Isi nke Iri na Anọ
Jehova Ebulie Ohu Ya Bụ́ Mesaịa Elu
1, 2. (a) Mee ihe atụ nke ọnọdụ ọtụtụ ndị Juu nọ na ya ná mmalite nke narị afọ mbụ O.A. (b) Ndokwa dị aṅaa ka Jehova mere iji nyere ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi aka ịmata Mesaịa ahụ?
KA E were ya na ị na-aga izute otu onye nọ n’ọkwá dị elu. E kwuwo oge na ebe unu ga-ezute. Ma e nwere nsogbu dịnụ: Ị maghị otú ọ dị, ọ ga-ejikwa akọ mee njem, n’emeghị oké ngosi. Olee otú ị ga-esi mata ya? Ọ ga-enye aka ma ọ bụrụ na i nwere nkọwa zuru ezu banyere onye ọ bụ.
2 Ná mmalite narị afọ mbụ nke O.A., ọtụtụ ndị Juu nọ n’ọnọdụ dị otú a. Ha nọ na-atụ anya Mesaịa ahụ—nwoke ga-abụ onye kasị mkpa nke dịworo ndụ. (Daniel 9:24-27; Luk 3:15) Ma olee otú ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ga-esi mata ya? Jehova, site n’ọnụ ndị amụma bụ́ ndị Hibru, akọwawo n’ụzọ zuru ezu ihe omume ndị metụtara Mesaịa ahụ, bụ́ ndị ga-enyere ndị nwere uche aka ịmata onye ọ bụ n’ehieghị ụzọ.
3. Olee ihe a kọwara banyere Mesaịa ahụ n’Aịsaịa 52:13–53:12?
3 N’ime amụma Hibru nile e buru banyere Mesaịa ahụ, ma eleghị anya ọ dịghị nke kọwara ya n’ụzọ doro anya karịa nke ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 52:13–53:12. Ihe karịrị afọ 700 tupu oge eruo, Aịsaịa kọwara, ọ bụghị ọdịdị elu ahụ nke Mesaịa ahụ, kama ụmụ irighiri ihe ndị ka mkpa—nzube na ụdị ahụhụ ọ ga-ata nakwa nkọwa ndị doro anya banyere ọnwụ ya, olili ya, na mbuli a ga-ebuli ya elu. Ịtụle amụma a na mmezu ya ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ ma wusie okwukwe anyị ike.
“Ohu M”—Ònye Ka Ọ Bụ?
4. Nkọwa dịgasị aṅaa ka ndị ọkà mmụta ụfọdụ bụ́ ndị Juu nyeworo banyere onye bụ́ “ohu” ahụ, ma gịnị mere na ha ekwekọghị n’amụma Aịsaịa?
4 Aịsaịa ka kwusịrị okwu banyere ntọhapụ nke ndị Juu n’ala ọzọ na Babilọn. N’ilepụ anya n’ihu ugbu a gaa n’ihe omume ka ukwuu, ọ na-edekọ ihe Jehova na-ekwu, sị: “Lee, ohu m ga-enwe uche, ọ ga-adị elu, a ga-ebulikwa ya, o wee dị elu nke ukwuu.” (Aịsaịa 52:13) Ònye kpọmkwem bụ “ohu” a? Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Juu enyewo nkọwa dị iche iche. Ụfọdụ sịrị na ọ nọchitere anya mba Israel dum n’oge e mere ka ha jee biri na Babilọn. Ma nkọwa dị otú ahụ ekwekọghị n’amụma ahụ. Ohu Chineke tara ahụhụ n’afọ ofufo. Ọ bụ ezie na aka ya dị ọcha, ọ tara ahụhụ n’ihi mmehie nke ndị ọzọ. Nke a adịtụghị akọwa mba ndị Juu, bụ́ nke e mere ka o jee biri n’ala ọzọ n’ihi ime mmehie ya. (2 Ndị Eze 21:11-15; Jeremaịa 25:8-11) Ndị ọzọ sịrị na Ohu ahụ nọchitere anya ndị na-eme nsọ nsọ nọ n’ọkwá dị elu n’Israel nakwa na ha tara ahụhụ n’ihi ndị Israel na-eme mmehie. Otú ọ dị, n’oge ndị e nwere nsogbu n’Israel, ọ dịghị otu ìgwè kpọmkwem tachiteere ìgwè ọzọ ahụhụ.
5. (a) Olee ụzọ ụfọdụ ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Juu siworo kọwaa amụma Aịsaịa? (Lee ihe odide ala ala peeji.) (b) Olee nkọwa doro anya e nyere n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndị Ozi banyere onye bụ́ Ohu ahụ?
5 Tupu Iso Ụzọ Kraịst amalite nakwa ruo oge ụfọdụ na narị afọ ndị mbụ nke Oge Anyị, ndị ọkà mmụta ole na ole bụ́ ndị Juu kwuru na amụma a mezuru n’ebe Mesaịa ahụ nọ. A na-ahụ na nke a bụ nkọwa ziri ezi n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-akọ na mgbe ọnaozi Etiopia kwuru na ya amaghị onye bụ Ohu ahụ e kwuru maka ya n’amụma Aịsaịa, Filip ‘ziri ya ozi ọma banyere Jisọs.’ (Ọrụ 8:26-40; Aịsaịa 53:7, 8) N’otu aka ahụ, akwụkwọ ndị ọzọ nke Bible na-eme ka a mata Jisọs Kraịst dị ka Ohu ahụ Bụ́ Mesaịa nke e kwuru maka ya n’amụma Aịsaịa.a Ka anyị na-atụle amụma a na-aga, anyị ga-ahụ myirịta na-enweghị mgbagha nke dị n’agbata onye ahụ Jehova kpọrọ “ohu m” na Jisọs nke Nazaret.
6. Olee otú amụma Aịsaịa si egosi na Mesaịa ahụ ga-emezu uche Chineke n’ụzọ gara nke ọma?
6 Amụma ahụ ji ịkọwa ihe ịga nke ọma nke Mesaịa ahụ ga-enwe n’ikpeazụ n’imezu uche Chineke wee malite. Okwu ahụ bụ́ “ohu” na-egosi na ọ ga-eme uche Chineke, otú ohu na-eme uche nna ya ukwu. N’ime otú ahụ, “ọ ga-enwe uche.” Uche bụ ikike ịghọta ihe gbara otu ọnọdụ gburugburu. Iji uche eme ihe bụ iji akọ eme ihe. Banyere ngwaa Hibru e ji mee ihe n’ebe a, otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na-ekwu, sị: “Echiche bụ́ isi dị na ya bụ iji akọ na amamihe eme ihe. Onye ji amamihe eme ihe ga-enwe ihe ịga nke ọma.” A na-ahụ na Mesaịa ahụ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ezie n’ihi na amụma ahụ na-ekwu na “a ga-ebulikwa ya, o wee dị elu nke ukwuu.”
7. Olee otú Jisọs Kraịst si ‘nwee uche,’ oleekwa otú e siworo ‘bulie ya elu, o wee dị elu nke ukwuu’?
7 Jisọs ‘nwere uche’ n’ezie, na-egosi nghọta ọ ghọtara amụma Bible ndị metụtara ya na ịbụ onye ha duziri ime uche Nna ya. (Jọn 17:4; 19:30) Gịnị si na ya pụta? Mgbe Jisọs bilitesịrị n’ọnwụ ma rịgoro n’eluigwe, “Chineke welikwara Ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu.” (Ndị Filipaị 2:9; Ọrụ 2:34-36) Mgbe ahụ, na 1914, e buliri Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube elu ọbụna karị. Jehova buliri ya elu ịnọ n’ocheeze Alaeze Mesaịa ahụ. (Mkpughe 12:1-5) Ee, e ‘buliri ya elu, o wee dị elu nke ukwuu.’
‘Ile Ya Anya n’Ijuanya’
8, 9. Mgbe Jisọs ahụ e buliri elu ga-abịa imezu ihe e kpere n’ikpe, olee otú ndị ọchịchị nke ụwa ga-esi meghachi omume, n’ihi gịnịkwa?
8 Olee otú mba dị iche iche na ndị na-achị ha ga-esi meghachi omume n’ebe Mesaịa ahụ e buliri elu nọ? Ọ bụrụ na anyị amaferegodị okwu ndị ahụ na-enyekwu nkọwa dị n’akụkụ nke abụọ nke amaokwu nke 14, amụma ahụ na-agụ, sị: “Ruo n’ókè nke na ọtụtụ elewo ya anya n’ijuanya . . . ọ ga-eme n’otu aka ahụ ka ọtụtụ mba kụja. Banyere ya, ndị eze ga-ekpuchi ọnụ ha, n’ihi na ihe a na-akọbeghịrị ha ka ha ga-ahụ n’ezie, n’ihe ha na-anụbeghịkwa ka ha na-aghaghị itinye uche ha.” (Aịsaịa 52:14a, 15, NW) Aịsaịa ji okwu ndị a kọwaa, ọ bụghị mpụta mbụ nke Mesaịa ahụ, kama nkwata ikpeazụ ya na ndị ọchịchị ụwa ga-akwata.
9 Mgbe Jisọs ahụ e buliri elu ga-abịa imezu ihe e kpere n’ikpe megide usoro ihe a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị eze nke ụwa ‘ga-ele ya anya n’ijuanya.’ N’eziokwu, ndị ọchịchị bụ́ mmadụ agaghị ahụ Jisọs ahụ e mere ka ọ dị ebube anya n’ụzọ nkịtị. Ma ha ga-ahụ ihe àmà ndị a pụrụ ịhụ anya nke ike ya dị ka Onye Agha Jehova, nke nọ n’eluigwe. (Matiu 24:30) A ga-amanye ha itinye uche ha n’ihe ha na-anụbeghị ka ndị ndú okpukpe kọrọ ya—na Jisọs bụ Onye Mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe! Ohu ahụ e buliri elu, bụ́ onye ha ga-ezute, ga-eme ihe n’ụzọ ha na-atụghị anya ya.
10, 11. N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi kwuo na e nyere Jisọs nkwarụ na narị afọ mbụ, oleekwa otú e siworo mee nke a taa?
10 Dị ka okwu ndị ahụ na-enyekwu nkọwa ndị dị n’amaokwu nke 14 si kwuo, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Nkwarụ ahụ dị nnọọ ukwuu banyere ọdịdị ya karịa onye ọ bụla ọzọ, banyekwara ọdịdị ya dị ebube karịa nke ihe a kpọrọ mmadụ.” (Aịsaịa 52:14b, NW) Jisọs ò nwere nkwarụ ọ bụla n’anụ ahụ? Ee e. Ọ bụ ezie na Bible enyeghị nkọwa sara mbara banyere otú Jisọs dị, obi abụọ adịghị ya na Ọkpara Chineke nke zuru okè nwere ọdịdị mara mma na ọdịdị ihu dị mma. Dị ka ihe àmà na-egosi, okwu Aịsaịa na-ezo aka ná mweda n’ala e wedara Jisọs. O ji anyaike mee ka a mata ndị ndú okpukpe nke oge ya na ha bụ ndị ihu abụọ, ndị ụgha, na ndị ogbu mmadụ; ha zaghachikwara site n’ịkatọ ya. (1 Pita 2:22, 23) Ha boro ya ebubo ịbụ onye na-ada iwu, onye nkwulu, onye nduhie, onye na-agba ọchịchị ndị Rom mgba okpuru. N’ụzọ dị otú a, ndị a na-ebo ebubo ụgha nyere nkọwa na-ezitụghị ezi banyere Jisọs.
11 A ka na-akọwahie Jisọs taa. Ọtụtụ ndị na-ewere Jisọs dị ka nwa ọhụrụ nọ n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri ma ọ bụ dị ka onye ọdachi dakwasịrị nke a kpọgidere n’elu obe, onye ihu ya hịkọsịrị ahịkọ n’ihi ihe mgbu nke okpu ogwu o kpu. Ndị ụkọchukwu nke Krisendọm akwadowo echiche ndị dị otú ahụ. Ha enwebeghị ike igosipụta Jisọs dị ka Eze eluigwe dị ike, onye mba nile ga-aza ajụjụ. Mgbe ndị ọchịchị bụ́ mmadụ na Jisọs ahụ e buliri elu ga-akwata n’ọdịnihu dị nso, ha ga-agbaso Mesaịa nke nwere “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa” mgba!—Matiu 28:18.
Ònye Ga-ekwere Ozi Ọma A?
12. Ajụjụ dịgasị aṅaa na-akpali mmasị ka ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 53:1 na-ewelite?
12 Mgbe ọ kọwasịrị mgbanwe na-eju anya nke Mesaịa ahụ—site n’ịbụ onye ‘e nyere nkwarụ’ gaa n’ịbụ onye ‘e buliri elu nke ukwuu’—Aịsaịa na-ajụ, sị: “Ònye kweere ihe anyị nụworo? ogwe aka Jehova kwa, n’ahụ ònye ka e kpugheworo ya?” (Aịsaịa 53:1) Ihe Aịsaịa kwuru na-ewelite ajụjụ ndị na-akpali mmasị: À ga-emezu amụma a? “Ogwe aka Jehova,” nke na-anọchite anya ikike o nwere iji ike mee ihe, ọ̀ ga-eme ka a hụ ya ma mee ka okwu ndị a mezuo?
13. Olee otú Pọl si gosi na e mezuru amụma Aịsaịa n’ahụ Jisọs, oleekwa mmeghachi omume e nwetara?
13 N’enweghị mgbagha, azịza ya bụ ee! N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl hotara ihe Aịsaịa kwuru iji gosi na amụma ahụ Aịsaịa nụrụ ma dekọọ mezuru n’ahụ Jisọs. Omume e mere ka Jisọs dị ebube mgbe ọ tasịrị ahụhụ n’ụwa bụ ozi ọma. “Ma,” ka Pọl na-ekwu n’izo aka n’ebe ndị Juu na-ekweghị ekwe nọ, “ọ bụghị ha nile ṅara ozi ọma ahụ ntị. N’ihi na Aịsaịa na-asị, Onyenwe anyị, ònye kweere ihe anyị nụworo? Ya mere, okwukwe si n’ọnụnụ pụta, ma ọnụnụ ahụ sitere n’okwu Kraịst.” (Ndị Rom 10:16, 17) Otú ọ dị, ọ bụ ihe mwute na n’oge Pọl, ọ bụ mmadụ ole na ole kwere n’ozi ọma banyere Ohu Chineke. N’ihi gịnị?
14, 15. Gịnị ga-abụ ọnọdụ Mesaịa ahụ mgbe ọ ga-abịa n’ụwa?
14 Amụma ahụ kọwaziiri ụmụ Israel ihe ndị mere e ji jụọ ajụjụ ndị ahụ e dekọrọ n’amaokwu nke 1, n’imekwa nke ahụ, ọ na-eme ka a ghọta ihe mere ọtụtụ ndị na-agaghị eji nabata Mesaịa ahụ: “O tolitere n’ihu [onye na-ahụ ya] dị ka ome, na dị ka mkpọrọgwụ nke pụtara n’ala kpọrọ nkụ: ọ dịghị ụdị ahụ ọma o nwere, ọ dịghịkwa ịma mma; anyị wee hụ ya, ma ọ maghị mma n’ile ya anya nke anyị ga-eji chọsie ya ike.” (Aịsaịa 53:2) N’ebe a, anyị na-ahụ ihe ga-abụ ọnọdụ Mesaịa ahụ mgbe ọ ga-abịa n’ụwa. Ọ ga-enwe mmalite dị ala, nyekwa ndị na-ahụ ya, ọ ga-eyi ka ọ gaghị abụ onye a ma ama. Ọzọkwa, ọ ga-adị ka ome efu, obere osisi na-etopụta etopụta, nke na-eto n’ogwe ma ọ bụ n’alaka osisi. Ọ ga-adịkwa ka mkpọrọgwụ osisi nke dabeere na mmiri n’ala kpọrọ nkụ, nke na-adịghị emepụta ihe. Ọ gajeghịkwa ịbịa n’ebube na okomoko nke onye eze—ọ gaghị eyi uwe onye eze ma ọ bụ okpueze na-egbuke egbuke. Kama nke ahụ, mmalite ya ga-adị ala bụrụkwa nke na-adịghị okomoko.
15 Lee otú nke ahụ si kọwaa mmalite dị ala nke Jisọs dị ka mmadụ nke ọma! Nwa agbọghọ onye Juu na-amaghị nwoke bụ́ Meri mụrụ ya n’ime ụlọ anụ ná ntakịrị obodo a maara dị ka Betlehem.b (Luk 2:7; Jọn 7:42) Meri na di ya, bụ́ Josef, dara ogbenye. Ihe dị ka ụbọchị 40 mgbe a mụsịrị Jisọs, ha wetara àjà mmehie a na-anabata ma ọ bụrụ ndị ogbenye, “nduru abụọ, ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.” (Luk 2:24; Levitikọs 12:6-8) Ka oge na-aga, Meri na Josef jere biri na Nazaret, bụ́ ebe Jisọs nọrọ tolite n’ime ezinụlọ buru ibu, ma eleghị anya n’ọnọdụ ndị dịtụ ala.—Matiu 13:55, 56.
16. Olee otú o si bụrụ eziokwu na Jisọs enweghị “ahụ ọma” ma ọ bụ “ịma mma”?
16 Dị ka mmadụ, o yiri ka Jisọs agbanyeghị mkpọrọgwụ n’ala kwesịrị ekwesị. (Jọn 1:46; 7:41, 52) Ọ bụ ezie na ọ bụ nwoke zuru okè, bụrụkwa nwa Eze Devid, ọnọdụ ya dị ala emeghị ya ka o nwee “ahụ ọma” ma ọ bụ “ịma mma”—ma ọ dịghị ihe ọzọ n’anya ndị na-atụ anya ka Mesaịa ahụ site n’ọnọdụ dị ebube karị. N’ịbụ ndị ndị ndú okpukpe ndị Juu kwaliri, e duhiere ọtụtụ ndị ileghara ya anya na ọbụna ileda ya anya. N’ikpeazụ, ìgwè mmadụ ahụ ahụghị ihe ọ bụla dị mma n’Ọkpara Chineke zuru okè.—Matiu 27:11-26.
‘Onye Ndị Mmadụ Ledara Anya Ma Zere’
17. (a) Gịnị ka Aịsaịa malitere ịkọwa, n’ihi gịnịkwa ka o ji dee ihe n’ụdị na-egosi ihe gara aga? (b) Olee ndị “ledara” Jisọs anya ma ‘zere ya,’ oleekwa otú ha si mee ya?
17 Ugbu a, Aịsaịa malitere ịkọwa n’ụzọ sara mbara otú a ga-esi were Mesaịa ahụ na otú a ga-esi mesoo ya: “E ledara ya anya, [ndị mmadụ zerekwaara ya]; onye nwere ọtụtụ ihe mgbu na onye maara ọrịa nke ọma: ee, dị ka onye mmadụ na-ezonahụ ihu ha, otú a ka e ledara ya anya, anyị wee ghara ịgụ ya n’ihe.” (Aịsaịa 53:3) Ebe o ji n’aka na ihe o kwuru ga-emezu, Aịsaịa dere ihe n’ụdị na-egosi ihe gaworo aga dị ka a ga-asị na ha emezuworị. Ndị mmadụ hà ledara Jisọs Kraịst anya ma zere ya n’ezie? N’ezie, ha mere otú ahụ! Ndị ndú okpukpe bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha na ụmụazụ ha weere ya dị ka onye kasị rụọ arụọ. Ha kpọrọ ya enyi ndị ọna ụtụ na ndị akwụna. (Luk 7:34, 37-39) Ha bụrụ ya asọ mmiri n’ihu. Ha suru ya aka ma kwutọọ ya. Ha chịrị ya ọchị, kwaakwa ya emo. (Matiu 26:67) N’ịbụ ndị ndị iro a nke eziokwu kpaliri, “ndị nke aka [Jisọs] akpọbataghị Ya.”—Jọn 1:10, 11.
18. Ebe ọ bụ na ọ dịghị oge Jisọs rịara ọrịa, olee otú o si bụrụ “onye nwere ọtụtụ ihe mgbu na onye maara ọrịa nke ọma”?
18 Ebe ọ bụ nwoke zuru okè, Jisọs arịaghị ọrịa. Ma, ọ bụ “onye nwere ọtụtụ ihe mgbu na onye maara ọrịa nke ọma.” Ọ bụghị ya onwe ya na-enwe ihe mgbu ma na-arịa ọrịa ndị dị otú ahụ. Jisọs si n’eluigwe bata n’ụwa na-arịa ọrịa. O biri ndụ n’etiti ndị na-ahụ ahụhụ ma na-enwe ihe mgbu, ma o zereghị ndị na-arịa ọrịa n’anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka dibịa nke na-enwe mmetụta maka ndị ọzọ, ọ bịara mata nke ọma ahụhụ nke ndị gbara ya gburugburu na-ata. Ọzọkwa, o mere ihe ọ na-adịghị dibịa nkịtị bụ́ mmadụ pụrụ ime ya.—Luk 5:27-32.
19. Ònye ka e ‘zochiri’ ihu ya, oleekwa otú ndị iro Jisọs si gosi na ha ‘agụghị ya n’ihe’?
19 Ka o sina dị, ndị iro Jisọs weere ya dị ka onye ọrịa, jụkwa imere ya ebere. E ‘zochiri’ ihu ya ka a ghara ịhụ ya ma ọ bụghị n’ihi na o zopụrụ ihu ya n’ebe ndị ọzọ nọ. N’ịsụgharị Aịsaịa 53:3, The New English Bible ji nkebi ahịrịokwu bụ́ “ihe ndị mmadụ na-ewepụ anya ha na ya,” mee ihe. Ndị na-emegide Jisọs lere ya anya dị ka onye na-asọ oyi nke na, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha wezụgara onwe ha n’ebe ọ nọ dị ka a ga-asị na ọ na-asọ oyi nke ukwuu nke na a pụghị ile ya anya. Ha weere ya na ọnụ ahịa ya bụ nanị ọnụ ahịa nke ohu. (Ọpụpụ 21:32; Matiu 26:14-16) Ha ji ogbu mmadụ bụ́ Barabas kpọrọ ihe karịa ya. (Luk 23:18-25) Olee ihe ọzọ fọdụụrụ ha ime iji gosi nleda anya ha ledara Jisọs?
20. Ihe Aịsaịa kwuru na-enye ndị Jehova taa nkasi obi dị aṅaa?
20 Ndị ohu Jehova taa pụrụ inweta nkasi obi dị ukwuu site n’ihe Aịsaịa kwuru. Mgbe ụfọdụ, ndị mmegide pụrụ ileda ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-efe Jehova ofufe anya ma ọ bụ mesoo ha dị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ. Ma, dị ka ọ dị n’ihe banyere Jisọs, ihe dị mkpa n’ezie bụ otú Jehova Chineke si were anyị. E kwuwerị, n’agbanyeghị na ndị mmadụ ‘agụghị Jisọs n’ihe,’ n’ezie nke a agbanweghị oké ọnụ ahịa ọ dị n’anya Chineke!
“Onye A Mapuworo Site ná Njehie Nile nke Anyị”
21, 22. (a) Gịnị ka Mesaịa ahụ buuru ma die n’ihi ndị ọzọ? (b) Olee otú ọtụtụ ndị si were Mesaịa ahụ, ahụhụ ya kwụsịkwara na gịnị?
21 N’ihi gịnị ka Mesaịa ahụ ji taa ahụhụ ma nwụọ? Aịsaịa na-akọwa, sị: “N’ezie ọrịa nile nke anyị ka ya onwe ya bupụworo, ihe mgbu nile nke anyị kwa, o buruwo ha; ma anyị onwe anyị gụrụ ya n’onye e tiworo ihe otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye e wedara n’ala. Ma ya onwe ya bụ onye a mapuworo site ná njehie nile nke anyị, onye a zọpịaworo site n’ajọ omume nile nke anyị: ahụhụ mmehie nke udo anyị dị n’ahụ ya; ọ bụkwa ubiri ụtarị ya ka e jiri mee ka ahụ anyị dị ike. Anyị nile kpafuru akpafu dị ka ìgwè atụrụ: anyị chere ihu, onye ọ bụla n’ụzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke anyị nile dakwasị ya.”—Aịsaịa 53:4-6.
22 Mesaịa ahụ buuru ọrịa nke ndị ọzọ ma die ihe mgbu ha. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, o buuru ibu arọ ha, dọkwasị ha n’ubu ya, ma buru ha. Ebe ọ bụkwa na ọrịa na ihe mgbu bụ ihe ndị si n’ọnọdụ mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ pụta, Mesaịa ahụ buuru mmehie nke ndị ọzọ. Ọtụtụ ndị aghọtaghị ihe mere o ji na-ata ahụhụ, ha kwenyekwara na Chineke na-enye ya ntaramahụhụ, jiri ọrịa na-asọ oyi na-eti ya ihe otiti.c Ahụhụ Mesaịa ahụ bịara ná njedebe na ya ịbụ onye a mapuru, zọpịa, ma merụọ ahụ—okwu ndị dị ike, ndị na-egosipụta ọnwụ ike, ọnwụ ahụhụ. Ma ọnwụ ya nwere ikike ikpuchi mmehie; ọ bụ ihe ndabere maka ịnapụta ndị na-awagharị ná njehie na ná mmehie, na-enyere ha aka ka ha na Chineke dị n’udo.
23. N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si buru ahụhụ nke ndị ọzọ?
23 Olee otú Jisọs si buru ahụhụ nke ndị ọzọ? Oziọma Matiu, n’ihota ihe e kwuru n’Aịsaịa 53:4, na-ekwu, sị: “[Ndị mmadụ] kuteere Ya ọtụtụ mmadụ ndị mmụọ ọjọọ ji: O wee were okwu ọnụ chụpụ ndị mmụọ ahụ, meekwa ndị nile ahụ na-adịghị mma ka ahụ ha dị ike: ka okwu e kwuru site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma wee mezuo, sị, Ya onwe ya naara nrịanrịa nile anyị, burukwa ọrịa nile anyị.” (Matiu 8:16, 17) Site n’ịgwọ ndị bu ụdị ọrịa dị iche iche bịakwute ya, Jisọs buuru ahụhụ ha, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọgwụgwọ ndị ahụ wepụkwara ya ike n’ahụ. (Luk 8:43-48) Ikike o nwere ịgwọ ụdị ọrịa nile—nke anụ ahụ na nke ime mmụọ—gosiri na e nyere ya ike ime ka ndị mmadụ dị ọcha pụọ ná mmehie.—Matiu 9:2-8.
24. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị ọtụtụ ndị ka Chineke ò ‘tiri Jisọs ihe otiti’? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs ji taa ahụhụ ma nwụọ?
24 N’agbanyeghị nke ahụ, nye ọtụtụ ndị, o yiri ka Chineke o ‘tiri Jisọs ihe otiti.’ E kwuwerị, ọ bụ ndị ndú okpukpe a na-akwanyere ùgwù kpatara ahụhụ ọ tara. Otú ọ dị, cheta na ọ taghị ahụhụ n’ihi mmehie nke ya. “Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu,” ka Pita na-ekwu, “na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ ya nile: Onye ọ dịghị mmehie ọ bụla O mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ Ya: Onye Ya onwe ya, dị ka àjà a chụrụ, buuru mmehie nile anyị n’ahụ Ya n’elu osisi ahụ, ka anyị, ebe anyị nwụworo n’ebe mmehie nile dị, ka anyị wee dị ndụ n’ebe ezi omume dị; Onye e ji ọnyá ụtarị Ya mee ka unu nwee ezi ndụ.” (1 Pita 2:21, 22, 24) N’otu oge, anyị nile furu efu n’ime mmehie, ‘dị ka atụrụ nke na-ehie ụzọ.’ (1 Pita 2:25) Otú ọ dị, site n’aka Jisọs, Jehova gbapụtara anyị n’ọnọdụ mmehie anyị. O mere ka njehie anyị “dakwasị” Jisọs, ka ọ dịkwasị ya. Jisọs ahụ na-emeghị mmehie ji ọchịchọ obi nata ntaramahụhụ maka mmehie anyị. Site n’ịnwụ ọnwụ ihere ọ na-ekwesịghị ịnwụ n’elu osisi, o mere ka o kwe omume anyị na Chineke ịdịghachi ná mma.
‘O Kwere Ka E Wedaa Ya n’Ala’
25. Olee otú anyị si mara na Mesaịa ahụ tara ahụhụ ma nwụọ ọnwụ site n’ọchịchọ obi ya?
25 Mesaịa ahụ ọ̀ dị njikere ịta ahụhụ ma nwụọ? Aịsaịa na-ekwu, sị: “A chịrị ya n’ihe ike, ma ya onwe ya [na-ekwe ka e wedaa, NW] ya n’ala, wee ghara ịsaghe ọnụ ya; dị ka atụrụ nke a na-akpụrụ ije n’ogbugbu ya, na dị ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị; ee, ọ dịghị asaghe ọnụ ya.” (Aịsaịa 53:7) N’abalị ikpeazụ ahụ ọ dịrị ndụ, Jisọs pụrụ ịkpọworị “[ihe karịrị] legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi” ka ha bịa nyere ya aka. Ma ọ sịrị: “Ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ ga-esikwa aṅaa mezuo, na ọ ghaghị ime otú a?” (Matiu 26:53, 54) Kama ime otú ahụ, “Nwa atụrụ Chineke” eguzogideghị ha. (Jọn 1:29) Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị okenye boro ya ebubo ụgha n’ihu Paịlet, Jisọs ‘azaghị ihe ọ bụla.’ (Matiu 27:11-14) Ọ chọghị ikwu ihe ọ bụla pụrụ igbochi mmezu nke uche Chineke n’ebe ọ nọ. Jisọs dị njikere ịnwụ dị ka Nwa Atụrụ e ji chụọ àjà, na-amara nke ọma na ọnwụ ya ga-agbapụta ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ná mmehie, ọrịa, na ọnwụ.
26. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị na-emegide Jisọs si tinye “ihe mgbochi”?
26 Ugbu a, Aịsaịa na-enye nkọwa sara mbara karị banyere ịta ahụhụ na mweda n’ala nke Mesaịa ahụ. Onye amụma ahụ na-ede, sị: “N’ihi ihe mgbochi na ikpe ka e ji wepụ ya: ònyekwa ga-echegbu onwe ya ọbụna banyere ihe ndị miri emi banyere ọgbọ ya? N’ihi na e kewapụrụ ya n’ala nke ndị dị ndụ. N’ihi njehie nke ndị m, a pịara ya ihe.” (Aịsaịa 53:8, NW) Mgbe ndị iro Jisọs mesịrị jide ya, ndị okpukpe a bụ́ ndị mmegide tinyere “ihe mgbochi” n’ụzọ ha si mesoo ya. Ọ bụghị na ha egosipụtaghị ịkpọasị ha, kama ha gbochiri, ma ọ bụ jichie ikpe ziri ezi. Ná nsụgharị ya nke Aịsaịa 53:8, Septuagint nke Grik sịrị “mweda n’ala” kama “ihe mgbochi.” Ndị iro Jisọs wedara ya n’ala site n’ịjụ imeso ya mmeso kwesịrị ekwesị nke e kwesịrị imeso ọbụna onye omekome nkịtị. Ikpe e kpere Jisọs mere ka ikpe ziri ezi yie ihe nzuzu. N’ụzọ dị aṅaa?
27. Mgbe ndị ndú okpukpe ndị Juu na-ekpe Jisọs ikpe, iwu dịgasị aṅaa ka ha leghaara anya, n’ụzọ dịgasịkwa aṅaa ka ha si mebie Iwu Chineke?
27 Ná mkpebisi ike ha igbu Jisọs, ndị ndú okpukpe ndị Juu mebiri iwu ndị ha onwe ha tiri. Dị ka ha si eme, Sanhedrin pụrụ ikpe ikpe nke pụrụ ịrụpụta ntaramahụhụ ọnwụ nanị n’ụlọ nzukọ ahụ e ji nkume a wapụtara awapụta wuo, bụ́ nke dị n’ogige ụlọukwu ahụ, ọ bụghị n’ụlọ onyeisi nchụàjà. A ghaghị ikpe ụdị ikpe ahụ n’ehihie, ọ bụghị mgbe anyanwụ dasịrị. N’ikpe nke pụkwara ịrụpụta ntaramahụhụ ọnwụ, e kwesịkwara ikwupụta amamikpe ahụ n’ụbọchị na-esote ụbọchị e kpebiri ikpe ahụ. N’ihi ya, a pụghị ikpe ikpe ọ bụla na chi ga-efote Ụbọchị Izu Ike ma ọ bụ ememe. E leghaara iwu ndị a nile anya n’ikpe e kpere Jisọs. (Matiu 26:57-68) Ọbụna nke ka njọ, ndị ndú okpukpe ahụ mebiri Iwu Chineke n’ụzọ pụtara ìhè ka ha na-ekpe ikpe ahụ. Dị ka ihe atụ, ha tụgharịrị wee nye aka azụ iji mata Jisọs n’ọnyà. (Deuterọnọmi 16:19; Luk 22:2-6) Ha ṅara ndị na-agba àmà ụgha ntị. (Ọpụpụ 20:16; Mak 14:55, 56) Ha gbakwara izu ịtọhapụ ogbu mmadụ, si otú ahụ na-ewetara onwe ha nakwa ala ha ikpe ọmụma ọbara. (Ọnụ Ọgụgụ 35:31-34; Deuterọnọmi 19:11-13; Luk 23:16-25) N’ihi ya, ọ dịghị “ikpe” e kpere, e kpeghị ikpe kwụ ọtọ nke rụpụtara mkpebi ikpe ziri ezi, nke a na-eleghị mmadụ anya n’ihu na ya.
28. Gịnị ka ndị iro Jisọs na-atụleghị?
28 Ndị iro Jisọs, hà mere nchọpụta iji mata onye nwoke ahụ ha na-ekpe ikpe bụ n’ezie? Aịsaịa jụrụ ajụjụ yiri ya, sị: “Ònyekwa ga-echegbu onwe ya ọbụna banyere ihe ndị miri emi banyere ọgbọ ya?” Okwu bụ́ “ọgbọ” pụrụ izo aka n’usoro ọmụmụ mmadụ, ma ọ bụ ebe o si. Mgbe Sanhedrin ahụ nọ na-ekpe Jisọs ikpe, ndị so na ya atụleghị ebe o si—na o mezuru ihe ndị a chọrọ maka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Kama nke ahụ, ha boro ya ebubo ikwu okwu nkwulu ma kwuo na o kwesịrị ọnwụ. (Mak 14:64) Ka e mesịrị, onye ọchịchị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet kwere ka e jiri nrụgide merie ya o wee ma Jisọs ikpe ka a kpọgbuo ya. (Luk 23:13-25) N’ihi ya, mgbe ọ dị nanị afọ 33 1/2, “e kewapụrụ,” ma ọ bụ bipụ, Jisọs n’uju ndụ ya.
29. Olee otú o si bụrụ na ili Jisọs “dị n’etiti ndị na-emebi iwu” na ‘ndị ọgaranya’?
29 Banyere ọnwụ na olili Mesaịa ahụ, Aịsaịa deziri, sị: “E wee mee ka ili ya dị n’etiti ndị na-emebi iwu, ya na ọgaranya nọkwa n’ọnwụ ya; ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ike o mererịị, ọ dịghịkwa aghụghọ dị n’ọnụ ya.” (Aịsaịa 53:9) Olee otú Jisọs si nọrọ n’etiti ndị na-emebi iwu na n’etiti ndị ọgaranya mgbe ọ nwụrụ, e liekwa ya? Na Nisan 14, 33 O.A., ọ nwụrụ n’elu osisi ogbugbu n’azụ mgbidi Jerusalem. Ebe a kpọgidere ya n’elu osisi n’etiti ndị mmebi iwu abụọ, n’otu ụzọ, ili ya dị n’etiti ndị na-emebi iwu. (Luk 23:33) Otú ọ dị, mgbe Jisọs nwụsịrị, Josef, otu nwoke bara ọgaranya nke bụ́ onye Arimatịa, nwere obi ike ịrịọ Paịlet ka o nye ya ikike ibutu ahụ Jisọs ma lie ya. Ná njikọta aka ya na Nikọdimọs, Josef kwadebere ahụ ya maka olili wee tinyezie ya n’ili o gwuru ọhụrụ bụ́ nke ya. (Matiu 27:57-60; Jọn 19:38-42) N’ihi ya, ili Jisọs dịkwa n’etiti ndị ọgaranya.
“Ọ Tọrọ Jehova Ụtọ Ịzọpịa Ya”
30. N’echiche dị aṅaa ka ọ tọrọ Jehova ụtọ ịzọpịa Jisọs?
30 Aịsaịa kwuziri ihe na-eju anya, sị: “Ọ tọrọ Jehova ụtọ ịzọpịa ya; O mewo ka ọ rịa ọrịa: ọ bụrụ na mkpụrụ obi ya achụọ àjà ikpe ọmụma, ọ ga-ahụ mkpụrụ ya, mee ka ụbọchị ya nile dị ogologo, ihe nke na-atọ Jehova ụtọ ga-agakwa nke ọma n’aka ya. Ihe nke sitere ná ndọgbu mkpụrụ obi ya na-adọgbu onwe ya n’ọrụ ka ọ ga-ahụ, afọ ga-eju ya: ihe ọmụma ya ka onye ezi omume ahụ, bụ́ ohu m, ga-eji mee ka ọha mmadụ ghọọ ndị ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe ya ga-ebukwa.” (Aịsaịa 53:10, 11) Olee otú ọ ga-esi kwe omume na ọ ga-atọ Jehova ụtọ ịhụ ka a zọpịara ohu a kwesịrị ntụkwasị obi? N’ụzọ doro anya, Jehova n’onwe ya emeghị ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya taa ahụhụ. Ọ bụ ndị iro Jisọs kpatara ihe nile ha mere ya. Ma Jehova kwere ka ha jiri obi ọjọọ mee ihe. (Jọn 19:11) N’ihi gịnị? N’ezie, o wutere Chineke na-eme ebere, nke nwere ọmịiko, ịhụ ka Ọkpara ya aka ya dị ọcha na-ata ahụhụ. (Aịsaịa 63:9; Luk 1:77, 78) N’ezie, Jehova adịghị ewesa Jisọs iwe ma ọlị. N’agbanyeghị nke ahụ, ịdị njikere nke Ọkpara ya dị ịta ahụhụ n’ihi ngọzi nile ga-esi na ya pụta tọrọ Jehova ụtọ.
31. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si dozie mkpụrụ obi Jisọs dị ka “àjà ikpe ọmụma”? (b) Mgbe Jisọs tasịworo ahụhụ nile ọ tara dị ka mmadụ, olee ihe na-aghaghị ịbụrụ ya ihe na-enye afọ ojuju karịsịa?
31 Otu ihe bụ na Jehova doziri mkpụrụ obi Jisọs dị ka “àjà ikpe ọmụma.” N’ihi ya, mgbe Jisọs rịgoghachiri n’eluigwe, o bu uru nke ndụ ya dị ka mmadụ bụ́ nke o jiri chụọ àjà wee baa n’ebe Jehova nọ dị ka àjà ikpe ọmụma, Jehova nwekwara obi ụtọ ịnabata ya n’ihi ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 9:24; 10:5-14) Site n’àjà ikpe ọmụma ya, Jisọs nwetara “mkpụrụ.” Dị ka “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi,” o nwere ikike inye ndị na-egosipụta okwukwe n’ọbara ọ wụsịrị, ndụ—ndụ ebighị ebi. (Aịsaịa 9:6) Mgbe Jisọs tasịworo ahụhụ nile ọ tara dị ka mmadụ bụ́ mkpụrụ obi, lee ka ọ na-aghaghị isiworị bụụrụ ya ihe na-enye afọ ojuju inwe olileanya nke ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ ná mmehie na ọnwụ! N’ezie, ọ ghaghị ịbụ ihe na-enye afọ ojuju ọbụna karị ịmata na iguzosi ike ya n’ezi ihe mere ka Nna ya nwee ihe ọ ga-azaghachi n’ịta ụta nile nke Onye Iro Ya, bụ́ Setan Ekwensu.—Ilu 27:11.
32. “Ihe ọmụma” dị aṅaa ka Jisọs ji na-eme ka “ọha mmadụ ghọọ ndị ezi omume,” olee ndị kwa nọ n’ọnọdụ a?
32 Ngọzi ọzọ nke si n’ọnwụ Jisọs pụta bụ na ọ na-eme ka “ọha mmadụ ghọọ ndị ezi omume,” ọbụna ugbu a. Aịsaịa na-ekwu na ọ na-eme ya site ‘n’ihe ọmụma ya.’ Dị ka ihe àmà na-egosi, nke a bụ ihe ọmụma Jisọs nwetara site n’ịghọ mmadụ na ịta ahụhụ n’ụzọ na-akwụghị ọtọ n’ihi nrubeisi ya nye Chineke. (Ndị Hibru 4:15) Ebe ọ taworo ahụhụ ruo n’ọnụ ọnwụ, Jisọs nwere ikike ịchụ àjà a chọrọ iji nyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị ezi omume. Olee ndị bụ ndị a na-aghọ ndị ezi omume? Nke mbụ, ụmụazụ ya e tere mmanụ. N’ihi na ha na-egosipụta okwukwe n’àjà Jisọs, Jehova na-agụ ha ná ndị ezi omume n’ebumnobi nke ido ha dị ka ụmụ na ime ha ndị ha na Jisọs ga-eketakọ ihe. (Ndị Rom 5:19; 8:16, 17) Ọzọkwa, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-egosipụta okwukwe n’ọbara Jisọs wụsịrị ma bụrụ ndị ezi omume n’ebumnobi nke ịbụ ndị enyi Chineke na ndị ga-alanarị Amagedọn.—Mkpughe 7:9; 16:14, 16; Jọn 10:16; Jemes 2:23, 25.
33, 34. (a) Gịnị ka anyị na-amụta banyere Jehova nke na-eme ka anyị nwee obi ụtọ? (b) Olee ndị bụ “ndị bara ụba,” bụ́ ndị Ohu ahụ Bụ́ Mesaịa ga-eketa “òkè” n’etiti ha?
33 N’ikpeazụ, Aịsaịa na-akọwa mmeri ndị Mesaịa ahụ ga-enwe, sị: “N’ihi nke a ka M ga-ekere ya òkè n’etiti ndị bara ụba, ọ ga-esokwa ndị nwere ume kesaa ihe ọ kwatara n’agha; n’ihi na ọ gbapụrụ mkpụrụ obi ya dị ka mmiri nye ọnwụ, ọ bụkwa ná ndị njehie ka a gụrụ ya: ma ya onwe ya bupụrụ mmehie ọtụtụ mmadụ, ọ bụkwa ndị njehie ka ọ na-arịọrọ arịrịọ.”—Aịsaịa 53:12.
34 Okwu mmechi nke akụkụ a nke amụma Aịsaịa na-akụzi ihe na-enye obi ụtọ banyere Jehova: O ji ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye ya kpọrọ ihe. A na-egosipụta nke a site ná nkwa bụ́ na ọ “ga-ekere” Ohu ahụ Bụ́ Mesaịa “òkè n’etiti ndị bara ụba.” O yiri ka e si n’ihe a na-emekarị, nke bụ́ ike ihe ndị a kwatara n’agha, nweta okwu ndị a. Jehova ji iguzosi ike n’ihe nke “ndị bara ụba” kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, gụnyere Noa, Abraham, na Job kpọrọ ihe, o debewokwara ha “òkè” n’ime ụwa ọhụrụ ya na-abịanụ. (Ndị Hibru 11:13-16) N’otu aka ahụ, ọ ga-ekenye Ohu ya Bụ́ Mesaịa òkè. N’ezie, Jehova agaghị ekwe ka nguzosi ike ya n’ezi ihe fuo nkịtị n’enwetaghị ụgwọ ọrụ. Anyị onwe anyị kwa pụrụ ijide n’aka na Jehova agaghị echezọ ‘ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri n’ebe aha Ya dị.’—Ndị Hibru 6:10.
35. Olee ndị bụ́ “ndị nwere ume,” ndị ha na Jisọs so kerịta ihe nkwata, gịnịkwa bụ ihe nkwata ndị ahụ?
35 Ohu Chineke ga-enwetakwa ihe nkwata n’agha site n’imeri ndị iro ya. Ọ ga-eso “ndị nwere ume” kerịta ihe nkwata ndị a. Ná mmezu ya, olee ndị bụ “ndị [ahụ] nwere ume”? Ha bụ ndị mbụ na-eso ụzọ Jisọs, ndị meriri ụwa dị ka o meriri ya—ụmụ amaala nke “Israel nke Chineke,” ndị dị 144,000. (Ndị Galetia 6:16; Jọn 16:33; Mkpughe 3:21; 14:1) Gịnịzi bụ ihe nkwata ndị ahụ? Dị ka ihe àmà na-egosi, ndị a na-agụnye “onyinye [n’ụdị] mmadụ,” bụ́ ndị Jisọs napụtara n’aka Setan, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, were ha nye ọgbakọ ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 4:8-12, NW) E nyekwara “ndị nwere ume” dị 144,000 òkè n’ihe nkwata ọzọ. N’ihi mmeri ha meriri ụwa, ha napụrụ Setan ihe ọ bụla ọ ga-eji taa Chineke ụta! Nrara ha raara onwe ha nye Jehova bụ́ nke a na-apụghị imebi emebi na-ebuli ya elu, na-eme ka obi ya ṅụrịa.
36. Jisọs ọ̀ maara na ya na-emezu amụma banyere Ohu Chineke? Kọwaa.
36 Jisọs maara na ya na-emezu amụma banyere Ohu Chineke. N’abalị ahụ e jidere ya, o hotara ihe e dekọrọ n’Aịsaịa 53:12 ma jiri ya mee ihe n’ebe onwe ya nọ, sị: “Asị m unu, na ihe a e deworo n’akwụkwọ nsọ aghaghị imezu n’ahụ m, Ọ bụkwa ná ndị na-emebi iwu ka a gụrụ Ya: n’ihi na ihe dịịrị m nwere ọgwụgwụ.” (Luk 22:36, 37) N’ụzọ dị mwute, e mesoro Jisọs n’ezie dị ka onye mmebi iwu. E gburu ya dị ka onye na-ada iwu, kpọgide ya n’elu osisi n’etiti ndị ohi abụọ. (Mak 15:27) Ma, o ji ọchịchọ obi ya die nkọcha a, ebe ọ maara nke ọma na ya na-arịọchitere anyị arịrịọ. Ya bụ, o gbochiere ndị mmehie ihe otiti nke bụ́ ntaramahụhụ ọnwụ, ọ natakwara ihe otiti ahụ n’onwe ya.
37. (a) Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme banyere ndụ na ọnwụ Jisọs na-enyere anyị aka ịmata gịnị? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ekele n’ebe Jehova Chineke na Ohu ya e buliri elu, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ?
37 Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme banyere ndụ na ọnwụ Jisọs na-eme ka anyị nwee ike ịmata n’ehieghị ụzọ na: Jisọs Kraịst bụ Ohu ahụ Bụ́ Mesaịa nke e kwuru maka ya n’amụma Aịsaịa. Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele na Jehova dị njikere ikwe ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya rụọ ọrụ ahụ e buru n’amụma banyere Ohu ahụ, taa ahụhụ ma nwụọ ka e wee nwee ike ịgbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ! Jehova si otú a gosi anyị ịhụnanya dị ukwuu. Ndị Rom 5:8 na-ekwu, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” Lee ka anyị kwesịkwara isi nwee ekele n’ebe Jisọs Kraịst nọ, bụ́ Ohu ahụ e buliri elu, onye ji ọchịchọ obi ya gbapụ mkpụrụ obi ya dị ka mmiri nye ọnwụ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ná nsụgharị ya nke Aịsaịa 52:13, Targum nke Jonathan ben Uzziel (narị afọ mbụ O.A.) dere, dị ka J. F. Stenning si sụgharịa ya, na-ekwu, sị: “Lee, ohu m, bụ́ Onye E Tere Mmanụ (ma ọ bụ, Mesaịa ahụ), ga-enwe ihe ịga nke ọma.” N’otu aka ahụ, Talmud nke Babilọn (ihe dị ka narị afọ nke atọ O.A.) na-ekwu, sị: “Mesaịa ahụ—gịnị bụ aha ya? . . . [; ndị] òtù Rabaị [na-ekwu na ọ bụ Onye ahụ na-arịa ọrịa], ebe ọ bụ na e kwuru sị, ‘N’ezie, o buruwo ọrịa anyị dị iche iche.’”—Sanhedrin 98b; Aịsaịa 53:4.
b Onye amụma bụ́ Maịka zoro aka n’ebe Betlehem nọ dị ka “nke dị nta ịdị n’etiti usuu nile nke [ọtụtụ puku] nke Juda.” (Maịka 5:2) Ma, Betlehem dị nta nwere ihe ùgwù pụrụ iche nke ịbụ obodo a mụrụ Mesaịa na ya.
c E jikwa okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “e tiworo ihe otiti” mee ihe n’ihe banyere ekpenta. (2 Ndị Eze 15:5) Dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta si kwuo, ndị Juu ụfọdụ nwetara echiche bụ́ na Mesaịa ahụ ga-abụ onye ekpenta site n’Aịsaịa 53:4. Talmud nke Babilọn ji amaokwu a mee ihe banyere Mesaịa ahụ, na-akpọ ya “ọkà mmụta bụ́ onye ekpenta.” N’iṅomi Vulgate nke Latin, Douay Version nke ndị Katọlik sụgharịrị amaokwu a ịbụ: “Anyị echewo na ọ bụ onye ekpenta, dị ka a pụrụ isi kwuo ya.”
[Chaatị dị na peeji nke 212]
OHU JEHOVA
Otú Jisọs Si Rụzuo Ọrụ Ahụ
AMỤMA
IHE MERENỤ
MMEZU YA
E mere ka ọ dị elu, buliekwa ya elu
Ọrụ 2:34-36; Fil. 2:8-11; 1 Pita 3:22
A kọwahiere ma katọọ ya
Mat. 11:19; 27:39-44, 63, 64; Jọn 8:48; 10:20
O mere ihe tụrụ ọtụtụ mba n’anya
Mat. 24:30; 2 Tesa. 1:6-10; Mkpu. 1:7
E kweghị na ya
Jọn 12:37, 38; Rom 10:11, 16, 17
Mmalite ya dị ka mmadụ dị ala, ọ bụghịkwa nke okomoko
E ledara ya anya ma jụ ya
Mat. 26:67; 23:18-25; Jọn 1:10, 11
O buuru ọrịa anyị
A mapuru ya
Ọ tara ahụhụ n’ihi mmehie nke ndị ọzọ
Ọ dị nwayọọ, ọ dịghịkwa eme mkpesa n’ihu ndị na-ebo ya ebubo
Mat. 27:11-14; Mak 14:60, 61; Ọrụ 8:32, 35
E kpere ya ikpe ma ma ya ikpe n’ụzọ na-ezighị ezi
Mat. 26:57-68; 27:1, 2, 11-26; Jọn 18:12-14, 19-24, 28-40
E liri ya n’etiti ndị ọgaranya
E doro mkpụrụ obi ya dị ka àjà ikpe ọmụma
O mepeere ọtụtụ ndị ụzọ ịghọ ndị ezi omume
Rom 5:18, 19; 1 Pita 2:24; Mkpu. 7:14
A gụrụ ya ná ndị mmehie
Mat. 26:55, 56; 27:38; Luk 22:36, 37
[Foto dị na peeji nke 203]
‘Ndị mmadụ ledara ya anya’
[Foto dị na peeji nke 206]
“Ọ dịghị asaghe ọnụ ya”
[Ebe E Si Nweta Foto]
Akụku nke ihe osise sitere na “Ecce Homo” nke Antonio Ciseri sere
[Foto dị na peeji nke 211]
“Ọ gbapụrụ mkpụrụ obi ya dị ka mmiri nye ọnwụ”