Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 25
IZU NA-AMALITE N’EPREL 25
Abụ nke 108 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 3 ¶1-3, igbe ndị dị na peeji nke 23-27 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Job 33-37 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. “Werenụ Ha Kama Ibusa Ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Okwu. Gwa ndị na-ege ntị akwụkwọ ndị merela ochie ọgbakọ unu nwere.
Nkeji 15: Teta! Ọ̀ Na-abara Gị Uru? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ihe bụ́ isi mere e ji ebipụta Teta! bụ ka o nyere ndị mmadụ aka ikwere na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu. E nweekwala isiokwu ndị na-agba na ya, bụ́ ndị na-amasị ọtụtụ ndị. Teta! na-ebukwa akụkọ ndụ ndị na-abara anyị uru. (I nwere ike jiri g11 04-IB p. 3-9, p. 25-27; g10 07-IB p. 16-18; g10 10-IB p. 12-14; ma ọ bụkwanụ nke ọ bụla ọzọ gosi uru Teta! bara ma gbaa ndị mmadụ ume ka ha na-agụ ya.) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ụfọdụ baara ha uru ha gụtara na Teta!
Nkeji 15: Na-echebara Ihe Jehova Merela Echiche. Okwu si n’Ụlọ Nche Jenụwarị 15, 2011, peeji nke 31, 32.
Abụ nke 119 na Ekpere