Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova na-eme ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ. Ememe ncheta ọmụmụ bụ ememe mgbaafọ nke ụbọchị a mụrụ gị. Ya mere gịnị mere a ga-eji na-eme ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ ma a gaghị eme ememe mgbaafọ ụbọchị ọmụmụ?
N’ikwu eziokwu, ọ dịghị mkpa onye Kraịst ime nke ọ bụla. Ma, nke ahụ apụtaghị na ha abụọ hà nhata n’ihe ha pụtara ma ọ bụ na ndị Kraịst ga-elerịrị nke mbụ (ya bụ́ ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ) anya otú ha si ele ememe ncheta ọmụmụ.
Dị ka e kwuru, a pụrụ ikwu na ha abụọ bụ ememe mgbaafọ n’ihi na “mgbaafọ” bụ ‘mbịaghachi kwa afọ nke otu ụbọchị na-aka otu ihe omume akara.’ Ọ pụrụ ịbụ ememe mgbaafọ nke ihe omume ọ bụla—ụbọchị i nwere ihe ọghọm ụgbọala, ị hụrụ ka ụwa na-aba n’etiti anyanwụ na ọnwa, i so ezinụlọ gị jee igwu mmiri, na ihe ndị ọzọ. O doro anya na ndị Kraịst adịghị eme “mgbaafọ” nke ihe nile ka ọ ghọọ ụbọchị pụrụ iche ma ọ bụ kpọọ oriri iji mee ememe ncheta ya. Mmadụ kwesịrị ịtụle akụkụ nile nke ihe omume ma kpebie ihe kwesịrị ekwesị.
Dị ka ihe atụ, Chineke nyere ụmụ Israel ntụziaka kpọmkwem ka ha na-eme ememe kwa afọ nke ụbọchị ahụ mgbe mmụọ ozi ya gabigara ụlọ ndị Israel n’Ijipt na ọpụpụ nke ndị ya na 1513 B.C.E., ọ rụpụtara. (Ọpụpụ 12:14) Mgbe ndị Juu, gụnyere Jisọs, mesịrị mee ememe ncheta mgbaafọ nke ihe omume ahụ, ọ bụ ná nrubeisi nye nduzi Chineke, ha ejighịkwa oriri ma ọ bụ inyerịta onyinye mee ya. Ndị Juu mere ememe mgbaafọ nke nraraghachi nye nke ụlọ nsọ ahụ dị ka nke pụrụ iche. Ọ bụ ezie na e nyeghị iwu na Bible ka e mee ememe ncheta nke ihe omume a mere ihe akụkọ, Jọn 10:22, 23 na-egosi na Jisọs akatọghị ya. N’ikpeazụ, ndị Kraịst na-enwe nzukọ pụrụ iche n’ememe mgbaafọ nke ọnwụ Jisọs. N’ezie, a na-eme nke a ná nrubeisi nye iwu doro anya dị n’Okwu Chineke.—Luk 22:19, 20.
Gịnị banyere ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ? N’ala ụfọdụ ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ di na nwunye ime ememe mgbaafọ nke mbanye ha banyere n’ọnọdụ alụmdi na nwunye, bụ́ ndokwa Chineke malitere. (Jenesis 2:18-24; Matiu 19:4-6) N’ezie, Bible adịghị egosi alụmdi na nwunye dị ka ihe na-ezighị ezi. Jisọs jere ememe alụmdi na nwunye ma kerekwa òkè n’ime ka ememe ahụ dị ụtọ.—Jọn 2:1-11.
Ya mere ọ gaghị abụ ihe a na-adịghị ahụkebe na di na nwunye pụrụ, n’ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ ha, iwepụta oge iji chee echiche n’ọṅụ nke ihe omume ahụ nakwa ná mkpebi ha ịrụ ọrụ maka ihe ịga nke ọma dị ka di na nwunye. Ma hà tụkwasịrị uche n’oge obi ụtọ a nanị n’onwe ha, dị ka di na nwunye nanị ma ọ bụ na ha nwere ndị ikwu ma ọ bụ ezi ndị enyi ha ole na ole sonyeere ha ga-abụ ihe dịịrị ha ikpebi. Oge ahụ ekwesịghị ịbụ ihe ngọpụ maka nnọkọ oriri na ọṅụṅụ buru ibu. N’oge a ndị Kraịst ga-achọ ịbụ ndị ụkpụrụ ndị dị ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị na-eduzi. Ya mere ma mmadụ ọ̀ na-eme ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ ma ọ bụ na ọ dịghị eme ya bụ okwu aka ya.—Ndị Rom 13:13, 14.
Otú ọ dị, gịnị banyere ime ememe ncheta ọmụmụ n’ụzọ pụrụ iche? Ànyị nwere ihe ngosi ọ bụla sitere na Bible banyere ememe mgbaafọ dị otú ahụ?
Ná mmalite narị afọ a, Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, mere ememe ncheta ọmụmụ. Ọtụtụ n’ime ha nwere akwụkwọ nta ndị a kpọrọ Daily Heavenly Manna. Ndị a nwere otu akụkụ Bible maka ụbọchị nke ọ bụla, ọtụtụ ndị Kraịst tinyekwara ntakịrị foto na peji ndị kwekọrọ n’ụbọchị a mụrụ Ndị Mmụta Bible ibe ha. Ọzọ, Ụlọ Nche nke February 15, 1909 (Bekee), kọrọ na n’otu mgbakọ na Jacksonville, Florida, U.S.A., a kpọlitere Nwanna Russell, bụ́ onyeisi oche nke Society mgbe ahụ, n’elu ikpo okwu. N’ihi gịnị? E nyere ya onyinye ncheta ụbọchị ọmụmụ ọ na-atụghị anya ya nke igbe ụfọdụ nke mkpụrụ osisi vine, akwụoro, na oroma. Nke ahụ na-egositụ anyị otú ihe dị n’oge gara aga. Iji ghọta ọnọdụ ndị gbara okwu ndị a gburugburu, cheta na n’oge ahụ, Ndị Mmụta Bible mekwara ememe December 25 dị ka ememe mgbaafọ nke ọmụmụ Jisọs, ma ọ bụ ncheta ụbọchị ọmụmụ ya. Ọ bụ omenala ọbụna inwe oriri Krismas n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn.
N’ezie, eri mgbe ahụ ndị Chineke etowo n’ụzọ ime mmụọ n’ọtụtụ ụzọ. N’afọ ndị 1920 ìhè eziokwu chapụtakwurunụ mere ka ha nwee ike ịhụ ihe ndị na-esonụ:
A mụghị Jisọs na December 25, bụ́ ụbọchị e jikọrọ ya na okpukpe ọgọ mmụọ. Bible na-atụziri anyị ime ememe ncheta nke ụbọchị ọnwụ Jisọs, ọ bụghị ememe mgbaafọ nke ọmụmụ ya ma ọ bụ nke ọmụmụ onye ọ bụla ọzọ. Ime otú ahụ kwekọrọ n’Eklisiastis 7:1 na n’eziokwu ahụ bụ́ na otú ndụ onye kwesịrị ntụkwasị obi si gaa ka mkpa karịa ụbọchị ọmụmụ ya. Bible enweghị ihe ndekọ na ohu ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi mere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ ya. O dekọrọ ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ nke ndị ọgọ mmụọ, na-ejikọ oge ndị a na ihe omume obi ọjọọ. Ka anyị leba anya n’ọnọdụ ndị gbara ememe mgbaafọ nke ụbọchị ọmụmụ ndị ahụ gburugburu.
Nke mbụ bụ ememe ncheta ọmụmụ nke Fero n’oge Josef. (Jenesis 40:20-23) Banyere nke a, isiokwu dabeere n’ememe ncheta ọmụmụ n’akwụkwọ Encyclopædia of Religion and Ethics nke Hastings na-amalite, sị: “E jikọtara omenala nke ime ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ na ọgụgụ oge, ma a bịa n’ọdịdị ya, ma a bịakwa n’ihe ndị mejupụtara ya, e jikọtara ya na ụkpụrụ okpukpe ụfọdụ nke mgbe ochie.” Mgbe e mesịrị, akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ hotara ihe onye ọkà n’ihe ọmụmụ banyere Ijipt mgbe ochie bụ́ Sir J. Gardner Wilkinson kwuru, bụ́ onye dere, sị: “Onye Ijipt ọ bụla jiri ụbọchị na ọbụna ruo na hour a mụrụ ya kpọrọ oké ihe; o yiri ka, dị ka ọ dị na Peasia, onye ọ bụla ò jiri oké aṅụrị mee ememe ncheta ọmụmụ ya, jiri ihe nile na-enye ndị mmadụ ntụrụndụ, na ihe oriri bara ụba na-anabata ndị enyi ya.”
Ememe ncheta ọmụmụ ọzọ a kpọtụrụ uche na Bible bụ nke Herọd, bụ́ nke e gbupụrụ isi Jọn Baptist na ya. (Matiu 14:6-10) Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia (mbipụta nke 1979) na-enye nghọta a: “Ndị Gris biri ndụ tupu Alexander Onye Ukwu mere ememe ncheta ọmụmụ nke chi dị iche iche na ndị ikom a ma ama. Okwu G[ri]k bụ́ genéthlia gosipụtara ememe ndị a, ebe genésia pụtara ememe e ji echeta ụbọchị ọmụmụ nke onye dị mkpa nwụrụ anwụ. Na 2 Macc[abees] 6:7 anyị na-ahụ ebe e zoro aka na genéthlia nke Antiochus nke Anọ e mere kwa ọnwa, bụ́ n’oge a manyere ndị Juu ‘ikere òkè n’ịchụ àjà.’ . . . Mgbe Herọd mere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ ya ọ na-eme ihe kwekọrọ n’omenala nke Oge Alexander Onye Ukwu nwụsịrị; e nweghị ihe àmà nke na-egosi na e mere ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ n’Israel tupu oge Alexander Onye Ukwu.”
N’eziokwu, ezi ndị Kraịst taa adịghị echegbubiga onwe ha ókè banyere otú omume ma ọ bụ omenala nile si malite na njikọ okpukpe oge ochie ndị ha pụrụ inwe, ha adịghịkwa enwe ọchịchọ ileghara mgbaàmà ụfọdụ ndị kwesịrị ekwesị bụ́ ndị dị n’Okwu Chineke anya. Nke a gụnyere na nanị ememe ncheta ọmụmụ ndị e dekọrọ na Bible bụ nke ndị ọgọ mmụọ, e jikọtakwara ya na ihe atụ dị iche iche nke obi ọjọọ. N’ihi ya, n’ụzọ doro anya Akwụkwọ Nsọ na-ele ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ anya ọjọọ, bụ́ eziokwu nke ezi ndị Kraịst na-adịghị eleghara anya.
N’ihi ya, ọ bụ ezie na ndị Kraịst ịhọrọ ma hà ga-eme ememe ncheta mgbaafọ agbamakwụkwọ ha bụ kpọmkwem okwu dịịrị onwe onye, e nwere ezi ihe ndị mere ndị Kraịst tozuru okè ji ezere ime ememe ncheta ụbọchị ọmụmụ.