ISI NKE 48
Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Udo Ga-adị na Ya—Ị Pụrụ Ibi na Ya
CHINEKE tinyere Adam na Iv n’ogige Iden. Ọ bụ ezie na ha nupụrụ isi ma nwụọ, Chineke mere ka o kwe ụmụ ha, gụnyere anyị bụ́ ndị dị ndụ taa, omume ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
Bible kwuru banyere “eluigwe ọhụrụ” na “ụwa ọhụrụ.” (Aịsaịa 65:17; 2 Pita 3:13) Ihe mejupụtara “eluigwe” nke dị ugbu a bụ ọchịchị ụmụ mmadụ ndị na-achị taa, ma, ọ bụ Jizọs Kraịst na ndị ya na ha ga-eso na-achị n’eluigwe ga-emejupụta “eluigwe ọhụrụ.” Lee ihe mara mma ọ ga-abụ mgbe eluigwe ọhụrụ a, bụ́ ọchịchị ezi omume Chineke nke ga-eweta udo, ga na-achị ụwa dum!
Mgbe ahụ, gịnịzi bụ “ụwa ọhụrụ” ahụ?— Ụwa ọhụrụ ahụ ga-abụ ndị ezi mmadụ ndị hụrụ Jehova n’anya. Ị̀ hụlanụ, mgbe Bible kwuru banyere “ụwa,” mgbe ụfọdụ ọ na-apụta ndị mmadụ bi n’ụwa, ọ bụghị ala n’onwe ya. (Jenesis 11:1; Abụ Ọma 66:4; 96:1) Ya mere, ndị ga-emejupụta ụwa ọhụrụ ahụ ga-ebi kpọmkwem n’elu ala ebe a.
Ụwa nke dị ugbu a nke ndị ajọ mmadụ agakwaghị adị. Cheta na Iju Mmiri nke oge Noa kpochapụrụ otu ajọ ụwa nke ndị mmadụ mejupụtara. Dịkwa ka anyị mụtaworo, a ga-ebibi ajọ ụwa nke dị ugbu a n’Amagedọn. Ugbu a, ka anyị lee otú ibi ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke ga-adị mgbe Amagedọn gasịrị.
Ị̀ chọrọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs n’ime ụwa ọhụrụ Chineke nke udo ga-adị na ya?— Ọ dịghị dọkịta nwere ike ime ka anyị dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ dịghị ọgwụ ga-eme ka anyị ghara ịnwụ anwụ. Nanị ụzọ anyị pụrụ isi dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi bụ site n’ịbịaru Chineke nso. Onye Ozizi Ukwu ahụ na-agwakwa anyị ụzọ isi mee nke ahụ.
Ka anyị wepụta Bible anyị ma sapeta Jọn isi 17, amaokwu 3. N’ebe a, anyị na-ahụ ihe Onye Ozizi Ukwu ahụ kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”
Ya mere, gịnị ka Jizọs sịrị na ọ dị mkpa ka anyị mee iji dị ndụ ebighị ebi?— Nke mbụ, anyị aghaghị inweta ihe ọmụma banyere Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, nakwa banyere Ọkpara ya, bụ́ onye nyere ndụ ya maka anyị. Nke a pụtara na ọ dị anyị mkpa ịmụ Bible. Akwụkwọ a, bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ na-enyere anyị aka ime nke ahụ.
Ma olee otú ịmụ banyere Jehova ga-esi nyere anyị aka ịdị ndụ ebighị ebi?— Dị nnọọ ka ọ dị anyị mkpa iri nri kwa ụbọchị, ọ dị anyị mkpa ịmụ banyere Jehova kwa ụbọchị. Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.”—Matiu 4:4.
Ọ dịkwa anyị mkpa inweta ihe ọmụma banyere Jizọs Kraịst n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ya ka o wepụ mmehie anyị. Bible na-ekwu, sị: “Nzọpụta adịghị n’onye ọ bụla ọzọ.” Bible na-ekwukwa, sị: “Onye na-egosipụta okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 4:12; Jọn 3:36) Gịnị ka ‘igosi okwukwe’ na Jizọs pụtara?— Ọ pụtara na anyị kwenyere n’ezie na Jizọs, marakwa na anyị apụghị ịdị ndụ ebighị ebi ma e wezụga ya. Ànyị kwenyere nke ahụ?— Ọ bụrụ na anyị kwenyere, anyị ga-anọgide na-amụta ihe site n’aka Onye Ozizi Ukwu ahụ kwa ụbọchị, anyị ga na-emekwa ihe o kwuru.
Otu ụzọ dị mma isi mụta ihe site n’aka Onye Ozizi Ukwu ahụ bụ ịgụ akwụkwọ a ugboro ugboro nakwa ikiri ihe osise nile dị na ya na iche echiche banyere ha. Lee ma ị ga-azali ajụjụ ndị ya na ihe osise ndị a so. Ọzọkwa, gị na nne gị ma ọ bụ nna gị na-agụkọ akwụkwọ a ọnụ. Ọ bụrụ na gị na ndị mụrụ gị anọghị, gị na ndị ọzọ toworo eto nakwa ụmụaka ndị ọzọ na-agụkọ ya ọnụ. Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya ma ọ bụrụ na ị pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe ọ dị mkpa ka ha mee iji dị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke site n’aka Onye Ozizi Ukwu ahụ?—
Bible na-agwa anyị, sị: “Ụwa na-agabiga.” Ma, Bible na-akọkwa otú anyị pụrụ isi dị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. Ọ na-ekwu, sị: “Onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ya mere, olee otú anyị pụrụ isi dị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke?— Ee, ọ bụ site n’inweta ihe ọmụma banyere Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs. Ma, anyị aghaghịkwa ịdị na-eme ihe anyị na-amụta. Ka ọmụmụ ị na-amụ akwụkwọ a nyere gị aka ime ihe ndị a.