egosipụta nghọta dị nkọ banyere ọdịdị mmadụ. Tụlee ihe atụ ụfọdụ nke ụkpụrụ ya ndị a kapịrị ọnụ, ndị dịịrị oge nile bụ́ ndị dị irè maka ibi ndụ n’oge a.
Nduzi Dị Irè Maka Alụmdi na Nwunye
Ezinụlọ, ka UN Chronicle na-ekwu, “bụ ndokwa kasị ochie na nke bụ isi karịsịa ná nhazi ụmụ mmadụ; njikọ kasị mkpa n’etiti ọgbọ na ọgbọ.” Otú ọ dị, “njikọ kasị mkpa” nke a na-adakpọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ụjọ. “N’ụwa taa,” ka Chronicle ahụ na-ekwu, “ọtụtụ ezinụlọ na-eche ihe ịma aka ndị na-akụda obi ihu bụ́ ndị na-eyi ikike ha ịnọgide na, n’ezie, ha ịlanarị egwu.”2 Olee ndụmọdụ Bible na-enye iji nyere ndokwa ezinụlọ aka ịlanarị?
Iji malite, Bible nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere ụzọ ndị bụ di na ndị bụ nwunye kwesịrị isi mesoo ibe ha. Banyere ndị bụ di, dị ka ihe atụ, ọ na-asị: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma.” (Ndị Efesọs 5:28, 29, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) A gwara nwunye ka “ọ na-atụ egwu di ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ndị Efesọs 5:33.
Tụlee ihe itinye ndụmọdụ Bible dị otú ahụ n’ọrụ gụnyere. Di nke na-ahụ nwunye ya n’anya ‘dị ka ahụ nke onwe ya’ adịghị akpọ ya asị ma ọ bụ na-emesi ya ike. Ọ dịghị eti ya ihe, ọ dịghịkwa emetọ ya n’okwu ọnụ ma ọ bụ ná mmetụta uche. Kama nke ahụ, ọ na-enye ya otu ùgwù na nchebara echiche ahụ ọ na-enye onwe ya. (1 Pita 3:7) Nwunye ya si otú a na-enwe mmetụta nke onye a hụrụ n’anya na ịnọ ná ntụkwasị obi n’ọlụlụ di ya. O si otú a na-enye ụmụ ya ezi ihe nlereanya nke otú e kwesịrị isi mesoo ndị inyom. N’aka nke ọzọ, nwunye “na-atụ egwu” di ya adịghị anapụ ya ùgwù ya site n’ịdị na-akatọ ya ma ọ bụ na-ewetu ya ala mgbe nile. N’ihi na ọ na-akwanyere ya ùgwù, di ya na-enwe mmetụta nke ịbụ onye a tụkwasịrị obi, a nakweere, nweekwa mmasị n’ebe ọ nọ.
Okwu ndụmọdụ dị otú a ọ̀ dị irè n’ụwa nke oge a? Ọ na-akpali mmasị na ndị ji ịmụ banyere ezinụlọ ndị dị taa mere ọrụ abịawo ná nkwubi okwu yiri ndị a. Onye isi nke otu usoro ihe omume ndụmọdụ ezinụlọ kwuru, sị: “Ezinụlọ ndị kasị mma m maara bụ ndị ebe nne na nna nwere mmekọrịta siri ike, nke ịhụnanya n’etiti onwe ha. . . . Mmetụta a siri ike nke dị mkpa yiri ka ha na-akụnye ịnọ ná ntụkwasị obi n’ime ụmụaka.”3
N’afọ ndị na-agafenụ, ndụmọdụ Bible n’alụmdi na nwunye ekwesịwo ndabere nke ukwuu karịa okwu ndụmọdụ nke ọnụ ọgụgụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nke ndị ndụmọdụ ezinụlọ bu ihe ọma n’obi. E kwuwerị, ọ dịbeghị anya ọtụtụ ndị ọkachamara nọ na-akwado ịgba alụkwaghịm dị ka ihe ngwọta dị ngwa ma dị mfe nye alụmdi na nwunye na-adịghị enye obi ụtọ. Taa, ọtụtụ n’ime ha na-agba ndị mmadụ ume ime ka alụmdi na nwunye ha dịtee aka ma o nwee ka o si kwe omume. Ma mgbanwe a abịawo nanị mgbe ihe dị ukwuu mebisịworo.
N’ụzọ dị iche, Bible na-enye ndụmọdụ kwesịrị ndabere, nke guzoziri eguzozi n’isiokwu alụmdi na nwunye. Ọ na-ekweta na ọnọdụ ụfọdụ dị oké njọ na-eme ka e nwee ohere ịgba alụkwaghịm. (Matiu 19:9) N’otu oge ahụ, ọ na-akagbu ịgba alụkwaghịm na-enweghị ezi ihe kpatara ya. (Malakaị 2:14-16) Ọ na-akagbukwa ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye. (Ndị Hibru 13:4) Alụmdi na nwunye, ka ọ na-ekwu, gụnyere nraranye: “N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.”a (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Jenesis 2:24; Matiu 19:5, 6.
Okwu ndụmọdụ Bible banyere alụmdi na nwunye dị irè taa dị ka ọ dị mgbe e dere Bible. Mgbe di na nwunye na-emeso ibe ha n’ịhụnanya na nkwanye ùgwù ma na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka mmekọrịta dịịrị nanị ha, alụmdi na nwunye ahụ yikarịrị ka ọ ga-adịgide—ya na ezinụlọ ahụkwa.
Nduzi Dị Irè Maka Nne na Nna
Ọtụtụ iri afọ gara aga ọtụtụ nne na nna—n’ịbụ ndị “echiche ndị ọhụrụ” banyere ịzụ ụmụ na-akpali—chere na “ọ bụ arụ ịsị na ihe bụ arụ.”8 Ha tụrụ egwu na ịkpara ụmụaka ókè ga-akpata mkpasasị uche na nkụda mmụọ. Ndị ndụmọdụ n’ịzụlite ụmụ bụ́ ndị nwere ezi nzube nọ na-esi ọnwụ ka ndị nne na nna kwụsị ihe ọ bụla karịrị inye ụmụ ha mgbazi olu kasị dị nro. Ma ọtụtụ n’ime ndị ọkachamara dị otú ahụ na-atụleghachi ugbu a ọrụ nke ịdọ aka ná ntị, nne na nna ndị ọ na-echegbu na-achọgharịkwa nkọwa ụfọdụ n’isiokwu ahụ.
Ma, eri mgbe, Bible enyewo ndụmọdụ doro anya, nke ezi uche dị na ya banyere ịzụlite ụmụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, ọ sịrị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Mkpọaha Grik a sụgharịrị “ọzụzụ” pụtara “nzụlite, inye nkụzi, ntụziaka.”9 Bible na-asị na ọzụzụ, ma ọ bụ ntụziaka dị otú ahụ, bụ ihe àmà nke ịhụnanya ndị nne na nna. (Ilu 13:24) Ụmụaka na-eji ụkpụrụ nduzi omume doro anya na echiche e wulitere ewulite nke ihe ọma na ihe ọjọọ eto nke ọma. Ọzụzụ na-agwa ha na nne na nna ha na-eche banyere ha na banyere ụdị mmadụ ha na-aghọ.
Ma ịbụisi nne na nna—“mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị”—ekwesịghị ịdị na-emerụ ahụ ma ọlị.b (Ilu 22:15; 29:15) Bible na-adọ ndị nne na nna aka ná ntị, sị: “Unu agbazila ụmụ unu olu gabiga ókè, ma ọ bụghị ya unu ga-eme ka obi fuo ha kpam kpam.” (Ndị Kọlọsi 3:21, Phillips) O kwetakwara na ọtụtụ mgbe ntaramahụhụ nkịtị abụghị ụzọ izi ihe kasị irè. Ilu 17:10 na-asị: “Ịbasi mba ike na-abami n’ime onye nghọta karịa ka [otu narị ihe otiti] ga-aba n’ime onye nzuzu.” E wezụga nke ahụ, Bible na-atụ aro ịdọ aka ná ntị mgbochi. Na Deuterọnọmi 11:19 a na-agba ndị nne na nna ume iji oge ntụsara ahụ kụbanye ụkpụrụ omume n’ime ụmụ ha.—Leekwa Deuterọnọmi 6:6, 7.
Okwu ndụmọdụ dịịrị oge nile nke Bible nyere ndị nne na nna doro anya. Ịdọ aka ná ntị kwụsiri ike na nke ịhụnanya dị ụmụaka mkpa. Ahụmahụ ihe na-eme eme na-egosi na ndụmọdụ dị otú ahụ dị irè n’ezie.c
Imeri Ihe Mgbochi Ndị Na-ekewa Ndị Mmadụ
Ihe mgbochi agbụrụ, mba, na ebo kewara ndị mmadụ taa. Mgbidi adịgboroja dịgasị otú ahụ esowo kpata oké mgbukpọ nke ndị aka ha dị ọcha n’agha n’ụwa nile. Ọ bụrụ na akụkọ ihe mere eme bụ ihe mgbaàmà, atụmanya nke ndị ikom na ndị inyom nke agbụrụ na mba dị iche iche ile ibe ha anya na imeso ibe ha dị ka ndị hà nhata adịghị adị n’ezie. “Ihe ngwọta ya,” ka otu onye Africa ọnụ na-eru n’okwu na-ekwu, “dị n’obi anyị.”11 Ma ịgbanwe obi ndị mmadụ adịghị mfe. Ma, tụlee ụzọ ozi Bible si eru n’obi ma na-akwalite àgwà nke ịha nhata.
Nkụzi Bible nke na Chineke ‘sitere n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ’ na-agụpụ echiche ọ bụla nke ọkaaka nke agbụrụ. (Ọrụ 17:26) Ọ na-egosi na e nwere n’ezie nanị otu agbụrụ—agbụrụ mmadụ. Bible gbakwuru anyị ume ‘ịbụ ndị na-eṅomi Chineke,’ onye ọ na-ekwu banyere ya, sị: “[Ọ dịghị] ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ndị Efesọs 5:1; Ọrụ 10:34, 35) Nye ndị ji Bible kpọrọ ihe na ndị na-achọ n’eziokwu ibi ndụ kwekọrọ ná nkụzi ya, ihe ọmụma a nwere mmetụta na-ejikọta ejikọta. Ọ na-arụ ọrụ n’ebe mikarịsịrị emi, n’ime obi mmadụ, na-agbaze ihe mgbochi ndị mmadụ guzobere bụ́ ndị na-ekewa ndị mmadụ. Tụlee otu ihe atụ.
Mgbe Hitler buru agha na Europe nile, e nwere otu ìgwè ndị Kraịst—Ndịàmà Jehova—jụwara isi isonye ná mgbukpọ nke ndị aka ha dị ọcha. Ha “agaghị ebuli mma agha” megide mmadụ ibe ha. Ha weere nguzo a n’ihi ọchịchọ ha ime ihe dị Chineke ụtọ. (Aịsaịa 2:3, 4; Maịka 4:3, 5) Ha kwenyere n’ezie n’ihe Bible na-akụzi—na ọ dịghị mba ma ọ bụ agbụrụ ka ibe ya mma. (Ndị Galetia 3:28) N’ihi nguzo ịhụ udo n’anya ha, Ndịàmà Jehova so ná ndị mbụ banyere n’ogige ịta ahụhụ.—Ndị Rom 12:18.
Ma ọ bụghị ndị nile zọọrọ na ha na-agbaso Bible weere nguzo dị otú ahụ. Ngwa ngwa Agha Ụwa nke Abụọ biri, Martin Niemöller, onye Germany bụ́ ụkọchukwu ndị Protestant, dere, sị: “Onye ọ bụla chọrọ ịta Chineke ụta maka [agha] amaghị, ma ọ bụ achọghị ịma, Okwu Chineke. . . . Chọọchị ndị Kraịst dị iche iche, n’ọgbọ nile, emikpuwo onwe ha ugboro ugboro n’ịgọzi agha, ìgwè ndị agha, na ngwá agha . . . kpeekwa ekpere n’ụzọ na-ekwesịghị ndị Kraịst ma ọlị maka mbibi nke ndị iro ha n’agha. Ihe a dum bụ emezighị emezi nke anyị na emezighị emezi nke ndị nna anyị ha, ma ọ bụtụghị Chineke ka ụta dịịrị. Anyị bụ́ ndị Kraịst nke taa na-eguzokwa n’ihere n’ihu otu ndị a na-asị na ha bụ ịrọ òtù dị ka Ndị Mmụta Bible Dị Uchu [Ndịàmà Jehova], bụ́ ndị gara n’ogige ịta ahụhụ n’ìgwè narị kwụrụ narị na puku kwụrụ puku na [ọbụna] nwụọ n’ihi na ha jụrụ ije ozi agha ma jụ ịgba ụmụ mmadụ égbè.”12
Ruo taa, a ma Ndịàmà Jehova nke ọma maka òtù ụmụnna ha, nke na-ejikọta ndị Arebia na ndị Juu, ndị Croatia na ndị Serbia, ndị Hutu na ndị Tutsi. Otú ọ dị, Ndịàmà na-ekweta ngwa ngwa na ịdị n’otu dị otú ahụ kwere omume, ọ bụghị n’ihi na ha ka ndị ọzọ mma, kama n’ihi na ike nke ozi Bible na-akwali ha.—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.
Nduzi Dị Irè Na-akwalite Ezi Ahụ Ike nke Uche
Ọnọdụ ahụ ike uche na mmetụta uche mmadụ na-emetụtakarị ahụ ike elu ahụ ya. Dị ka ihe atụ, ihe ọmụmụ sayensị anwapụtawo mmetụta ọjọọ nke iwe. “Ihe ka ukwuu n’ihe àmà dịnụ na-atụ aro na ndị na-ewekarị iwe nọ n’ihe ize ndụ kanụ maka ọrịa obi (nakwa ọrịa ndị ọzọ) n’ihi ihe dị iche iche, gụnyere mbelata ná nkwado ọha mmadụ na-enye, mmụba nke nzaghachi usoro ahụ mgbe e were iwe, na mmụba nke itinye aka n’akparamàgwà ahụ ike dị ize ndụ,” ka Dr. Redford Williams, Onye Ntụzi nke Nnyocha Akparamàgwà n’Ogige Ahụ Ike nke Mahadum Duke, na nwunye ya, bụ́ Virginia Williams, dere n’akwụkwọ ha bụ́ Anger Kills (Iwe Na-egbu Egbu).13
Ọtụtụ puku afọ tupu ihe ọmụmụ sayensị dịgasị otú ahụ, Bible, n’okwu ndị dị mfe ma doo anya, jikọrọ ọnọdụ mmetụta uche anyị na ahụ ike elu ahụ anyị: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ: ma ire ure nke ọkpụkpụ nile ka ekworo bụ.” (Ilu 14:30; 17:22) N’amamihe, Bible na-adụ ọdụ, sị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma,” na “Ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị.”—Abụ Ọma 37:8; Eklisiastis 7:9.
Bible nwekwara okwu ndụmọdụ ezi uche dị na ya maka ịchịkwa iwe. Dị ka ihe atụ, Ilu 19:11 na-asị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ; ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie.” E si na ngwaa na-adọrọ uche gaa ‘n’ihe ọmụma banyere ihe kpatara’ ihe nweta okwu Hibru maka “ezi uche.”14 Okwu ndụmọdụ amamihe ahụ bụ: “Chee echiche tupu i mee ihe.” Ịgbali ịghọta ihe bụ isi mere ndị ọzọ ji kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe n’otu ụzọ pụrụ inyere mmadụ aka ịnagidekwu ihe—gharakwuo ịdị na-ewe iwe.—Ilu 14:29.
A na-ahụ okwu ndụmọdụ ọzọ dị irè ná Ndị Kọlọsi 3:13, nke na-asị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu.” Ụmụ ihe mgbakasị ahụ bụ ihe a na-ahụ ná ndụ. Okwu bụ “na-anagiderịtanụ ibe unu” na-atụ aro ịnagide ihe ndị anyị na-enweghị mmasị na ha n’ebe ndị ọzọ nọ. “Gbaghara” pụtara ịhapụ ibu iwe n’obi. Mgbe ụfọdụ ọ bụ ihe amamihe ịhapụ mmetụta obi ilu kama ịdị na-akwanye ha ọkụ; nanị ihe ibu iwe ahụ n’obi ga-eme bụ ịtụkwasị ihe n’ibu arọ anyị.—Lee igbe bụ́ “Nduzi Dị Irè Maka Mmekọrịta Ụmụ Mmadụ.”
Taa, e nwere ọtụtụ isi iyi nke ndụmọdụ na nduzi. Ma Bible pụrụ nnọọ iche. Ndụmọdụ ya abụghị okwu ọnụ efu, ọ dịghịkwa mgbe okwu ndụmọdụ ya na-ewetara anyị mmerụ ahụ. Kama nke ahụ, amamihe ya abụwo nke “kwesịrị ntụkwasị obi nke ukwuu.” (Abụ Ọma 93:5) Ọzọkwa, ndụmọdụ Bible dịịrị oge nile. Ọ bụ ezie na e dezuru ya ihe dị ka afọ 2,000 gara aga, okwu ya ka dị irè. Ha na-enwekwa mmetụta hà nhata n’agbanyeghị ụcha akpụkpọ ahụ anyị ma ọ bụ mba ebe anyị bi. Okwu Bible dịkwa ike—ike ịgbanwe ndị mmadụ n’ụzọ ka mma. (Ndị Hibru 4:12) Ịgụ akwụkwọ ahụ na itinye ụkpụrụ ya dị iche iche n’ọrụ pụrụ isi otú a mee ka ọdịdị nke ndụ gị ka mma.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu Hibru bụ́ da·vaqʹ, a sụgharịrị “rapara” n’ebe a, “na-ebu echiche nke ịgagide mmadụ aka n’ụzọ ịhụnanya na n’ịnọgidesi ike n’ihe.”4 Na Grik, e jikọrọ okwu a kpọrọ “ga-arapara” na Matiu 19:5 na okwu pụtara “ịnya mgba,” “ijikọ ihe,” “ijikọsi ọnụ ike.”5
b N’oge Bible, okwu bụ́ “mkpanaka” (Hibru, sheʹvet) pụtara “osisi” ma ọ bụ “mkpara,” dị ka nke onye na-azụ atụrụ na-eji.10 N’ọnọdụ okwu nke a mkpanaka nke ịbụisi na-atụ aro nduzi ịhụnanya, ọ bụghị mmesi ike obi ọjọọ.—Tụlee Abụ Ọma 23:4.
c Lee isiokwu ndị bụ “Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ,” “Nyere Nwa Gị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Aka Inwe Ọganihu,” “È Nwere Onye Nnupụisi n’Ụlọ?,” na “Chebe Ezinụlọ Gị Pụọ n’Ihe Ndị Na-eweta Mbibi” n’akwụkwọ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]
Bible na-enye ndụmọdụ doro anya, nke ezi uche dị na ya banyere ndụ ezinụlọ
Igbe dị na peeji nke 23]
Njimara nke Ezinụlọ Ndị Dị Mma
Ọtụtụ afọ gara aga otu onye ọkà nkụzi na ọkachamara banyere ezinụlọ mere nnyocha sara mbara ebe a gwara ihe karịrị ndị ọkachamara 500 na-ahụ maka ezinụlọ ka ha kwuo banyere àgwà ndị ha hụrụ n’ezinụlọ ndị “dị mma.” N’ụzọ na-akpali mmasị, ihe ndị Bible kwuru eri mgbe dị anya so n’àgwà ndị ha kasị depụta.
Àgwà nkwurịta okwu dị mma nọ n’ọkwá mbụ, gụnyere ụzọ ndị dị irè isi dozie esemokwu. Ụkpụrụ a na-ahụkarị n’ezinụlọ ndị dị mma bụ na “ọ dịghị onye na-eburu onye ọzọ iwe n’obi alakpu ụra,” ka onye chepụtara nnyocha ahụ kwuru.6 Ma, ihe karịrị afọ 1,900 gara aga, Bible dụrụ ọdụ, sị: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” (Ndị Efesọs 4:26) N’oge Bible a na-agụ ụbọchị malite n’ọdịda anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ. Ya mere, ogologo oge tupu ndị ọkachamara nke oge a amụọ banyere ezinụlọ, Bible ji amamihe dụọ ọdụ, sị: Dozie okwu ndị na-akpata nkewa ngwa ngwa—tupu ụbọchị agwụ ọzọ ewee malite.
Ezinụlọ ndị dị mma “adịghị ewelite isiokwu ndị pụrụ ịkpasu iwe kpọmkwem tupu ha apụọ apụ ma ọ bụ tupu oge ịlakpu ụra,” ka onye ahụ chọpụtara. “Ugboro ugboro anụrụ m nkebi okwu bụ́ ‘oge kwesịrị ekwesị.’”7 Ezinụlọ ndị dị otú ahụ n’amaghị ama tụghachiri ilu Bible e dekọrọ ihe karịrị afọ 2,700 gara aga: “Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.” (Ilu 15:23; 25:11, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Okwu ihe yiri ihe a pụrụ izo aka n’ọla ọlaedo ndị dị n’ụdị apple bụ́ ndị e tinyere n’efere e ji ọlaọcha tụọ—ihe onwunwe ndị a na-achọsi ike na ndị mara mma n’oge Bible. Ọ na-egosi ịma mma na uru nke okwu ndị e kwuru na mgbe kwesịrị ha. N’oge ihe isi ike, okwu ndị kwesịrị ekwesị e kwuru na mgbe kwesịrị ekwesị dị oké ọnụ ahịa.—Ilu 10:19.
Igbe dị na peeji nke 26]
Nduzi Dị Irè Maka Mmekọrịta Ụmụ Mmadụ
“Maanụ jijiji, emehiekwala: sịnụ otú a n’obi unu n’elu ihe ndina unu, wee dere duu.” (Abụ Ọma 4:4) N’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ ndị metụtara ụmụ obere mmejọ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe igbochi okwu gị, si otú ahụ na-ezere esemokwu pụrụ isite n’ọnọdụ uche.
“O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Chee echiche tupu i kwuo okwu. Okwu ndị a na-echeghị eche pụrụ imerụ ndị ọzọ ahụ ma gbuo ọbụbụenyi.
“Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Ọ na-ewe njide onwe onye iji zaghachi n’ụzọ dị nwayọọ, ma ụzọ dị otú ahụ na-edozikarị nsogbu ma na-akwalite mmekọrịta udo.
“Dị ka mgbe mmadụ na-ehupụ mmiri, otú a ka isi mmalite iseokwu dị: n’ihi ya tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.” (Ilu 17:14) Ọ bụ ihe amamihe isi n’ọnọdụ na-akpasu iwe pụọ tupu i tiwapụ n’iwe.
“Adịla ngwa igosipụta iwe; n’ihi na ọ bụ ndị nzuzu na-azụ iwe.” (Eklisiastis 7:9, The New English Bible) Mmetụta uche na-ebutekarị ime ihe ụzọ. Onye dị ngwa iwe iwe dị nzuzu, n’ihi na ụzọ ya pụrụ iduba n’okwu ma ọ bụ omume a na-echeghị eche.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ndịàmà Jehova so ná ndị mbụ e tinyere n’ogige ịta ahụhụ