IHE ỌMỤMỤ NKE 50
Mgbalị Iji Ruo n’Obi
TINYERE ịgbara ndị mmadụ àmà, ọ dị gị mkpa ịgbalị iru n’obi ha. N’ime Bible, a na-egosikarị na obi mmadụ dị iche n’ihe onye ahụ bụ n’elu ahụ́. Obi ihe atụ na-anọchite anya ihe mmadụ bụ n’ime—mmetụta ọ na-enwe, ihe nile ọ na-eche banyere ha, ihe mere o ji na-eche banyere ha, na otú echiche ndị ahụ si enwe mmetụta n’omume ya. Ọ bụ n’obi ihe atụ a ka a na-agha mkpụrụ nke eziokwu. (Mat. 13:19) Ọ bụkwa n’obi ka nrubeisi nye Chineke na-aghaghị isite.—Ilu 3:1; Rom 6:17.
Ka izi ihe gị wee bamie abamie otú ahụ, lekwasị anya n’ebumnobi ndị a: (1) Chọpụta ihe nweworo mmetụta n’obi onye na-ege gị ntị. (2) Mee ka àgwà ndị dị mma, dị ka ịhụnanya, na egwu Chineke, sikwuo ike. (3) Gbaa onye na-ege gị ntị ume inyocha ebumnobi ya ka o wee nwee ike ime ihe na-atọ Jehova ụtọ n’ụzọ zuru ezu.
Iji Nghọta Eme Ihe. Ihe mere na ndị mmadụ anakwerebeghị eziokwu ahụ dịgasị iche iche. Mgbe ị na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i wepụsịa ajọ mbunobi e nwere ma kwuo ihe ndị bụ́ eziokwu iji gbazie echiche ndị na-ezighị ezi onye ị na-amụrụ ihe nwere, ma ọ bụ ọ pụrụ nanị ịdị mkpa ka i nye ihe àmà. Jụọ onwe gị, sị: ‘Onye a ọ̀ maara na dị ka mmadụ, na ya nwere mkpa ime mmụọ? Olee ihe ndị o kwenyeworo na ha? Olee ihe ndị ọ na-ekweghị na ha? Gịnị mere o ji ruo nkwubi okwu ndị ahụ? Ọ̀ chọrọ enyemaka iji merie ọchịchọ ndị pụrụ igbochi ya ịnakwere ibu ọrụ ndị na-abịa site n’ịmata eziokwu?’
Ọ naghị adị mfe mgbe nile ịchọpụta ihe mere ndị mmadụ ji kwenye n’ihe ndị ha kwenyere. “Mmiri nke miri emi ka ndụmọdụ n’obi mmadụ bụ,” ka Ilu 20:5 na-ekwu, “ma onye nghọta ga-adọpụta ya.” Nghọta bụ ikike ịghọta ihe a na-apụghị ịmata ngwa ngwa. Nke a na-achọ nleruanya na omume inwe mmetụta banyere ndị ọzọ.
Ọ bụghị nanị ọnụ ka e ji ezirịta ozi. Otu isiokwu pụrụ ime ka ọdịdị ihu ma ọ bụ ụda olu nke onye a na-amụrụ ihe gbanwee. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị maara na ọ bụrụ na e nwee mgbanwe n’àgwà nwa gị, ọ pụrụ igosi na ọ dị ihe ọhụrụ na-enwe mmetụta ná ndụ ya. Elegharala ihe mgbaàmà ndị a anya. Ha bụ ihe ndị na-eme ka a matatụ ihe dị ya n’obi.
Ajụjụ ndị e ji nlezianya họrọ pụrụ inyere gị aka ịjụpụta ihe dị mmadụ n’obi. Ị pụrụ ịjụ ya, sị: “Olee ihe i chere banyere . . . ?” “Olee ihe mere i ji kweta na . . . ?” “Gịnị ka ị ga-eme ma . . . ?” Ma, lezie anya ka ị ghara ịjụ ndị mmadụ ajụjụ gabiga ókè. Tupu ị jụọ ajụjụ, ị pụrụ iji akọ kwuo, sị: “Ewela iwe ka m jụọ gị. . . . ” Ịchọpụta ihe dị mmadụ n’obi bụ ọrụ na-achọ oké nlezianya, nke a na-apụghị ime ọkụ ọkụ. N’ọnọdụ ka ukwuu, a ghaghị ime ka e nwee ntụkwasị obi ruo oge ụfọdụ tupu mmadụ adị njikere ikwupụta ihe dị ya n’obi. Ọbụna mgbe i meworo nke ahụ, ị ghaghị ilezi anya ka onye ahụ ghara iche na ị na-achọ ịmata ihe ndị na-agbasaghị gị.—1 Pita 4:15.
A chọkwara nghọta n’ụzọ i si emeghachi omume n’ihe ị nụrụ. Cheta na ebumnobi gị bụ ịghọta ihe ndị mmadụ na-eche ka i wee mata ihe ọmụma dabeere na Bible nke yikarịrị ka ọ ga-akpali ha. Merie n’egbughị oge, ọchịchọ ọ bụla nke ikpughe ezighị ezi nke echiche ha. Kama nke ahụ, mụrụ anya iji chọpụta mmetụta ndị kpaliri okwu ndị ahụ. Mgbe ahụ ị ga-amata ụzọ ị ga-esi zaghachi; onye ị na-amụrụ ihe, n’inwekwa mmetụta na ị ghọtara echiche ya, yikarịrị ka ọ ga-echesi echiche ike banyere ihe ị na-ekwu.—Ilu 16:23.
Ruo n’ókè ụfọdụ, ị pụrụ ịkpali ndị mmadụ ọbụna mgbe ị na-agwa ìgwè buru ibu okwu. Ọ bụrụ na ị na-ele ndị na-ege gị ntị anya otú dị mma, na ị mụ anya iji chọpụta ọdịdị ihu ha, na-ajụkwa ajụjụ ndị na-achọghị nzaghachi bụ́ ndị na-akpali iche echiche, o yikarịrị ka ị ga-amatatụ ihe ndị na-ege gị ntị na-eche banyere ihe ị na-ekwu. Ọ bụrụ na ị mata ndị na-ege gị ntị nke ọma, gosi na ọnọdụ ha na-emetụ gị n’obi. Buru àgwà nke ọgbakọ ahụ dum n’uche ka i so ha na-atụgharị uche n’Okwu Chineke.—Gal. 6:18.
Ịkpali Mmetụta Ndị Bara Uru. Mgbe ị ghọtatụworo ihe mmadụ kwenyere, ihe ọ na-ekwenyeghị, na ihe kpatara ya, ị ga-enwe ike ịdabere na ya kwuo okwu. Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Jizọs ruru n’obi nke ndị na-eso ụzọ ya site ‘n’imepere ha Akwụkwọ Nsọ nke ọma’ n’ihe banyere ihe ndị ka mesịrịnụ. (Luk 24:32) Gị onwe gị kwa kwesịrị ịgbalị ijikọta ahụmahụ mmadụ nweworo, ihe na-agụsi ya agụụ ike na ihe ọ na-agụta n’Okwu Chineke. A ga-akpali obi onye a na-amụrụ ihe n’ụzọ bara uru mgbe ọ ghọtara n’ụzọ doro anya na: “Ihe a bụ EZIOKWU AHỤ!”
Mgbe i mesiri ịdị mma Jehova, ịhụnanya ya, obiọma ya na-erughịrị mmadụ, na izi ezi nke ụzọ ya ike, ị na-enyere ndị ị na-akụziri ihe aka ịmụba ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ. Mgbe i wepụtara oge wee gosi ndị na-ege gị ntị àgwà ọma ndị Chineke na-ahụ n’ime ha n’otu n’otu, ị na-eme ka ha nwee ihe mere ha ga-eji kwere na ọ pụrụ ikwe omume ha na ya inwe mmekọrịta. A pụrụ imezu nke a site n’ịtụgharị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Abụ Ọma 139:1-3, Luk 21:1-4, na Jọn 6:44 nakwa site n’inyere ndị na-ege gị ntị aka ịghọta ịdị omimi nke ịhụnanya Jehova n’ebe ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ. (Rom 8:38, 39) Kọwaa na ọ bụghị nanị mmejọ ka Jehova na-ahụ, ọ na-ahụkwa ụzọ ndụ anyị dum, ịnụ ọkụ n’obi anyị maka ofufe dị ọcha, ịhụnanya anyị nwere maka aha ya. (2 Ihe 19:2, 3; Hib. 6:10) Ọ na-echeta ọbụna ihe ndị kasị nta banyere anyị n’otu n’otu, n’ụzọ dịkwa ịrịba ama, ọ ga-eme ka “ndị nile nọ n’ili ncheta” dịghachi ndụ. (Jọn 5:28, 29; Luk 12:6, 7) Ebe ọ bụ na e mere ụmụ mmadụ n’oyiyi Chineke, ọtụtụ mgbe, ịtụle àgwà ya dị iche iche ga-akpali mmadụ iji obi ya gee ntị.—Jen. 1:27.
A pụkwara iru n’obi mmadụ mgbe ọ mụtara ile ndị mmadụ anya otú Jehova si ele ha anya. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ọ bụrụ na Chineke anyị na-emere anyị ebere n’otu n’otu, mgbe ahụ ọ na-egosikwa ndị ọzọ otu nchebara echiche ahụ n’agbanyeghị nzụlite ha, mba, ma ọ bụ ebo ha si na ya. (Ọrụ 10:34, 35) Mgbe ọ bụla mmadụ ghọtara nke ahụ, a ga-enwe ezi ihe ndabere sitere n’Akwụkwọ Nsọ mere ọ ga-eji wepụ ịkpọasị na ajọ mbunobi n’ime obi ya. Nke a ga-eme ka o nwee ike iso ndị ọzọ na-adị n’udo ka ọ na-amụta imezu uche Chineke.
Egwu Chineke bụ mmetụta ọzọ i kwesịrị inyere ndị ọzọ aka ịzụlite. (Ọma 111:10; Mkpu. 14:6, 7) Nsọpụrụ dị omimi, ma ọ bụ egwu Chineke, dị otú ahụ pụrụ ịkpali mmadụ imezu ihe ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị emeli n’ike ya. Site n’ịtụle ihe omume dị iche iche Jehova na-eme bụ́ ndị na-akpali egwu nsọpụrụ, tinyere ebere ịhụnanya ya na-enweghị atụ, ị pụrụ inyere ndị ọzọ aka inwe egwu dị mma nke ime ihe na-adịghị amasị ya.—Ọma 66:5; Jer. 32:40.
Jide n’aka na ndị na-ege gị ntị ghọtara na àgwà ha dị mkpa nye Jehova. O nwere mmetụta, sitekwa n’otú anyị si emeghachi omume ná nduzi ya, anyị na-akpasu ya iwe ma ọ bụ na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ. (Ọma 78:40-42) Gosi ndị mmadụ ihe mere àgwà ha pụrụ iji nwee mmetụta dị mkpa n’ịzaghachi ịma aka Setan mara Chineke.—Ilu 27:11.
Nyere ndị na-ege gị ntị aka ịhụ na ime ihe Chineke na-achọ baara ha uru. (Aịsa. 48:17) Otu ụzọ a pụrụ isi mee nke a bụ site n’izo aka n’ihe ịjụ amamihe Chineke, ọbụna ruo nwa oge, na-arụpụta n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ anụ ahụ́. Kọwaa otú mmehie si ekewapụ anyị n’ebe Chineke nọ, na-anapụ ndị ọzọ ohere nke isite n’aka anyị mụta eziokwu ahụ, n’aka nke ọzọkwa, na-anapụ ha ihe ruuru ha. (1 Tesa. 4:6) Nyere ndị na-ege gị ntị aka iji ngọzi ndị ha malitewororị inweta n’ihi idebe iwu Chineke kpọrọ ihe. Mee ka ekele ha nwere maka eziokwu ahụ bụ́ na ịga ije n’ụzọ ezi omume nke Jehova na-eme ka anyị zere oké nhụsianya sikwuo ike. Ozugbo mmadụ nwere okwukwe n’amamihe dị n’ime ihe n’ụzọ nke Chineke, ọ ga-ajụ ụzọ ọ bụla nke na-emegide ya. (Ọma 119:104) Ọ gaghị ewere nrubeisi dị ka ibu arọ kama dị ka ụzọ isi gosipụta iguzosi ike n’ihe nke sitere n’ịhụnanya maka Jehova dị ka onye.
Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Nnyocha. Iji nọgide na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ, ọ dị ndị mmadụ mkpa ịdị na-eme ihe banyere ihe dị ha n’obi. Kọwaa otú Bible pụrụ isi nyere ha aka ime nke a.
Nyere ndị na-ege gị ntị aka ịmata na Bible abụghị nanị ihe ndekọ nke iwu dị iche iche, ndụmọdụ, akụkọ nke ihe ndị mere eme, na amụma. Ọ na-ekpughekwa ihe bụ́ echiche Chineke. Na Jems 1:22-25, e ji Okwu Chineke tụnyere enyo. Site n’otú anyị si emeghachi omume n’ihe ọ na-ekwu nakwa n’ụzọ Jehova si emezu nzube ya, ozi Bible na-ekpughe ihe dị anyị n’obi. N’ụzọ dị otú a ọ na-ekpughe ihe Chineke, bụ́ “Onye na-anwa obi,” na-ahụ n’ime anyị. (Ilu 17:3) Gbaa ndị na-ege gị ntị ume iburu nke a n’uche. Gbaa ha ume ịtụgharị uche n’ihe Chineke chekwawooro anyị n’ihe ndekọ Bible nakwa mgbanwe ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ka ha mee ná ndụ ha iji na-eme ihe na-atọ ya ụtọ karị. Nyere ha aka iwere ịgụ Bible dị ka ụzọ isi ghọta otú Jehova si atụ “echiche na ebumnuche nke obi” n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ka ha wee nwee ike ikwenyere Chineke n’ime mgbanwe ọ bụla dị mkpa.—Hib. 4:12; Rom 15:4.
Ndị ụfọdụ a na-amụrụ Bible pụrụ ịchọ itinye ihe ha na-amụta n’ọrụ; ma ha na-enwe nchegbu banyere ihe ndị ọzọ ga na-eche. Ha pụrụ ịdị na-agbaso ọchịchọ anụ ahụ́ ụfọdụ siri ike mgba. Ma ọ bụ, ha pụrụ ịdị na-ewere omume ha dị ka ihe na-adịghị oké njọ ka ha wee hụ ụzọ isi na-ejere Chineke ozi mgbe ha ka nọ na-eme omume ụwa. Kọwapụta ihe ize ndụ dị n’inwe obi abụọ dị otú ahụ. (1 Eze 18:21) Gbaa ha ume ikpegara Chineke ekpere ka o nyochaa ma nụchaa obi ha.—Ọma 26:2; 139:23, 24.
Gosi ha na Jehova na-aghọta mgba ha na-agba nakwa na Bible na-akọwa ihe na-ewere ọnọdụ. (Rom 7:22, 23) Nyere ha aka ilezi anya ka ha ghara ikwe ka ọchịchọ nke obi na-ezughị okè merie ha.—Ilu 3:5, 6; 28:26; Jer. 17:9, 10.
Gbaa onye nke ọ bụla ume inyocha ebumnobi o ji na-eme ihe. Kụziere ya ịjụ onwe ya, sị: ‘Gịnị mere m ji chọọ ime ihe a? Ọ̀ ga-egosi Jehova na m ji ihe nile o mewooro m kpọrọ ihe n’ezie?’ Rụọ ọrụ iji wusie nkwenye o nwere ike, nke bụ́ na iso Jehova nwee mmekọrịta ọ nabatara bụ ihe onwunwe kasị oké ọnụ ahịa mmadụ ọ bụla pụrụ inwe.
Nyere ndị na-ege gị ntị aka ịghọta mkpa iji ‘obi ha dum’ na-ejere Jehova ozi dị. (Luk 10:27) Nke a pụtara na mmetụta ha, ọchịchọ ha, na ebumnobi ha dum aghaghị ikwekọ n’ụzọ Jehova. Ya mere kụziere ndị na-ege gị ntị inyocha ọ bụghị nanị ihe ha na-eme kamakwa ihe ha na-eche banyere ihe ndị Chineke chọrọ na ebumnobi ha ji na-ejere ya ozi. (Ọma 37:4) Ka ndị ị na-amụrụ ihe na-aghọta ebe ndị ọ dị mkpa ka ha meziwanye ihe, gbaa ha ume ikpe ekpere gwa Jehova, sị: “Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.”—Ọma 86:11.
Mgbe onye a na-amụrụ ihe so Jehova na-enwe mmekọrịta onwe onye, ọ ga-erubere Chineke isi n’ihi okwukwe ọ bụghị nanị n’ihi agbamume gị. Mgbe ahụ ọ ga-eji aka ya “na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma.” (Efe. 5:10; Fil. 2:12) Ụdị nrubeisi ahụ sitere n’obi na-atọ Jehova ụtọ.—Ilu 23:15.
Buru n’uche na ọ bụ Jehova bụ onye na-anwa obi ma na-adọta ndị mmadụ ka ya na ha nwee mmekọrịta. (Ilu 21:2; Jọn 6:44) Òkè nke anyị bụ iso ya rụkọọ ọrụ. (1 Kọr. 3:9) O yiri “ka à ga-asị na Chineke na-arịọsi arịrịọ ike site n’ọnụ anyị.” (2 Kọr. 5:20; Ọrụ 16:14) Jehova adịghị amanye onye ọ bụla ịnakwere eziokwu ahụ, ma ka anyị ji Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe, ọ pụrụ ime ka ndị na-ege anyị ntị ghọta na ihe ha na-anụ bụ azịza nye ajụjụ ha—ma ọ bụ ekpere ha. Buru nke a n’uche mgbe ọ bụla i nwere ohere izi ihe, rịọsiekwa Jehova arịrịọ ike maka nduzi na enyemaka ya.—1 Ihe 29:18, 19; Efe. 1:16-18.