Igbe Ajụjụ
◼ Olee akwụkwọ ndị e kwesịrị itinye n’ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke?
E wepụtawo ụbara akwụkwọ ime mmụọ maka abamuru nke ndị Chineke. Ebe ọ bụ na ọtụtu ndị nkwusa enweghị ndị a nile n’onwe ha, ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ka e nwee ụzọ isi mee nnyocha n’akwụkwọ ndị ọ pụrụ ịbụ na e nweghị. Ya mere, o kwesịrị nnọọ inwe ụdị nsụgharị Bible dị iche iche, mbipụta ndị ọhụrụ nke Society, Ozi Alaeze Anyị, mpịakọta Ụlọ Nche na Teta!, na Watch Tower Publications Index. Tụkwasị, e kwesịrị ịgbakwụnye ezigbo akwụkwọ ọkọwa okwu ọgbara ọhụrụ. Ọ bụrụ na e nwere ha ma bụrụ nke a pụrụ ịzụtali, akwụkwọ ihe ọmụma, atlas, ma ọ bụ akwụkwọ izo aka n’ụtọ asụsụ na akụkọ ihe mere eme pụrụ ịba uru. Otú ọ dị, ebe anyị ga-elekwasị anya karị kwesịrị ịbụ n’akwụkwọ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” wepụtara.—Mat. 24:45.
N’ọnọdụ ụfọdụ a na-akọ na e tinyewo akwụkwọ ndị a na-enyo enyo n’ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ọ gaghị ekwesị ekwesị ịgụnye akwụkwọ na-akọ akụkọ e chepụtara echepụta, akwụkwọ ndị na-akọwa Bible bụ́ ndị na-ewepụta oké nkatọ Bible, ma ọ bụ akwụkwọ nkà ihe ọmụma ma ọ bụ mgbaasị. Ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke kwesịrị ịgụnye nanị akwụkwọ ndị ga-enyere ndị ji ya eme ihe aka ịnọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ.—1 Tim. 4:15.
Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na-elekọta ọ́bá akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na a pụrụ ikenye nwanna ọzọ inyere ya aka n’ilekọta ya. O kwesịrị ịhụ na ọ́bá akwụkwọ ahụ dị ọhụrụ, ka a na-atụkwasị akwụkwọ ndị ọhụrụ ozugbo e nwere ha. E kwesịrị ide ná mkpo ime nke akwụkwọ ọ bụla n’ụzọ doro anya aha ọgbakọ nwe ya. Kwa afọ, e kwesịrị inyocha akwụkwọ ndị ahụ iji hụ ma ọ̀ dị nke chọrọ ndozi ma ọ bụ ndochi.
Mmadụ nile pụrụ ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ilekọta ọ́bá akwụkwọ ahụ. E kwesịrị ịkpachara anya n’otu e si ejide ma na-eji akwụkwọ ndị ahụ na-eme ihe. E kwesịghị ikwe ka ụmụaka jiri ha gwurie egwu, onye ọ bụla ekwesịghịkwa ide ihe na ha. A pụrụ itinye ihe àmà dị mma dị ka ihe ncheta na a gaghị ewere akwụkwọ ndị ahụ pụọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Ebe a na-eguzobe ọgbakọ ndị ọhụrụ oge nile, o yiri ka ọtụtụ ọ́bá akwụkwọ dị ntakịrị n’otú ha hà. Ndị nkwusa ụfọdụ nwere akwụkwọ anyị ndị meworo ochie karị pụrụ ịtụle inye ha ọgbakọ dị ka onyinye. Ndị okenye pụrụ ịchọ ịtụ ọda maka mbipụtaghachi Society nke mpịakọta Ụlọ Nche. N’ụzọ ndị a, ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-aba nnọọ uru n’inyere mmadụ nile aka igwupụta akụ̀ ndị zoro ezo nke Okwu Chineke, bụ́ nke na-enye ihe ọmụma, amamihe, na nghọta.—Ilu 2:4-6.