Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 11/1 p. 28-31
  • Ụzọ Isi Hazie Ọbá Akwụkwọ Ọchịchị Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Hazie Ọbá Akwụkwọ Ọchịchị Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọbá Akwụkwọ Abụghị Ihe Okomoko”
  • Olee Akwụkwọ Ndị Dị M Mkpa?
  • Hazie Ọbá Akwụkwọ Gị!
  • Ọbá Akwụkwọ Ọchịchị Chineke Pụrụ Inye Aka Wulite Ọnọdụ Ime Mmụọ
  • Olee Uru Ọ́bá Akwụkwọ Dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Baara Anyị?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ndokwa Ọhụrụ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Ụlọ Nzukọ Alaeze
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Werenụ Ha Kama Ibusa Ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze
    Ozi Alaeze Anyi—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 11/1 p. 28-31

Ụzọ Isi Hazie Ọbá Akwụkwọ Ọchịchị Chineke

SHEREZADE, ntakịrị nwa nwanyị bụ́ onye Spain nke nwere ọgụgụ isi, dị afọ anọ mgbe onye nkụzi ya gwara ụmụ klasị na ha gaje iji ágbá tejie onyinyo dị iche iche nke “Fada Krismas.” Ozugbo ahụ Sherezade rịọrọ ka ya ghara iso. Ọ kọwara na akọ na uche ya agaghị ekwe ya mee nke ahụ.

N’ịbụ onye ọjụjụ nke a juru anya, onye nkụzi ahụ gwara ya na o yiri nanị ka iji ágbá tejie ihe osise nke ihe ngwuri egwu na ọ dịghịkwa ihe dị njọ na nke ahụ. Sherezade zaghachiri, sị: “Ọ bụrụ na ọ bụ nanị ihe ngwuri egwu, ọ ga-amasị m karị ise otu ihe ngwuri egwu n’onwe m ma ọ bụrụ na ị ga-ekwe.”

N’oge ọzọkwa a gwara ụmụ klasị ahụ ka ha tejie ọkọlọtọ mba ahụ. Ọzọkwa Sherezade rịọrọ ma ya pụrụ ime ihe ọzọ dị iche. N’ụzọ nkọwa, ọ kọọrọ onye nkụzi ahụ akụkọ Shedrak, Mishak, na Abednego.​—⁠Daniel 3:​1-⁠28.

Oge na-adịghị anya ka e mesịrị onye nkụzi ahụ kpọrọ nne Sherezade na fon iji kọwapụta ihe ijuanya ya. “Ada gị nwanyị agwawo m okwu ọtụtụ ugboro banyere akọ na uche ya,” ka ọ sịrị. “Cheedị echiche banyere nke ahụ. Nwatakịrị nwanyị dị ka ya ịkọwara m ihe mere akọ na uche ya ji na-enye ya nsogbu! Lee anya, akwadoghị m ihe ị na-akụziri ya, ma ana m emesi gị obi ike na ị na-enwe ihe ịga nke ọma. Achọkwara m ime ka ị mara na ana m ekpupụrụ ada gị okpu.”

Olee otú nwatakịrị nwanyị dị afọ anọ pụrụ isi nweta akọ na uche e ji Bible zụọ? Nne ya, bụ́ Marina, na-akọwa na Sherezade nwere ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke nke ya n’ime ụlọ ihi ụra ya. Ọbá akwụkwọ ahụ gụnyere Ụlọ Nche ndị nke ya, bụ́ ndị ọ kaworo ákàrà n’okpuru ha, akwụkwọ ndị o ji eme nkwusa, na mbipụta nile nke Watchtower Society ndị e wepụtaworo kemgbe a mụrụ ya. Ihe kasị amasị ya n’ọbá akwụkwọ ya bụ tepu bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible, bụ́ nke ọ na-ege kwa abalị ka ọ na-esonye n’akwụkwọ nke ya. Ọ bụ ihe ndekọ Bible ndị a nyeere ya aka ime mkpebi ndị ahụ e hotara n’elu.

Ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke a haziri nke ọma ọ̀ pụrụ inyere gị na ụmụ gị aka? N’ihi gịnị ka ọbá akwụkwọ ebe obibi ji dị mkpa?

“Ọbá Akwụkwọ Abụghị Ihe Okomoko”

“Ọbá akwụkwọ abụghị ihe okomoko, kama otu n’ime ihe ndị dị mkpa ná ndụ,” ka Henry Ward Beecher kwupụtara. Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ anyị nile nwere otu n’ime ‘ihe ndị a dị mkpa ná ndụ,’ ọ bụ ezie na ọ bụ n’amaghị ama. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na a sịgodi na ọ dịghị ihe ọzọ anyị nwere ma e wezụga Bible, anyị nwere ihe a pụrụ ịkpọ ọbá akwụkwọ.

Bible bụ n’ezie ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke nke kasị mma. Na narị afọ nke anọ, Jerome wepụtara okwu Latin bụ́ Bibliotheca Divina (Ọbá Akwụkwọ Chineke) iji kọwaa nchịkọta ahụ zuru ezu nke akwụkwọ ndị sitere n’ike mmụọ nsọ nke anyị na-akpọ Bible. Jehova nyere anyị ọbá akwụkwọ nke a dị nsọ iji nye anyị enyemaka, ntụziaka, na nduzi a pụrụ itinye n’ọrụ. Ọ bụ ihe anyị na-ekwesịghị ileda anya mgbe ọ bụla. Nanị inwe Bible n’ozuzu ya pụtara na anyị nwere ọbá akwụkwọ ka saa mbara karịa ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke n’oge ndị gara aga.

Mgbe ọ bụ nanị mpịakọta ndị garara ọnụ ndị e ji aka dee bụ nanị ihe e nwere, ebe obibi ole na ole, ma ọ bụrụ na ọ dị nke ọ bụla, pụrụ ịnya isi na ha nwere Bible zuru ezu. Mgbe ọ gụrụ Pọl agụụ ịmụ Akwụkwọ Nsọ n’oge ọ nọ mkpọrọ ikpeazụ ya na Rom, ọ rịọrọ Timoti ka o wetara ya mpịakọta ụfọdụ site n’Asia Minor​—⁠ma eleghị anya akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. (2 Timoti 4:13) Otú ọ dị, ụlọ nzukọ dị iche iche chekwara nchịkọta nke akwụkwọ mpịakọta dị iche iche, ma Jisọs Kraịst ma Pọl onyeozi jikwara ọbá akwụkwọ ndị a mee ihe n’ọrụ nkwusa ha. (Luk 4:​15-⁠17; Ọrụ 17:​1-⁠3) N’ịbụ ihe obi ụtọ, aka pụrụ iru Akwụkwọ Nsọ ugbu a karị ka ha dị na narị afọ mbụ.

N’ihi mmepụta nke ígwè ibi akwụkwọ, taa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ohu Chineke nile​—⁠n’agbanyeghị ihe bụ asụsụ ha⁠—​pụrụ inweta Bible dum n’ọnụ ego dị ala. Anyị nwekwara ihe ùgwù pụrụ iche nke ịgbakwụnye ihe ‘n’ọbá akwụkwọ’ a dị nsọ. Ruo ihe karịrị otu narị afọ, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” anọwo na-arụsi ọrụ ike na-ewepụta ihe oriri ime mmụọ n’oge ya.​—⁠Matiu 24:​45-⁠47.

Ma o yighị ka anyị ga-eji ihe ọmụma nke a bara oké uru mee ihe n’ụzọ zuru ezu ma ọ bụrụ na anyị ahazighị ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke nke onwe onye. Olee otú a pụrụ isi mee nke ahụ? N’ezie, nzọụkwụ mbụ bụ inweta akwụkwọ ndị dị ọbá akwụkwọ dị otú ahụ mkpa. O kwesịrị nnọọ mgbalị ya, ebe ọ bụ na ọ ga-enyere anyị aka inweta ngwa ngwa ihe ọmụma dị anyị mkpa kpọmkwem iji lebara nsogbu dị iche iche anya ma zaa ajụjụ dị iche iche nke Bible.

Olee Akwụkwọ Ndị Dị M Mkpa?

Ì chetụwo n’echiche otú ị pụrụ isi dozie nsogbu nkwurịta okwu n’ime alụmdi na nwunye gị ma ọ bụ otú ị pụrụ isi nyere ụmụ gị aka ịsị ee e n’ebe ọgwụ ọjọọ dị? Olee otú ị pụrụ isi nyere otu enyi aka bụ́ onye na-enwe obi ịda mbà? Ị̀ pụrụ ịkọwa n’ụzọ doro anya ihe àmà anyị nwere na Chineke dị na ihe mere o ji kwere ka ajọ omume dịrị? Gịnị ka anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nke Mkpughe isi 17 na-anọchite anya ya?

A pụrụ ịza ajụjụ ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ ma ọ bụrụ na i nwere ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke zuru ezu. Watchtower Society ebipụtawo akwụkwọ, broshuọ, na isiokwu magazin dị iche iche ndị na-atụle ozuzu nke isiokwu dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ. Ọzọkwa, akwụkwọ nke a na-ekwu banyere okwu ndị metụtara ezinụlọ, na-ewuli okwukwe anyị elu n’ebe Chineke na Bible dị, na-enyere anyị aka imeziwanye nkà ime nkwusa anyị, na-enyekwara anyị aka ịghọta amụma dị iche iche nke Bible.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime mbipụta ndị Society biworo n’ime 20 afọ gara aga ka dị. Ọ bụrụ na ị batara n’eziokwu n’oge na-adịbeghị anya, ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị ka i nweta akwụkwọ nile dị otú ahụ ndị e nwere n’asụsụ gị. Ọ pụrụ ịbụ na e nwere mpịakọta Ụlọ Nche nke afọ ndị gara aga n’asụsụ gị. E bipụtawokwa akwụkwọ ndị e ji eme nnyocha bụ́ ndị pụrụ iche, dị ka Insight on the Scriptures na Comprehensive Concordance, n’asụsụ dị iche iche. Otú ọ dị, inweta akwụkwọ ndị a bụ nanị nzọụkwụ mbụ.

Hazie Ọbá Akwụkwọ Gị!

Ịmata na ọ dị ebe i nwere akwụkwọ ndị ahụ bụ otu ihe, ma ịchọta nke dị gị mkpa bụ ihe ọzọ. Ọ bụrụ na anyị ga-etufu oge dị ukwuu n’ịchọgharị akwụkwọ e ji eme nnyocha nke dị anyị mkpa, ma eleghị anya anyị agakwaghị enwe mmasị n’okwu ahụ. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị ahazie akwụkwọ anyị nke ọma, n’ebe dị mfe iru, anyị ga-enwe ọchịchọ karị ime nnyocha onwe onye.

Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ọ na-enye aka idokọta akwụkwọ ọchịchị Chineke anyị nile n’otu ebe. A pụrụ ịrụ ihe ndebe akwụkwọ, ọtụtụ mgbekwa n’ọnụ ego dị nnọọ ala, ma ọ bụrụ na anyị agaghị enwe ike ịzụta nke a rụsịworo arụ, ọ dịghịkwa mkpa na ha ga-ewere ohere buru ibu. Aka iru ọbá akwụkwọ ahụ n’ụzọ dị mfe dịkwa mkpa. Akwụkwọ ndị e dokpuru n’ime ukó ụlọ adịghị abakebe uru ọ bụla ma e wezụga ikpokọta ntụ́.

Nzọụkwụ na-esote bụ ịhazi akwụkwọ ndị ahụ. Nanị ntakịrị oge e tinyere n’ịhazi akwụkwọ ndị ahụ n’ụzọ ezi uche dị na ya na-aba uru.

Gịnị ma ọ bụrụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ezinụlọ gị abụghị Ndịàmà Jehova? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị enwe ike ịhazi ọbá akwụkwọ otú ị ga-enwe mmasị isi hazie ya, n’ime ọnụ ụlọ nke gị ị pụrụ inwe otu ihe ndebe akwụkwọ nke nwere ma ọ dịkarịa ala mbipụta ụfọdụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.

Ọbá Akwụkwọ Ọchịchị Chineke Pụrụ Inye Aka Wulite Ọnọdụ Ime Mmụọ

Ozugbo anyị hazisịrị akwụkwọ anyị, ọ dị anyị mkpa inwe otu usoro iji nyere anyị aka ịchọta ihe ọmụma ahụ. Ike ncheta ihe anyị pụrụ inwe nsogbu, ọ pụkwara ịbụ na anyị amaghị ihe dị n’ime akwụkwọ nile dị n’ime ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke anyị n’onwe anyị. Ka o sina dị, a pụrụ inweta ihe ọmụma nile dị n’ọbá akwụkwọ ahụ ngwa ngwa. Ọ bụrụ na e nwere ya n’asụsụ anyị, akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index pụrụ inyere anyị aka ịchọta ihe ọmụma kpọmkwem n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’isiokwu ọ bụla n’ime mkpirikpi oge.

Julián, bụ́ onye jeworo ozi ruo ọtụtụ afọ dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na okenye, na-akọwa na Index ahụ bara oké uru n’ịkụziri nwa ya nke ikpeazụ inwe ọmụmụ ihe onwe onye. “Jairo, bụ́ onye dị afọ asaa, si n’ụlọ akwụkwọ lọta otu ụbọchị wee jụọ m, sị, ‘Papa, gịnị ka Society kwuworo banyere anụ bụ́ dinosaur?’ Anyị banyere ozugbo n’Index ahụ wee chọta okwu ahụ bụ́ ‘dinosaurs.’ Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ anyị chọtara usoro mbipụta Teta! (Bekee) n’isiokwu ahụ. [February 8, 1990] Otu ụbọchị ahụ, Jairo malitere ịgụ ya. Ọ maararị na ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke anyị nwere ihe ọmụma bara uru n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’isiokwu nile. N’onwe m, ekwenyesiri m ike na mgbe ụmụ anyị mụtara iji ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke eme ihe n’ụzọ dị mma, ọ na-enyere ha aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ. Ha na-amụta iche echiche, ọzọkwa, ha na-achọpụta na ọmụmụ ihe onwe onye pụrụ ịtọ ụtọ.”

Fausto, bụ́ nna Sherezade nke e hotara ná mmalite, kwenyere na i kwesịrị ịmalite n’oge n’ịzụ ụmụaka iji ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke mee ihe. “Anyị amalitelarị igosi Sherezade, bụ́ onye dị afọ isii ugbu a, otú e si eji Index eme ihe,” ka ọ na-akọwa. “Ebe olileanya nke Paradaịs elu ala na-amasị ya nke ukwuu, anyị malitere site n’igosi ya n’ime Index okwu ahụ bụ́ ‘paradise,’ mgbe ahụkwa na-achọta isiokwu Ụlọ Nche ndị e hotara. Ọtụtụ mgbe anyị ga-egosi ya nanị ihe osise dị iche iche. Ka o sina dị, site n’ụzọ dị otú a ọ mụtara na Index bụ́ igodi e ji achọta ihe ọmụma n’ọbá akwụkwọ ebe obibi anyị. Anyị maara na ọ ghọtawo isi ihe ahụ mgbe o ji otu ajụjụ banyere ememe Ista si n’ụlọ akwụkwọ lọta otu ụbọchị. ‘Gịnịkwanụ ma anyị jiri Index chọta ihe?’ ka ọ jụrụ nne ya.”

N’agbanyeghị afọ ndụ anyị, Bible na-agba anyị ume ịdị ‘na-anwa ihe nile; jidesie ihe ọma ike.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Nke a na-achọ na anyị ga-enyocha ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. (Ọrụ 17:11) Ọ bụrụ na anyị nwere ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke a haziri nke ọma, nnyocha dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe obi ụtọ. Mgbe ọ bụla anyị nwere ihe ịga nke ọma n’iji ọbá akwụkwọ anyị kwadebe okwu, chọta ndụmọdụ bara uru n’ilebara otu nsogbu anya, ma ọ bụ chọta ihe ọmụma na-adọrọ mmasị, ọ ga-emesi abamuru nke ọbá akwụkwọ anyị ike n’obi anyị.

Nne na nna Sherezade na-ekwu hoo haa, sị: “N’ezinụlọ ndị Kraịst, ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke abụghị ihe okomoko ma ọlị!”

[Igbe dị na peeji nke 30]

OLEE OTÚ Ị PỤRỤ ISI HAZIE AKWỤKWỌ GỊ?

E nweghị iwu a ga-agbasorịrị n’ihe banyere otú ị ga-esi hazie akwụkwọ gị. Otú o sina dị, nkeji ndị na-esonụ bụ́ ndị ezi echiche dị na ha na-eme ihe atụ nke otu ụzọ ị pụrụ isi hazie akwụkwọ gị dị ka ihe dị n’ime ha si dị.

1. Akwụkwọ ndị nwere ntụle amaokwu n’amaokwu nke akụkụ ụfọdụ nke Bible

(Ihe atụ: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, Revelation​—⁠Its Grand Climax At Hand!, “The Nations Shall Know That I Am Jehovah”​—⁠How?, “Ka Emee Ihe I Na-achọ n’Uwa”)

2. Akwụkwọ ndị metụtara ndụ ezinụlọ

(Ihe atụ: Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi​—⁠Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Akwukwọm nke Akukọ Bible)

3. Bible na akwụkwọ ndị e ji eme nnyocha

(Ihe atụ: New World Translation of the Holy Scriptures​—⁠With References, Bible ndị ọzọ, Watch Tower Publications Index dị iche iche, Comprehensive Concordance, Insight on the Scriptures, The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures, ezigbo akwụkwọ ọkọwa okwu)

4. Akwụkwọ ndị e ji eme ihe ugbu a maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke

5. Kaseti vidio na tepu

6. Mpịakọta dị iche iche nke Ụlọ Nche na Teta!

7. Akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova

(Ihe atụ: Yearbook of Jehovah’s Witnesses dị iche iche, Jehovah’s Witnesses​—⁠Proclaimers of God’s Kingdom)

8. Akwụkwọ na broshuọ ndị anyị na-eji eme ihe oge nile n’ozi anyị

(Ihe atụ: Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, Reasoning From the Scriptures, Life​—⁠How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?, Mankind’s Search for God, Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ)

[Foto dị na peeji nke 31]

Sherezade aghọworị ezi onye mmụta Bible

[Foto dị na peeji nke 31]

Ọ bụ ezie na ọ dị ntakịrị, nwatakịrị nwoke a ji ọbá akwụkwọ ọchịchị Chineke na-eme ihe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya