Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jd isi 7 p. 83-95
  • Fee Jehova n’Ụzọ Kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ya Dị Elu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Fee Jehova n’Ụzọ Kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ya Dị Elu
  • Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỤKPỤRỤ CHINEKE SETỊPỤRỤ HÀ DỊ ELU GABIGA ÓKÈ?
  • GỊNỊ MERE A GA-EJI NABATA ỤKPỤRỤ JEHOVA?
  • “KPỌỌNỤ IHE ỌJỌỌ ASỊ, HỤKWANỤ EZI IHE N’ANYA”
  • BURU OKWU CHINEKE N’UCHE
  • NA-ATỤ CHINEKE EGWU DỊ MMA
  • Ọ Bụ Gị Ga-ekpebi Ma Ị̀ Ga-ahọrọ Ime Ihe Ọma Ka Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2024
  • Ndị Jehova Ji Ezi Omume Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ụkpụrụ Ònye Ka Ị Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Chọọnụ Jehova” Site n’Ife Ya n’Ụzọ Dị Ya Mma
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
jd isi 7 p. 83-95

ISI NKE ASAA

Fee Jehova n’Ụzọ Kwekọrọ n’Ụkpụrụ Ya Dị Elu

1. Olee ihe ndị bi na Jeruselem n’oge Zefanaya chere banyere ụkpụrụ Jehova?

“JEHOVA agaghị eme ihe ọma, ọ gaghịkwa eme ihe ọjọọ.” Nke a bụ ihe ndị bi na Jeruselem chere n’oge Zefanaya. Ha chere na Jehova atụghị anya n’aka ha na ha ga-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ọ bụla. Zefanaya kwuru na ha “dị ka ikè mmanya.” Ihe ọ na-ekwu bụ na ụmụ Izrel chọrọ ịnọgide na-ebi ndụ ntụsara ahụ́ n’echegbughị onwe ha banyere ozi ọ bụla nke na-ekwu na Chineke ga-eme ihe banyere ihe ha na-eme. Ma, Chineke gwara ndị Juu ahụ na ya “ga-eji oriọna nyochaa Jeruselem nke ọma” ma ‘lebara’ ndị leghaara ụkpụrụ ya anya anya. Ee, Jehova nwere ụkpụrụ, ọ chọkwara ịma otú ndị ya si ele ụkpụrụ ndị ahụ anya.—Zefanaya 1:12.

2. N’ebe i bi, olee otú ndị mmadụ si ele inwe ụkpụrụ anya?

2 Taakwa, ọtụtụ ndị enweghị mmasị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ. Ị pụrụ ịnụ ka ha na-asị, ‘Mewe ihe masịrị gị!’ Ụfọdụ na-eche, sị, ‘Ọ bụrụ na enweghị m ego ga-ezuru m ma ọ bụ na enweghị m ike ime ihe na-agụ m, o nweghị ihe ọjọọ dị na ya ma m mee ihe ọ bụla m nwere ike ime iji gbanwee ọnọdụ ahụ.’ Ha adịghị achọ ịma ihe bụ́ echiche Chineke ma ọ bụ ihe ọ chọrọ ha n’aka. Oleekwanụ banyere gị? Obi ọ̀ dị gị ụtọ na Onye Okike setịpụụrụ anyị ụkpụrụ?

3, 4. N’ihi gịnị ka i ji enwe mmasị na e nwere ụkpụrụ ndị ị ga na-agbaso?

3 Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị na-achọghị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke, na-anabata ụkpụrụ ụmụ mmadụ setịpụrụ n’ọtụtụ ihe a na-eme ná ndụ ngwa ngwa. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere ụkpụrụ e setịpụrụ n’ihe banyere mmiri. Ọtụtụ ọchịchị na-esetịpụ ụkpụrụ maka ụdị mmiri ha chọrọ ka ndị mmadụ na-aṅụ. Ọ́ bụrụkwanụ na ụkpụrụ ahụ dị nnọọ ala? Ọ pụrụ ịkpata otoro na ọrịa ndị ọzọ a na-aṅụta na mmiri. Ọ na-emetụtakwa ụmụaka karịsịa. Otú ọ dị, o yikarịrị ka ụkpụrụ ahụ dị elu e setịpụrụ maka mmiri ọṅụṅụ ọ̀ na-abara gị uru. Òtù Na-ahụ Maka Isetịpụ Ụkpụrụ ná Mba Dị Iche Iche kwuru, sị, “Ọ bụrụ na e nweghị ụkpụrụ, onye ọ bụla ga-achọpụta n’oge na-adịghị anya. Ọtụtụ mgbe, anyị adịghị ama otú ụkpụrụ ndị e setịpụrụ si eme ka e nwee ngwá ahịa ndị ka mma, ndị na-adịghị ize ndụ, ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị a rụpụtara n’ụzọ ka mma nakwa ndị a pụrụ iji dochie ibe ha—gụnyere inweta ha n’ọnụ ala.”

4 Ọ bụrụ na i kwere na ọ bara uru inwe ụkpụrụ n’ihe dị iche iche a na-eme ná ndụ, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na Chineke ga-enwe ụkpụrụ dị elu ọ chọrọ ka ndị a kpọkwasịrị aha ya na-agbaso?—Ọrụ 15:14.

ỤKPỤRỤ CHINEKE SETỊPỤRỤ HÀ DỊ ELU GABIGA ÓKÈ?

Ihe Osise dị na peeji nke 85

5. Olee otú Jehova si gosi site n’ọnụ Emọs na ọ dị mkpa ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Ya?

5 Ọ bụrụ na ị na-arụ ụlọ, ọ dị mkpa na ị ga-enwe ụkpụrụ ị ga-agbaso. Ọ bụrụ na otu n’ime mgbidi ya akwụghị ọtọ, ụlọ ahụ dum nwere ike ihuru ehuru. Ma ọ bụ, ọ bụrụ na e nwee ebe ahụ́ ụlọ ahụ na ibe ya na-ejikọtaghị ejikọta, ọ pụrụ ime ka ụlọ ahụ ghara ịdị mma obibi. Nke ahụ bụ isi ihe dị n’ọhụụ nke Emọs, bụ́ onye buru amụma na narị afọ nke itoolu T.O.A., hụrụ banyere ọnọdụ ebo iri nke mba Izrel nọ na ya. Ọ hụrụ ka Jehova ji “eriri e ji atụ̀ ihe kwụ ọtọ” guzoro ná mgbidi. Chineke kwuru, sị: “Lee, ana m etinye eriri a n’etiti ndị m, bụ́ Izrel. M gakwaghị ahapụ ha.” (Emọs 7:7, 8) “E ji eriri e ji atụ̀ ihe kwụ ọtọ wuo” mgbidi ihe atụ ahụ Emọs hụrụ nke Jehova guzo na ya. Mgbidi ahụ kwụ ọtọ. Otú ọ dị, n’oge Emọs, ụmụ Izrel akwụghịzi ọtọ n’ụzọ ime mmụọ—ha yiri mgbidi huuru ehuru nke e kwesịrị ịkwatu tupu ya adaa.

6. (a) Gịnị bụ isi ihe dị n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere? (b) Olee ihe mere ị ga-eji kwuo na a pụrụ ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke?

6 Ka ị na-amụ akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere, ị ga-ahụ isi ihe a nke pụtara ọtụtụ ugboro: Ọ dị oké mkpa ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. Ọ bụghị naanị ozi banyere nkatọ a katọrọ ndị na-adịghị eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ dị elu nke Chineke dị n’akwụkwọ ndị ahụ. Mgbe ụfọdụ Jehova nyochara ndị ya, ọ chọpụtara na ha na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. Na ha nwere ike ime otú ahụ gosiri na a pụrụ ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya; ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya ga-ekwe ụmụ mmadụ na-ezughị okè dị ka anyị omume. Tụlee otu ihe atụ.

7. Olee otú Zekaraya si enyere anyị aka ịhụ na ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova ga-ekwe ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume?

7 Mgbe ndị Juu ahụ si Babịlọn lọta tọsịrị ntọala ụlọ nsọ ahụ, ọrụ iwughachi ihe nke ha na-arụ kwụsịrị. Ya mere, Chineke zipụrụ ndị amụma ya bụ́ Hagaị na Zekaraya ka ha gaa gbaa ha ume ịmaliteghachi ọrụ ahụ. N’otu ọhụụ Jehova mere ka Zekaraya hụ, Ọ kọwara na Zerọbabel, bụ́ gọvanọ Juda, ji “eriri e ji atụ̀ ihe kwụ ọtọ n’aka” mgbe o doro nkume bụ́ isi nke wetara ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ ná njedebe. E wuru ụlọ nsọ ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. (Zekaraya 4:10) Ma tụlee ihe a na-adọrọ mmasị e kwuru banyere ụlọ nsọ ahụ e wuchaworo: “Anya asaa ndị a bụ anya Jehova. Ha na-awagharị n’ụwa dum.” Chineke hụrụ mgbe Zerọbabel doro nkume ahụ bụ́ isi. Ebe o nwekwara anya na-ahụ ihe niile, Ọ hụrụ na ụlọ ahụ e wughachiri ewughachi ruru ihe Ọ chọrọ, na o kwekọrọ n’ụkpụrụ Ya! Ihe anyị na-ekwu bụ na ọ bụ ezie na Jehova nwere ụkpụrụ dị elu, ụmụ mmadụ pụrụ ime ihe kwekọrọ na ya. N’ihi agbamume Hagaị na Zekaraya nyere, Zerọbabel na ndị ya mere ya. Dị ka Zerọbabel mere, gị onwe gị kwa pụrụ ime ihe Chineke na-atụ anya ka i mee. Ịmara nke ahụ na-eme ka obi sie anyị ike nke ukwuu!

GỊNỊ MERE A GA-EJI NABATA ỤKPỤRỤ JEHOVA?

8, 9. (a) Gịnị mere o ji kwesị ekwesị na Jehova ga na-esetịpụrụ ụmụ mmadụ ụkpụrụ? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe kwesịrị ekwesị na Chineke chọrọ ka ụmụ Izrel na-edebe iwu ya?

8 Ebe Chineke bụ Onye Okike, o nwere ikike isetịpụrụ ụmụ mmadụ ụkpụrụ nakwa ịtụ anya ka anyị na-eme ihe kwekọrọ na ha. (Mkpughe 4:11) Ọ dịghị mkpa ka Jehova kọchaara anyị ihe niile, n’ihi na o nyere ụmụ mmadụ akọ na uche dị ka ihe bara uru ga na-eduzi ha. (Ndị Rom 2:14, 15) Chineke gwara mmadụ abụọ mbụ ka ha ghara iri mkpụrụ si “n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ,” bụ́ nke na-egosi na Chineke nwere ikike isetịpụ ụkpụrụ ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. Ị manụ ihe mere. (Jenesis 2:17; 3:1-19) Ka Hosia na-arụtụ aka ná mkpebi na-ezighị ezi Adam mere, o dere, sị: ‘Ụmụ Izrel, dị ka mmadụ [bụ́ Adam], emebiwo ọgbụgba ndụ m.’ (Hosia 6:7) Hosia si otú a gosi na ụmụ Izrel leziri anya mehie.

9 Olee mmehie ha mere? Ha “emebiela ọgbụgba ndụ [Iwu] ahụ.” (Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Chineke ghọrọ onye nwe ndị ya site n’ịnapụta ha n’Ijipt. O dokwara anya na o nwere ikike isetịpụrụ ha ụkpụrụ. Ụmụ Izrel nabatara ọgbụgba ndụ ha na Jehova wee si otú ahụ kweta ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. (Ọpụpụ 24:3; Aịzaya 54:5) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ n’ime ha erubeghị isi n’Iwu ahụ. Ha ghọrọ ndị ikpe ịwụfu ọbara, igbu ọchụ, na ịkwa iko, mara.—Hosia 6:8-10.

10. Olee otú Chineke si gbalịa inyere ndị na-adịghị eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya aka?

10 Jehova zipụrụ ndị amụma dị ka Hosia ka ha nyere ndị Ya raara onwe ha nye ya aka. Mgbe Hosia na-emechi akwụkwọ amụma ya, o kwuru, sị: “Ònye maara ihe, ka o wee ghọta ihe ndị a? Ònye nwere uche, ka o wee mara ha? N’ihi na ụzọ Jehova ziri ezi, ọ bụ ndị ezi omume ga na-eje ije na ya; ma ndị na-emebi iwu ga-asụ ngọngọ na ya.” (Hosia 14:9) Ná mmalite isi nke iri na anọ n’akwụkwọ Hosia, anyị hụrụ na onye amụma ahụ kwusiri okwu ike banyere mkpa ọ dị ịlaghachikwuru Jehova. Ndị maara ihe ga-aghọta na Jehova kwupụtara ụzọ ziri ezi ndị ya kwesịrị ije ije na ha. Dị ka ohu Chineke raara onwe ya nye, o doro anya na ị chọrọ n’ezie ịnọgide na-eje ije na ha, na-eje ije n’ụzọ Jehova.

Ihe Osise dị na peeji nke 87

N’ihi gịnị ka i ji na-agbaso ụkpụrụ onye rụrụ ya setịpụrụ ma kwuo ka a na-agbaso?

11. Gịnị mere i kwesịrị iji debe iwu Chineke?

11 Hosia 14:9 gwakwara anyị uru ndị dị n’ime ihe ziri ezi. Anyị na-enweta ọtụtụ ngọzi na uru site n’ime ihe Chineke na-achọ. Ebe ọ bụ Onye Okike, ọ maara otú e si kee anyị. Ihe ọ na-atụ anya ka anyị mee bụ maka ọdịmma anyị. Anyị pụrụ iji ụgbọala na onye rụrụ ya mee ihe atụ mmekọrịta anyị na Chineke nwere. Onye rụrụ ụgbọala ma otú o si rụọ ya ma jikọta akụkụ ya dị iche iche. Ọ maara na ọ dị mkpa ka a na-agbanwe mmanụ injin ụgbọala ahụ site n’oge ruo n’oge. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na i leghara ụkpụrụ ahụ onye rụrụ ya setịpụrụ anya, ikekwe, na-eche na ụgbọala ahụ na-arụ ọrụ nke ọma? N’oge na-adịghị anya, injin ahụ ga-emebi, ọ ga-akwụsịkwa ịrụ ọrụ. Otú ahụ ka ọ dị ụmụ mmadụ. Onye kere anyị enyewo anyị iwu. Idebe ha ga-abara anyị uru. (Aịzaya 48:17, 18) Ịghọta na anyị na-erite uru site n’ịgbaso ụkpụrụ ya bụ ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya, na-edebe iwu ya.—Abụ Ọma 112:1.

12. Olee otú ije ije n’aha Chineke pụrụ isi mee ka mmekọrịta anyị na ya chikwuo anya?

12 Uru kasịnụ anyị na-erite n’idebe iwu Chineke bụ na anyị na Chineke ga-enwe mmekọrịta chiri anya karị. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya ma hụ otú ha si baa uru ma bụrụ ihe ezi uche dị na ha, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Onye setịpụrụ ụkpụrụ ndị ahụ nọ ga-esiwanye ike. Maịka onye amụma kọwara mmekọrịta ahụ chiri anya karị n’ụzọ mara mma, sị: “Ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya; ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Maịka 4:5) Lee ihe ùgwù anyị nwere ije ije n’aha Jehova, ịkwado aha ọma ya nakwa ịnabata ikike o nwere iduzi ndụ anyị! Dị ka o kwesịrị ịdị, anyị ga-achọ iṅomi àgwà ya. Ka anyị niile n’otu n’otu gbalịa mee ka mmekọrịta anyị na Chineke chikwuo anya.—Abụ Ọma 9:10.

13. N’ihi gịnị ka ịtụ egwu aha Chineke na-ejighị bụrụ egwu na-adịghị mma?

13 Ndị na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke, ma na-eje ije n’aha ya, na-atụ egwu aha Chineke. Ọ bụghị egwu na-adịghị mma. Jehova na-emesi ndị dị otú ahụ obi ike, sị: “Anyanwụ nke ezi omume, bụ́ nke nku ya na-eweta ọgwụgwọ, ga-awakwasị unu ndị na-atụ egwu aha m; unu ga-apụkwa na-awụgharị dị ka ehi mara abụba.” (Malakaị 4:2) Mgbe amụma a mezuru, “anyanwụ nke ezi omume” bụ Jizọs Kraịst. (Mkpughe 1:16) Ọ na-acha ugbu a wee na-eweta ọgwụgwọ ime mmụọ. Mgbe oge na-agakwa, ọ ga-achakwa wee wetara ụmụ mmadụ ọgwụgwọ nkịtị. E ji ọṅụ nke ndị a gwọrọ na-enwe tụnyere ọṅụ ehi mara abụba ndị ‘na-apụ na-awụgharị’ na-enwe. Ha nwere obi ụtọ na ọṅụ ịbụ ndị nweere onwe ha. Ọ̀ bụ na i nwerebeghị onwe gị n’ụzọ dị ukwuu?—Jọn 8:32.

14, 15. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka i si erite uru n’ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova?

14 Ụzọ ọzọ ị ga-esi rite uru n’ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke bụ na ọ ga-eme ka gị na mmadụ ibe gị dịkwuo ná mma. Habakọk kwupụtara ahụhụ ise—ndị ga-abịakwasị ndị anyaukwu, ndị chọrọ uru aghụghọ, ndị wụfuru ọbara, ndị kpara nkata ịkwa iko, nakwa ndị fere arụsị. (Habakọk 2:6-19) Nkwupụta Jehova kwupụtara ahụhụ ndị a na-egosi n’ụzọ doro anya na o setịpụwo ụkpụrụ banyere otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. Ma buru n’obi na anọ n’ime ihe ọjọọ ndị ahụ a kpọtụrụ aha metụtara otú anyị si emeso mmadụ ibe anyị. Ọ bụrụ na anyị amụta ile ihe anya otú Chineke si ele ihe anya, anyị agaghị eme ndị agbata obi anyị ihe ọjọọ. N’ụzọ dị otú a, mmekọrịta anyị na ihe ka ọtụtụ n’ime ha ga-aka mma.

15 Ụzọ nke atọ anyị si erite uru bụ n’ihe gbasara inwe obi ụtọ n’ezinụlọ. Taa, ndị mmadụ na-ewerekarị ịgba alụkwaghịm dị ka ụzọ kasị mma isi dozie nsogbu alụmdi na nwunye ha. Ma, Jehova si n’ọnụ Malakaị onye amụma kwuo, sị: ‘Akpọrọ m ịgba alụkwaghịm asị.’ (Malakaị 2:16) E mesịa, anyị ga-atụle Malakaị 2:16 n’ụzọ sara mbara karị. Ma ugbu a, buru n’obi na ihe e kwuru na Malakaị 2:16 na-egosi na Chineke ejiriwo amamihe setịpụ ụkpụrụ ndị nọ n’ezinụlọ kwesịrị ịgbaso; ọ bụrụhaala na ha na-agbaso ha, udo ga-adị. (Ndị Efesọs 5:28, 33; 6:1-4) N’eziokwu, anyị niile ezughị okè, a ga na-enwe nsogbu. N’agbanyeghị nke ahụ, n’akwụkwọ Hosia, Onye ahụ “ezinụlọ ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa sitere n’ebe ọ nọ nweta aha ya” nyere anyị ihe atụ nke na-egosi ụzọ isi dozie ọbụna ụfọdụ nsogbu ndị kasị taa akpụ n’alụmdi na nwunye. Anyị ga-atụlekwa nke ahụ n’isiokwu anyị ka ga-ahụ n’akwụkwọ a. (Ndị Efesọs 3:15) Ka anyị tụlezie ihe ọzọ ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke pụtara.

“KPỌỌNỤ IHE ỌJỌỌ ASỊ, HỤKWANỤ EZI IHE N’ANYA”

16. Olee ihe Emọs 5:15 kwuru nke gbasara ụkpụrụ Chineke?

16 Nwoke mbụ, bụ́ Adam, mere mkpebi amamihe na-adịghị na ya n’ihe banyere onye ụkpụrụ ya kasị mma n’ihe metụtara ezi ihe na ihe ọjọọ. Ànyị ga-eji amamihe mee mkpebi ka mma? Emọs dụrụ anyị ọdụ ka ime nke a gụsie anyị agụụ ike. Ọ gbara ume, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụkwanụ ezi ihe n’anya.” (Emọs 5:15) William Rainey Harper, nke nwụworonụ, onye bụbu prọfesọ n’asụsụ nakwa n’edemede ndị Juu na Mahadum Chicago, kwuru banyere amaokwu a, sị: “Ụkpụrụ nke ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ, nke [Emọs] bu n’uche, kwekọrọ n’uche Yahweh.” Nke a bụ isi ihe anyị pụrụ ịmụta n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere. Ànyị dị njikere ịnabata ụkpụrụ Jehova setịpụrụ n’ihe banyere ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ? A na-eme ka anyị mara ụkpụrụ ndị ahụ dị elu n’ime Baịbụl. Ndị Kraịst tozuru okè, ndị maara ihe, ndị mejupụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” na-akọwakwara anyị ha.—Matiu 24:45-47.

Ihe Osise dị na peeji nke 90

Olee otú ịgbaso ndụmọdụ ndị amụma iri na abụọ ahụ nyere pụrụ isi nyere mmadụ aka izere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ?

17, 18. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ịkpọ ihe ọjọọ asị? (b) Nye ihe atụ iji gosi otú anyị pụrụ isi mụta ịkpọ ihe ọjọọ asị n’ụzọ siri ike.

17 Ịkpọ ihe ọjọọ asị na-enyere anyị aka izere ihe ndị na-adịghị Chineke mma. Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ ịma ihe ize ndụ dị n’ihe ndị dị n’Intanet bụ́ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma na-agbalị izere ha. Ma, olee ihe ‘mmadụ ahụ ọ bụ n’ime’ na-eche banyere ebe ndị a na-egosi ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet? (Ndị Efesọs 3:16) Site n’itinye agbamume ahụ Chineke nyere nke dị n’Emọs 5:15 n’ọrụ, ọ ga-adịrị ya mfe karị ịmụta ịkpọ ihe ọjọọ asị. Ọ pụrụ isi otú a nwee mmeri na mgba ime mmụọ ọ na-agba.

18 Tụlee ihe atụ ọzọ. Ị̀ pụrụ iche echiche na ị ga-akpọrọ arụsị ndị e ji inwe mmekọahụ na-efe ofufe isiala? Ichetụdị ya n’echiche na-asọ oyi, ọ̀ bụ na ọ dịghị asọ? N’agbanyeghị nke ahụ, Hosia kwuru okwu banyere ndị nna nna ụmụ Izrel ime omume rụrụ arụ n’ihu Bel nke Piọ. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-3; Hosia 9:10) O doro anya na Hosia kwuru banyere ihe a merenụ n’ihi na ife Bel bụ mmehie bụ́ isi alaeze ebo iri nke Izrel mere. (2 Ndị Eze 17:16-18; Hosia 2:8, 13) Chegodị echiche banyere ọnọdụ a jọgburu onwe ya: Ụmụ Izrel nọ na-akpọrọ arụsị isiala ka ha nọ na-enwe mmekọahụ aghara aghara. Ịmara na Chineke katọrọ ya kpamkpam pụrụ inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka izere ọnyà ndị Setan na-esi n’Intanet. Taa, ọtụtụ ndị na-enwe mmasị gafere ókè n’ebe ụmụ nwaanyị na ụmụ nwoke mara mma nọ, bụ́ ndị na-eme ihe ntụrụndụ ndị na-ewu ewu. Otú ọ dị, lee otú anyị si dị iche, anyị bụ́ ndị mụtaworo ihe n’ịdọ aka ná ntị ndị amụma ahụ nyere banyere ife arụsị!

BURU OKWU CHINEKE N’UCHE

19. Gịnị ka ị pụrụ ịmụta n’ihe Jona mere mgbe ọ nọ n’afọ nnukwu azụ̀?

19 Ka ị na-agbalịsi ike ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke ndị dị elu n’agbanyeghị ọnwụnwa na ihe isi ike, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị gị ka ị gaghị emeli ya, ma ọ bụ, e nwere ike ị gaghị ama ihe ị ga-eme. Ọ bụrụ na i nwere ịda mbà n’obi, olee otú ị ga-esi merie ọnọdụ tara akpụ? (Ilu 24:10) Ọ dị ihe anyị ga-amụta n’ihe Jona mere, bụ́ onye anyị maara na ọ bụ mmadụ na-ezughị okè, nke mere mmehie. Cheta ihe o mere mgbe ọ nọ n’afọ nnukwu azụ̀. O kpekuru Jehova ekpere. Rịba ama ihe o kpere n’ekpere.

20. Olee otú ị pụrụ isi kwadebe iji mee ihe Jona mere?

20 Mgbe Jona nọ “n’afọ Shiol” kpekuo Chineke ekpere, okwu ndị o kwuru bụ okwu ndị ọ maara nke ọma, okwu ndị e kwuru n’abụ ọma. (Jona 2:2) Ọ nọ n’oké ahụhụ ma rịọ Jehova ka o meere ya ebere. N’agbanyeghị nke ahụ, okwu Devid kwuru batara Jona n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, jiri ihe e kwuru na Jona 2:3, 5 tụnyere ihe dị n’Abụ Ọma 69:1, 2.a Ọ̀ bụ na o doghị anya na Jona maara abụ ọma Devid, ndị nke ruru onye amụma ahụ aka n’oge ahụ, nke ọma? Ihe ndị e kwuru n’abụ ọma ndị ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ gbatara ya n’uche. Okwu Chineke nke e dere site n’ike mmụọ nsọ dị “n’ime obi” ya. (Abụ Ọma 40:8) Ọ bụrụ na ọ dị nsogbu na-akpatara gị obi erughị ala, ị̀ pụrụ icheta ihe ụfọdụ Chineke kwuru, bụ́ ndị dabara adaba n’ọnọdụ ahụ? Ịmatakwu Okwu Chineke ugbu a pụrụ inyere gị aka n’ọdịnihu mgbe ọ ga-adị mkpa ka i mee mkpebi ma mee ihe banyere nsogbu ụfọdụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke setịpụrụ.

NA-ATỤ CHINEKE EGWU DỊ MMA

21. Gịnị ka ọ dị mkpa ka ị mụta ime iji nọgide na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke?

21 N’ezie, naanị ịmara Okwu Chineke ezughị iji mee ka ị na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova. Maịka onye amụma mere ka anyị ghọtakwuo ihe dị anyị mkpa iji tinye Okwu Chineke n’ọrụ: “Onye nwere ezi amamihe ga-atụkwa egwu aha gị.” (Maịka 6:9) Ka mmadụ wee bụrụ onye nwere ezi amamihe, onye pụrụ itinye ihe ndị ọ maara n’ọrụ ná ndụ ya, ọ ghaghị ịmụta ịtụ egwu aha Chineke.

22, 23. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji zigara ndị Juu ahụ si mba ọzọ lọta Hagaị? (b) Olee ihe mere i ji nwee obi ike na ị ga-enwe ike ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke?

22 Olee otú ị pụrụ isi mụta ịtụ egwu aha Chineke? Jụọ Hagaị, bụ́ onye amụma nke dịrị ndụ n’oge ụmụ Izrel si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta. Ọ kpọrọ aha ahụ bụ́ Jehova ugboro iri atọ na ise n’akwụkwọ ya nke na-etoghị ogologo, nke nwere naanị amaokwu iri atọ na asatọ! Mgbe Jehova nyere Hagaị ọrụ dị ka onye amụma, n’afọ 520 T.O.A., afọ iri na isii agafeela n’enweghị oké ihe ha rụrụ n’ọrụ iwughachi ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem. Ndị Chineke enweela ịda mbà n’obi n’ihi mmegide nke ndị iro ha na-emegide ha. (Ezra 4:4, 5) Ụmụ Izrel chere na oge a ga-ewughachi ụlọ nsọ ahụ erubeghị. Jehova dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Chebaranụ ụzọ unu echiche. . . . Wuokwanụ ụlọ a, ka o wee mee m obi ụtọ, ka e wee nye m otuto.”—Hagaị 1:2-8.

23 Zerọbabel bụ́ gọvanọ na Jọshụa bụ́ nnukwu onye nchụàjà na “ndị niile fọdụrụ n’ime ndị Izrel, wee malite ige ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke ha, . . . ha wee malite ịtụ egwu n’ihi Jehova.” Chineke wee sị: “Anọnyeere m unu.” Lee ka o si na-emesi obi ike! Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke, ha “na-abata, na-arụ ọrụ dị n’ụlọ Jehova.” (Hagaị 1:12-14) Egwu dị mma ha na-atụ ka ha ghara imejọ Chineke kpaliri ndị obi na-esibughị ike ime ihe n’agbanyeghị mmegide.

24, 25. Jiri ihe atụ ụfọdụ kpọmkwem gosi otú ị pụrụ isi tinye ụkpụrụ ndị a tụlere n’isiakwụkwọ a n’ọrụ.

24 Olee maka gị? Ọ bụrụ na ị ghọta ihe bụ́ ụkpụrụ Chineke banyere ọnọdụ ọ bụla ị nọ na ya, ị̀ ga-enwe obi ike a chọrọ ma tụọ egwu Jehova kama ịtụ egwu mmadụ? Ikekwe, ị bụ nwa agbọghọ. N’ebe ị na-arụ ọrụ, e nwekwara otu nwoke nke na-adịghị ele ụkpụrụ Chineke anya otú i si ele ha anya. Ma, ọ dị obiọma ma nwee mmasị n’ebe ị nọ. Ị̀ ga-echeta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ga-echetara gị ụkpụrụ Jehova na ihe ize ndụ ndị dị n’ileghara ha anya? Gịnị banyere Hosia 4:11? “Ịkwa iko na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ na-anapụ ezi uche.” Nke a, tinyere egwu ị na-atụ Chineke, ọ̀ ga-eme ka ị nọgide na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya ma jụ ma ọ bụrụ na nwoke ahụ akpọọ gị ka i soro ya gaa nnọkọ ntụrụndụ? Ọ bụrụ na ọ malite ịkpa gị nso, egwu imejọ Chineke gị nke nwere ịhụnanya pụrụ inyere gị aka ‘ịgba ọsọ.’—Jenesis 39:12; Jeremaya 17:9.

Ihe Osise dị na peeji nke 95

Olee otú ịtụ egwu Chineke si enye aka n’ụdị ọnọdụ a?

25 Ugbu a, ka anyị laghachi n’ihe atụ ahụ e nyere banyere nwoke nke na-agbalị izere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ndị dị n’Intanet. Ọ̀ ga-echeta ihe e kwuru n’Abụ Ọma 119:37, nke dị n’ụdị ekpere? “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.” Ọ̀ ga-atụgharị uche n’ihe Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ahụ? “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Matiu 5:28) Ịtụ egwu Jehova na ịchọ ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya kwesịrị ịkpali Onye Kraịst izere ihe ọ bụla pụrụ imerụ mmadụ. Mgbe ọ bụla ọ dị gị ka i chee echiche megidere ụkpụrụ Chineke ma ọ bụ, dị gị ka i mebie ya, gbalịa nwekwuo egwu Chineke. Burukwa n’uche ihe Jehova na-agwa gị site n’ọnụ Hagaị, sị: ‘Anọnyeere m gị.’

26. Olee ihe anyị ka ga-atụle?

26 N’ezie, ị pụrụ ijere Jehova ozi n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya ndị dị elu ma rite uru n’ime otú ahụ. Ka ị na-enyochakwu akwụkwọ amụma iri na abụọ ahụ, ị ga-amatakwu ụkpụrụ Chineke, ma ọ bụ ihe ọ chọrọ n’aka onye ọ bụla n’ime anyị. Nkebi nke Atọ n’akwụkwọ a ga-atụle akụkụ atọ dị mkpa Jehova setịpụrụ ụkpụrụ ndị magburu onwe ha: omume anyị, otú anyị si emeso ndị ọzọ, na ndụ ezinụlọ anyị.

a Jirikwa ihe e kwuru na Jona 2:2, 4-9 tụnyere ihe dị n’Abụ Ọma 18:6; 31:22; 30:3; 142:3; 31:6; nakwa nke 3:8 n’usoro Jona si jiri ha mee ihe.

OLEE IHE Ị GA-AZA?

  • Olee otú ọ na-adị Chineke ma ọ bụrụ na i mee ma ọ bụ ghara ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya?—Emọs 7:7-9.

  • N’ihi gịnị ka i ji sị na ụkpụrụ Jehova adịghị elu gabiga ókè?—Zekaraya 4:10.

  • Olee ihe mere i ji nabata ụkpụrụ Jehova?—Maịka 4:5; Malakaị 4:2; 2 Ndị Kọrịnt 5:15; Mkpughe 4:11.

OLEE OTÚ IHE NDỊ A PỤRỤ ISI NYERE GỊ AKA IME IHE KWEKỌRỌ N’ỤKPỤRỤ CHINEKE?

  • Ịkpọ ihe ọjọọ asị—Emọs 5:15.

  • Ịmara Okwu Chineke—Jona 2:4-9.

  • Ịmụta ịtụ egwu Jehova—Hagaị 1:12-14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya