Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 9 p. 15
  • Olee Ndị Bụ Ndị Enyi Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Bụ Ndị Enyi Chineke?
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọtụtụ Nde Ndị Mmụọ E Kere Eke
    Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ụmụ Mmadụ Hà Na-aghọ Ndị Mmụọ Ozi Ma Ha Nwụọ?
    Teta!—2006
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 9 p. 15

IHE ỌMỤMỤ NKE 9

Olee Ndị Bụ Ndị Enyi Chineke?

Ebe Jizọs Kraịst bụ Eze nke Alaeze Chineke, ndị mmụọ ozi na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma

Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Jehova na onye kasị bụrụ enyi ya, nke ọ hụkarịsịrị n’anya. Tupu o bie ndụ n’elu ala dị ka mmadụ, Jisọs biri ndụ n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke nke dị ike. (Jọn 17:5) Ọ bịaziri n’ụwa ịkụziri ndị mmadụ ihe bụ eziokwu banyere Chineke. (Jọn 18:37) O nyekwara ndụ ya dị ka mmadụ iji zọpụta ụmụ mmadụ na-erube isi pụọ ná mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 6:23) Ugbu a Jisọs bụ Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ ọchịchị eluigwe nke ga-eweta Paradaịs n’ụwa a.—Mkpughe 19:16.

Ndị mmụọ ozi bụkwa ndị enyi Chineke. Ndị mmụọ ozi amaliteghị ndụ ha n’elu ala dị ka ụmụ mmadụ. E kere ha n’eluigwe tupu Chineke ekee ụwa. (Job 38:4-7) E nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi. (Daniel 7:10) Ndị enyi Chineke ndị a nọ n’eluigwe chọrọ ka ndị mmadụ mụta ihe bụ eziokwu banyere Jehova.—Mkpughe 14:6, 7.

Ebe Ndịàmà Jehova abụọ na-ezi otu nwaanyị ozi ọma

Chineke nwekwara ndị enyi n’ụwa; ọ na-akpọ ha ndị àmà ya. Onye àmà n’ụlọikpe na-ekwu ihe ọ maara banyere mmadụ ma ọ bụ otu ihe. Ndịàmà Jehova na-agwa ndị ọzọ ihe ha maara banyere Jehova na nzube ya. (Aịsaịa 43:10) Dị ka ndị mmụọ ozi, Ndịàmà chọrọ inyere gị aka ịmụta ihe bụ eziokwu banyere Jehova. Ha chọrọ ka gị onwe gị kwa bụrụ enyi Chineke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya