Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 29 p. 152-156
  • Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Nile Na-amasị Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Nile Na-amasị Chineke?
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • E Gburu Mmadụ n’Otu Ememme Ncheta Ọmụmụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eme Ememme Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 29 p. 152-156

ISI NKE 29

Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Nile Na-amasị Chineke?

[Foto dị na peeji nke 152]

Gịnị mere nnọkọ oriri na ọṅụṅụ a ji dị Chineke mma?

Ị̀ NA-ENWE mmasị ịga nnọkọ oriri na ọṅụṅụ?— Ha pụrụ ịdị na-atọ ụtọ nke ukwuu. Ì chere na Onye Ozizi Ukwu ahụ ga-achọ ka anyị na-aga nnọkọ oriri na ọṅụṅụ?— O jere ihe a pụrụ ịkpọ nnọkọ oriri na ọṅụṅụ mgbe otu onye lụrụ nwunye, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya jee. Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ,” n’ihi ya, ọ na-enwe obi ụtọ mgbe anyị na-enwe ọṅụ ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ndị dị mma.—1 Timoti 1:11; Jọn 2:1-11.

Peeji nke 29 nke akwụkwọ a na-agwa anyị na Jehova kewara Oké Osimiri Uhie ka ndị Izrel nwee ike ịgafere. Ì chetara mgbe ị gụrụ ya?— Mgbe e mesịrị, ndị ahụ bụrụ abụ, gbaa egwú ma kelee Jehova. O yiri nnọkọ oriri na ọṅụṅụ. Ndị ahụ nwere nnukwute obi ụtọ, o dokwara anya na Chineke nwekwara obi ụtọ.—Ọpụpụ 15:1, 20, 21.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 40 mgbe nke ahụ gasịrị, ndị Izrel gara nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ọzọ buru ibu. Na nke ugbu a, ndị kpọrọ ha òkù anaghịdị efe Jehova ofufe. N’ezie, ndị kpọrọ ha òkù ọbụna na-akpọ isiala nye chi ndị ọzọ, na-esokwa ndị na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha enwe mmekọahụ. Ì chere na o kwesịrị ekwesị ije nnọkọ oriri na ọṅụṅụ dị otú ahụ?— Ọ masịghị Jehova, o nyekwara ndị Izrel ntaramahụhụ.—Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9; 1 Ndị Kọrint 10:8.

Bible kọkwara akụkọ banyere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ abụọ. Ọ̀ dị nke ọ bụla n’ime ha bụ́ iji cheta ụbọchị ọmụmụ nke Onye Ozizi Ukwu ahụ?— Ee e. Ọ bụ ndị ikom na-adịghị efe Jehova ka e meere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ abụọ a. Otu n’ime ha bụ ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ nke Eze Herọd Antipas. Ọ bụ ya na-achị ógbè Galili mgbe Jizọs bi n’ebe ahụ.

Eze Herọd mere ọtụtụ ihe ọjọọ. Ọ kpọghaara nwunye nwanne ya. Aha nwanyị ahụ bụ Herodias. Ohu Chineke, bụ́ Jọn Onye Na-eme Baptizim, gwara Herọd na ihe ahụ o mere adịghị mma. Herọd enweghị obi ụtọ n’ihe ahụ o kwuru. N’ihi ya, ọ tụrụ Jọn mkpọrọ.—Luk 3:19, 20.

Ka Jọn nọ n’ụlọ mkpọrọ, oge ruru mgbe a ga-eme ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ Herọd. Herọd kpọrọ nnukwute oriri. Ọ kpọrọ ọtụtụ ndị ukwu. Ha nile riri ma ṅụọ, nweekwa obi ụtọ. Ada Herodias bataziri ma gbaara ha egwú. Egwú ahụ ọ gbara tọgburu onye ọ bụla atọgbu nke na Eze Herọd chọrọ inye ya onyinye pụrụ iche. Ọ sịrị ya: “Ihe ọ bụla ị rịọrọ m, m ga-enye gị ya, ruo ọkara nke alaeze m.”

Olee ihe ọ ga-arịọ? Ọ̀ ga-arịọ ego? ka ọ̀ bụ uwe ndị mara mma? ka ọ̀ bụ obí eze nke ya? Nwatakịrị nwanyị ahụ amaghị ihe ọ ga-ekwu. Ya mere, ọ gakwuuru nne ya, bụ́ Herodias, sị ya: “Gịnị ka m kwesịrị ịrịọ?”

Herodias kpọrọ Jọn Onye Na-eme Baptizim asị nke ukwuu. Ya mere, ọ gwara nwa ya nwanyị ka ọ rịọ ka e nye ya isi Jọn. Nwatakịrị nwanyị ahụ gaghachikwuuru eze, sị ya: “Achọrọ m ka i nye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim ozugbo n’ọkwá.”

Eze Herọd achọghị igbu Jọn n’ihi na ọ maara na Jọn bụ ezi mmadụ. Ma Herọd ekwela ya nkwa, ọ nọkwa na-eche ihe ndị ọzọ bịara nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ahụ ga-eche ma ọ bụrụ na ọ gbanwee obi ya. Ya mere, o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa n’ụlọ mkpọrọ bepụ Jọn isi. N’oge na-adịghị anya, nwoke ahụ lọghachitere. O bu isi Jọn n’ọkwá, o wee bunye ya nwa agbọghọ ahụ. Nwatakịrị nwanyị ahụ bunyeziri ya nne ya.—Mak 6:17-29.

Ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ nke ọzọ Bible kọrọ banyere ya dịkwa njọ dị ka nke Herọd. Ọ bụ otu eze Ijipt ka e meere ya. N’oge a nọ na-enwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ a, eze ahụ kwukwara ka e bepụ otu onye isi. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ kwụbara ozu nwoke ahụ n’elu osisi ka nnụnụ rie anụ ya! (Jenesis 40:19-22) Ì chere na Chineke kwadoro nnọkọ oriri na ọṅụṅụ abụọ ahụ?— Ị̀ gaara achọ ịga ha?—

[Foto dị na peeji nke 153]

Gịnị mere n’ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ Herọd?

Anyị ma na ihe nile e dere n’ime Bible nwere ihe mere e ji dee ha. Ọ kọrọ nanị banyere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ abụọ. E mekwara ihe ọjọọ na ha abụọ dị ka ihe so n’ememe ahụ. Ya mere, olee ihe ị ga-asị na Chineke na-agwa anyị banyere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ? Chineke ọ̀ chọrọ ka anyị na-eme ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ?—

Ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ adịghị ebepụ mmadụ isi ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ dị otú ahụ taa. Ma, ọ bụ ndị na-adịghị efe ezi Chineke ahụ ofufe malitere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ. Akwụkwọ a na-eji eme nnyocha bụ́ The Catholic Encyclopedia kwuru okwu banyere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ ndị e hotara na Bible, sị: “Ọ bụ nanị ndị mmehie . . . na-eme oké oriri iji cheta ụbọchị a mụrụ ha.” Ànyị chọrọ ịdị ka ha?—

Gịnị banyere Onye Ozizi Ukwu ahụ? Ò mere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ ya?— Ee e, Bible ekwughị ihe ọ bụla banyere ime oriri iji cheta ụbọchị a mụrụ Jizọs. N’ezie, ụmụazụ Jizọs nke oge mbụ emeghị ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ ya. Ị̀ ma ihe mere ndị mmadụ ji kpebie ka oge na-aga ime ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ Jizọs na December 25?—

Dị ka akwụkwọ a na-eji eme nnyocha bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, a họọrọ ụbọchị ahụ n’ihi na “ndị Rom anọworị jiri ya na-eme ihe dị ka ụbọchị Oriri nke Saturn, na-eme ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ nke anyanwụ.” Ya mere, ndị mmadụ kpebiri ime ememe ụbọchị ọmụmụ Jizọs n’ụbọchị ndị na-ekpere arụsị ji eme ememe ha!

Ị̀ ma ihe mere ọ na-apụghị iji bụrụ na a mụrụ Jizọs na December?— Ọ bụ n’ihi na Bible na-ekwu na mgbe a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ ka nọ n’ime ọhịa n’abalị. (Luk 2:8-12) Ha agaraghịkwa anọ n’ime ọhịa ebe ahụ n’ọnwa December ahụ nke bụ́ oge oyi nakwa oge udu mmiri n’obodo ahụ.

[Foto dị na peeji nke 154]

N’ihi gịnị ka ọ na-apụghị iji bụrụ na a mụrụ Jizọs na December 25?

Ọtụtụ ndị ma na Krismas abụghị ụbọchị a mụrụ Jizọs. Ha maara ọbụna na ndị na-ekpere arụsị na-emebu ememe na-adịghị amasị Chineke n’ụbọchị ahụ. Ma ọtụtụ ndị na-agba Krismas n’agbanyeghị nke ahụ. Inwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ dị ha mkpa karịa ịchọpụta ihe bụ́ echiche Chineke n’ezie banyere ya. Ma, anyị chọrọ ime ihe ga-adị Jehova mma, ọ́ bụghị ya?—

Ya mere, mgbe anyị na-enwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, anyị kwesịrị ijide n’aka na ha bụ ndị dị mma n’anya Jehova. Anyị pụrụ inwe ha n’oge ọ bụla n’afọ. Ọ dịghị mkpa ka anyị chere maka otu ụbọchị pụrụ iche tupu anyị enwee ya. Anyị pụrụ iri nri pụrụ iche ma nweta obi ụtọ site n’igwuri egwú. Ị̀ ga-achọ ime nke ahụ?— Ma eleghị anya, gị na ndị mụrụ gị pụrụ ikwurịta ya, ha ga-enyekwara gị aka ịhazi otu nnọkọ oriri na ọṅụṅụ. Nke ahụ ga-adị mma, ọ́ bụghị ya?— Ma, tupu i mee ndokwa ọ bụla maka inwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, i kwesịrị ijide n’aka na ọ bụ nke ga-adị Chineke mma.

[Foto dị na peeji nke 156]

Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na nnọkọ oriri na ọṅụṅụ anyị na-eme dị Chineke mma?

E gosikwara mkpa ọ dị ịdị na-eme ihe dị Chineke mma mgbe nile n’Ilu 12:2; Jọn 8:29; Ndị Rom 12:2; nakwa na 1 Jọn 3:22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya