Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 41 p. 226-p. 228 para. 6
  • Ndị Ọzọ Pụrụ Ịghọta Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ọzọ Pụrụ Ịghọta Ya
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikwu Ihe Ndị Ọzọ Ga-aghọtali
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Ndị Na-ege Gị Ntị Mụtara Ihe na Ya
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Na-akụzi Ihe Otú Ọ Ga-adị Mfe Nghọta
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 41 p. 226-p. 228 para. 6

IHE ỌMỤMỤ NKE 41

Ndị Ọzọ Pụrụ Ịghọta Ya

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Kwupụta ihe i bu n’obi n’ụzọ ndị ọzọ ga-enwe ike ịghọta ihe ihe ị na-ekwu pụtara ngwa ngwa.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ruo n’ókè okwu gị dị mfe nghọta, ruo n’ókè ahụ ka ndị na-ege ntị ga-eritekwu uru zuru ezu na ya.

MGBE ị na-ekwu okwu, ya abụla nanị iwepụta ihe ọmụma ka ị na-eme. Gbalịa ime ka ndị na-ege ntị nwee ike ịghọta ihe ị na-ekwu. Nke a pụrụ inyere gị aka inye ihe ọmụma n’ụzọ dị irè, ma ị̀ na-agwa ọgbakọ okwu ma ị na-agwa ndị na-abụghị Ndịàmà okwu.

E nwere ọtụtụ ihe dị n’okwu a pụrụ ịghọta aghọta. A tụlere ụfọdụ n’ime ha n’Ihe Ọmụmụ nke 26, “Ịkọwapụta Okwu n’Ụzọ Ezi Uche Dị na Ya.” A tụlere ndị ọzọ n’Ihe Ọmụmụ nke 30, “E Gosiri Mmasị n’Ebe Onye nke Ọzọ Nọ.” N’ihe ọmụmụ a, anyị ga-atụle isi ihe ole na ole ndị ọzọ.

Mkpụrụ Okwu Ndị Dị Mfe Nghọta, Ikwu Okwu n’Ụzọ Doro Anya. Mkpụrụ okwu ndị dị mfe nghọta na ahịrịokwu ndị dị nkenke bụ ngwá ọrụ ndị dị ike n’inye ihe ọmụma. Ozizi Elu Ugwu Jizọs bụ ihe atụ magburu onwe ya nke okwu ndị mmadụ pụrụ ịghọta n’agbanyeghị ndị ha bụ ma ọ bụ ebe ha bi. Echiche ndị dị na ya pụrụ ịbụrụ ha ihe ọhụrụ. Ma, ha pụrụ ịghọta ihe Jizọs kwuru n’ihi na o kwuru banyere ihe ndị na-echegbu anyị nile: ụzọ isi nwee obi ụtọ, ụzọ isi meziwanye mmekọrịta anyị na ndị ọzọ, ụzọ isi merie nchegbu, na ụzọ isi mee ka ndụ anyị nwee nzube. O jikwa okwu ndị dị mfe nghọta kwupụta echiche ya. (Mat., isi 5-7) N’ezie, Bible na-enye ọtụtụ ihe atụ nke ahịrịokwu dị iche iche, bụ́ ndị otú ha toruru n’ogologo na otú e si hazie ha dịgasị iche iche. Ebumnobi gị bụ́ isi kwesịrị ịbụ ikwupụta echiche dị n’okwu gị n’ụzọ doro anya, n’ụzọ a pụrụ ịghọta ya.

Ọbụna mgbe ị na-atụle isiokwu siri ike ịghọta, ikwu okwu n’ụzọ doro anya pụrụ ime ka ọ dị mfe nghọta karị. Olee otú a pụrụ isi mee ka o doo anya? Ejila nkọwa ndị na-adịghị mkpa mee ka ike gwụ ndị na-ege gị ntị. Hazie ihe ọmụma gị ka ha kwadoo ihe ndị bụ́ isi ihe. Jiri nlezianya họrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi ị ga-eji mee ihe. Kama isi n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ mafere ọsọ ọsọ n’ọzọ, gụọ ma tụlee ha. Ejila ọtụtụ okwu kwuchie otu isi ihe dị mma.

Mgbe ị na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, jiri ụkpụrụ ndị ahụ mee ihe. Agbalịla ịkọwa ihe nile. Nyere onye a na-amụrụ ihe aka ịghọta echiche ndị bụ́ isi nke ọma. Ka oge na-aga, n’ọmụmụ ihe onwe onye na ná nzukọ ọgbakọ, ọ pụrụ ịmụta ihe ndị ọzọ.

Ime ezi nkwadebe dị mkpa iji kwuo okwu n’ụzọ doro anya. Gị onwe gị aghaghị ịghọta isiokwu gị nke ọma ma ọ bụrụ na ị ga-eme ka ndị ọzọ ghọta ya. Mgbe ị ghọtara ihe n’ezie, ị na-enwe ike ikwu ihe ndị mere o ji dị otú ahụ. Ị na-enwekwa ike ikwu ya n’okwu nke aka gị.

Kọwaa Okwu Ndị A Na-amachaghị. Mgbe ụfọdụ, ime ka ihe kwe nghọta na-achọ ka ị kọwaa ihe okwu ndị na-ege gị ntị na-amachaghị pụtara. Echela na ndị na-ege gị ntị maara ihe karịa otú ha ma n’ezie, ma eledala ọgụgụ isi ha anya. N’ihi ọmụmụ ị na-amụ Bible, ị pụrụ iji okwu ụfọdụ ndị ọzọ na-amachaghị mee ihe. Ọ bụrụ na a kọwaghị ha, ndị na-adịghị esonyere Ndịàmà Jehova agaghị aghọta na “ihe fọdụrụ,” “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” “atụrụ ọzọ,” na “oké ìgwè mmadụ” na-ezo aka n’ìgwè mmadụ ụfọdụ kpọmkwem. (Rom 11:5; Mat. 24:45; Jọn 10:16; Mkpu. 7:9) N’otu aka ahụ, ọ gwụla ma mmadụ ọ maara ihe banyere nzukọ Ndịàmà Jehova, ma eleghị anya ọ gaghị aghọta ihe okwu ndị dị ka “onye nkwusa,” “ọsụ ụzọ,” “onye nlekọta sekit,” na “Ememe Ncheta” pụtara.

Ọ pụrụ ịdị mkpa ka a kọwaa okwu ụfọdụ sitere na Bible bụ́ ndị ọbụna ndị na-abụghị Ndịàmà na-ejikarị eme ihe. Nye ọtụtụ ndị, “Amagedọn” pụtara oké mgbuchapụ site ná ngwá agha nuklia. Ha pụrụ iwere “Alaeze Chineke” dị ka ihe dị n’obi mmadụ ma ọ bụ dị ka eluigwe ọ bụghị dị ka ọchịchị. Izo aka ná “mkpụrụ obi” pụrụ ime ka uche mmadụ gaa n’ihe ahụ a sịrị na ọ bụ akụkụ ahụ́ mmadụ nke bụ́ mmụọ nke na-anọgide na-adị ndụ mgbe ahụ́ nwụsịrị. Dị ka a kụziwooro ọtụtụ nde mmadụ, “mmụọ nsọ” bụ onye, nke bụ́ otu akụkụ nke Atọ n’Ime Otu. N’ihi na ọtụtụ ndị adịkwaghị agbaso ụkpụrụ omume nke Bible, ha pụrụ ọbụna ịchọ enyemaka iji ghọta ihe Bible na-ekwu mgbe ọ sịrị: “Gbanahụnụ ịkwa iko.”—1 Kọr. 6:18.

Ọ gwụla ma ndị mmadụ ha na-agụchi Bible anya, ha nwere ike ịghọtahie ihe ị na-ekwu ma ọ bụrụ na i kwuo nanị na “Pọl dere . . . ” ma ọ bụ na “Luk sịrị . . . ” Ha pụrụ inwe ndị enyi ma ọ bụ ndị agbata obi na-aza aha ndị ahụ. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka i nyetụkwuo nkọwa iji mee ka a mata onye ahụ dị ka Onye Kraịst bụ́ onyeozi ma ọ bụ onye so dee Bible.

Enyemaka na-adịkarị ndị na-ege ntị n’oge a mkpa iji ghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị nwere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụ omenala oge ochie. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ha agaghị aghọta ihe ọ pụtara ma e kwuo na ụgbọ Noa dị kubit 300 n’ogologo, kubit 50 n’obosara, na kubit 30 n’ịdị elu. (Jen. 6:15) Ma ọ bụrụ na i jiri ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ha maara, ndị e ji akọwa ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ógbè ha kọwaa ha, ndị na-ege gị ntị ga-aghọta otú ụgbọ ahụ hà ozugbo.

Nye Nkọwa Dị Mkpa. Iji mee ka otu okwu doo ndị na-ege gị ntị anya, a pụrụ ịchọ ihe karịrị nkọwa ziri ezi nke otu okwu. Na Jeruselem, n’oge nke Ezra, a na-agụ Iwu ahụ ma na-akọwa ya. Iji nyere ndị ahụ aka ịghọta ihe ọ pụtara, ndị Livaị kọwara, gosikwa otú a pụrụ isi jiri Iwu ahụ mee ihe n’ọnọdụ dị iche iche ndị ahụ na-eche ihu n’oge ahụ. (Neh. 8:8, 12) N’otu aka ahụ, wepụta oge kọwaa ma jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị gụrụ mee ihe.

Mgbe ọ nwụsịrị ma si n’ọnwụ bilie, Jizọs kọwaara ndị na-eso ụzọ ya na ihe ka mesịrịnụ bụ iji mezuo ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. O mesikwara ibu ọrụ ha nwere ike dị ka ndị hụrụ ihe ndị ahụ merenụ. (Luk 24:44-48) Mgbe i nyeere ndị mmadụ aka ịhụ otú ihe a kụziiri ha kwesịrị isi metụta ndụ ha, ha ga-aghọta ihe ọ pụtara n’ezie ngwa ngwa karị.

Otú O si Agụnye Obi. N’ezie, ọ bụrụgodị na nkọwa ndị i nyere doro anya, ihe ndị ọzọ pụrụ ikpebi ma onye nke ọzọ ọ̀ ga-aghọta ya ma ọ bụ na ọ gaghị aghọta ya. Mgbe obi mmadụ na-anabataghị ihe, ọ na-egbochi ya ịghọta ihe e kwuru. (Mat. 13:13-15) Nye ndị kpebisiri ike ịdị na-ele ihe anya nanị n’ụzọ anụ ahụ́, ihe ime mmụọ bụ ihe nzuzu. (1 Kọr. 2:14) Mgbe mmadụ gosipụtara na o nwere ụdị echiche ahụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ịkwụsị nnọọ mkparịta ụka ahụ—ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’oge ahụ.

Ma, mgbe ụfọdụ, obi mmadụ adịghị anabata ihe n’ihi ọnọdụ ndị siri ike ọ na-eche ihu ná ndụ. Ọ bụrụ na e nye ya ohere ịdị na-anụ eziokwu Bible ruo oge ụfọdụ, obi onye dị otú ahụ pụrụ ịghọ nke na-anabata ihe. Mgbe Jizọs gwara ndịozi ya na a gaje ịpịa ya ihe ma gbuo ya, ha aghọtaghị ya. N’ihi gịnị? Ọ bụghị ihe ha tụrụ anya ya, n’ezie, ọ bụghịkwa ihe ha chọrọ! (Luk 18:31-34) Otú ọ dị, ka oge na-aga, ndịozi 11 ahụ ghọtara ya, ha gosipụtakwara nke ahụ site n’ime ihe kwekọrọ n’ihe Jizọs kụziiri ha.

Mmetụta Ezi Ihe Nlereanya Na-enwe. A na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ọ bụghị nanị site n’okwu ọnụ anyị kamakwa site n’omume anyị. N’ikwu okwu banyere oge mbụ ha gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọtụtụ ndị na-ekwu na ha na-echeta ịhụnanya ha hụrụ, ọ bụghị ihe e kwuru. N’otu aka ahụ, obi ụtọ anyị na-egosipụta na anyị nwere enyeworo ọtụtụ ndị nwe ụlọ aka ịnakwere eziokwu Bible. Ịhụ obiọma ndị Jehova ji ịhụnanya na-egosirịta onwe ha na nchebara echiche ha ji obiọma na-egosi ndị ọzọ mgbe ha nọ n’ahụhụ emewo ka ụfọdụ ndị kwubie na Ndịàmà nwere ezi okpukpe ahụ. Ya mere, ka ị na-agbalị inyere ndị mmadụ aka ịghọta eziokwu Bible, chee echiche banyere otú ị na-esi akọwa ya na ihe nlereanya ị na-esetịpụ.

ỤZỌ ISI MEE YA

  • Jiri okwu dị mfe nghọta mee ihe; jiri ahịrịokwu ndị dị nkenke kwupụta echiche okwu ndị bụ́ isi.

  • Mesie nanị isi ihe ole na ole ike.

  • Kọwaa okwu ndị na-ege gị ntị na-amachaghị.

  • Wepụta oge kọwaa ma gosi otú a pụrụ isi jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche mee ihe.

  • Tụlee otú ihe nlereanya ị na-esetịpụ pụrụ isi metụta ndị ị na-agwa okwu.

IHE OMUME: Gbalịa ịgwa onye ikwu gị na-abụghị Onyeàmà, onye agbata obi, onye ọrụ ibe gị, ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe gị banyere ihe masịrị gị ná nzukọ ọgbakọ e nwere n’izu a. Hụ na ị kọwara okwu ndị ọ pụrụ ịbụ na onye ahụ agaghị aghọta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya