Ndokwa Ọhụrụ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Ụlọ Nzukọ Alaeze
Ruo ọtụtụ afọ ugbu a, ọgbakọ dị iche iche gburugburu ụwa eritewo uru site n’iji ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ha eme ihe, bụ́ nke a na-akpọbu ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. N’oge gara aga, e weere ya dị ka ihe dị mkpa ka ọgbakọ ọ bụla nwee ọ́bá akwụkwọ nke ya. Otú ọ dị, ebe e nwere ugbu a ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ihe karịrị otu ọgbakọ na-eji eme ihe, ụfọdụ n’ime ọgbakọ ndị a bụ ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ, o yiri ka ọ kasị mma inwe nanị otu ọ́bá akwụkwọ nke nwere ọtụtụ akwụkwọ dịgasị iche iche, ndị kasị ọhụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze maka ìgwè asụsụ ọ bụla n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ọ bụla. N’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị nwere ihe karịrị otu ụlọ nzukọ, ọnụ ụlọ nzukọ nke ọ bụla kwesịrị inwe otu ọ́bá akwụkwọ maka ìgwè asụsụ nke ọ bụla na-ezukọ n’ebe ahụ.
A na-atụ anya na ndokwa a ga-eme ka e nwee ohere ma belata mmefu. Ọzọkwa, ijikọta ọ́bá akwụkwọ nke ọgbakọ abụọ ma ọ bụ karị yikarịrị ka ọ ga-eme ka e nwee ọ́bá akwụkwọ ndị ka mma. Ka a na-ejikọta ha, a pụrụ idebe akwụkwọ ndị karịrị otu ma jiri ha mee ihe n’ọdịnihu mgbe e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ. Ọ bụrụ na e nwere kọmputa nwere Watchtower Library dị na CD-ROM n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ pụrụ ịbara ụfọdụ ndị uru nke ukwuu.
Maka ọ́bá akwụkwọ nke ọ bụla dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, otu nwanna nwoke, ọ kasị mma ma ọ bụrụ otu n’ime ndị nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ga na-eje ozi dị ka onye na-elekọta ọ́bá akwụkwọ ahụ. O kwesịrị ịdị na-etinyekwu akwụkwọ ndị kwesịrị ekwesị n’ọ́bá akwụkwọ ahụ, na-edenye ihe n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ n’akụkụ ebe ime nke mkpó akwụkwọ ọ bụla dị n’ọ́bá akwụkwọ ahụ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O kwesịrị ịdị na-enyocha ọ́bá akwụkwọ ahụ, ọ dịkarịa ala otu ugboro n’afọ iji hụ na ọ dịghị akwụkwọ na-efu efu na ya nakwa iji jide n’aka na akwụkwọ ndị dị na ya emebibeghị. E kwesịghị isi n’ọ́bá akwụkwọ ndị a were akwụkwọ si n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụọ.
Ndị nile so ọgbakọ na-emekọ ihe anọgidewo na-eji ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Nzukọ Alaeze akpọrọ ihe nke ukwuu. Ka anyị gosi na anyị ji ndokwa a kpọrọ ihe n’onwe anyị site n’ịdị na-elekọta ya na site n’iji ya na-achọpụta “ihe ọmụma Chineke.”—Ilu 2:5.