Isi nke Atọ
E Lere Ya Ule—Ma O Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nye Jehova!
1, 2. Ihe omume ndị dị aṅaa dị ịrịba ama jere ozi dị ka mmalite ihe ndekọ nke Daniel?
AKWỤKWỌ amụma bụ́ Daniel na-amalite n’oge mgbanwe dị mkpa n’ụwa nile. A ka napụsịrị Asiria isi obodo ya, bụ́ Nineve. E debewo Ijipt n’ọnọdụ dị ala n’ebe ndịda nke ala Juda. Babilọn na-ebilikwa n’ike n’ike dị ka ike bụ́ isi na mgba a na-agba maka ịchị ụwa nile.
2 Na 625 T.O.A., Fero Neko nke Ijipt mere mgbalị ikpeazụ iji gbochie ndị Babilọn ịgbasa gaa ebe ndịda. Iji mezuo nke ahụ, o duuru ndị agha ya gaa Kakemish, nke dị n’ụsọ Osimiri Yufretis dị ná mgbago. Agha nke Kakemish, dị ka e mesịrị kpọọ ya, bụ ihe mere akụkọ, nke e ji mechie okwu. Usuu ndị agha Babilọn, ndị Nwa Eze bụ́ Nebukadneza du, kpara ndị agha Fero Neko aka ọjọọ. (Jeremaịa 46:2) Ná mkpali nke mmeri ya, Nebukadneza wakwasịrị Siria na Palestine, n’ihi ihe ndị dokwara anya, o wetara ọchịchị Ijipt dị n’ógbè a ná njedebe. Ọ bụ nanị ọnwụ nna ya, bụ́ Nabopolassar, kwụsịtụrụ mwakpo ya.
3. Gịnị si ná mwakpo mbụ Nebukadneza wakporo Jerusalem pụta?
3 N’afọ na-esonụ, Nebukadneza—onye nọkwasịworo n’ocheeze ugbu a dị ka eze Babilọn—maliteghachiri mwakpo agha ya na Siria na Palestine. Ọ bụ n’oge a ka ọ bịara Jerusalem na nke mbụ ya. Bible na-akọ, sị: “N’ụbọchị ya Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, rịgoro, Jehoiakim wee ghọọrọ ya ohu afọ atọ: o wee chigharịa nupụ isi n’okpuru ya.”—2 Ndị Eze 24:1.
NEBUKADNEZA N’IME JERUSALEM
4. Olee otú e kwesịrị isi ghọta okwu ahụ bụ́ “n’afọ nke atọ nke ọbụbụeze nke Jehoiakim” dị na Daniel 1:1?
4 Okwu ahụ bụ́ “afọ atọ” na-adọrọ mmasị anyị karịsịa, n’ihi na okwu ndị malitere Daniel na-agụ, sị: “N’afọ nke atọ nke ọbụbụeze nke Jehoiakim, bụ́ eze Juda, ka Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, bịara na Jerusalem, nọchigide ya n’agha.” (Daniel 1:1) N’afọ nke atọ nke ọbụbụeze nile nke Jehoiakim, bụ́ onye chịrị malite na 628 ruo 618 T.O.A., Nebukadneza abụrụbeghị “eze Babilọn” kama ọ bụ nwa eze. Na 620 T.O.A., Nebukadneza manyere Jehoiakim ịtụ ụtụ. Ma mgbe ihe dị ka afọ atọ gasịrị, Jehoiakim nupụrụ isi. N’ihi ya, ọ bụ na 618 T.O.A., ma ọ bụ n’afọ nke atọ nke ọbụbụeze Jehoiakim dị ka eze nọ n’okpuru Babilọn, ka Eze Nebukadneza bịara Jerusalem nke ugboro abụọ, ịbịa taa Jehoiakim ahụ nupụrụ isi ahụhụ.
5. Gịnị si ná mwakpo nke abụọ nke Nebukadneza wakporo Jerusalem pụta?
5 Ihe si ná nnọchibido a pụta bụ na “Onyenwe anyị wee were Jehoiakim, bụ́ eze Juda, na ihe ụfọdụ nke ụlọ Chineke, nye n’aka ya.” (Daniel 1:2) Eleghị anya e gburu Jehoiakim egbu ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ nwụrụ n’agha nnupụisi, ná mmalite nke nnọchibido ahụ. (Jeremaịa 22:18, 19) Na 618 T.O.A., nwa ya nwoke dị afọ 18, bụ́ Jehoịakin, nọchiri ya dị ka eze. Ma ọchịchị Jehoịakin dịruru nanị ọnwa atọ na ụbọchi iri, ọ chịlikwara aka elu na 617 T.O.A.—Tụlee 2 Ndị Eze 24:10-15.
6. Gịnị ka Nebukadneza ji arịa ndị dị nsọ nke ụlọ nsọ dị na Jerusalem mee?
6 Nebukadneza buuru arịa dị nsọ nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem laa dị ka ihe a lụtara n’agha wee “chịrị ha bịa n’ala Shaịna n’ụlọ chi ya: ọ bụkwa ihe ndị a ka ọ chịbatara n’ụlọ akụ̀ nke chi ya,” bụ́ Marduk, ma ọ bụ Merodak n’asụsụ Hibru. (Daniel 1:2; Jeremaịa 50:2) A chọtara ihe odide Babilọn ebe e gosiri na Nebukadneza kwuru banyere ụlọ nsọ Marduk, sị: “M chịkọbara n’ime ya ọlaọcha na ọlaedo na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa . . . ma debe ụlọ akụ̀ nke alaeze m n’ebe ahụ.” Anyị ga-agụ banyere arịa ndị a dị nsọ ọzọkwa n’ụbọchị Eze Belshaza.—Daniel 5:1-4.
NDỊ NTOROBỊA JERUSALEM NỌ N’ỌKWÁ DỊ ELU
7, 8. Site na Daniel 1:3, 4, na nke 6, gịnị ka anyị pụrụ ịghọta banyere nzụlite Daniel na ndị enyi ya atọ?
7 E wetara ihe karịrị akụ̀ nke ụlọ nsọ Jehova na Babilọn. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Eze ahụ wee sị Ashpenaz, bụ́ onyeisi ndị ọnaozi ya, ka o mee ka ụfọdụ n’ụmụ Israel bata, bụ́ ụfọdụ n’ime mkpụrụ alaeze na n’ime ndị isi; bụ́ ụmụ okoro nke ọ dịghị ọrụ ọ bụla dị ha n’ahụ, ndị mara mma n’ile anya, nwee uche n’amamihe nile, mara ihe ọmụma, na-aghọta ihe a na-ama ama, ndị nwekwara ike iguzo n’ụlọukwu eze.”—Daniel 1:3, 4.
8 Olee ndị a họọrọ? A gwara anyị: “N’etiti ha ka ụmụ Juda ụfọdụ dị, bụ́ Daniel, na Hananaịa, na Mishael, na Azaraịa.” (Daniel 1:6) Nke a na-eme ka a ghọta ihe gaara abụ nzụlite a na-amaghị ama nke Daniel na ndị enyi ya. Dị ka ihe atụ, anyị na-arịba ama na ha bụ “ụmụ Juda,” bụ́ ebo na-abụ eze. Ma hà si n’eriri ndị eze pụta ma ọ bụ na ha esighị, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na ma ọ dịghị ihe ọzọ ha sitere n’ezinụlọ ndị oké ozu. E wezụga ịbụ ndị uche na ahụ ha zuru okè, ha nwere nghọta, amamihe, ihe ọmụma, na ezi uche—ha nile mgbe ha dị nnọọ obere ịbụ ndị a kpọrọ “ụmụaka,” eleghị anya ná mmalite afọ iri na ụma ha. Daniel na ndị enyi ya aghaghị ịpụworị iche—ndị nọ n’ọkwá dị elu—n’etiti ndị ntorobịa nọ na Jerusalem.
9. N’ihi gịnị ka o ji yie ihe doro anya na Daniel na ndị enyi ya atọ nwere ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke?
9 Ihe ndekọ ahụ agwaghị anyị ndị mụrụ ụmụ okoro a. Ka o sina dị, o yiri ka o doro anya na ha bụ ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị wewooro ibu ọrụ ha nke ịbụ ndị mụrụ ụmụ kpọrọ ihe. N’ihi nretọ omume na nke ime mmụọ jupụtara na Jerusalem n’oge ahụ, karịsịa n’etiti ‘ụmụ eze na ndị isi,’ o doro anya na ọmarịcha àgwà ndị Daniel na ndị enyi ya atọ nwere abịaghị na mberede. Ọ dịghị mkpa ikwuwe na ọ ghaghị ịbụworị ihe na-agbawa obi nye ndị mụrụ ha ịhụ ka a kpọ ụmụ ha na-aga ala dị anya. A sị nnọọ na ha pụrụ ịhụ ihe ga-esi na ya pụta, lee obi ụtọ ha gaara enwe! Lee ka o si dị mkpa nye ndị nne na nna ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị”!—Ndị Efesọs 6:4.
ỌGỤ MAKA UCHE
10. Gịnị ka a kụziiri ndị Hibru atọ ahụ na-eto eto, gịnịkwa bụ nzube nke a?
10 Ozugbo, a malitere ịlụ ọgụ maka uche ndị a na-eto eto e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ. Iji jide n’aka na a ga-akpụzi ndị Hibru a nọ n’afọ iri na ụma ha ikwekọ n’ụzọ ndị Babilọn si eme ihe, Nebukadneza nyere iwu ka ndị ọrụ ya “mee ka ha mụta akwụkwọ na asụsụ nke ndị Kaldea.” (Daniel 1:4) Nke a abụghị agụmakwụkwọ nkịtị. The International Standard Bible Encyclopedia na-akọwa na ọ “gụnyere ọmụmụ nke Sumerian, Akkadian, Aramaic . . . , na asụsụ ndị ọzọ, nakwa ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ ndị e dere n’asụsụ ndị ahụ.” Ihe mejupụtara “ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ” ahụ bụ akụkọ ihe mere eme, mgbakọ na mwepụ, nkà mmụta mbara igwe, na ihe ndị ọzọ. Otú ọ dị, “ihe odide okpukpe ndị e jikọrọ ha na ha, ma ihe àmà ọdịnihu ma ịgụ kpakpando . . . , keere òkè dị ukwuu.”
11. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ka e weere iji hụ na ndị ntorobịa ahụ bụ́ ndị Hibru ga-anakwere ndụ a na-ebi n’obí eze Babilọn?
11 Ka ndị ntorobịa Hibru atọ a wee nabata kpam kpam omenala na ọdịbendị nke ndụ a na-ebi n’obí eze Babilọn, “eze wee kepụtara ha òkè nke ụbọchị ọ bụla n’ụbọchị ya site n’ihe oriri ọma nke eze, na site na mmanya vine nke ọ na-aṅụ, sị ka e mee ka ha topụta afọ atọ, ka ha wee guzo n’ihu eze n’ọgwụgwụ afọ atọ ahụ.” (Daniel 1:5) Ọzọkwa, “onyeisi ndị ọnaọzi wee gụọ ha aha: o wee gụọ Daniel aha Belteshaza, gụọkwa Hananaịa aha Shedrak, gụọkwa Mishael aha Mishak, gụọkwa Azaraịa aha Abednego.” (Daniel 1:7) N’oge Bible ọ bụ omume a na-ahụkarị mmadụ ịbụ onye e nyere aha ọhụrụ iji kaa ihe omume dị ịrịba ama ná ndụ ya akara. Dị ka ihe atụ, Jehova gbanwere aha Abram na Seraị ka ọ bụrụ Abraham na Sera. (Jenesis 17:5, 15, 16) Mmadụ ịgbanwe aha onye ọzọ bụ ihe àmà doro anya nke inwe ikike ma ọ bụ ịchịisi. Mgbe Josef ghọrọ onye nlekọta nri nke Ijipt, Fero gụrụ ya Zafenat-pania.—Jenesis 41:44, 45; tụlee 2 Ndị Eze 23:34; 24:17.
12, 13. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịgbanwe aha ndị Hibru a na-eto eto bụ mgbalị e mere iji mebie okwukwe ha?
12 N’ihe banyere Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru, mgbanwe aha ha dị ịrịba ama. Aha ndị mụrụ ha nyere ha kwekọrọ n’ofufe Jehova. “Daniel” pụtara “Chineke Bụ Onyeikpe M.” “Hananaịa” pụtara “Jehova Egosiwo Ihu Ọma.” Ikekwe “Mishael” pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?” “Azaraịa” pụtara “Jehova Enyewo Aka.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị mụrụ ha nwere olileanya siri ike na ụmụ ha ga-etolite n’okpuru nduzi Jehova Chineke ịghọ ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ma na-eguzosi ike n’ihe.
13 Otú ọ dị, aha ọhụrụ ahụ e nyere ndị Hibru anọ a nwechara njikọ chiri anya n’ebe chi ụgha dị iche iche dị, na-atụ aro na chi ndị dị otú ahụ emeriwo ezi Chineke ahụ. Lee mgbalị aghụghọ nke ahụ bụ iji mebie okwukwe nke ndị ntorobịa a!
14. Gịnị ka aha ọhụrụ ahụ a gụrụ Daniel na ndị enyi ya atọ pụtara?
14 A gbanwere aha Daniel ịbụ Belteshaza, nke pụtara “Chebe Ndụ Eze.” Dị ka ihe àmà na-egosi, nke a bụ ụdị nkwubiri nke arịrịọ nye Bel, ma ọ bụ Marduk, chi bụ́ isi nke Babilọn. Ma Nebukadneza o tinyere aka n’ịhọta aha a maka Daniel ma ọ bụ na o tinyeghị, obi dị ya ụtọ ikweta na ọ bụ “dị ka aha chi [ya] si dị.” (Daniel 4:8) A gụgharịrị Hananaịa Shedrak, bụ́ nke akwụkwọ ụfọdụ kwenyere na ọ bụ aha nke ọtụtụ okwu mejupụtara bụ́ nke pụtara “Iwu nke Aku.” N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Aku bụ aha nke chi ndị Sumer. A gụgharịrị Mishael Mishak (ikekwe, Mi·sha·aku), nke ihe àmà na-egosi na ọ bụ nhịgharị e ji akọ hịgharịa “Ònye Dị Ka Chineke?” ịbụ “Ònye Bụ Ihe Aku Bụ?” Aha Babilọn e nyere Azaraịa bụ Abednego, nke pụtara “Ohu Nego” ma eleghị anya. “Nego” bụkwa ụdị ọzọ nke “Nebo,” aha chi nke a gụkwara ọtụtụ ndị ọchịchị Babilọn.
NDỊ KPEBISIRI IKE ỊNỌGIDE NA-EKWESỊ NTỤKWASỊ OBI NYE JEHOVA
15, 16. Ihe ize ndụ ndị dị aṅaa chere Daniel na ndị enyi ya ihu ugbu a, gịnịkwa bụ mmeghachi omume ha?
15 Aha Babilọn ndị ahụ, usoro nzigharị ihe ahụ, na ihe oriri ahụ pụrụ iche—ihe a nile bụ mgbalị ọ bụghị nanị iji mee ka Daniel na ụmụ okoro Hibru atọ ahụ kwekọọ n’ụzọ ndụ Babilọn kamakwa iji kewapụ ha n’ebe Chineke nke ha, bụ́ Jehova nọ, nakwa ná nzụlite na ọzụzụ okpukpe ha. N’ịbụ ndị nrụgide na ọnwụnwa a nile chere ihu, olee ihe ụmụ okoro a ga-eme?
16 Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Daniel wee tinye nke a n’obi ya na ọ gaghị ewere ihe oriri ọma eze ma ọ bụ mmanya vine ọ na-aṅụ mee onwe ya ka ọ ghara ịdị nsọ.” (Daniel 1:8a) Ọ bụ ezie na Daniel bụ nanị onye a kpọtụrụ aha, ihe sochirinụ na-egosi na ndị enyi ya atọ kwadoro mkpebi ya. Okwu bụ́ “tinye nke a n’obi ya” na-egosi na ọzụzụ nne na nna Daniel na ndị ọzọ nyere ya n’ụlọ eruwo n’obi ya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọzụzụ yiri nke ahụ duziri ndị Hibru atọ ndị ọzọ n’ime mkpebi ha. Nke a na-egosi nnọọ uru nke ịkụziri ụmụ anyị ihe, ọbụna mgbe ha pụrụ iyi ndị dị nnọọ obere gabiga ókè ịghọta ihe.—Ilu 22:6; 2 Timoti 3:14, 15.
17. N’ihi gịnị ka Daniel na ndị enyi ya ji jụ nanị ihe oriri eze na-enye kwa ụbọchị n’ajụghị ndokwa ndị ọzọ?
17 N’ihi gịnị ka ndị Hibru ahụ na-eto eto ji jụ nanị nri ọma na mmanya ahụ ma ghara ịjụ ndokwa ndị ọzọ? Ntụgharị uche Daniel na-egosi n’ụzọ doro anya ihe kpatara nke ahụ: ‘Ọ gaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị nsọ.’ Ịmụ “akwụkwọ na asụsụ nke ndị Kaldea” na ịbụ ndị a gụrụ aha ndị Babilọn, ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mma, agachaghị eme ka mmadụ ghara ịdị nsọ. Tụlee ihe atụ nke Mosis, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,000 afọ tupu mgbe ahụ. Ọ bụ ezie na ‘e ziri ya ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt,’ ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova. Ọzụzụ ndị mụrụ ya nyere ya mere ka o nwee ntọala siri ike. N’ihi ya, “mgbe Mosis toruru mmadụ, ọ bụ okwukwe ka o ji jụ ka a kpọọ ya nwa nwoke nke nwa nwanyị Fero; n’ihi na ọ họọrọ ka e mejọkọọ ya na ndị nke Chineke, kama inwe ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge.”—Ọrụ 7:22; Ndị Hibru 11:24, 25.
18. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka nri eze ga-esi mee ka ndị Hibru ahụ na-eto eto ghara ịdị nsọ?
18 N’ụzọ dị aṅaa ka ihe oriri eze Babilọn ga-esi mee ka ụmụ okorobịa ahụ ghara ịdị nsọ? Nke mbụ, nri ọma ndị ahụ nwere ike ịgụnyeworị nri ndị Iwu Mosis machibidoro. Dị ka ihe atụ, ndị Babilọn riri ụmụ anụ na-adịghị ọcha, ndị a machibidooro ụmụ Israel n’okpuru Iwu. (Levitikọs 11:1-31; 20:24-26; Deuterọnọmi 14:3-20) Nke abụọ, ndị Babilọn adịghị agbapụ ọbara nke ụmụ anụ ndị a na-egbu egbu tupu ha erie anụ ha. Iri anụ a na-agbapụghị ọbara ga-abụ kpọmkwem imebi iwu Jehova banyere ọbara. (Jenesis 9:1, 3, 4; Levitikọs 17:10-12; Deuterọnọmi 12:23-25) Nke atọ, ọ na-abụkarị omenala ndị na-efe chi ụgha iche nri ha n’ihu arụsị tupu ha eriwe ya dị ka nri e rikọrọ ọnụ. Ndị ohu Jehova agaghị etinye onwe ha n’ihe ndị ahụ! (Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:20-22.) N’ikpeazụ, iribiga nri mara abụba ókè na ịṅụ oké mmanya kwa ụbọchị agaghị abụtụ ihe na-akwalite ahụ ike nye onye ọ bụla, ka ọ fọdụzie ndị na-eto eto.
19. Olee otú ndị ntorobịa ahụ bụ́ ndị Hibru pụrụ isiworị gọpụ onwe ha, ma gịnị nyeere ha aka ịbịa ná nkwubi okwu ziri ezi?
19 Ọ bụ otu ihe ịmara ihe ị ga-eme, ma ọ bụ nnọọ ihe ọzọ inwe obi ike ime ya mgbe ị nọ ná nrụgide ma ọ bụ ọnwụnwa. Daniel na ndị enyi ya atọ pụrụ icheworị na ebe ọ bụ na ha nọ ebe dị anya n’ebe nne na nna ha na ndị enyi ha nọ, ndị dị otú ahụ agaghị ama ihe ha mere. Ha pụkwara ịgọpụ onwe ha na ọ bụ iwu eze nakwa na o yiri ka ha enweghị nhọrọ ọzọ. E wezụga nke ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị na-eto eto ndị ọzọ nakweere ndokwa ahụ ozugbo ma were ya dị ka ihe ùgwù kama ịbụ ihe siri ike ikere òkè na ya. Ma ụdị echiche ahụ hiere ụzọ pụrụ n’ụzọ dị mfe iduje n’ọnyà nke mmehie zoro ezo, nke bụụrụ ọtụtụ ndị na-eto eto ọnyà. Ndị ntorobịa ahụ bụ́ ndị Hibru maara na “n’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị” nakwa na “ọrụ ọ bụla ka Chineke ga-eme ka ọ baa n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ.” (Ilu 15:3; Eklisiastis 12:14) Ka anyị nile mụta ihe site n’omume nke ndị a na-eto eto kwesịrị ntụkwasị obi.
OBI IKE NA NNỌGIDESI IKE WETARA ỤGWỌ ỌRỤ
20, 21. Gịnị ka Daniel mere, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
20 N’ịbụ onye kpebisiworo ike n’obi ya iguzogide mmetụta ndị na-emetọ emetọ, Daniel gara n’ihu ime ihe kwekọrọ ná mkpebi ya. “O wee [nọgide na-arịọ, NW ] onyeisi ndị ọnaozi ka ọ ghara ime onwe ya onye na-adịghị nsọ.” (Daniel 1:8b) “Nọgide na-arịọ”—nke ahụ bụ okwu kwesịrị ịrịba ama. Ọtụtụ mgbe, ịnọgidesi ike dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị nwere olileanya inwe ihe ịga nke ọma n’iguzogide ọnwụnwa ma ọ bụ imeri ụfọdụ adịghị ike.—Ndị Galetia 6:9.
21 N’ọnọdụ Daniel, nnọgidesi ike rụpụtara ezi ihe. “Chineke wee nye Daniel ka e nwee ebere na obi ebere nile n’ahụ ya n’ihu onyeisi ndị ọnaozi.” (Daniel 1:9) Ọ bụghị n’ihi na Daniel na ndị enyi ya bụ ndị mara mma na ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ mere ihe jiri gaziere ha n’ikpeazụ. Kama nke ahụ, ọ bụ n’ihi ngọzi Jehova. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Daniel chetara ilu Hibru bụ́: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” (Ilu 3:5, 6) Ịgbaso ndụmọdụ ahụ wetara ụgwọ ọrụ n’ezie.
22. Olee arụmụka ezi uche dị na ha nke onyeisi ndị ọnaozi ahụ welitere?
22 Na mbụ, onyeisi ndị ọnaozi ahụ jụrụ ajụ, sị: “Mụ onwe m na-atụ egwu onyenwe m, bụ́ eze, onye kepụtaworo ihe oriri unu na ihe ọṅụṅụ unu: n’ihi na ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka ọ ga-ahụ ihu unu ka ha gbarụrụ karịa ihu ụmụ okoro ndị ọgbọ unu? unu ewee mee ka eze nara isi m ná nhá?” (Daniel 1:10) Ihe ndị a bụ ọjụjụ na ịtụ egwu ezi uche dị na ha. Eze Nebukadneza abụghị onye a ga-enupụrụ isi, onye ọrụ ya ahụ ghọtakwara na “isi” ya ga-anọ n’ihe ize ndụ ma ọ bụrụ na o meghị ihe eze tụziri ka e mee. Gịnị ka Daniel ga-eme?
23. Site n’ihe o mere, olee otú Daniel si gosi nghọta na amamihe?
23 Ebe a bụ ebe nghọta na amamihe batara n’ọrụ. Ikekwe Daniel ka na-eto eto chetara ilu ahụ bụ́: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ: ma okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Kama ịgba isi akwara na a ga-emerịrị ihe ọ rịọrọ nakwa eleghị anya na-akpali ndị ọzọ igbu ya n’ihi ihe o kwere, Daniel hapụrụ okwu ahụ. N’oge kwesịrị ekwesị, ọ gakwuuru “onye nlekọta,” bụ́ onye dị njikere karị ma eleghị anya inyetụ ohere n’ihi na ọ gaghị aza eze ajụjụ kpọmkwem.—Daniel 1:11.
A TỤỌ ARO ỤBỌCHỊ IRI NKE ULE
24. Olee ule Daniel tụrụ aro ya?
24 Daniel tụụrụ onye nlekọta ahụ aro ka e nwee ule, na-asị: “Biko, na-anwa ndị ohu gị ụbọchị iri; ka ha nyekwa anyị akụ́kụ́ ụfọdụ, anyị ewee rie, ka ha nyekwa anyị mmiri, anyị ewee ṅụọ. Ka a hụkwa otú anyị dị n’ihu gị n’ile anyị anya, na otú ụmụ okoro ndị na-eri ihe oriri ọma eze dị n’ile ha anya; ma dị ka i si hụ, mesoo ndị ohu gị otú a.”—Daniel 1:12, 13.
25. Olee ihe nwere ike iso ‘n’akụ́kụ́’ e nyere Daniel na ndị enyi ya atọ?
25 E nye ha ‘akụ́kụ́ na mmiri’ ụbọchị iri—ihu ha ọ̀ ‘ga-agbarụ agbarụ’ ma e jiri ha tụnyere ndị nke ọzọ? A sụgharịtara “akụ́kụ́” site n’okwu Hibru pụtara n’ụzọ bụ isi “mkpụrụ ihe ọkụkụ.” A kọwara nsụgharị a bụ “akụ́kụ́” dị ka “mkpụrụ a na-eri eri nke ihe ọkụkụ dị iche iche na-amị n’ala (dị ka ahụekere, àgwà, ma ọ bụ lentil).” Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-eche na ihe gbara ya gburugburu na-egosi nri gụnyere ihe karịrị nanị ihe ọkụkụ a na-eri eri. Otu akwụkwọ e ji eme nchọpụta na-asị: “Ihe Daniel na ndị enyi ya na-arịọ bụ nanị akụ́kụ́ nke ọha mmadụ na-eri kama ịbụ nke nri mara abụba karị, nke jupụtara n’anụ nke tebụl ndị eze.” N’ihi ya, akụ́kụ́ pụrụ ịgụnyeworị nri ndị na-emezi ahụ e ji àgwà, cucumber, garlic, leek, lentil, egusi, na yabasị sie na bred e ji mkpụrụ akụ́kụ́ dị iche iche mee. N’ezie ọ dịghị onye ga-ewere nke ahụ dị ka nri ịkwụ agụụ. Dị ka ihe àmà na-egosi onye nlekọta ahụ ghọtara ihe ọ na-ekwu. “O wee gee ha ntị n’okwu a, wee nwaa ha ụbọchị iri.” (Daniel 1:14) Gịnị si na ya pụta?
26. Gịnị si n’ụbọchị iri nke ule ahụ pụta, n’ihi gịnịkwa ka ihe ji dapụta otú ahụ?
26 “N’ọgwụgwụ ụbọchị iri e wee hụ na ha dị mma n’ile ha anya, ha makwara abụba n’anụ ahụ, karịa ụmụ okoro ahụ nile ndị na-eri ihe oriri ọma eze.” (Daniel 1:15) A gaghị ewere nke a dị ka ihe àmà na iri nanị akụ́kụ́ dị mma karịa nri mara abụba nke jupụtara n’anụ. Ụbọchị iri bụ oge dị mkpirikpi ka ụdị nri ọ bụla rụpụta ihe ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ, ma ọ dịghị oké mkpirikpi nye Jehova imezu nzube ya. “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute,” ka Okwu ya na-asị. (Ilu 10:22) Ụmụ okorobịa anọ ahụ bụ́ ndị Hibru nwere okwukwe na ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ, ọ gbahapụghịkwa ha. Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Jisọs Kraịst nọgidere ndụ n’erighị nri ruo ụbọchị 40. N’akụkụ nke a, o hotara okwu ndị dị na Deuterọnọmi 8:3, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.” Banyere nke a, ahụmahụ nke Daniel na ndị enyi ya bụ ihe nlereanya magburu onwe ya.
NGHỌTA NA AMAMIHE N’ỌNỌDỤ NRI ỌMA NA MMANYA
27, 28. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka nri Daniel na ndị enyi ya atọ riri ji bụrụ nkwadebe maka ihe ndị ka ukwuu na-abịa n’ihu?
27 Ụbọchị iri ahụ bụ nanị ule, ma ihe ọ rụpụtara na-eju nnọọ afọ. “Onye nlekọta ahụ wee na-ewepụ ihe oriri ọma ha na mmanya vine ha ga na-aṅụ, o wee na-enye ha akụ́kụ́.” (Daniel 1:16) O sighị ike iche n’echiche ihe ndị ntorobịa ndị ọzọ nọ n’usoro ọzụzụ ahụ chere banyere Daniel na ndị enyi ya. Ịjụ nri mara abụba nke eze ma na-eri akụ́kụ́ kwa ụbọchị aghaghị iyiworị ezigbo ihe nzuzu nye ha. Ma oké ule na ọnwụnwa na-abịa nso, ndị ga-achọkwa ịmụ anya na uche zuru okè nile nke ụmụ okorobịa a bụ́ ndị Hibru pụrụ inweta. Nke ka nke, ọ bụ okwukwe ha na ntụkwasị obi ha n’ebe Jehova nọ ga-eme ka ha gabiga ule nke okwukwe ha.—Tụlee Joshua 1:7.
28 A pụrụ ịhụ ihe àmà nke na-egosi na Jehova nọnyeere ụmụ okorobịa a n’ihe ọzọ e kwuru: “Ụmụ okoro anọ ndị a, Chineke nyere ha ọmụma ihe na uche n’akwụkwọ na amamihe nile: Daniel ghọtakwara ọhụụ na nrọ nile.” (Daniel 1:17) Iji nagide oge siri ike ndị na-abịanụ, ihe karịrị ike ọkpụkpụ aka na ezi ahụ ike dị ha mkpa. “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; ìzùzù ga na-eche gị nche: nghọta ga-echebe gị: ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ.” (Ilu 2:10-12) Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Jehova nyere ndị ntorobịa anọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi iji kwadebe ha maka ihe na-abịa n’ihu.
29. N’ihi gịnị ka Daniel ji nwee ike ‘ịghọta ọhụụ na nrọ nile’?
29 E kwuru na Daniel “ghọtakwara ọhụụ na nrọ nile.” Nke a abụghị n’echiche nke na ọ ghọwo onye nwere ike nghọta karịrị uche mmadụ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ọ bụ ezie na e weere Daniel dị ka otu n’ime ndị amụma ukwu bụ́ ndị Hibru, ọ dịghị mgbe e nyere ya ike mmụọ nsọ ikwu okwu ndị dị ka “otú a ka Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, sịrị” ma ọ bụ “otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Aịsaịa 28:16; Jeremaịa 6:9) Ma, ọ bụ nanị site ná nduzi nke mmụọ nsọ Chineke ka Daniel nwere ike ịghọta na ịkọwa ọhụụ na nrọ ndị kpughere nzube Jehova.
N’IKPEAZỤ, ULE AHỤ DỊ MKPA
30, 31. Olee otú ụzọ Daniel na ndị enyi ya họọrọ si baara ha uru?
30 Afọ atọ ahụ nke nzigharị ihe na inye ọzụzụ bịara ná njedebe. Ule ahụ dị mkpa sochiri—eze ịgba ha ajụjụ ọnụ n’otu n’otu. “N’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a nke eze sịrị ka e mee ka ha bata, onyeisi ndị ọnaọzi wee mee ka ha bata n’ihu Nebukadneza.” (Daniel 1:18) Oge eruola ka ndị ntorobịa anọ ahụ gosi ihe ha bụ. Ịraparasi ike n’iwu Jehova kama ịnakwere omume ndị Babilọn ọ̀ ga-abara ha uru?
31 “Eze wee kpanyere ha ụka; ma a hụghị n’etiti ha nile onye ọ bụla dị ka Daniel na Hananaịa na Mishael na Azaraịa: ha wee guzo n’ihu eze.” (Daniel 1:19) Lee mwepụ n’ụta zuru ezu ọ bụ nye ihe ha mere n’afọ atọ gara aga! Ọ bụghị ara ọgbụgba n’akụkụ ha ịrapara ná nri nke okwukwe na akọ na uche ha tụziiri ha. Site n’ikwesị ntụkwasị obi n’ihe pụrụ iyi ihe dịkarịsịrị nta, e ji ihe ndị ka ukwuu gọzie Daniel na ndị enyi ya. Ihe ùgwù nke ‘iguzo n’ihu eze’ bụ ihe mgbaru ọsọ nke ndị na-eto eto nile so n’usoro ọzụzụ ahụ na-achụso. Ma ndị ntorobịa anọ ahụ bụ́ ndị Hibru hà bụ nanị ndị a họọrọ, Bible ekwughị. Ka o sina dị, ụzọ ikwesị ntụkwasị obi ha wetaara ha “ụgwọ ọrụ dị ukwuu” n’ezie.—Abụ Ọma 19:11, NW.
32. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Daniel, Hananaịa, Mishael, na Azaraịa nwetara ihe ùgwù karịrị nke ịnọ n’obí eze?
32 “Ị̀ hụwo mmadụ nke na-eme ngwa n’ije ozi ya? n’ihu ndị eze ka ọ ga-eguzo onwe ya,” ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. (Ilu 22:29) N’ihi ya, Nebukadneza họọrọ Daniel, Hananaịa, Mishael, na Azaraịa iguzo n’ihu eze, ya bụ, iso n’òtù ndị ọchịchị nke eze. N’ihe ndị a nile, anyị pụrụ ịhụ aka Jehova ka ọ na-eduzi ihe ka e wee site n’aka ụmụ okorobịa a—karịsịa site n’aka Daniel—mee ka a mara akụkụ ndị dị mkpa nke nzube Chineke. Ọ bụ ezie na ịbụ ndị a họọrọ iso n’òtù ndị ọchịchị nke Nebukadneza bụ ihe ùgwù, ọ bụ ihe ùgwù ka nnọọ ukwuu ịbụ ndị Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova, ji mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ dị egwu.
33, 34. (a) N’ihi gịnị ka obi ji dị eze ụtọ banyere ndị Hibru a na-eto eto? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ ndị Hibru anọ ahụ?
33 O teghị anya Nebukadneza chọpụtara na amamihe na nghọta nke Jehova nyere ndị ntorobịa anọ a bụ́ ndị Hibru karịrị nnọọ nke ndị ndụmọdụ na ndị amamihe nile nọ n’òtù ndị ọchịchị. “N’okwu ọ bụla nke amamihe nke nghọta, nke eze chọrọ n’aka ha, ọ hụrụ na ha ka ndị odeakwụkwọ dị nsọ nile na ndị dibịa nile ndị nọ n’alaeze ya nile mma ugbo iri.” (Daniel 1:20) Ò nwere ihe mere ọ na-agaghị eji dị otú ahụ? “Ndị odeakwụkwọ dị nsọ” na “ndị dibịa” dabeere ná mmụta ụwa na nke nkwenkwe ụgha Babilọn, ebe Daniel na ndị enyi ya tụkwasịrị obi ha n’amamihe sitere n’elu. A pụghị nnọọ iji ha tụnyere ha—a naghị agbagha ya agbagha!
34 Ihe agbanwebeghị nke ukwuu n’ezie kemgbe afọ ndị a nile. Na narị afọ mbụ O.A., mgbe nkà ihe ọmụma ndị Gris na iwu ndị Rom na-ewu ewu, e nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “Amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ. N’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onye na-ejide ndị maara ihe n’aghụghọ ha: ọzọkwa, Onyenwe anyị maara ihe ndị maara ihe na-atụle n’obi ha, na ha bụ ihe efu. Ya mere onye ọ bụla anyala isi na mmadụ.” (1 Ndị Kọrint 3:19-21) Taa, ọ dị anyị mkpa ijidesi ihe Jehova kụziwooro anyị ike, ghara ịbụ ndị ịma mma na mgbukepụ nke ụwa dọpụrụ uche ha n’ụzọ dị mfe.—1 Jọn 2:15-17.
IKWESỊ NTỤKWASỊ OBI RUO ỌGWỤGWỤ
35. Ihe ha aṅaa ka a gwara anyị banyere ndị enyi Daniel atọ?
35 E gosiri okwukwe siri ike nke Hananaịa, Mishael, na Azaraịa n’ụzọ dị ịrịba ama na Daniel isi nke 3, n’ihe banyere ihe onyinyo ọlaedo Nebukadneza dị na ndagwurugwu Dura na ule nke ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu. Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na ndị Hibru a na-atụ egwu Chineke nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ruo ọnwụ ha. Anyị maara nke a n’ihi na o doro anya na Pọl onyeozi zoro aka n’ebe ha nọ mgbe o dere banyere ndị “sitere n’okwukwe . . . menyụọ ike ọkụ.” (Ndị Hibru 11:33, 34) Ha bụ ihe nlereanya dị ịrịba ama nye ndị ohu Jehova, ma ụmụaka ma ndị agadi.
36. Olee ọrụ dị ịrịba ama Daniel nwere?
36 Banyere Daniel 1:21, amaokwu ikpeazụ nke isi 1 na-asị: “Daniel wee nọgide ruo afọ mbụ nke Saịrọs, bụ́ eze.” Akụkọ ihe mere eme na-ekpughe na Saịrọs kwaturu Babilọn n’otu abalị, na 539 T.O.A. Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ihi aha ọma na ọdịdị ya, Daniel nọgidere na-eje ozi n’obí eze Saịrọs. N’ezie, Daniel 10:1 na-agwa anyị na “n’afọ nke atọ nke Saịrọs, bụ́ eze Peasia,” Jehova kpugheere Daniel otu ihe kwesịrị ịrịba ama. Ọ bụrụ na ọ bụ onye nọ n’afọ iri na ụma mgbe a kpọtara ya Babilọn na 617 T.O.A., ọ ga-afọ nke nta ka ọ gbaa 100 afọ mgbe ọ natara ọhụụ ikpeazụ ahụ. Lee ọrụ dị ogologo, nke a gọziri agọzi, nke ije ozi ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova ọ bụ!
37. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ịtụle Daniel isi 1?
37 Isi mbụ nke akwụkwọ Daniel na-agwa anyị ọ bụghị nanị banyere ndị ntorobịa anọ kwesịrị ntụkwasị obi nwere ihe ịga nke ọma n’izute ule nke okwukwe. Ọ na-egosi anyị otú Jehova pụrụ isi jiri onye ọ bụla masịrị ya mezuo nzube ya. Ihe ndekọ ahụ na-egosi na ọ bụrụ na Jehova ekwe, ihe pụrụ iyi ọdachi pụrụ ịba ezigbo uru. Ọ na-agwakwa anyị na ikwesị ntụkwasị obi n’ihe ndị dị nta na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere nzụlite Daniel na ndị enyi ya atọ na-eto eto?
• Olee otú e si tinye nzụlite mara mma nke ndị ntorobịa anọ ahụ bụ́ ndị Hibru n’ule na Babilọn?
• Olee otú Jehova si nye ndị Hibru anọ ahụ ụgwọ ọrụ maka nguzo obi ike ha?
• Olee ihe ndị ohu Jehova nke oge a pụrụ ịmụta site n’aka Daniel na ndị enyi ya atọ?
[Foto dị na peeji nke nke 30]