Isi nke iri
“Mgbe Ihe Mmadụ Na-atọ M Ụtọ”
1, 2. (a) Ngọzi dị aṅaa ka Aịsaịa nwetara? (b) Olee ndị so n’okwu amụma ndị ahụ e dekọrọ n’akụkụ nke mbụ nke Aịsaịa isi 49?
ỤMỤ mmadụ nile kwesịrị ntụkwasị obi anọwo na-enwe nnwapụta na nchebe Chineke eri ogologo oge. Ma ọ bụghị nnọọ onye ọ bụla ka ihe ya na-atọ Jehova ụtọ. Mmadụ aghaghị iru eru iji nweta ngọzi dị otú ahụ nke na-enweghị atụ. Aịsaịa bụ otu onye nke ruru eru. O nwetara ihu ọma Chineke, Jehova jikwa ya mee ihe dị ka ngwá ọrụ iji mee ka ndị ọzọ mara uche Ya. E dekọrọ otu ihe atụ banyere nke a n’akụkụ mbụ nke isi 49 n’amụma Aịsaịa.
2 Ọ bụ mkpụrụ Abraham ka a gwara okwu ndị a n’ụzọ amụma. Ná mmezu mbụ ya, ọ bụ mba Israel, bụ́ nke sitere n’Abraham bụ mkpụrụ ahụ. Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime okwu ndị e jiri mee ihe na-emetụta n’ụzọ doro anya, Mkpụrụ Abraham ahụ a nọworo na-atụ anya ya eri ogologo oge, bụ́ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-emetụtakwa ụmụnna ime mmụọ nke Mesaịa ahụ, bụ́ ndị ghọrọ akụkụ nke mkpụrụ ime mmụọ nke Abraham nakwa nke “Israel nke Chineke.” (Ndị Galetia 3:7, 16, 29; 6:16) Karịsịa, akụkụ a nke amụma Aịsaịa na-akọwa mmekọrịta pụrụ iche nke dị n’etiti Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Aịsaịa 49:26.
Onye Jehova Họpụtara, Chebekwa
3, 4. (a) Nkwado dị aṅaa ka Mesaịa ahụ nwere? (b) Ole ndị ka Mesaịa ahụ na-agwa okwu?
3 Ihe Mesaịa ahụ na-atọ Chineke ụtọ, ma ọ bụ o nwere nnwapụta Ya. Jehova nyere ya ikike na ihe ndị dị mkpa ga-eme ka o ruo eruo irụzu ọrụ ya. N’ụzọ kwesịziri ekwesị, onye ahụ ga-abụ Mesaịa n’ọdịnihu na-ekwu, sị: “Geenụ m ntị, unu àgwàetiti; ṅaakwanụ ntị, unu ndị dị iche iche, site n’ebe dị anya: Jehova esitewo na mgbe m nọ n’afọ kpọọ m; site na mgbe m nọ n’afọ nne m ka O hotaworo aha m.”—Aịsaịa 49:1.
4 N’ebe a, ọ bụ ndị si “n’ebe dị anya” ka Mesaịa ahụ na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị Juu ka e kwere nkwa inye Mesaịa ahụ, ozi ọ ga-eje ga-abụ ihe ngọzi nye mba nile. (Matiu 25:31-33) “Àgwàetiti” na “ndị dị iche iche,” ọ bụ ezie na ha na Jehova anọghị n’ọgbụgba ndụ, kwesịrị ịṅa Mesaịa nke Israel ntị n’ihi na e zitere ya iji wetara ihe nile a kpọrọ mmadụ nzọpụta.
5. Gịnị ka a kpọrọ Mesaịa ahụ ọbụna tupu a mụọ ya dị ka mmadụ?
5 Amụma ahụ na-ekwu na Jehova ga-ekwu aha Mesaịa ahụ tupu a mụọ ya dị ka mmadụ. (Matiu 1:21; Luk 1:31) Ogologo oge tupu a mụọ ya, a kpọrọ Jisọs “Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke Nke bụ́ Dike, Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo.” (Aịsaịa 9:6) Immanuel, nke bụ́ aha nwa nwoke Aịsaịa ma eleghị anya, mesịkwara bụrụ aha amụma e nyere Mesaịa ahụ. (Aịsaịa 7:14; Matiu 1:21-23) E buru ọbụna aha e kwuru a ga-eji mara Mesaịa ahụ—Jisọs—n’amụma tupu a mụọ ya. (Luk 1:30, 31) Aha a sitere n’okwu Hibru nke pụtara, “Jehova Bụ Nzọpụta.” N’ụzọ doro anya, Jisọs abụghị onye ji aka ya họpụta onwe ya ịbụ Kraịst.
6. N’ụzọ dị aṅaa ka ọnụ Mesaịa ahụ si dị ka mma agha dị nkọ, oleekwa otú e si zobe ya?
6 Okwu amụma nke Mesaịa ahụ gara n’ihu, sị: “O wee mee ka ọnụ m dị ka mma agha dị nkọ, na ndo aka Ya ka O zobeworo m; O wee mee ka m ghọọ akụ́ na-egbu àmụ̀mà, n’akpa akụ́ Ya ka O zobeworo m.” (Aịsaịa 49:2) Mgbe oge ruru ka Mesaịa nke Jehova malite ozi elu ala ya na 29 O.A., ihe ndị Jisọs kwuru na ihe ndị o mere dị n’ezie ka ngwá agha dị nkọ, nke na-egbu àmụ̀mà, nke nwere ikike ịba n’obi nke ndị na-ege ya ntị. (Luk 4:31, 32) Ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere kpasuru onye iro ukwu nke Jehova, bụ́ Setan, na ndị ọrụ ya iwe. Malite n’oge a mụrụ Jisọs, Setan nwara igbu Ya, ma Jisọs yiri akụ́ nke e zobere n’akpa akụ́ Jehova.a Ọ pụrụ iji obi ike tụọ anya nchebe nke Nna ya. (Abụ Ọma 91:1; Luk 1:35) N’oge a kara aka, Jisọs nyere ndụ ya n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. Ma oge ga-eru mgbe ọ ga-aga dị ka dike dị ike nke eluigwe, onye ji n’echiche dị iche, mma agha dị nkọ nke si n’ọnụ ya na-apụta. N’oge a, mma agha ahụ dị nkọ na-anọchi anya ikike Jisọs nwere ịma ndị iro Jehova ikpe na imezu ihe e kpere n’ikpe megide ha.—Mkpughe 1:16.
Ndọgbu Ndị Ohu Chineke Na-adọgbu Onwe Ha n’Ọrụ Abụghị n’Efu
7. Ònye ka okwu Jehova ndị dị n’Aịsaịa 49:3 mezuru n’ebe ọ nọ, n’ihi gịnịkwa?
7 Ugbu a, Jehova na-ekwu okwu amụma ndị a, sị: “Ohu m ka ị bụ; gị Israel, onye ọ bụ n’ime gị ka M ga-eme Onwe m ka M maa mma.” (Aịsaịa 49:3) Jehova na-ezo aka n’ebe mba Israel nọ dị ka ohu ya. (Aịsaịa 41:8) Ma Jisọs Kraịst bụ Ohu Chineke nke kasịnụ. (Ọrụ 3:13) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị Chineke kere eke nke pụrụ igosipụta ‘ịma mma’ Jehova karịa Jisọs. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ọ bụ Israel ka a kpọrọ aha gwa okwu, okwu ndị a mezuru n’ezie n’ebe Jisọs nọ.—Jọn 14:9; Ndị Kọlọsi 1:15.
8. Olee otú ndị nke Mesaịa ahụ si mesoo ya omume, ma ònye ka Mesaịa ahụ na-elekwasị anya ikpebi ma ò nwere ihe ịga nke ọma?
8 Otú ọ dị, ọ́ bụghị eziokwu na ihe ka ọtụtụ ná ndị nke Jisọs ledara ya anya ma jụ ya? Ee. N’ozuzu ha, mba Israel anakwereghị Jisọs dị ka Ohu Chineke e tere mmanụ. (Jọn 1:11) Ihe nile Jisọs rụzuru mgbe ọ nọ n’elu ala pụrụ iyi ihe na-abachaghị uru na ọbụna ihe na-enweghị isi n’anya ndị ha na ya dịkọrọ ndụ. Mesaịa ahụ zoziri aka n’ihe a yiri ọdịda ọ dara n’ozi ya, sị: “N’efu ka m dọgbuworo onwe m n’ọrụ, n’ihi ihe tọgbọrọ n’efu na otu nku ume ka m meworo ka ike m gwụsịa.” (Aịsaịa 49:4a) E kwughị ihe ndị a n’ihi na Mesaịa ahụ nwere nkụda mmụọ. Tụlee ihe ọzọ o kwuru: “N’ezie ikpe m dị n’aka Jehova, ụgwọ ọrụ m dịkwa n’aka Chineke m.” (Aịsaịa 49:4b ) Ọ bụghị mmadụ ga-ekpebi ma Mesaịa ahụ ò nwere ihe ịga nke ọma, kama ọ bụ Chineke.
9, 10. (a) Olee ọrụ Jehova nyere Mesaịa ahụ, oleekwa ihe ndị ọ na-arụpụta? (b) Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi bụrụ ndị a gbara ume site n’ahụmahụ Mesaịa ahụ?
9 Jisọs nwere mmasị karịsịa ná nnwapụta Chineke, ma ọ bụ n’ihe ya ịtọ Ya ụtọ. N’amụma ahụ, Mesaịa na-ekwu, sị: “Ugbu a Jehova sịrị, bụ́ Onye kpụworo m site n’afọ nne m ịbụrụ Ya ohu, ime ka Jekọb laghachikwute Ya, ka e wee chịkọtakwara Ya Israel: (a na-asọpụkwara m n’anya Jehova, Chineke m aghọwo ike m:).” (Aịsaịa 49:5) Mesaịa ahụ bịara iji mee ka obi ụmụ Israel chigharịkwuru Nna ha nke eluigwe. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ekweghị, ma ụfọdụ kwere. Otú ọ dị, nke bụ́ ezigbo ụgwọ ọrụ ya dị n’aka Jehova Chineke. A gaghị atụ ihe ịga nke ọma ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dị ka mmadụ si ele ihe anya kama ọ bụ dị ka ụkpụrụ Jehova si dị.
10 Taa, ọ pụrụ ịdị ụmụazụ Jisọs mgbe ụfọdụ ka hà na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu. N’ebe ụfọdụ, ihe ndị ha na-arụpụta n’ozi ha pụrụ iyi ka ọ dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ọrụ ha na mgbalị ha tinyere. N’agbanyeghi nke ahụ, ha na-atachi obi, bụrụ ndị ihe nlereanya Jisọs gbara ume. A na-ewusikwa ha ike site n’ihe Pọl onyeozi kwuru, bụ́ onye dere, sị: “Ya mere, ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike, bụrụnụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ, ndị na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 15:58.
“Ìhè nke Mba Nile”
11, 12. Olee otú Mesaịa ahụ siworo bụrụ “ìhè nke mba nile”?
11 N’amụma Aịsaịa, Jehova gbara Mesaịa ahụ ume site n’ichetara ya na ịbụ Ohu Chineke abụghị “ihe dị karị mfe.” Jisọs gaje “ime ka ebo nile nke Jekọb bilie, na ime ka ndị Israel e chebere echebe lọta.” Jehova kọwakwara sị: “Enyewokwa m gị ka ị bụrụ ìhè nke mba nile, ịbụ nzọpụta m ruo nsọtụ ụwa.” (Aịsaịa 49:6) Olee otú Jisọs si eme ka ndị mmadụ hụ ìhè “ruo nsọtụ ụwa” ebe ọ bụ nanị n’Israel ka o jere ozi elu ala ya?
12 Ihe ndekọ ahụ nke Bible na-egosi na e menyụghị “ìhè nke mba nile” nke Chineke mgbe Jisọs hapụrụ ụwa. Ihe dị ka afọ 15 mgbe Jisọs nwụsịrị, ndị ozi ala ọzọ bụ́ Pọl na Banabas, hotara amụma ahụ dị n’Aịsaịa 49:6 ma jiri ya mee ihe n’ebe ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ, bụ́ ụmụnna ime mmụọ ya. Ha kọwara, sị: “Otú a ka Onyenwe anyị nyeworo anyị iwu, sị, Edebewo m [Gị] ka Ị bụrụ ìhè nke mba nile, ka I wee dị inye nzọpụta ruo nsọtụ ụwa.” (Ọrụ 13:47) Tupu Pọl anwụọ, ọ hụrụ na ozi ọma nke nzọpụta ahụ rutere, ọ bụghị nanị ndị Juu, kama “ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:6, 23) Taa, ndị fọdụrụ n’ime ụmụnna Kraịst e tere mmanụ na-aga n’ihu n’ọrụ a. N’ịbụ ndị “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ nde na-akwado, ha na-eje ozi dị ka “ìhè nke mba nile” n’ihe karịrị ala 230 gburugburu ụwa.—Mkpughe 7:9.
13, 14. (a) Mesaịa ahụ na ụmụazụ ya enwetawo mmeghachi omume dị aṅaa n’ebe ọrụ nkwusa ahụ dị? (b) Mgbanwe dị aṅaa nke ọnọdụ werewooro ọnọdụ?
13 N’ezie, Jehova aghọwo ike nke na-akwado Ohu ya bụ́ Mesaịa, ụmụnna Mesaịa ahụ bụ́ ndị e tere mmanụ, na ndị nile so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị nọgidere soro ha na-arụ ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ. N’eziokwu, dị ka Jisọs, ndị na-eso ụzọ ya ezutewo nlelị na mmegide. (Jọn 15:20) Ma n’oge nke Jehova, ọ na-eme mgbe nile ka ọnọdụ gbanwee iji napụta ma nye ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe ụgwọ ọrụ. Banyere Mesaịa ahụ, bụ́ “onye mmadụ na-eleda” na “onye bụ́ ihe arụ nke mba nke a,” Jehova na-ekwe nkwa, sị: “Ndị eze ga-ahụ, wee bilie; ndị isi ga-ahụ, wee kpọọ isiala; n’ihi Jehova Nke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Onye Nsọ nke Israel, Nke họpụtaworo gị.”—Aịsaịa 49:7.
14 Ka oge na-aga, Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Filipaị akwụkwọ banyere mgbanwe a e buru n’amụma nke ọnọdụ ga-agbanwe. Ọ kọwara Jisọs dị ka onye e wedara ala n’elu osisi ịta ahụhụ ma bụrụ onye Chineke buliri elu. Jehova nyere Ohu ya ọnọdụ dị “elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala.” (Ndị Filipaị 2:8-11) A dọwo ụmụazụ Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi aka ná ntị na a ga-akpagbukwa ha. Ma dị ka Mesaịa ahụ, obi siri ha ike na ihe ha ga-atọ Jehova ụtọ.—Matiu 5:10-12; 24:9-13; Mak 10:29, 30.
“Oge A Na-anara Mmadụ nke Ọma”
15. Olee “mgbe” pụrụ iche e kwuru okwu ya n’amụma Aịsaịa, gịnịkwa ka nke a na-enye echiche ya?
15 Amụma Aịsaịa gara n’ihu site n’ikwu okwu dị oké mkpa. Jehova gwara Mesaịa ahụ, sị: “Na mgbe ihe mmadụ na-atọ m ụtọ ka M zaworo gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka M nyewooro gị aka: M ga-echebekwa gị, nye gị ka ị bụrụ ọgbụgba ndụ nke ndị m.” (Aịsaịa 49:8a) E dekọrọ amụma yiri ya n’Abụ Ọma 69:13-18. Ọbụ abụ ahụ zoro aka n’oge “mgbe ihe mmadụ na-atọ m ụtọ,” na-eji okwu bụ́ “mgbe ọ na-atọ Gị ụtọ.” Okwu ndị a na-enye echiche bụ́ na ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ọ na-enyekwa nchebe ya n’ụzọ pụrụ iche, ma, ọ bụ nanị n’otu oge kpọmkwem nke na-adịru nwa oge.
16. Olee mgbe bụ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ nye Israel oge ochie?
16 Olee mgbe bụ mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ? Mgbe mbụ e kwuru ha, okwu ndị a so n’amụma mweghachi ma buo amụma banyere nlaghachi nke ndị Juu site n’ala ọzọ. Mba Israel nwere mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ mgbe ha nwere ike “ime ka ala bilie” ma nwetaghachi ‘ihe nketa ha nile tọgbọrọ n’efu.’ (Aịsaịa 49:8b) Ha abụkwaghị “ndị e kere agbụ” na Babilọn. N’oge ha na-ala, Jehova hụrụ na ‘agụụ agụghị ha’ na ‘akpịrị akpọghịkwa ha nkụ,’ ọ dịghịkwa ‘mirage na anyanwụ magburu ha.’ Ndị Israel nọgasị n’ebe dị iche iche nukọọrọ laghachi n’ala nna ha ‘site n’ebe dị anya, site n’Ugwu na n’Ọdịda anyanwụ.’ (Aịsaịa 49:9-12) N’agbanyeghị mmezu mbụ a dị ịrịba ama, Bible na-egosi na amụma a nwere mmezu ndị ọzọ.
17, 18. Olee oge bụ́ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ nke o wepụtara na narị afọ mbụ?
17 Nke mbụ, mgbe a mụrụ Jisọs, ndị mmụọ ozi kpọsara udo na mgbe ihe mmadụ na-atọ Chineke ụtọ, ma ọ bụ ihu ọma n’ebe mmadụ nọ. (Luk 2:13, 14) Ọ bụghị mmadụ nile ka e kwere nkwa na ihe ha ga-atọ ya ụtọ, kama ọ bụ nanị ndị gosiri okwukwe na Jisọs. Ka e mesịrị, Jisọs gụrụ amụma Aịsaịa 61:1, 2 n’ihu ọha ma jiri ya mee ihe n’ebe ya onwe ya nọ dị ka onye na-akpọsa “afọ mgbe Onyenwe anyị na-anara mmadụ nke ọma.” (Luk 4:17-21) Pọl onyeozi kwuru banyere Kraịst dị ka onye Jehova chebere n’ụzọ pụrụ iche n’oge ọ bụ mmadụ. (Ndị Hibru 5:7-9) Ya mere, mgbe a ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ na-ezo aka n’ihu ọma Chineke gosiri Jisọs mgbe ọ dị ndụ dị ka mmadụ.
18 Otú ọ dị, amụma a nwere mmezu ọzọ. Mgbe o hotasịrị ihe Aịsaịa kwuru banyere mgbe ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ, Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.” (2 Ndị Kọrint 6:2) Pọl dere okwu ndị a afọ 22 mgbe Jisọs nwụsịrị. Dị ka ihe àmà gosiri, mgbe e guzobere ọgbakọ ndị Kraịst na Pentikọst 33 O.A., Jehova gbatịkwuru afọ ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ iji gụnye ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ.
19. Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi rite uru n’oge mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ?
19 Olee banyere ụmụazụ Jisọs taa, ndị a na-eteghị mmanụ dị ka ndị nketa nke alaeze eluigwe nke Chineke? Ndị nwere olileanya elu ala, hà pụrụ irite uru n’oge a a na-anara mmadụ nke ọma? Ee. Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-egosi na ugbu a bụ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ n’ihe banyere oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị ga-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta” ịdị ndụ n’ime ụwa paradaịs. (Mkpughe 7:13-17) N’ihi ya, ndị Kraịst nile pụrụ iji oge a a kpaara ókè mee ihe, bụ́ mgbe Jehova kwere ka ihe ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-atọ ya ụtọ.
20. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst pụrụ isi zere ịbụ ndị naara amara Jehova n’efu?
20 Pọl onyeozi bu ụzọ nye ịdọ aka ná ntị tupu o kwupụta banyere oge Jehova na-anara mmadụ nke ọma. Ọ rịọrọ ndị Kraịst ka ha “ghara ịnara amara Chineke n’efu.” (2 Ndị Kọrint 6:1) Ya mere, ndị Kraịst na-eji ohere nile eme ihe na-atọ Chineke ụtọ ma na-eme uche ya. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ha ga-eme nke ọma ịgbaso ndụmọdụ Pọl: “Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma eleghị anya, n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ: kama na-arịọrịtanụ ibe unu arịrịọ kwa ụbọchị, n’ogologo oge a a na-akpọ ya Taa; ka obi onye ọ bụla n’etiti unu ghara ime etili site n’aghụghọ nke mmehie.”—Ndị Hibru 3:12, 13.
21. Okwu dị aṅaa na-enye ọṅụ ka e ji mechie akụkụ nke mbụ nke Aịsaịa isi 49?
21 Ka okwu amụma ndị ahụ Jehova na Mesaịa ya na-ekwurịta bịara ná njedebe, Aịsaịa kwuru okwu na-enye ọṅụ, sị: “Tienụ mkpu ọṅụ, unu eluigwe; tegharịa egwú ọṅụ, gị ụwa; tiwaanụ mkpu ọṅụ, unu ugwu: n’ihi na Jehova akasiwo ndị Ya obi, Ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ndị Ya e wedara n’ala.” (Aịsaịa 49:13) Lee okwu nkasi obi mara mma nke ahụ bụ nye ndị Israel oge ochie na nye Ohu Jehova dị ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, nakwa nye ndị ohu Jehova e tere mmadụ na “atụrụ ọzọ” ahụ bụ́ ndị ibe ha taa!—Jọn 10:16.
Jehova Adịghị Echezọ Ndị Ya
22. Olee otú Jehova si emesi ya ike na ọ dịghị mgbe ya ga-echezọ ndị ya?
22 Aịsaịa gara n’ihu ugbu a ịkọ banyere nkwupụta okwu dị iche iche nke Jehova. O buru amụma na ndị Israel ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ga-enwe ike ọgwụgwụ ma ghara inwe olileanya. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Zaịọn sịrị, Jehova ahapụwo m, Onyenwe anyị echezọwokwa m.” (Aịsaịa 49:14) Nke a ọ̀ bụ eziokwu? Jehova, ọ̀ gbahapụwo ndị ya ma chezọọ ha? N’ije ozi dị ka ọnụ na-ekwuru Jehova, Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Nwanyị, ọ̀ ga-echezọ nwa ya na-aṅụ ara, wee ghara inwe obi ebere n’ahụ nwa afọ ya? ee, eleghị anya ndị a ga-echezọ, ma Mụ onwe m agaghị echezọ gị.” (Aịsaịa 49:15) Lee nzaghachi ịhụnanya Jehova nyere ha! Ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị ya nọ karịrị nke nne na-enwe n’ebe nwa ya nọ. Ọ na-eche echiche mgbe nile banyere ndị ya na-eguzosi ike n’ihe. Ọ na-echeta ha dị ka a ga-asị na a kanyere aha ha n’aka ya: “Lee, n’ọbụ aka m abụọ ka M kaworo gị aka; mgbidi gị nile dị n’ihu m mgbe nile.”—Aịsaịa 49:16.
23. Olee otú Pọl si gbaa ndị Kraịst ume ịtụkwasị Jehova obi na ọ gaghị echezọ ha?
23 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Galetia, Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume, sị: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.” (Ndị Galetia 6:9) O degaara ndị Hibru okwu a na-agba ume, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.” (Ndị Hibru 6:10) Anyị ekwesịghị iche mgbe ọ bụla na Jehova echezọwo ndị ya. Dị ka Zaịọn oge ochie, ndị Kraịst nwere ezi ihe mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ ma jiri ndidi na-echere Jehova. Ọ na-emezu nkwa ya nile nakwa akụkụ nke ya n’ọgbụgba ndụ.
24. N’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi weghachi Zaịọn, ajụjụ dịgasịkwa aṅaa ka ọ ga-ajụ?
24 Jehova, site n’ọnụ Aịsaịa, nyekwuru nkasi obi. Ndị “na-akwada [Zaịọn],” ma hà bụ ndị Babilọn ma hà bụ ndị Juu ahụ si n’ezi ofufe dapụ, abụkwaghị ihe iyi egwu. “Ụmụ” Zaịọn, bụ́ ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova,“emewo ngwa ngwa.” A ‘ga-achịkọta’ ha. Ebe ha meworo ngwa ngwa laghachi Jerusalem, ndị Juu ahụ si mba ọzọ lọta ga-abụrụ isi obodo ha ihe ịchọ mma, dị nnọọ ka e si eyikwasị “nwunye ọhụrụ” “ihe ịchọ mma.” (Aịsaịa 49:17, 18) E mewo ka ebe dị iche iche nke Zaịọn “tọgbọrọ n’efu.” Cheedị ihe ijuanya ọ ga-enwe mgbe ọ ga-enwe na mberede ọtụtụ ndị bi n’ime ya nke na ebe obibi ya ga-eyi ka ọ kpara akpa. (Gụọ Aịsaịa 49:19, 20.) Dị ka o kwesịrị ịdị, ọ na-ajụ ebe ụmụ a nile si bịa: “Ị ga-asịkwa n’obi gị, Ònye mụrụ ndị a nye m, ebe mụ onwe m bụ onye a gbabaworo aka ụmụ, na nwanyị aga, na onye e meworo ka o jee biri n’ala ọzọ, na onye e wezụgara ewezụga? ma ndị a, ònye mere ka ha topụta? Lee, mụ onwe m fọdụrụ, nanị m; ndị a, olee ebe ha nọ?” (Aịsaịa 49:21) Lee ọnọdụ na-enye obi ụtọ nke ahụ ga-abụrụ Zaịọn ahụ bụbu nwanyị àgà!
25. N’oge a, mweghachi dị aṅaa ka e weghachiri Israel ime mmụọ?
25 Okwu ndị a nwere mmezu ha nke oge a. N’afọ ndị ahụ tara akpụ n’oge Agha Ụwa Mbụ, Israel ime mmụọ nọ n’oge ịtọgbọrọ n’efu na ndọrọ n’agha. Ma e weghachiri ya, ọ bịakwa nọrọ na paradaịs ime mmụọ. (Aịsaịa 35:1-10) Dị ka obodo ahụ nke nwere mgbe ọ tọgbọrọ n’efu, nke Aịsaịa kọwara, obi dị ya ụtọ—dị ka a pụrụ isi kwuo ya—ịhụ onwe ya n’etiti ọtụtụ ndị na-aṅụrị ọṅụ, ndị ji ịdị uchu na-efe Jehova ofufe.
“Ọkọlọtọ Ndị Nile Dị Iche Iche”
26. Nduzi dị aṅaa ka Jehova nyere ndị ya a tọhapụrụ atọhapụ?
26 N’ụzọ amụma, Jehova duuru Aịsaịa gaa ugbu a n’oge a ga-atọhapụ ndị Ya site na Babilọn. Hà ga-anata ntụziaka ọ bụla site n’aka Chineke? Jehova na-aza, sị: “Lee, M ga-eweliri mba nile aka m, ọ bụkwa ndị dị iche iche ka M ga-ebuliri ọkọlọtọ m: ha ga-ekutekwa ụmụ gị ndị ikom n’obi ha, a ga-ebukwa ụmụ gị ndị inyom n’ubu ha.” (Aịsaịa 49:22) Ná mmezu mbụ ya, Jerusalem, nke bụbu isi ọnọdụ nke ọchịchị nakwa ebe ụlọ nsọ Jehova dị, ghọrọ “ọkọlọtọ” Jehova. Ọbụna ndị a ma ama na ndị dị ike ná mba ndị ọzọ, dị ka “ndị eze” na “ndị eze nwanyị,” nyeere ndị Israel aka na njem ha ịlaghachi n’ebe ahụ. (Aịsaịa 49:23a) Ndị eze Peasia, bụ́ Saịrọs na Ataksakses Longimanus na ezinụlọ ha so ná ndị a nyeere ha aka. (Ezra 5:13; 7:11-26) Ihe Aịsaịa kwuru nwere mmezu ọzọ.
27. (a) Ná mmezu ya nke ka ukwuu, ‘n’ọkọlọtọ’ dị aṅaa ka ndị mmadụ ga-enukọta? (b) Gịnị ga-esi na ya pụta mgbe a manyere mba nile ido onwe ha n’okpuru ịchịisi Mesaịa ahụ?
27 Aịsaịa 11:10 na-ekwu banyere “ọkọlọtọ ndị nile dị iche iche.” Pọl onyeozi ji okwu ndị a mee ihe banyere Kraịst Jisọs. (Ndị Rom 15:8-12) N’ihi ya, ná mmezu ya nke ka ukwuu, Jisọs na ndị ha na ya ga-eso chịa, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ “ọkọlọtọ” Jehova ebe ndị mmadụ na-enukọta. (Mkpughe 14:1) Mgbe oge ruru, ndị nile nọ n’ụwa—ọbụna ndị na-achị achị taa—ga-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi Mesaịa. (Abụ Ọma 2:10, 11; Daniel 2:44) Gịnị ga-esi na ya pụta? Jehova na-ekwu, sị: “I wee mara na Mụ onwe m bụ Jehova, Onye ihere agaghị eme ndị na-ele anya m.”—Aịsaịa 49:23b.
“Nzọpụta Anyị Dị Nso Karị”
28. (a) Okwu ndị dị aṅaa ka Jehova ji mesighachi ndị ya obi ike na a ga-atọhapụ ha? (b) Nkwa dị aṅaa ka Jehova ka na-ekwe banyere ndị ya?
28 Ụfọdụ n’ime ndị ahụ e mere ka ha jee biri na Babilọn pụrụ ịdị na-eche, sị, ‘Ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie na a ga-atọhapụ Israel?’ Jehova lebaara ajụjụ ahụ anya site n’ịjụ, sị: “À ga-anara dike ihe o wetara n’agha, ma ọ bụ ndị onye ezi omume dọtara n’agha, à ga-eme ka ha wepụga onwe ha?” (Aịsaịa 49:24) Azịza ya bụ ee. Jehova na-emesi ha obi ike, sị: “Ọbụna ndị dike dọtara n’agha ka a ga-ewepụ, ọzọ, ihe onye na-eme ka mmadụ maa jijiji wetara n’agha, a ga-eme ya ka o wepụga onwe ya.” (Aịsaịa 49:25a) Lee mmesi obi ike na-enye nkasi obi nke ahụ bụ! Ọzọkwa, a na-ejikọta ihe nke ndị ya ịtọ Jehova ụtọ na nkwa siri ike o kwere ichebe ha. Ọ na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Onye na-alụso gị ọgụ ka Mụ onwe m ga-alụso ọgụ, ọ bụkwa ụmụ gị ka Mụ onwe m ga-azọpụta.” (Aịsaịa 49:25b) Nkwa ahụ ka dị irè. Dị ka e dekọrọ na Zekaraịa 2:8, Jehova na-agwa ndị ya, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [m].” N’eziokwu, anyị nọ ugbu a n’oge ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ mgbe ndị mmadụ gburugburu ụwa nwere ohere inute na Zaịọn ime mmụọ. Otú ọ dị, oge ahụ ihe mmadụ na-atọ ya ụtọ ga-abịa ná njedebe.
29. Olee atụmanya ọjọọ na-echere ndị jụrụ irubere Jehova isi?
29 Gịnị ga-eme ndị ji ịgba isi akwara jụ irubere Jehova isi, ọbụnakwa ndị na-akpagbu ndị na-efe ya ofufe? Ọ na-ekwu, sị: “M ga-emekwa ka ndị na-eme gị ihe ike rie anụ ahụ onwe ha: ha ga-aṅụbigakwa ọbara onwe ha ókè.” (Aịsaịa 49:26a) Nke ahụ bụ atụmanya ọjọọ! Ndị mmegide dị otú ahụ gbara isi akwara enweghị ọdịnihu na-adịte aka. A ga-ebibi ha. Ya mere, ma site n’ịzọpụta ndị ya ma site n’ibibi ndị iro ha, a ga-ahụ Jehova dị ka Onye Nzọpụta. “Anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ewee mara na Mụ onwe m, Jehova, bụ Onye nzọpụta gị, na Onye mgbapụta gị, bụ́ onye dị ike nke Jekọb.”—Aịsaịa 49:26b.
30. Ọrụ nzọpụta dịgasị aṅaa ka Jehova rụworo n’ihi ndị ya, gịnịkwa ka ọ ka ga-eme?
30 Okwu ndị ahụ nwere mmezu mbụ ha mgbe Jehova jiri Saịrọs tọhapụ ndị Ya n’agbụ nke Babilọn. Ha mezukwara na 1919 mgbe Jehova jiri Ọkpara ya e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst, tọhapụ ndị Ya n’ịbụ ohu ime mmụọ. N’ihi ya, Bible na-ekwu banyere ma Jehova ma Jisọs dị ka ndị nzọpụta. (Taịtọs 2:11-13; 3:4-6) Jehova bụ Onye Nzọpụta anyị, Jisọs kwa, bụ́ Mesaịa ahụ, bụ onye “Onye Nnọchiteanya Ukwu” ya. (Ọrụ 5:31, NW) N’ezie, ọrụ nzọpụta ndị Chineke na-arụ site n’aka Jisọs Kraịst dị ebube. Site n’ozi ọma ahụ, Jehova na-atọhapụ ndị obi ha ziri ezi n’agbụ nke okpukpe ụgha. Site n’àjà mgbapụta ahụ, ọ na-anapụta ha n’agbụ nke mmehie na ọnwụ. Na 1919, ọ napụtara ụmụnna Jisọs n’agbụ ime mmụọ. N’agha Amagedọn ahụ nke jikwa ọsọ na-abịa, ọ ga-anapụta oké ìgwè ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ná mbibi nke ga-abịakwasị ndị mmehie.
31. Olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi meghachi omume n’ihi ịbụ ndị ihe ha na-atọ Chineke ụtọ?
31 Mgbe ahụ, lee ihe ùgwù ọ bụ ịbụ ndị ihe ha na-atọ Chineke ụtọ! Ka anyị nile jiri oge a a na-anara mmadụ nke ọma mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Ka anyị meekwa ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ịdị ngwa nke oge anyị, na-aṅa ntị n’ihe Pọl gwara ndị Rom, sị: “Unu matara oge a, na oge awa eruwo ugbu a ka unu teta n’ụra: n’ihi na ugbu a nzọpụta anyị dị nso karịa mgbe anyị kweere na mbụ. Chi ejimiwo, chi ọbụbọ dịkwa nso: ya mere ka anyị yipụ ọrụ nile nke ọchịchịrị, ma ka anyị yikwasị ihe agha nke ìhè. Ka anyị na-ejegharị dị ka o kwesịrị anyị, dị ka n’ehihie; ọ bụghị n’ite egwú na ịṅụbiga mmanya ókè, ọ bụghị n’ịkwa iko na agụụ ịkwa iko, ọ bụghị n’esemokwu na ekworo. Kama yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, unu ebukwala ụzọ na-echere ahụ, ime ihe ọjọọ na-agụ ya.”—Ndị Rom 13:11-14.
32. Mmesi obi ike dịgasị aṅaa ka ndị Chineke nwere?
32 Jehova ga-anọgide na-egosi ndị na-aṅa ntị na ndụmọdụ ya ihu ọma. Ọ ga-enye ha ume na ikike dị mkpa iji kwusaa ozi ọma ahụ. (2 Ndị Kọrint 4:7) Jehova ga-eji ndị ohu ya mee ihe dị ka o ji Onye Ndú ha, bụ́ Jisọs, na-eme. Ọ ga-eme ka ọnụ ha “dị ka mma agha dị nkọ” ka ha wee jiri ozi ọma ha ruo n’obi nke ndị dị nwayọọ n’obi. (Matiu 28:19, 20) Ọ ga-echebe ndị ya “na ndo aka Ya.” A ga-ezobe ha “n’akpa akụ́ Ya” dị ka “akụ́ na-egbu àmụ̀mà.” N’ezie, Jehova agaghị ahapụ ndị ya!—Abụ Ọma 94:14; Aịsaịa 49:2, 15.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a “Setan, ebe o doro anya na ọ matara Jisọs dị ka Ọkpara Chineke na onye e buru n’amụma nke ga-echifịa ya n’isi (Je 3:15), mere ihe nile o nwere ike ime iji bibie Jisọs. Ma, mgbe ọ na-agwa Meri banyere ntụrụ ọ ga-atụrụ ime Jisọs, mmụọ ozi bụ́ Gebriel gwara ya, sị: ‘Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị Ihe Nile Elu ga-ekpuchikwa gị: n’ihi nke a Ihe dị nsọ nke ị dị ime Ya, a ga-akpọ Ya Ọkpara Chineke.’ (Lu 1:35) Jehova chebere Ọkpara ya. Mgbalị ndị e mere ibibi Jisọs mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ kụrụ afọ n’ala.”—Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peeji nke 868, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 139]
Mesaịa ahụ yiri “akụ́ na-egbu àmụ̀mà” nke dị n’akpa akụ́ Jehova
[Foto dị na peeji nke 141]
Mesaịa ahụ anọwo na-abụ “ìhè nke mba nile”
[Foto dị na peeji nke 147]
Ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị ya nọ karịrị nke nne na-enwe n’ebe nwa ya nọ