Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Eprel 25, 2011. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a, bụ́ nke ga-ewe nkeji iri abụọ. Ihe ndị a ga-atụle ga-abụ ihe ndị a mụrụ n’izu Mach 7 ruo n’izu Eprel 25, 2011.
1. Olee otú o si bụrụ na ‘ọtụtụ n’ime ndị obodo ahụ na-ekwu na ha bụ ndị Juu’? (Esta 8:17) [w06 3/1 p. 11 para. 3]
2. Gịnị mere e ji hapụ Setan ka o guzoro n’ihu Jehova? (Job 1:6; 2:1) [w06 3/15 p. 13 para. 6]
3. Gịnị ka ajụjụ Setan jụrụ, nke bụ́ “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke,” pụtara? (Job 1:9) [w94 11/15 p. 11 para. 6]
4. Okwu Job kwuru na Job 7:9, 10 nakwa 10:21 hà gosiri na Job ekwetaghị na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ? [w06 3/15 p. 14 para. 11]
5. Olee otú o si bụrụ na Elifaz chere echiche ka Setan mgbe o kwuru na mmadụ na-aṅụ “ajọ omume dị ka mmiri”? (Job 15:16) [w10 2/15 p. 19 para. 7–p. 20 para. 1]
6. Gịnị ka anyị na-amụta ná mkpu ákwá Job tiri, bụ́ nke e dere na Job 19:2? [w94 10/1 p. 32 para. 1-5]
7. Gịnị nyeere Job aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? (Job 27:5) [w09 4/15 p. 6 para. 17]
8. Ọ bụrụ na ndị ọzọ nọ ná mkpa, olee otú anyị ga-esi mee ka Job? (Job 29:12, 13) [w02 5/15 p. 22 para. 19; w94 9/15 p. 24 para. 1]
9. Olee otú ndụmọdụ Elaịhu si dị iche na nke ndị enyi atọ ndị ọzọ Job nwere? (Job 33:1, 6) [w95 2/15 p. 29 para. 3]
10. Gịnị ka ichebara ọrụ dị ebube Jehova na-arụ echiche ga-eme ka anyị mee? (Job 37:14) [w06 3/15 p. 16 para. 4]