IHE ỌMỤMỤ NKE 39
Okwu Mmechi nke Dị Irè
Ọ PỤRỤ ịbụ na i jiriwo nlezianya mee nnyocha ma hazie ihe ọmụma ị ga-eji mee ihe n’ụmị okwu gị. Ọ pụkwara ịbụ na ị kwadebewo okwu mmeghe na-akpali mmasị. Ma, a chọrọ otu ihe ọzọ—okwu mmechi dị irè. Eledala mkpa ọ dị anya. A na-echetakarị ihe ikpeazụ i kwuru ruo ogologo oge karịsịa. Ọ bụrụ na okwu mmechi gị adịghị irè, ọbụna ihe ndị i bu ụzọ kwuo nwere ike ha agaghị adịchakwa irè.
Tụlee ihe na-esonụ: Ka ọ na-abịaru ná njedebe nke ndụ ya, Jọshụa gwara ndị okenye nke mba Izrel okwu a na-adịghị echefu echefu. Mgbe ọ kọsịrị otú Jehova si na-emeso Izrel eri oge Ebreham, ihe Jọshụa mere ọ̀ bụ nanị ikwughachi isi ihe ndị ahụ n’ụdị ịchịkọta ihe? Ee e. Kama nke ahụ, o ji oké mmetụta gbaa ndị ahụ ume, sị: “Na-atụnụ egwu Jehova, na-efekwanụ Ya ofufe n’izu okè na n’eziokwu.” Gụọ n’onwe gị, okwu mmechi Jọshụa nke e dekọrọ na Joshua 24:14, 15.
Ọ bụ Pita onyeozi kwuru okwu ọzọ kwesịrị ịrịba, nke dị n’Ọrụ 2:14-36, bụ́ nke ọ gwara ìgwè mmadụ nọ na Jeruselem n’Ememe Pentikọst 33 O.A. O bu ụzọ kọwaa na ha na-ahụ mmezu nke amụma Joel banyere mwụpụ nke mmụọ Chineke. O gosiziri otú e si jikọta nke a na amụma ndị dị n’Abụ Ọma banyere Mezaịa, bụ́ ndị kwuru banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst na mbuli elu a ga-ebuli ya gaa n’aka nri Chineke. Mgbe ahụzi, ná mmechi okwu ya, Pita kwuru n’ụzọ doro anya ihe ọ dị mkpa ka onye ọ bụla nke na-ege ya ntị mee ihe banyere ya. Ọ sịrị: “Ya mere, ka ụlọ Izrel dum mara n’ezie na Chineke mere ya Onyenwe anyị na Kraịst, bụ́ Jizọs a, onye unu kpọgidere n’osisi.” Ndị nọ n’ebe ahụ jụrụ, sị: “Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga-eme?” Pita zara, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst.” (Ọrụ 2:37, 38) N’ụbọchị ahụ, ihe dị ka mmadụ 3,000 so ná ndị na-ege ya ntị, n’ịbụ ndị ihe ha nụrụ kwaliri, nakweere eziokwu banyere Jizọs Kraịst.
Isi Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche. Ihe ị ga-ekwu n’okwu mmechi gị kwesịrị inwe njikọ kpọmkwem ya na isiokwu nke okwu gị. O kwesịrị ịbụ nkwubi okwu ezi uche dị na ya nye isi ihe ndị ị kọwapụtaworo. Ọ bụ ezie na ị pụrụ ịchọ iwebata okwu ụfọdụ bụ́ isi sitere n’isiokwu gị, ọ dịịrị gị ikpebi ma ị ga-ekwughachi ya kpọmkwem otú ọ dị.
Dị ka ọ na-adịkarị, nzube i ji na-ekwu okwu bụ iji gbaa ndị ọzọ ume ime ihe dabere n’ihe ị na-ekwu. Otu n’ime nzube bụ́ isi nke okwu mmechi bụ ịgwa ha ihe ha ga-eme. Mgbe ị họọrọ isiokwu gị na isi ihe ndị ị ga-eji mee ihe, ì ji nlezianya tụlee ihe mere ihe ọmụma ahụ ga-eji dị ndị ga-ege gị ntị mkpa nakwa ihe ga-abụ ebumnobi gị n’ikwu ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ị maara ihe ị ga-achọ ka ha mee. Ọ dịzi gị mkpa ịkọwa ihe ahụ ha ga-eme, ma eleghịkwa anya, otú ha ga-esi mee ya.
Tụkwasị n’ịgwa ndị na-ege gị ntị ihe ha ga-eme, okwu mmechi gị kwesịrị ịkwali ha ime ya. O kwesịrị ịgụnye ezi ihe mere ha ga-eji mee ihe na ikekwe uru ndị a pụrụ inweta site n’ime otú ahụ. Ọ bụrụ na e ji nlezianya chepụta ma hazie ahịrịokwu ikpeazụ otú dị mma, ọ ga-emesi mmetụta okwu gị dum nwere ike.
Buru n’uche na okwu ahụ na-abịa ná njedebe. Ihe ị na-ekwu kwesịrị igosi ya. Otú i si ekwu okwu ọsọ ọsọ kwesịkwara ịdaba adaba. Ekwugidela okwu ọsọ ọsọ ruo nnọọ ná ngwụsị mgbe ahụ kwụsị n’ike. N’aka nke ọzọ, ekwela ka ụda olu gị nyụọ ka ọkụ. Olu gị kwesịrị ịdị na-adapụta ụda otú kwesịrị ekwesị ma ọ gaghị na-adabiga ụda ókè. Ahịrịokwu ikpeazụ ole na ole ị ga-ekwu kwesịrị igosi na ọ na-abịaru ná njedebe. Otú ị ga-esi kwuo ha kwesịrị igosi iji ihe kpọrọ ihe na nkwenye. Mgbe ị na-akwadebe otú ị ga-esi kwuo okwu gị, ahapụla ịmụgharị okwu mmechi gị.
Olee otú okwu mmechi ahụ ga-aha n’ogologo? Ọ bụghị nanị oge e nyere ga-ekpebi ya. Okwu mmechi ekwesịghị ịnọte aka. Mmetụta o nwere n’ahụ́ ndị na-ege ntị pụrụ ikpebi ma ọ̀ dị ogologo otú kwesịrị ekwesị. A na-enwe mmasị mgbe nile n’okwu mmechi dị mfe, nke gara n’ihe a chọrọ, ma na-ewuli elu. Okwu mmechi nke totụrụ ogologo karị, nke gụnyere ihe atụ dị nkenke pụkwara ịdị irè ma ọ bụrụ na e ji nlezianya hazie ya. Jiri okwu mmechi dị nkenke nke akwụkwọ Eklisiastis dum, nke dị n’Eklisiastis 12:13, 14, tụnyere nke dị nkenke karị maka Ozizi Elu Ugwu ahụ, bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 7:24-27.
N’ozi Ubi. Ọ dịghị ebe ị ga-ahụ mkpa okwu mmechi dị ọtụtụ mgbe ka n’ozi ubi. Site n’ime nkwadebe na inwe mmasị ịhụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ, ị pụrụ ịrụpụta ọtụtụ ihe ọma. A pụrụ iji ndụmọdụ ndị e depụtara na peeji ndị bu ụzọ mee ihe n’ụzọ bara uru ọbụna mgbe e ji ha mee ihe ná mkparịta ụka otu onye na ibe ya.
Mkparịta ụka pụrụ ịdị nnọọ nkenke. Onye ahụ pụrụ iji ọrụ n’aka. Nleta gị dum pụrụ iwe nanị otu minit. Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, ị pụrụ ikwu ihe dị ka: “Aghọtara m. Ma ka m gwa gị otu ihe na-agba ume. Bible na-egosi na Onye Okike anyị nwere nzube magburu onwe ya—ime ụwa a ebe ndị mmadụ pụrụ ịnụ ụtọ ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Anyị pụrụ ịnọ n’ime Paradaịs ahụ, ma ọ dị anyị mkpa ịmụta ihe Chineke chọrọ.” Ma ọ bụkwanụ ị pụrụ nanị ikwu na ị ga-alaghachite n’oge ga-adịrị ya mma karị.
Ọ bụrụ na e mee ka nleta ahụ dị nkenke n’ihi na onye nwe ụlọ achọghị ikwu okwu ruo ogologo oge—ọbụna ghara inwe omume enyi—a ka pụrụ ịrụpụta ọtụtụ ihe ọma. Buru ndụmọdụ ahụ dị na Matiu 10:12, 13 na ná Ndị Rom 12:17, 18 n’uche. Nzaghachi gị dị nro nwere ike ime ka ọ gbanwee echiche ya banyere Ndịàmà Jehova. Nke ahụ ga-abụ ihe ọma a rụzuru.
N’aka nke ọzọ, gị na onye nwe ụlọ pụrụ inweworị mkparịta ụka dị ụtọ. Gịnị ma i kwughachi isi ihe ndị ị chọrọ ka ọ na-echeta? Gụnyekwa ịkpali ya ime ihe banyere ya.
Ọ bụrụ na ị hụ ohere inwekwu nkwurịta okwu n’oge ọzọ, gwa onye ahụ ihe ụfọdụ ga-eme ka ọ na-atụ anya ya. Jụọ ajụjụ—ikekwe ajụjụ a tụlere na Reasoning From the Scriptures ma ọ bụ n’akwụkwọ e mere maka iji na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. Buru ihe mgbaru ọsọ gị n’uche, dị ka Jizọs kọwapụtara nakwa dị ka e dekọrọ na Matiu 28:19, 20.
Ị̀ na-emechi ọmụmụ Bible ebe obibi gị? Ikwughachi isiokwu ahụ ga-enyere onye a na-amụrụ ihe aka icheta ihe a tụlere. Iji ajụjụ ntụleghachi mee ihe ga-enye aka mesie ihe ndị bụ́ isi ihe ike n’uche onye ahụ a na-amụrụ ihe, karịsịa ma ọ bụrụ na e meghị ntụleghachi ahụ ọkụ ọkụ. Ịjụ otú ihe ahụ a mụrụ pụrụ isi baara onye ahụ a na-amụrụ ihe uru ma ọ bụ otú ọ pụrụ isi soro ndị ọzọ kerịta ya pụrụ inyere ya aka iche echiche otú ọ ga-esi jiri ihe ọ mụtara mee ihe n’ụzọ bara uru.—Ilu 4:7.
Cheta—okwu mmechi gị na-ekpebi ịdị irè nke nkwurịta okwu gị dum.