Werenụ Ha Kama Ibusa Ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze
Ọtụtụ ọgbakọ nwejuru akwụkwọ ndị merela ochie enweju. Í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị nara ụfọdụ n’ime ha dewe n’ọ́bá akwụkwọ gị? Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ na i nwere Watchtower Library, bụ́ ebe e tinyere akwụkwọ anyị niile merela ochie, ma, e nwere uru ọ bara mmadụ inwe akwụkwọ ndị ahụ n’onwe ha. È nwere onye ị na-eduziri ọmụmụ Baịbụl, bụ́ onye na-eme nke ọma? Ya bụrụ otú ahụ, gwa onye ahụ ka ọ nara akwụkwọ ndị ahụ were ha malite ọ́bá akwụkwọ nke ya. Onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke kwesịrị ịhụ na ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nwere akwụkwọ ndị a merela ochie ọgbakọ nwere. Akwụkwọ ndị ahụ ka bara uru. Ọ ka mma ka anyị werechaa ha kama ịhapụ ha ka ha dọrọ n’ebe a na-edewe akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.