Ụzọ Isi Mee Nnyocha
EZE SOLOMỌN “ṅakwara ntị, wee gwupụta, mee ka ọtụtụ ilu dịzie.” N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere mmasị ide “okwu nile nke eziokwu.” (Ekli. 12:9, 10) Luk ‘sitere ná mmalite tụleghachi ihe nile n’ụzọ ziri ezi’ iji wee kọọ ihe ndị mere ná ndụ Kraịst n’usoro n’usoro. (Luk 1:3) Mmadụ abụọ a jeere Chineke ozi nọ na-eme nnyocha.
Gịnị bụ nnyocha? Ọ bụ nchọpụta e leziri anya na-eme iji nweta ihe ọmụma banyere ihe. Ọ na-agụnye ịgụ ihe, ọ na-achọkwa ka e jiri ụkpụrụ ndị e ji amụ ihe mee ihe. Ọ pụkwara ịgụnye ịgba ndị mmadụ ajụjụ ọnụ.
Ọnọdụ ndị dị aṅaa na-eme ka ime nnyocha dị mkpa? Lee ihe atụ ole na ole. Ọmụmụ ihe onwe onye gị ma ọ bụ ọgụgụ Bible pụrụ ịkpalite ajụjụ ndị dị mkpa nye gị. Onye ị gbaara àmà pụrụ ịjụ ajụjụ nke ị ga-achọ inweta ihe ọmụma a kapịrị ọnụ iji zaa ya. Ọ pụrụ ịbụ na e kenyere gị okwu ị ga-ekwu.
Chee echiche banyere ihe omume ahụ e kenyere gị bụ́ ikwu okwu. Ihe e kenyere gị ikwu okwu na ya pụrụ iyi nke sara mbara. Olee otú ị pụrụ isi kwuo ya ka o metụta ọgbakọ gị? Mee ka o nwekwuo ihe mmụta site n’ime nnyocha. Mgbe e ji ndekọ ọnụ ọgụgụ ma ọ bụ ihe atụ kwekọrọ n’ihe ị ga-ekwu nke metụtara ndụ ndị na-ege gị ntị kwadoo ya, isi ihe nke pụrụ iyiworị ihe onye ọ bụla maara na-aghọ nke nwere ihe mmụta, ọbụna nke na-akpali akpali. Ọ pụrụ ịbụ na e bu ndị na-agụ akwụkwọ anyị n’ụwa dum n’obi wee kwadebe akwụkwọ ahụ ihe omume gị si na ya, ma ọ dị mkpa ka ị kọwakwuo isi ihe ndị dị na ya, nye ihe atụ, ma mee ka ha metụta otu ọgbakọ ma ọ bụ otu onye. Olee otú i kwesịrị isi malite?
Tupu ị chọgharịwa ihe ọmụma, chee echiche banyere ndị ga-ege gị ntị. Gịnị ka ha ga-amaworị? Gịnị ka ọ dị ha mkpa ịmara? Mgbe ahụ, mata ihe bụ́ ebumnobi gị. Ọ̀ bụ ịkọwa ihe? ime ka e kweta n’ihe? ịgbagha ihe? ka ọ̀ bụ ịkpali ndị na-ege ntị? Ịkọwa ihe na-achọ ka e nyekwuo ihe ọmụma iji mee ka otu ihe doo anya. Ọ bụ ezie na a pụrụ ịghọta eziokwu ndị bụ́ isi, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i nyekwuo nkọwa banyere mgbe ma ọ bụ otú a ga-esi mee ihe ị na-ekwu. Ime ka e kweta ihe na-achọ ka e kwuo ihe mere ihe ji dị otú ọ dị, tinyere inye ihe àmà. Ịgbagha ihe na-achọ ka a mara ihe nile metụtara otu okwu nke ọma tinyere iji nlezianya tụlee ihe àmà ndị e ji mee ihe. Otú ọ dị, anyị na-achọ ọ bụghị nanị arụmụka ndị gbara ọkpụrụkpụ kama ụzọ isi wepụta ihe ndị bụ́ eziokwu n’ụzọ obiọma. Ịkpali ndị na-ege ntị na-agụnye iru n’obi ha. Ọ pụtara ịgwa ndị na-ege gị ntị ihe ga-akwali ha ma mee ka ha nwekwuo ọchịchọ ime ihe banyere ihe a na-ekwu. Ihe atụ mere eme n’ezie banyere ndị meworo ụdị ihe ahụ, ọbụna mgbe ha nọ na-eche ihe isi ike ihu, pụrụ inye aka iji ruo n’obi ha.
Ugbu a, ị̀ dị njikere ịmalite? Ọ ka fọtụrụ. Tụlee otú ihe ọmụma ị chọrọ ga-aha. Oge pụrụ ịbụ otu ihe dị mkpa. Ọ bụrụ na ị ga-agwa ndị ọzọ ihe ọmụma ahụ, oge hà aṅaa ka ị ga-enwe iji mee ya? Ọ̀ bụ minit 5? Ọ̀ bụ minit 45? À kapịrị oge ị ga-ekwu ya ọnụ, dị ka ná nzukọ ọgbakọ, ka ọ̀ bụ nke a pụrụ ịgbanwegharị, dị ka mgbe a na-eduzi ọmụmụ Bible ma ọ bụ na-eme nleta ọzụzụ atụrụ?
N’ikpeazụ, olee ihe ndị e ji eme nnyocha ndị aka gị pụrụ iru? Tụkwasị ná ndị i nwere n’ụlọ, è nwere ndị ọzọ n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Ụmụnna ndị nọworo na-ejere Jehova ozi eri ọtụtụ afọ, hà ga-ekwe ka i jiri ihe ndị ha ji eme nnyocha mee ihe? È nwere ọ́bá akwụkwọ ọha na eze n’ógbè gị bụ́ ebe a pụrụ iji akwụkwọ ndị e ji eme nchọpụta mee ihe ma ọ́ dị mkpa?
Iji Ihe Bụ́ Isi Anyị Ji Eme Nnyocha Eme Ihe—Bible
Ọ bụrụ na nnyocha ị na-eme bụ banyere ihe otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ pụtara, malite na Bible n’onwe ya.
Nyochaa Ihe Ndị E Kwuru Gburugburu Ya. Jụọ onwe gị sị: ‘Ònye ka a gwara ihe dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a? Gịnị ka amaokwu ndị gbara ya gburugburu na-egosi banyere ọnọdụ ndị dugara n’okwu ahụ ma ọ bụ banyere omume nke ndị o metụtara?’ Ọtụtụ mgbe ụmụ irighiri ihe ndị dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịghọta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ha pụkwara ime ka okwu ị pụrụ iji ha mee ihe na ya kporo ọkụ.
Dị ka ihe atụ, a na-ehotakarị Ndị Hibru 4:12 iji gosi ike Okwu Chineke nwere iru n’obi na ịgbanwe ndụ ndị mmadụ. Ihe ndị e kwuru gburugburu ya na-eme ka anyị ghọtakwuo ụzọ nke ahụ pụrụ isi dị otú ahụ. Ọ na-ekwu banyere ahụmahụ ụmụ Izrel nwere n’ime afọ 40 ha nọrọ n’ala ịkpa tupu ha abanye n’ala ahụ Jehova kwererị Ebreham ná nkwa. (Hib. 3:7–4:13) “Okwu Chineke,” nke bụ́ nkwa o kwere iduba ha n’ebe izu ike n’ikwekọ n’ọgbụgba ndụ ya na Ebreham, anwụghị anwụ; ọ dị ndụ, na-erukwa mmezu ya. Ụmụ Izrel nwere ezi ihe mere ha ga-eji nwee okwukwe na ya. Otú ọ dị, ka Jehova du ha site n’Ijipt ruo n’Ugwu Saịnaị, na-agakwa n’Ala Nkwa ahụ, ha gosiri enweghị okwukwe ugboro ugboro. Ya mere, site ná mmeghachi omume ha n’ụzọ Chineke si mezuo okwu ya, ihe dị ha n’obi pụtara ìhè. N’ụzọ yiri nke ahụ taa, nkwa Chineke kwere na-ekpughe ihe dị ndị mmadụ n’obi.
Lee Ntụaka Etiti Peeji. Bible ụfọdụ nwere ntụaka etiti peeji. Nke gị ò nwere ha? Ọ bụrụ na o nwere ha, ha pụrụ inye aka. Lee otu ihe atụ nke sitere na New World Translation of the Holy Scriptures. Pita nke Mbụ 3:6 na-ekwu na Sera bụ ihe nlereanya, nke ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi. Ntụaka etiti peeji nke na-atụ aka na Jenesis 18:12 na-akwado nke ahụ site n’ikwu na Sera kpọrọ Ebreham onyenwe ya “n’ime onwe ya.” Ya mere, odudo o doro onwe ya n’okpuru ya sitere ya n’obi. Tụkwasị n’ime ka e nweta nghọta ndị dị otú ahụ, ntụaka etiti peeji pụrụ ịtụrụ gị aka n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi mmezu nke otu amụma Bible ma ọ bụ ihe atụ nke ọgbụgba ndụ Iwu. Otú ọ dị, ghọta na e deghị ụfọdụ ntụaka etiti peeji iji na-enye nkọwa ndị dị otú ahụ. Ha pụrụ nanị izo aka n’echiche ndị yiritara ma ọ bụ n’ihe ọmụma banyere ndụ ndị mmadụ ma ọ bụ ebe dị iche iche.
Jiri Ndepụta nke Okwu Ndị Dị na Bible Mee Nnyocha. Ndepụta okwu ndị dị na Bible bụ ndepụta nke mkpụrụ okwu ndị e ji mee ihe na Bible n’usoro mkpụrụ akwụkwọ ha. Ọ pụrụ inyere gị aka ịchọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara isiokwu ị na-eme nnyocha na ya. Ka ị na-enyocha ha, ị ga-amụta ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ na-enye aka. Ị ga-ahụ ihe àmà nke “ụkpụrụ” nke eziokwu nke e setịpụrụ n’Okwu Chineke. (2 Tim. 1:13) Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nwere ndepụta na-asaghị mbara nke “Ndepụta nke Okwu Ndị Dị na Bible.” Comprehensive Concordance nwere ndepụta sara nnọọ mbara karị. Ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ gị, ọ ga-eduru gị gaa n’amaokwu nile nwere nke ọ bụla n’ime okwu ndị bụ́ isi ndị dị n’ime Bible.
Ịmụta Iji Ihe Ndị Ọzọ E Ji Eme Nnyocha Eme Ihe
N’igbe dị na peeji nke 33, e depụtara ụfọdụ ihe ndị ọzọ e ji eme nnyocha nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” wepụtaworo. (Mat. 24:45-47) Ọtụtụ n’ime ha nwere ndepụta nke ihe ndị dị n’ime ha, ọtụtụ nwekwara ndepụta ntụaka n’azụ ha, bụ́ nke e mere iji nyere gị aka ịchọta kpọmkwem ihe ọmụma a kapịrị ọnụ ị na-achọ. Ná ngwụsị afọ ọ bụla, a na-ebipụta ndepụta ntụaka nke isiokwu dị iche iche ma n’Ụlọ Nche ma na Teta! maka isiokwu nile e bipụtara n’afọ ahụ.
Ịmara ụdị ihe ọmụma ndị a na-ede n’akwụkwọ ndị a e ji amụ Bible pụrụ ime ka ime nnyocha dịkwuo ngwa. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị chọrọ ịmara banyere amụma, ozizi, omume Ndị Kraịst, ma ọ bụ itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. O yiri ka ihe ị na-achọ ọ̀ ga-adị n’Ụlọ Nche. Teta! na-akọ banyere ihe ndị na-eme eme ugbu a, nsogbu ndị a na-enwe n’oge a, okpukpe, sayensị, na ndị nọ ná mba dị iche iche. Nkọwa nke akụkọ nke ọ bụla dị n’Oziọma ndị ahụ, n’usoro oge ha ji mee, dị na Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ntụle amaokwu n’amaokwu nke otu akwụkwọ dum n’ime akwụkwọ ndị dị n’ime Bible dị ná mbipụta ndị dị ka Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, nakwa ná mpịakọta abụọ nke Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ. Na Reasoning From the Scriptures, ị ga-achọta azịza ndị na-eju afọ nye ọtụtụ narị ajụjụ dabeere na Bible bụ́ ndị a na-ajụkarị n’ozi ubi. Iji nweta nghọta doro anya karị banyere okpukpe ndị ọzọ, ozizi ha, na akụkọ banyere otú ha si malite, lee Mankind’s Search for God. Ihe ndekọ sara mbara nke akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova n’oge a dị na Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom. Iji nweta akụkọ banyere ihe kasị ọhụrụ na-emenụ ná nkwusa ozi ọma zuru ụwa ọnụ, lee Yearbook of Jehovah’s Witnesses nke kasị ọhụrụ. Insight on the Scriptures bụ akwụkwọ ihe ọmụma Bible nakwa akwụkwọ nwere maapụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta nkọwa zuru ezu banyere ndị mmadụ, ebe dị iche iche, ihe, asụsụ dị iche iche, ma ọ bụ akụkọ ihe mere eme ndị e jikọtara ha na Bible, akwụkwọ a bụ ebe magburu onwe ya a pụrụ isi nweta ihe ọmụma.
“Watch Tower Publications Index.” Index a, nke a na-ebipụta n’ihe karịrị asụsụ 20, ga-atụrụ gị aka n’ihe ọmụma ndị dị ná mbipụta anyị dịgasị iche iche. E kebiri ya gaa ná ndepụta ntụaka isiokwu nakwa ná ndepụta ntụaka akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Iji jiri ndepụta ntụaka isiokwu mee ihe, chọta otu okwu nke na-anọchite anya ihe ị chọrọ ime nnyocha na ya. Iji jiri ndepụta ntụaka akụkụ Akwụkwọ Nsọ mee ihe, chọta n’ebe ahụ e depụtara akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche otu nke ị ga-achọ ịghọtakwu. Ọ bụrụ na ọ dịwo ihe e bipụtara banyere isiokwu ahụ ma ọ bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’asụsụ gị n’afọ ndị Index ahụ gụnyere, ị ga-ahụ ndepụta nke akwụkwọ ndị e zoro aka na ha ndị ị ga-aga gụọ. Jiri nkọwa dị ná mbido Index ahụ mata ndebiri nke aha akwụkwọ ndị e zoro aka na ha. (Dị ka ihe atụ, site n’ihe enyemaka ahụ, ị ga-amụta na w99 3/1 15 na-ezo aka n’Ụlọ Nche nke 1999 (Bekee), mbipụta nke March 1, peeji nke 15.) Isiokwu ndị bụ́ isi, dị ka “Field Ministry” (Ahụmahụ Ozi Ubi) na “Life Stories of Jehovah’s Witnesses” (Akụkọ Ndụ nke Ndịàmà Jehova), pụrụ inye aka n’ịkwadebe ihe omume na-akpali akpali maka ọgbakọ.
Ebe ọ bụ na ime nnyocha pụrụ ịbụ ihe na-adọrọ mmasị nke ukwuu, lezie anya ka ị ghara ịga n’ihe ọzọ. Mee ka uche gị dịrị n’ebumnobi gị nke bụ́ ịchọta ihe ọmụma dị mkpa maka ihe omume i ji n’aka. Ọ bụrụ na ọ dị akwụkwọ nke Index ahụ zooro gị aka na ya, sapeta peeji (ndị) o zoro aka na ya (ha), mgbe ahụ jiri isiokwu nta na ahịrịokwu ndị malitere paragraf dị iche iche mere ihe nduzi iji nweta ihe ọmụma nke dabara n’ihe ị chọrọ. Ọ bụrụ na e nwere otu amaokwu Bible ị na-achọ ihe ọ pụtara, buru ụzọ chọta ebe e dere amaokwu ahụ n’ime peeji ahụ e zooro gị aka na ya. Mgbe ahụ tụlee ihe ndị e kwuru gburugburu ya.
“Watchtower Library” nke Dị na CD-ROM. Ọ bụrụ na i nwere kọmputa, ị pụrụ irite uru site n’iji Watchtower Library nke dị na CD-ROM na-eme ihe, bụ́ nke nwere ọtụtụ akwụkwọ anyị. Usoro dị mfe e ji achọta ihe na ya na-eme ka o kwe gị omume ịchọ otu mkpụrụ okwu, ihe karịrị otu mkpụrụ okwu, ma ọ bụkwanụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ na nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị dị na Watchtower Library ahụ. Ọ bụrụgodị na ihe a e ji eme nnyocha adịghị n’asụsụ gị, ị ga-enwe ike irite uru na ya n’asụsụ ị na-aghọta nke a na-asụ n’ihe karịrị otu mba.
Ọ́bá Akwụkwọ Ọchịchị Chineke Ndị Ọzọ
N’akwụkwọ ozi ya nke abụọ sitere n’ike mmụọ nsọ o degaara Timoti, Pọl gwara nwa okorobịa ahụ ka o wetara ya na Rom, “akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, karịsịa akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe.” (2 Tim. 4:13) Pọl jiri ihe odide ụfọdụ kpọrọ ihe ma debe ha. Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Ị̀ na-edebe Ụlọ Nche, Teta!, na Ozi Alaeze Anyị nke gị ọbụna mgbe a tụlesịworo ha ná nzukọ ọgbakọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-enwe ha maka iji ha na-eme ihe dị ka ihe ndị e ji eme nnyocha, tinyere akwụkwọ ndị ọzọ nke Ndị Kraịst bụ́ ndị i nwetaworo. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ọgbakọ na-enwe akwụkwọ ọchịchị Chineke dị iche iche n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha bụ maka abamuru nke ọgbakọ dum, maka ha iji ha na-eme ihe mgbe ha nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Nwee Faịlụ nke Aka Gị
Mụrụ anya iji rịba ihe ndị na-akpali mmasị bụ́ ndị ị pụrụ iji mee ihe mgbe ị na-ekwu okwu ma na-ezi ihe ama. Ọ bụrụ na ị hụ otu akụkọ, ọnụ ọgụgụ, ma ọ bụ ihe atụ ị pụrụ iji mee ihe n’ozi gị n’ime akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ na magazin, bekapụta ya ma ọ bụ depụta ihe ọmụma ahụ. Denye akara ụbọchị, isiokwu mbipụta ahụ, nakwa ma eleghị anya aha onye dere ya ma ọ bụ ndị bipụtara ya. Ná nzukọ ọgbakọ, detuo ihe ndị ị pụrụ iji soro ndị ọzọ tụgharịa uche na ihe atụ ndị pụrụ inyere gị aka ịkọwara ndị ọzọ eziokwu ahụ. Ọ̀ dịtụwo mgbe i chetara ihe atụ dị mma ma i nweghị ohere iji ya mee ihe ozugbo? Detuo ya, ma tinye ya na faịlụ. Mgbe ị nọworo na-ekere òkè n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ruo oge ụfọdụ, ọ ghaghị ịbụ na ị kwadebewo ọtụtụ ihe omume. Kama ịtụfu ihe ndị i deturu n’okwu ndị a, debe ha. Nnyocha ndị ị meworo pụrụ ịbara gị uru n’ọdịnihu.
Soro Ndị Mmadụ Kwurịta Okwu
A na-esite n’aka ndị mmadụ enweta ọtụtụ ihe ọmụma. Mgbe Luk na-edekọ Oziọma ya, ihe àmà na-egosi na o nwetara ihe ọmụma dị ukwuu site n’ịgba ndị ji anya ha hụ ihe ndị merenụ ajụjụ ọnụ. (Luk 1:1-4) Ikekwe, Onye Kraịst ibe gị pụrụ ime ka ị ghọtakwuo ihe ị nọworo na-agbalị ime nnyocha na ya. Dị ka Ndị Efesọs 4:8, 11-16 si kwuo, Kraịst na-eji “onyinye n’ụdị mmadụ” enyere anyị aka ito eto “n’ezi ihe ọmụma banyere Ọkpara Chineke.” Ịgba ndị nweworo ahụmahụ n’ijere Chineke ozi ajụjụ ọnụ pụrụ ime ka i nweta echiche bara uru. Gị na ndị mmadụ ikwurịta okwu pụkwara ikpughe ihe ha na-eche, nke a pụkwara inyere gị aka ịkwadebe ihe omume dị irè n’ezie.
Tụlee Ihe Ndị I Metara ná Nnyocha Gị
Mgbe e wetasịrị ọka wit n’ubi, ọ na-adị mkpa iwepụtasị mkpụrụ ya site n’ahịhịa ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ihe i metara ná nnyocha gị. Tupu ọ dị mma ka e jiri ya mee ihe, ọ dị mkpa ka i kewapụ ihe ndị bara uru site n’ihe ndị na-adịghị mkpa.
Ọ bụrụ na ị ga-eji ihe ọmụma ahụ mee ihe n’okwu, jụọ onwe gị, sị: ‘Isi ihe m na-eme atụmatụ iji mee ihe, ọ̀ na-atụnye ụtụ bara uru n’ezie n’isiokwu ahụ m ga-ekwu? Ka ò yiri ka ọ na-adọpụ uche n’isiokwu m kwesịrị ikwu okwu na ya, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe na-akpali mmasị?’ Ọ bụrụ na ị na-eche echiche iji ihe ndị na-eme ugbu a mee ihe ma ọ bụ ihe ọmụma sitere na nkà mmụta sayensị ma ọ bụ nkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike bụ́ nke na-agbanwe agbanwe mgbe nile, jide n’aka na ihe ọmụma ahụ bụ nke kasị ọhụrụ. Ghọtakwa na ọ pụrụ ịbụ na e kwuwo ihe ndị ọhụrụ n’isi ihe ụfọdụ dị ná mbipụta anyị ndị metụworo ochie, ya mere tụlee ihe kasị ọhụrụ e bipụtaworo n’isiokwu ahụ.
Ọ dị mkpa nke ukwuu ịkpachara anya ma ọ bụrụ na ị kpebiri isi n’akwụkwọ ndị ụwa were ihe ọmụma. Echefula mgbe ọ bụla na Okwu Chineke bụ eziokwu. (Jọn 17:17) Jizọs na-ekere òkè gbara ọkpụrụkpụ ná mmezu nke nzube Chineke. N’ihi nke a, Ndị Kọlọsi 2:3 na-asị: “E ji nlezianya zochie akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nile nke amamihe na nke ihe ọmụma n’ime ya.” Jiri echiche ahụ tụlee ihe ndị i metara ná nnyocha gị. Banyere ime nnyocha n’akwụkwọ ndị ụwa, jụọ onwe gị, sị: ‘È kwubigara okwu ókè, kọọ nkọ, ma ọ bụ gosi echepụghị echiche n’ihu n’ihe ọmụma a? Ọ̀ bụ ọdịmma onwe onye nanị ka ọ̀ bụ iji chụta ego ka e bu n’obi dee ya? Akwụkwọ ndị ọzọ maara nke ha na-akọ, hà kwenyere na ya? Karịsịa, ò kwekọrọ n’eziokwu Bible?’
Ilu 2:1-5 na-agba anyị ume ịnọgide na-achọ ihe ọmụma, nghọta, na mmata ‘dị ka ọlaọcha na akụ̀ zoro ezo.’ Nke ahụ na-apụta ma mgbalị siri ike ma ụgwọ ọrụ bara ụba. Ime nnyocha na-achọ mgbalị, ma ime ya ga-enyere gị aka ịchọpụta echiche Chineke n’ihe, ịgbazi echiche na-ezighị ezi, na ime ka i jisie eziokwu aka ike. Ọ ga-atụkwasị ihe n’okwu gị ma mee ka ọ na-ekpo ọkụ karị, na-eme ka ha dị ụtọ okwukwu, dịkwa ụtọ ịnụ.