IHE ỌMỤMỤ NKE 6
Imesi Echiche Okwu Ike n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
MGBE ị na-ekwu okwu ma ọ bụ na-agụpụta ihe, ọ dị mkpa, ọ bụghị nanị ka ị kpọzie mkpụrụ okwu akpọzi, kamakwa ka i mesie okwu ndị bụ́ isi na okwu ndị na-ewepụta echiche okwu ike n’ụzọ ga-ewepụta echiche dị na ha nke ọma.
Imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-agụnye ihe karịrị imesikwu mkpụrụ okwu ole na ole ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ okwu ike. A ghaghị imesi okwu ndị kwesịrị ekwesị ike. Ọ bụrụ na e mesie okwu ndị na-ekwesịghị ekwesị ike, ihe okwu gị pụtara nwere ike ọ gaghị edo ndị na-ege gị ntị anya, bụ́ ndị pụkwara ikwe ka uche ha kpapụ gaa n’ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ihe ọmụma a na-ewepụta pụrụ ịdị mma, okwu a na-emesighị echiche okwu ike na ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị agaghị adịcha irè n’ịkpali ndị na-ege ntị.
A pụrụ imesikwu okwu ike n’ọtụtụ ụzọ, bụ́ ndị a na-ejikarị ihe karịrị otu n’ime ha eme ihe n’otu oge ahụ: site n’iwelikwu olu elu, site n’ikpokwu ọkụ, site n’iji nnọọ nwayọọ kwuo okwu, site n’ịkwụsịtụ tupu ma ọ bụ mgbe e kwusịrị okwu (ma ọ bụ ha abụọ), site n’imegharị ahụ́ na ọdịdị ihu. N’asụsụ ụfọdụ, a pụkwara imesi okwu ike site n’iwetulata ụda olu ma ọ bụ iweli ọdịdị ụda olu elu. Tụlee ihe omume gị na ọnọdụ ndị dịnụ iji kpebie nke ga-akasị kwesị ekwesị.
Mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-emesi ike, tụlee ihe ndị na-esonụ. (1) N’ahịrịokwu ọ bụla, ihe na-ekpebi okwu ndị e kwesịrị imesikwu ike abụghị nanị ihe ndị ọzọ e kwuru n’ahịrịokwu ahụ kamakwa ihe ndị e kwuru gburugburu ya. (2) A pụrụ iji imesi echiche okwu ike mee ka mmalite nke echiche ọhụrụ pụta ìhè, ma ọ̀ bụ isi ihe ma ọ bụ nanị mgbanwe echiche okwu. Ọ pụkwara ịdọrọ uche gaa ná ngwụsị nke otu arụmụka. (3) Ọkà okwu nwere ike imesi echiche okwu ike iji gosi ihe ọ na-eche banyere otu okwu. (4) A pụkwara imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji mee ka isi ihe ndị dị n’okwu pụta ìhè.
Iji mesie echiche okwu ike n’ụzọ ndị a, ọkà okwu ma ọ bụ onye na-agụpụta ihe n’ihu ọha aghaghị ịghọta ihe omume ya nke ọma ma chọsie ike ka ndị na-ege ya ntị ghọta ya. Banyere ntụziaka e nyere n’oge Ezra, Nehemaịa 8:8 na-ekwu, sị: “Ha wee gụọ n’akwụkwọ ahụ, bụ́ n’iwu Chineke, gụpụta ya nke ọma, wee mee ka a mata isi ya, ha wee ghọta ọgụgụ ya.” O doro anya na ndị gụrụ ma kọwaa Iwu Chineke n’oge ahụ ghọtara mkpa ọ dị inyere ndị na-ege ha ntị aka ịghọta ihe ihe a gụrụ pụtara, icheta ya, na iji ya mee ihe.
Ihe Pụrụ Ịkpata Nsogbu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-enwe ike eme ka ihe ha bu n’obi doo anya ná mkparịta ụka ha na-enwe kwa ụbọchị. Otú ọ dị, mgbe ha gụwara ihe onye ọzọ dere, ịmata okwu ha ga-emesi ike pụrụ isiri ha ike. Ọgwụ ya bụ ịghọta ihe omume ahụ nke ọma. Nke ahụ na-achọ iji nlezianya mụọ ihe e dere. Ya mere, ọ bụrụ na a gwa gị ka ị gụpụta ihe ná nzukọ ọgbakọ, i kwesịrị ịkwadebe nke ọma.
Ụfọdụ ndị na-eme ihe a pụrụ ịkpọ “mmesi okwu ike site n’oge ruo n’oge” kama imesi echiche okwu ike. Ha na-emesi okwu ike n’ime ogologo oge a kapịrị ọnụ kpọmkwem ma imesi okwu ike dị otú ahụ ọ̀ bara uru ma ọ bụ na ọ baghị uru. Ndị ọzọ na-emesi mkpụrụ okwu ụfọdụ ike, ikekwe na-emesi mbuụzọ na okwu njikọ ike gabiga ókè. Mgbe imesi okwu ike na-adịghị enye aka n’ime ka echiche okwu doo anya, n’ụzọ dị mfe ọ na-aghọ àgwà maara mmadụ ahụ́ nke na-adọpụ uche.
Ná mgbalị iji mesie echiche okwu ike, ndị ọkà okwu ụfọdụ na-eweli olu ha elu n’ụzọ pụrụ ime ka ndị na-ege ntị chee na a na-abara ha mba. Otú ọ dị, nke ahụ adịghị arụpụtakebe ihe dị mma. Ọ bụrụ na imesi echiche okwu ike adịghị otú o kwesịrị, ọ pụrụ ime ka e chee na ọkà okwu na-eleda ndị na-ege ya ntị anya. Lee ka ọ ga-esi ka nnọọ mma iji ịhụnanya kpalie ha ma nyere ha aka ịhụ na ihe a na-ekwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, bụrụkwa ihe ezi uche dị na ya!
Ụzọ Isi Meziwanye Ihe. Ọtụtụ mgbe, onye imesi echiche okwu ike na-esiri ike adịghị ama. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka onye ọzọ gwa ya banyere ya. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i meziwanye ihe na nke a, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ gị ga-enyere gị aka. Ọzọ, i nweere onwe gị ịgwa onye ọzọ bụ́ ezi ọkà okwu ka o nyere gị aka. Gwa ya ka o gee ntị nke ọma n’ọgụgụ ihe gị na n’okwu gị nakwa ka ọ tụọrọ gị aro iji meziwanye ihe.
Iji malite, onye ndụmọdụ gị pụrụ ịtụ aro ka i jiri otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche nwee mmụgharị ihe. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-agwa gị ka ị tụlee ahịrịokwu dị iche iche n’otu n’otu iji mata okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ndị dị mkpa ka e mesie ike iji mee ka ihe ọ pụtara dị mfe nghọta. Ọ pụrụ ichetara gị ka i leruo okwu ụfọdụ e dere n’aka akwụkwọ dị iche anya nke ọma. Cheta na mkpụrụ okwu ndị dị n’otu ahịrịokwu na-agakọ ọnụ. Mgbe mgbe, ọ bụ ìgwè okwu ka e kwesịrị imesi ike, ọ bụghị nanị otu mkpụrụ okwu. N’asụsụ ụfọdụ, a pụrụ ịgba ndị mmụta ume iji nlezianya lebakwuoro ihe akara ụda olu na-egosi banyere imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị anya.
Dị ka nzọụkwụ ọzọ n’ịmụta ihe e kwesịrị imesi ike, onye ndụmọdụ gị pụrụ ịgba gị ume ka i chebara ihe gbara ya gburugburu echiche, bụ́ nke sara mbara karịa ahịrịokwu ahụ n’onwe ya. Olee echiche bụ́ isi a na-ewepụta na paragraf ahụ dum? Olee otú nke ahụ kwesịrị isi metụta ihe ị ga-emesi ike n’ahịrịokwu nke ọ bụla? Lee anya n’isiokwu ahụ nakwa n’isiokwu nta e dere n’aka akwụkwọ gbara okpotokpo bụ́ nke ihe ị na-agụ dị n’okpuru ya. Olee otú ha si emetụta okwu ndị ị ga-ahọrọ imesi ike? Ihe ndị a nile bụ ihe a ga-echebara echiche. Ma lezie anya ka ị ghara imesi ọtụtụ okwu ike karịa otú o kwesịrị.
Ma ị̀ ga-ekwu okwu n’agụghị ya agụ ma ị ga-agụ ihe, onye ndụmọdụ gị pụkwara ịgba gị ume ka i mee ka ọ bụrụ arụmụka ị na-ewepụta ga-ekpebi echiche okwu ị na-emesi ike. Ọ dị mkpa ka ị mara ebe otu arụmụka jedebere ma ọ bụ ebe ihe omume ahụ si n’otu echiche dị mkpa gafere n’ọzọ. Ọ ga-amasị ndị na-ege gị ntị ma ọ bụrụ na okwu gị emee ka ha mara ebe ndị a. A pụrụ ime nke a site n’imesi okwu ndị dị ka nke mbụ, ọzọ, n’ikpeazụ, otú a, na n’ụzọ ezi uche dị na ya, ike.
Onye ndụmọdụ gị ga-adọrọkwa uche gị gaa n’echiche okwu ndị i kwesịrị iji mmetụta pụrụ iche kwuo. Iji mee nke a, ị pụrụ imesi okwu ndị dị ka nnọọ, n’ezie, ọ dịghị ma ọlị, ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche, dị mkpa, na mgbe nile, ike. Gị ime otú ahụ pụrụ inwe mmetụta n’ihe ndị na-ege gị ntị na-eche banyere ihe ị na-ekwu. A ga-ekwukwu okwu banyere nke a n’Ihe Ọmụmụ nke 11, “Jiri Mmetụta Kwuo Okwu.”
Ka i wee mee ka otú i si emesi echiche okwu ike ka mma, a ga-agbakwa gị ume iburu n’uche nke ọma isi ihe ndị ị chọrọ ka ndị na-ege gị ntị cheta. A ga-atụlekwu nke a n’ihe metụtara ịgụ ihe n’ihu ọha n’Ihe Ọmụmụ nke 7, “E Mesiri Echiche Ndị Bụ́ Isi Ike,” nakwa n’ihe metụtara ikwu okwu, n’Ihe Ọmụmụ nke 37, “E Mere Ka Ihe Ndị Bụ́ Isi Ihe Pụta Ìhè.”
Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ime ka ozi ubi gị ka mma, lebara otú i si agụ Akwụkwọ Nsọ anya nke ọma. Mee ka ọ mara gị ahụ́ ịjụ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere m ji na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ a?’ Nye onye na-ezi ihe, nanị ịkpọ okwu otú kwesịrị ekwesị adịghị ezu mgbe nile. Ọbụna iji mmetụta gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ nwere ike ọ gaghị ezu. Ọ bụrụ na ị na-aza ajụjụ mmadụ jụrụ ma ọ bụ na-akụzi otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, ọ dị mma imesi mkpụrụ okwu ma ọ bụ ahịrịokwu ndị na-akwado ihe a na-atụle bụ́ ndị dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ike. Ma ọ́ bụghị ya, onye ị na-agụrụ ihe nwere ike ọ gaghị aghọta isi ihe ị na-ekwu.
Ebe imesi echiche okwu ike na-agụnye imesikwu okwu na nkebi ahịrịokwu ụfọdụ ike, ọkà okwu na-enwebeghị ahụmahụ pụrụ imesi okwu na nkebi ahịrịokwu ndị ahụ ike gabiga ókè. Ihe ndị ga-esi na ya pụta ga-eyitewe ụda nke onye ka malitere ịmụ otú e si akpọ ngwá egwú amụ na-akpọpụta. Otú ọ dị, ọ mụtụkwuo ya, “ụda” nke ọ bụla ga-eso bụrụ “egwú” dị ụtọ.
Mgbe ị mụtaworo ụfọdụ ihe ndị bụ́ isi, ị ga-enwe ike irite uru site n’ileru ndị ọkà okwu nweworo ahụmahụ anya. N’oge na-adịghị anya, ị ga-abịa ghọta ihe a pụrụ iji ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche nke imesi okwu ike rụzuo. Ị ga-aghọtakwa uru ọ bara bụ́ imesi okwu ike n’ụzọ dịgasị iche iche iji mee ka ihe ihe a na-ekwu pụtara doo anya. Ịzụlite nkà nke imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-eme ka ihe ọgụgụ na okwu gị dịkwuo irè nke ukwuu.
Amụtala imesi echiche okwu ike nanị iji lafere. Iji na-ekwu okwu n’ụzọ dị irè, nọgide na-arụ ọrụ na ya ruo mgbe ị mụtara imesi echiche okwu ike nke ọma, nweekwa ike iji ya na-eme ihe n’ụzọ ga na-ada ná ntị ndị ọzọ ka otú i si ekwu okwu.