Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 23 p. 157-p. 159 para. 4
  • E Mere Ka Uru Ọ Bara Doo Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Mere Ka Uru Ọ Bara Doo Anya
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-ege Gị Ntị Mụtara Ihe na Ya
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Okwu Mmeghe nke Na-akpasu Mmasị
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Okwu A Ga-agwa Ọgbakọ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 23 p. 157-p. 159 para. 4

IHE ỌMỤMỤ NKE 23

E Mere Ka Uru Ọ Bara Doo Anya

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Nyere ndị na-ege gị ntị aka ịhụ otú isiokwu gị si emetụta ndụ ha ma ọ bụ otú ha pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ụzọ bara uru.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ahụghị uru ihe ị na-ekwu bara, ha pụrụ ịgwa gị na ha enweghị mmasị, ma ọ bụ ha nwere ike ịkwụsị ige ntị, kwe ka uche ha na-awagharị.

MA Ị̀ na-agwa otu onye okwu ma ị na-agwa ìgwè buru ibu karị okwu, ọ bụghị ihe amamihe dị na ya bụ iwere ya na onye (ndị) na-ege gị ntị ga-enwe mmasị n’isiokwu gị nanị n’ihi na i nwere mmasị na ya. Ozi gị dị mkpa, ma ọ bụrụ na i nweghị ike ime ka uru ọ bara doo anya, ikekwe ị gaghị enwe ike ime ka ha nọgide na-ege gị ntị ruo ogologo oge.

Nke a bụ eziokwu ọbụna banyere ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha nwere ike ige ntị mgbe i ji ihe atụ ha na-anụtụbeghị mee ihe ma ọ bụ na-akọ ahụmahụ ha na-anụtụbeghị. Ma, ha pụrụ ịkwụsị ige ntị mgbe ị na-ekwu banyere ihe ndị ha marawooro, karịsịa ma ọ bụrụ na ị kọwakwughị ihe ndị ahụ. Ọ dị gị mkpa inyere ha aka ịhụ ihe mere ihe ị na-ekwu ji baara ha uru n’ezie na otú o si baara ha uru.

Bible na-agba anyị ume iche echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ilu 3:21) Jehova ji Jọn Onye Na-eme Baptizim duzie ndị mmadụ gaa “n’ezi amamihe nke ndị ezi omume.” (Luk 1:17) Nke a bụ amamihe nke gbanyere mkpọrọgwụ n’egwu ziri ezi nke Jehova. (Ọma 111:10) A na-enyere ndị ji amamihe a kpọrọ ihe aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ugbu a nakwa ijide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie n’aka, bụ́ ndụ ebighị ebi nke gaje ịbịa.—1 Tim. 4:8; 6:19.

Ime Ka Okwu Baa Uru. Ọ bụrụ na okwu gị gaje ịba uru, ị ghaghị ichebara ọ bụghị nanị ihe ị ga-ekwu echiche kamakwa ndị ga-ege gị ntị. Ewela ha nanị dị ka otu ìgwè. Ihe mejupụtara ìgwè ahụ bụ ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa ezinụlọ dị iche iche. A pụrụ inwe ndị bụ́ nnọọ ụmụaka, ndị nọ n’afọ iri na ụma, ndị toruworo ogo mmadụ, na ụfọdụ ndị meworo agadi. A pụrụ inwe ndị ọhụrụ nwere mmasị nakwa ndị malitere ijere Jehova ozi tupu a mụọ gị. Ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ; ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị àgwà na omume ụfọdụ nke ụwa ka na-enwe mmetụta siri ike n’ahụ́ ha. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú ihe m na-aga ịtụle pụrụ isi baara ndị ga-ege ntị uru? Olee otú m pụrụ isi nyere ha aka ịghọta isi ihe dị na ya?’ Ị pụrụ ikpebi ilekwasị anya nanị n’ebe otu ìgwè ma ọ bụ abụọ n’ime ìgwè ndị a kpọtụrụ aha n’ebe a dị. Otú ọ dị, echefula ndị nke ọzọ kpam kpam.

Gịnị ma ọ bụrụ na e kenyere gị ịtụle otu ozizi bụ́ isi nke Bible? Olee otú ị pụrụ isi mee ka okwu dị otú ahụ baara ndị ga-ege ntị, bụ́ ndị kwetawororị n’ozizi ahụ, uru? Gbalịsie ike ime ka nkwenye ha na ya sikwuo ike. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịtụgharị uche n’ihe àmà sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke na-akwado ya. Ị pụkwara ime ka ha ghọtakwuo ozizi ahụ dabeere na Bible. A pụrụ ime nke a site n’igosi otú ozizi ahụ si kwekọọ n’eziokwu ndị ọzọ nke Bible na n’ụdị onye Jehova bụ. Jiri ihe atụ—ahụmahụ ndị mere eme mee ihe ma o kwe mee—ndị na-egosi otú ịghọta ozizi a kpọmkwem siworo baara ndị mmadụ uru ma gbanwee otú ha si ele ọdịnihu anya.

Ya abụla nanị okwu ole na ole ị ga-ekwu ná mmechi okwu ka ị ga-eji kọwaa otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe. Site nnọọ ná mmalite, onye ọ bụla na-ege gị ntị kwesịrị iche na “nke a metụtara m.” Ebe ị tọworo ntọala ahụ, nọgide na-egosi otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe ka ị na-akọwapụta nke ọ bụla n’ime isi ihe ndị dị n’okwu ahụ nakwa ná mmechi ya.

Mgbe ị na-akọwa otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe, jide n’aka na ị na-eme ya n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ pụtara ime ya n’ịhụnanya, na-egosikwa mmetụta ọmịiko. (1 Pita 3:8; 1 Jọn 4:8) Ọbụna mgbe ọ na-ekwu okwu banyere nsogbu ndị siri ike dị na Tesalonaịka, Pọl onyeozi hụrụ na o mere ka akụkụ ndị dị mma n’ọganihu ime mmụọ nke ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ pụta ìhè. O kwupụtakwara obi ike o nwere na ha ga-achọ ime ihe ziri ezi banyere okwu a nọ na-atụle n’oge ahụ. (1 Tesa. 4:1-12) Lee ụkpụrụ dị mma iṅomi ọ bụ!

È zubere ka okwu gị kpalie ikere òkè n’ọrụ ikwusa na ịkụziri ndị ọzọ ozi ọma ahụ? Mee ka e nwee ịnụ ọkụ n’obi na ekele maka ihe ùgwù ahụ. Otú ọ dị, ka ị na-eme otú ahụ, buru n’uche na otú ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ikereru òkè na nke a na-adị iche iche, Bible rịbakwara nke a ama. (Mat. 13:23) Ejila mmetụta nke obi amamikpe mee ka ike gwụ ụmụnna gị. Ndị Hibru 10:24 na-agba anyị ume ‘ịkpali inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ Ọ bụrụ na anyị akpalie inwe ịhụnanya, ọrụ ndị sitere n’ezi ebumnobi ga-esochi. Kama ịchọ ịmanye mmadụ nile ime ihe n’otu ụzọ ahụ, mata na ihe Jehova chọrọ bụ ka anyị kwalite “nrubeisi site n’okwukwe.” (Rom 16:26) N’iburu nke a n’uche, anyị na-achọ iwusi okwukwe ike—ma nke anyị ma nke ụmụnna anyị.

Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọta Ihe A Na-ekwu. Ka ị na-agbara ndị ọzọ àmà, ahapụla ime ka uru ozi ọma ahụ bara pụta ìhè. Ime otú ahụ ga-achọ ka ị tụlee ihe ndị mmadụ nọ n’ókèala unu na-eche. Olee otú ị pụrụ isi chọpụta? Gee ntị n’akụkọ a na-akọ na redio ma ọ bụ na telivishọn. Lee anya n’ihu akwụkwọ akụkọ. Ọzọkwa, gbalịa ime ka ndị mmadụ soro gị nwee nkwurịta okwu, ṅaakwa ntị mgbe ha na-ekwu okwu. Ị pụrụ ịchọpụta na ha na-agbaso nsogbu siri ike mgba—enwekwaghị ọrụ, ịkwụ ụgwọ ụlọ, ọrịa, ọnwụ nke onye òtù ezinụlọ, ihe ize ndụ n’ihi mpụ, ikpe na-ezighị ezi site n’aka onye nwere ikike, ntisa alụmdi na nwunye, ịchịkwa ụmụaka, na ihe ndị ọzọ. Bible ọ̀ pụrụ inyere ha aka? N’ezie ọ pụrụ.

Mgbe ị na-amalite mkparịta ụka, o yikarịrị ka ị ga-ebu otu isiokwu n’uche. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ahụ egosi na ọ dị isiokwu ọzọ na-echegbu ya mgbe ahụ, egbula oge iso ya kwurịta nke ahụ ma ọ bụrụ na ị ga-enwe ike ime otú ahụ, ma ọ bụ kwee nkwa iji ihe ọmụma ga-enye aka gaghachi. N’ezie, anyị na-ezere ‘itinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị anyị,’ ma anyị na-eji obi ụtọ esoro ndị ọzọ atụle ndụmọdụ bara uru Bible na-enye. (2 Tesa. 3:11) O doro anya na ihe ga-akasị masị ndị mmadụ bụ ndụmọdụ Bible nke na-emetụta ndụ ha.

Ọ bụrụ na ndị mmadụ apụghị ịhụ otú ozi anyị si metụta ha, ha pụrụ igbubi nkwurịta okwu ahụ ngwa ngwa. Ọ bụrụgodị na ha ekwe anyị kwuo okwu, ọ bụrụ na anyị enweghị ike igosi ha uru isiokwu ahụ bara ọ pụrụ ịpụta na ozi anyị agaghị enwekebe mmetụta ná ndụ ha. N’ụzọ dị iche, ọ bụrụ na anyị emee ka uru ozi ahụ bara doo anya, nkwurịta okwu anyị pụrụ ime ka ndụ ndị mmadụ gbanwee.

Mgbe ị na-eduzi ọmụmụ Bible, nọgide na-eme ka otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe pụta ìhè. (Ilu 4:7) Nyere ndị ị na-amụrụ ihe aka ịghọta ndụmọdụ, ụkpụrụ, na ihe atụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi ha ụzọ isi na-aga ije n’ụzọ Jehova. Mesie uru ndị a na-enweta site n’ime otú ahụ ike. (Aịsa. 48:17, 18) Nke a ga-akpali ndị a na-amụrụ ihe ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ha. Kụbanye n’ime ha ịhụnanya maka Jehova na ọchịchọ ime ihe na-atọ ya ụtọ, kwekwa ka mkpali itinye ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke n’ọrụ si ha n’obi.

ỤZỌ ISI MEE YA

  • Mgbe ị na-akwadebe okwu gị, chebara ọ bụghị nanị ihe ị ga-ekwu echiche kamakwa ndị ga-ege gị ntị. Kwuo ya n’ụzọ ga-abara ha uru n’ezie.

  • E kwesịghị ịhapụ nkọwa nke otú a pụrụ isi jiri okwu ahụ mee ihe ruo ná mmechi. O kwesịrị ịpụta ìhè n’okwu gị dum.

  • Mgbe ị na-akwadebe ịgba àmà, tụlee ihe ndị mmadụ nọ n’ókèala unu na-eche.

  • Mgbe ị na-agba àmà, ṅaa onye nke ọzọ ntị n’ezie, hazigharịakwa okwu gị otú kwesịrị ekwesị.

IHE OMUME: Tụleghachi mbipụta Ozi Alaeze Anyị ndị ị pụrụ inweta, họrọkwa otu ụzọ iche ihe n’ihu ma ọ bụ abụọ ndị i chere ga-akasị dị irè iji mee ihe n’ókèala unu. Nwalee ha n’ozi ubi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya