ISI NKE ASATỌ
“Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Gị?”
1, 2. Gịnị mere o ji bụrụ ihe na-agba ume ịhụ ihe Jehova mere banyere omume rụrụ arụ nke ndị ya n’oge ochie?
CHEGODỊ echiche banyere nke a: Ụjọ jidere otu nwatakịrị nwaanyị mgbe ọ nụrụ ka a na-esu aka n’ụzọ. Ụjọ ji ya na ọ ga-abụ otu oji ego achụ ego bụ́ onye arụrụala nke bịara ịgba ezinụlọ ya ụgwọ. Nwoke ahụ ejiriwo ihe na-adịghị mma e ji atụ̀ ihe nara ọtụtụ ndị ihe ha, na-anakwa ha ọmụrụ nwa iwu na-akwadoghị. Iji hụ na ọ dịghị ihe ọ bụla a ga-eme ya, ọ na-enye ndị ndú obodo aka azụ, bụ́ ndị na-eleghara mkpesa niile ndị ọ na-anara ihe ha na-eme, anya. Ọ dịghị onye ga-enyere nwa agbọghọ ahụ aka; nna ya agbahapụwo nne ya na ezinụlọ ya gaa lụrụ nwa agbọghọ. A pụrụ ire ma ya ma nne ya ka ha ghọọ ndị ohu.
2 Ihe ahụ a kọrọ n’elu bụ njikọta nke ụfọdụ n’ime ihe ndị mmadụ na-eme, bụ́ ihe ndị amụma iri na abụọ ahụ katọrọ. (Emọs 5:12; 8:4-6; Maịka 6:10-12; Zefanaya 3:3; Malakaị 2:13-16; 3:5) A sị na ị dị ndụ n’oge ahụ, gịnị ka ị gaara eme? Ọ bụ ezie na ọnọdụ ahụ dị njọ, ụzọ dị mma Jehova si meso ndị ya n’oge ndị amụma ahụ pụrụ imesi gị obi ike. N’ezie, ị ga-ahụ n’akwụkwọ iri na abụọ ahụ na Chineke kwusiri okwu ike banyere àgwà na omume ndị dị mma. Agbamume o nyere pụrụ ime ka ị na-emekwu omume ọma, ka ị na-eme ihe ndị dị mma ma kpalie gị ito ya. Ebe ọ bụ na ụbọchị Jehova ji ọsọ na-abịa, ichebara ozi na-agba ume nke dị n’akwụkwọ ndị ahụ echiche pụrụ ime ka ị ghọta ihe Chineke na-achọ n’aka gị. Malite ime nke a site n’ịtụle ihe mere n’oge Maịka na narị afọ nke asatọ T.O.A.
Jehova na-ahụ nrụrụaka na ikpe na-ezighị ezi
GỊNỊ KA JEHOVA NA-ACHỌ N’AKA GỊ?
3, 4. (a) Olee arịrịọ na-akpali mmasị nke so n’ihe e dere n’akwụkwọ Maịka? (b) Olee otú ajụjụ ahụ dị na Maịka 6:8 si gbasa gị?
3 Ọ bụrụ na ị gụọ akwụkwọ Maịka, ọ pụrụ ịdị gị ná mmalite ka ihe jupụtara na ya ọ̀ bụ ndepụta nke ihe ọjọọ ụmụ Izrel na-enupụ isi mere. N’eziokwu, Jehova hụrụ omume rụrụ arụ nke ndị ya raara onwe ha nye ya mere, tinyere nke ndị ọ kọwara dị ka “ndị kpọrọ ihe ọma asị ma hụ ihe ọjọọ n’anya.” (Maịka 3:2; 6:12) Otú ọ dị, tụkwasị n’okwu nkatọ ahụ, ihe e kwuru n’ebe ahụ bụ otu n’ime ndụmọdụ kasị akpali akpali ndị dị na Baịbụl. Maịka lekwasịrị anya n’ebe Onye na-esetịpụ ụkpụrụ ndị ziri ezi nọ wee jụọ ajụjụ a na-akpali iche echiche, sị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—Maịka 6:8.
4 Ị̀ chọpụtara arịrịọ Onye Okike anyị na-arịọ n’ebe a? O ji ịhụnanya chetara anyị àgwà ọma ndị anyị pụrụ ịmụta kama ikwe ka ajọ omume ndị jupụtara ebe niile duhie anyị. Jehova maara na anyị, dị ka ụmụ mmadụ na-eguzosi ike n’ihe, chọrọ ịmụta àgwà ndị yiri nke ya, o nwekwara obi ike na anyị ga-eme ya. Olee ihe ị ga-aza ma a jụọ gị, sị: ‘Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị?’ Ị̀ pụrụ ikwu kpọmkwem ebe ụfọdụ ná ndụ gị bụ́ ebe ụkpụrụ Chineke setịpụrụ n’ihe banyere omume na-enwe mmetụta ma ọ bụ kwesịrị ịdị na-enwe mmetụta n’otú i si akpa àgwà? Ka ị na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị ahụ, mmekọrịta gị na Chineke ga-echi anya karị, ị ga na-ebikwa ndụ n’ụzọ ka mma. Ebe ọ bụ na ụwa niile ga-aghọ paradaịs n’oge na-adịghị anya, ka ndụmọdụ a gbaa gị ume: “Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume; jirinụ obiọma ghọọ mkpụrụ. Kọọnụ ala ubi unu, mgbe oge ka dị ịchọ Jehova ruo mgbe ọ ga-abịa nye unu ntụziaka n’ezi omume.” (Hosia 10:12) Ugbu a, ka anyị tụlee isi ihe ụfọdụ dị na ndụmọdụ ahụ magburu onwe ya nke dị na Maịka 6:8.
‘DỊRỊ OBI UMEALA’
5. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị “jiri obi umeala” soro Chineke na-eje ije?
5 N’ụzọ dị ịrịba ama, Maịka na-ekwu na Jehova na-agwa anyị ka anyị ‘jiri obi umeala soro Ya na-eje ije.’ Ịdị obi umeala ga-abara anyị nnọọ uru n’ihi na “ndị dị obi umeala nwere amamihe.” (Ilu 11:2) Ịdị obi umeala na-agụnye ịmata ihe ndị anyị na-agaghị emeli n’ihi mmehie anyị ketara n’aka Adam. Ikweta na a mụrụ anyị n’ime mmehie bụ ihe mbụ dị oké mkpa ná mgbalị siri ike anyị na-eme iji zere ịkpachara anya na-eme mmehie.—Ndị Rom 7:24, 25.
6. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị obi umeala mara ihe mmehie na-arụpụta?
6 N’ihi gịnị ka ịdị obi umeala na ịdị umeala n’obi ji dị oké mkpa n’izere ịkpachara anya na-eme mmehie? Onye dị obi umeala maara ụdị ike mmehie nwere. (Abụ Ọma 51:3) Hosia na-enyere anyị aka ịghọta na mmehie na-adọrọ adọrọ nakwa na ọ na-arụpụtakarị ihe ndị na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, Jehova kwere nkwa na ya ga-eme ka ndị ya n’oge ochie “zaa ajụjụ” maka nnupụisi ha. Nke ahụ ọ̀ dara ka à ga-asị na ndị mmehie ahụ na-adịghị obi umeala agaghị ata ahụhụ mmehie ha? Ma eleghị anya, ha chere otú ahụ, ebe ọ bụ na mmehie na-ekpuchikarị onye ahụ na-eme mmehie anya ma na-eri ya ahụ́. Nke ka njọ bụ na mmehie na-ekewapụ ndị mmehie n’ebe Chineke nọ, ikekwe, mee ka ha ruo n’ókè a jọgburu onwe ya: “Omume ha ekweghị ka ha lọghachikwute Chineke ha.” Ịkpachara anya na-eme mmehie ga-eme ka onye ahụ na-eme mmehie ghara inwekwa ike izere ime ihe ọjọọ wee mee ka ọ ghọọ onye “na-eme ihe ọjọọ.” Ọzọkwa, mmehie na-eme ka ndụ onye mmehie ghara ịba uru. N’eziokwu, ruo oge ụfọdụ, ọ pụrụ iyi ka ihe ọ̀ na-agaziri ya, ma onye mmehie nke na-enweghị nchegharị apụghị ịtụ anya na ihe ya ga-adị Chineke mma.—Hosia 1:4; 4:11-13; 5:4; 6:8.
7. Olee ihe bụ́ omume nke ndị dị obi umeala n’ebe nduzi Jehova dị?
7 Ndị dị obi umeala na-ekweta na nduzi Chineke dị ha mkpa iji zere ihe ọjọọ mmehie na-arụpụta. Maịka hụrụ oge anyị tupu ya eruo—mgbe ìgwè mmadụ ga-achọsi ike ka ‘a kụziere ha ụzọ Jehova,’ nakwa ka ha ‘jee ije n’ụzọ ya.’ Ndị dị otú ahụ dị nwayọọ n’obi na-achọ “iwu” na “okwu Jehova.” Ikekwe, obi dị gị ụtọ iso ná ndị ọ na-agụ agụụ ‘ijegharị n’aha Jehova’ site n’ime ihe ndị ọ chọrọ. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka Maịka, ị ga-enwe mmasị ịmatakwu ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi nọgide ‘na-adị ọcha.’ (Maịka 4:1-5; 6:11) Iji ịdị obi umeala na-achọ ime ihe Jehova na-achọ n’aka gị ga-enyere gị aka nke ukwuu.
MỤTA ÀGWÀ ỌMA
8. Olee ihe ị chọpụtaworo banyere omume a na-eme n’ụwa taa?
8 Ka ihe wee dịrị anyị mma n’ụzọ ime mmụọ na n’anụ ahụ́, Jehova na-agwa anyị ka anyị dị ọcha n’omume n’agbanyeghị na omume ndị mmadụ na-adịwanye njọ n’ụwa niile. (Malakaị 2:15) Anyị na-enweta ọtụtụ ozi ndị na-ekwu banyere mmekọahụ. Ọtụtụ ndị na-eche na ikiri foto na ihe nkiri ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ịgụ akwụkwọ ndị na-akọ banyere mmekọahụ rụrụ arụ, na ige egwú ndị na-ekwu banyere mmekọahụ enweghị oké ihe ha bụ. Ọzọkwa, e nwere ndị na-adịghị akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, ndị na-ewere ụmụ nwaanyị naanị dị ka ihe e ji emejụ agụụ mmekọahụ. Ma ọ bụkwanụ, ndị ntorobịa nọ n’ụlọ akwụkwọ pụrụ ịdị na-ewebata njakịrị ndị rụrụ arụ na okwu ndị metụtara mmekọahụ ná mkparịta ụka ha. Olee otú ị pụrụ isi zere ihe ndị ahụ na-emebi omume ọma?
9. Olee otú ọtụtụ ndị si ghara ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova n’oge ndị amụma iri na abụọ ahụ?
9 Ndị amụma iri na abụọ ahụ anyị na-atụle banyere ha nyere ndụmọdụ ndị bụ́ ịgba. Ha dịrị ndụ tupu a malite imepụta ihe nkiri nakwa tupu a malite inwe ebe ndị a na-agbazite ihe nkiri vidio. Ma n’oge ha, e nwere ihe oyiyi nke ihe e ji bụrụ nwoke, na ihe a na-akpọ ịgba akwụna dị nsọ, nakwa inwe mmekọahụ aghara aghara n’emeghị ihere. (1 Ndị Eze 14:24; Aịzaya 57:3, 4; Habakọk 2:15) Ị ga-ahụ ihe na-egosi nke ahụ n’ihe ndị amụma ahụ dere: “Ndị ikom na-akpọrọ ndị akwụna nọpụ iche, ọ bụkwa ha na ndị inyom bụ́ akwụna ụlọ arụsị na-achụ àjà.” “Nwoke na nna ya agakwuruwo otu nwa agbọghọ, iji metọọ aha nsọ m.” Ụfọdụ ndị na-akwụ ‘ụgwọ maka ndị akwụna’ site n’oge ruo n’oge n’oge ha na-eme ememme ọmụmụ.a Ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye juru ebe niile, ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ‘na-agakwuru ndị ha na ha na-eme enyi.’—Hosia 2:13; 4:2, 13, 14; Emọs 2:7; Maịka 1:7, Contemporary English Version.
10. (a) Olee isi ihe na-akpata omume rụrụ arụ? (b) Olee otú ndị Chineke n’oge ochie si ghọọ ndị na-akwa iko n’ụzọ ime mmụọ?
10 Ma eleghị anya, ị ma na mmekọahụ rụrụ arụ na-egosi àgwà na ebumnobi mmadụ. (Mak 7:20-22) Jehova kwuru banyere ndị ya na-eme omume rụrụ arụ na “mmụọ ịkwa iko [“inwe agụụ maka mmekọahụ,” CEV] emewo ka ha kpafuo” nakwa na “naanị ihe ha na-eme bụ omume rụrụ arụ.” (Hosia 4:12; 6:9)b Zekaraya kwuru okwu banyere “mmụọ nke ịrụ arụ.” (Zekaraya 13:2, Bible Nsọ nke Union Version) Ụzọ ha si na-ebi ndụ gosiri omume asọghị anya, nlelị ma ọ bụ ọbụna ileghara ụkpụrụ Jehova nakwa ikike Ya anya. Ya mere, iji gbazie ebumnobi ya, ọ ga-adị mkpa ka mmadụ gbanwee kpamkpam otú o si eche echiche nakwa otú obi ya dị. Ịghọta nke a kwesịrị ime ka Ndị Kraịst nwekwuo ekele maka enyemaka ha na-enweta iji zere omume rụrụ arụ na ihe ọjọọ ndị ọ na-arụpụta.
NA-EME OMUME DỊ ỌCHA
11. Olee ụfọdụ n’ime ihe mmekọahụ rụrụ arụ na-arụpụta?
11 Ikekwe, ị hụla na ime omume rụrụ arụ na-etisakarị ezinụlọ, na-eme ka ụmụaka ghara inweta nduzi nke ndị mụrụ ha, na-akpata ọrịa ndị na-asọ oyi, na-edugakwa n’isikwopụ afọ ime nke na-ala ndụ n’iyi. Ndị na-eleghara Onye Okike anya n’ihe banyere mmekọahụ na-enwekarị nsogbu ime mmụọ, obi adịghịkwa eru ha ala. Maịka dere, sị: “Ebe ọ bụ na ọ ghọwo onye na-adịghị ọcha, a ga-ebibi ya; mbibi ahụ na-egbukwa mgbu.” (Maịka 2:10) Ịmara nke a na-eme ka ndị na-atụ egwu Chineke nọgidesikwuo ike ná mkpebi ha. Ha adịghị eji echiche ndị na-adịghị ọcha emetọ obi ha na uche ha.—Matiu 12:34; 15:18.
12. Olee uru anyị na-erite site n’ile mmekọahụ anya otú Jehova si ele ya anya?
12 Ndị Kraịst na-ezere omume rụrụ arụ ọ bụghị naanị iji zere ọrịa ma ọ bụ n’ihi ụjọ ịtụrụ ime ọkwa. Ha na-ahụ uru dị n’ịhụ iwu Chineke n’anya nakwa n’ile mmekọahụ anya otú o si ele ya anya. Jehova kenyere mmadụ agụụ kwesịrị ekwesị maka mmekọahụ dị ka ụzọ isi gosipụta ịhụnanya n’alụmdi na nwunye. Nke ahụ so ná nzube Chineke mgbe o kere mmadụ. Mgbe e mere ya otú o kwesịrị—n’alụmdi na nwunye—mmekọahụ na-arụpụta ihe dị mma, ọ na-ejikọta di na nwunye. Mgbe ụfọdụkwa, ọ na-eme ka a mụta nwa. Ka o sina dị, mgbe ndị na-abụghị di na nwunye nwere mmekọahụ, ọ na-ebibi nnọọ ihe, dị ka ndị amụma iri na abụọ ahụ gosiri. Ọ bụ mmekọahụ rụrụ arụ mere ka Chineke jụ ndị Izrel. Ọ rụpụtaara ha oké ihe ọjọọ n’oge ahụ. Ọ ga-arụpụtakwara onye ọ bụla na-eme otú ahụ oké ihe ọjọọ taa.
13. Olee otú anyị pụrụ isi ‘wepụ ịkwa iko’ ma zere ọnwụnwa?
13 Hosia rịọrọ ndị ha na ya dịkọrọ ndụ ka ha ‘wepụ ịkwa iko n’ihu ha,’ nke pụtara na ha kwesịrị ime ihe doro anya iji nọgide na-eme omume dị mma. (Hosia 2:2) Ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya ka anyị zere ọnọdụ ọ bụla nke ga-eme ka anyị daba n’ọnwụnwa. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịdị na-enweta ọnwụnwa ugboro ugboro n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na gburugburu ebe i bi. E nwere ike ị gaghị enwe ike ịgbanwe ụlọ akwụkwọ ebe ị na-aga akwụkwọ ma ọ bụ kwaga ebe ọzọ, ma a pụrụ inwe ụzọ ndị ọzọ ị pụrụ isi zere ọnọdụ ahụ nke pụrụ ime ka ị daba n’ọnwụnwa wee si otú ahụ ‘wepụ ịkwa iko n’ihu gị.’ Mee ka ndị ọzọ mara na ị bụ ezi Onye Kraịst, otu n’ime Ndịàmà Jehova. Jiri nkwanye ùgwù kọwaara ha n’ụzọ doro anya ụdị omume ndị ị na-enweghị mmasị na ha nakwa ihe ndị i kweere. Jide n’aka na ndị ọzọ maara na i kpebisiri ike ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Jehova. (Emọs 5:15) Ụzọ ọzọ ị ga-esi ‘wepụ ịkwa iko’ bụ izere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ nakwa ntụrụndụ ndị na-adịchaghị mma. Ọ pụrụ ịpụta na ị ga-atụfu magazin i nwere ma ọ bụ imete ndị enyi ọhụrụ—ndị hụrụ Jehova n’anya, ndị kwekwara na i kwesịrị ime ihe ọ gwara gị ka i mee. (Maịka 7:5) Ee, site n’enyemaka Jehova, ị pụrụ izere ịbụ onye omume rụrụ arụ nke ụwa a metọrọ!
Ime ka a mara ihe ndị i kweere dị ka Onye Kraịst ga-abụ ihe nchebe
‘HỤ OBIỌMA N’ANYA’
14, 15. (a) Gịnị ka ‘ịhụ obiọma n’anya’ pụtara? (b) Olee otú ịhụ obiọma n’anya si enyere anyị aka izere ihe ọ bụla a ga-eji taa anyị ụta?
14 Maịka mesiri ya ike na Jehova chọrọ ka anyị ‘hụ obiọma n’anya.’ Inwe obiọma pụtara ime ihe ọma kama ime ihe ọ bụla na-adịghị mma. A na-ejikọtakarị obiọma na ịdị mma nakwa omume ọma. Nke ahụ na-achọ ka anyị na-akwụwa aka ọtọ ma na-eme ihe ziri ezi n’ihe ndị anyị na-eme nakwa n’otu anyị si emeso ndị ọzọ. N’Isi nke Isii n’akwụkwọ a, anyị tụlere akụkụ ndị dị mkpa ná ndụ, dị ka n’achụmnta ego nakwa n’okwu ego, bụ́ ebe ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ dị ezigbo mkpa. Ma ọ bụghị naanị n’akụkụ ndị a ná ndụ ka anyị kwesịrị ịdị na-eme ihe ziri ezi, na-akwụwa aka ọtọ ma dị obiọma.
15 Ndị hụrụ obiọma n’anya, ndị na-achọkwa imere ndị ọzọ ihe ọma, na-agbalịsi ike izere ihe ọ bụla a ga-eji taa ha ụta. Jehova gwara ndị Izrel na-adịghị eme ihe ha kwesịrị ime n’ihe banyere iji ihe onwunwe ha na-enye onyinye, sị: “Unu na-ezu m ohi.” (Malakaị 3:8) Ị̀ chọpụtara ụzọ dị iche iche mmadụ pụrụ isi “na-ezu [Chineke] ohi” taa? Ọ́ bụrụkwanụ na Onye Kraịst na-ahụ maka ego e nyere n’onyinye n’ọgbakọ ya ma ọ bụ n’ebe ọzọ maka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ? Ònye nwe ego ahụ? Ọ bụ Jehova nwe ego ahụ, ebe ọ bụ na e nyere ya maka iji kwado ofufe ya. (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Mmadụ ò kwesịrị iche na ya pụrụ “ịgbaziri” ego ahụ iji gboo mkpa dapụtaara ya na mberede ma ọ bụ jiri ego e nyere n’onyinye mee ihe n’anataghị ikike? Ee e. Ọ ga-abụ izu Chineke ohi! Ọ gaghịkwa abụ obiọma ma ọ bụ imeso ndị nyere ego ahụ maka ọrụ Chineke n’ụzọ ziri ezi.—Ilu 6:30, 31; Zekaraya 5:3.
16, 17. (a) Olee otú ụfọdụ ndị si gosi anyaukwu n’oge Emọs na Maịka? (b) Olee otú Chineke si ele anyaukwu anya?
16 Obiọma na ịdị mma na-akpalikwa Ndị Kraịst izere anyaukwu. N’oge Emọs, ọtụtụ ndị nwebigara anyaukwu ókè. Ndị ihe na-adịghị eju afọ dị njikere ‘ire onye ezi omume’—ndị ha na ha na-efekọ ofufe—“naanị n’ihi ọlaọcha”! (Emọs 2:6) Ọ dịkwa otú ahụ n’oge Maịka, bụ́ mgbe ndị ọgaranya nọ na Juda na-eweghara ihe onwunwe nke ndị na-apụghị ịzọta ihe ha, ha na-ewere ya n’ike ma ọ dị mkpa. (Maịka 2:2; 3:10) Site n’iweghara ala mmadụ ibe ha, ndị ahụ dị anyaukwu na-emebi Iwu Jehova: tinyere nke ikpeazụ n’ime Iwu Iri ahụ nakwa iwu ndị megidere mmadụ ire ala o ketara eketa n’enweghị mgbe a ga-agbara ya.—Ọpụpụ 20:13, 15, 17; Levitikọs 25:23-28.
17 E nwere ike a dịghị erekarị mmadụ ma ọ bụ agba ohu taa dị ka e mere n’oge ndị amụma ahụ. Ma, olee banyere iji aghụghọ na-anara ndị ọzọ ego ha ma ọ bụ na-aghọgbu ha? Onye Kraịst nke hụrụ obiọma n’anya agaghị aghọgbu ndị ha na ya na-efekọ ofufe. Dị ka ihe atụ, ọ ga-aghọta na o kwesịghị ekwesị, ọ bụghịkwa obiọma iburu ndị kwere ekwe ibe anyị n’obi malite achụmnta ego ma ọ bụ ịkpọsa otu atụmatụ ọnyà ego. Mmadụ ime atụmatụ ịkpata ego ngwa ngwa site n’ịghọgbu Ndị Kraịst ibe ya ga-egosi anyaukwu, bụ́ nke a dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha zere. (Ndị Efesọs 5:3; Ndị Kọlọsi 3:5; Jems 4:1-5) Mmadụ pụrụ igosi na ya dị anyaukwu site n’ịhụ ego n’anya, inwe ọchịchọ inweta ike ma ọ bụ uru, ọbụna inwe agụụ gabigara ókè maka ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, mmekọahụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Maịka gosiri na “afọ agaghị eju” ndị anyaukwu, ndị na-achọ ọdịmma onwe ha naanị. Otú ahụkwa ka ọ dị taa.—Maịka 6:14.
Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eji ịhụnanya egbo mkpa ime mmụọ nke ndị si ala ọzọ
18, 19. (a) Gịnị ka ụfọdụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ kwuru banyere otú Jehova si elekọta “onye mbịarambịa”? (b) Olee otú iji ịhụnanya na-egosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ pụrụ isi mee ka mmekọrịta gị na ndị mmadụ ka mma n’ebe i bi?
18 Jehova nyere ndị ya ntụziaka ka ha ‘ghara irigbu onye mbịarambịa.’ Chineke kwukwara site n’ọnụ Malakaị, sị: ‘M ga-abịaru unu nso ikpe unu ikpe, megide ndị na-emegbu onye mbịarambịa.’ (Zekaraya 7:10; Malakaị 3:5) Ihe ọ̀ na-agbanwe n’ebe unu bi n’ihi ọtụtụ ndị na-akwabata n’ógbè unu, bụ́ ndị si ala ọzọ, mba ọzọ, agbụrụ ọzọ, ma ọ bụ ndị a zụlitere n’ụzọ dị iche? Ma eleghị anya, ha kwagara n’ebe ahụ n’ihi na ha na-achọ ọrụ ma ọ bụ ebe ọnọdụ dị mma karị ma ọ bụ ebe a na-enweghị ihe ize ndụ. Olee otú i si ele ndị asụsụ ha na ụzọ ha si ebi ndụ dị iche na nke gị anya? Ị̀ na-achọpụta na ọ dị ka ọ̀ dị ndị ị kpọrọ asị, bụ́ nke na-abụghị igosi obiọma?
19 Chegodị echiche otú obi ga-adị ndị ọzọ ma ọ bụrụ na i gosi na ndị si mba ọzọ ma ọ bụ ndị a zụlitere n’ụzọ dị iche kwesịkwara ịnụ eziokwu Baịbụl. Obiọma ga-emekwa ka ị ghara iche na ndị ahụ bịara ọhụrụ na-enye unu nsogbu n’iji Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ihe ndị ọzọ eme ihe. Pọl onyeozi chetaara ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ, bụ́ ndị kpọrọ ndị na-abụghị ndị Juu asị ruo n’ókè ụfọdụ, na ọ dịghị onye ruru eru n’ezie inweta nzọpụta; ọ bụ naanị obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ mere ka o kwe omume na a ga-azọpụta mmadụ ọ bụla. (Ndị Rom 3:9-12, 23, 24) Inwe obiọma n’ebe ndị ọzọ nọ ga-eme ka anyị na-aṅụrị ọṅụ na ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-agaraghị enwe ohere ịnụ ozi ọma ahụ na-enweta ịhụnanya Chineke ugbu a. (1 Timoti 2:4) Ọtụtụ mgbe, ọnọdụ nke ndị si ala ọzọ na-eme ka ihe siere ha ike. Ya mere, ihe banyere ha kwesịrị ịdị na-emetụ anyị n’obi. Anyị kwesịrị ịdị na-egosi ha obiọma, na-anabata ha n’ebe anyị nọ ma were onye nke ọ bụla nọ n’etiti anyị dị “ka nwa afọ.”—Levitikọs 19:34.
SORO EZI CHINEKE NA-EJE IJE
20. Ole ndị ka ụmụ Izrel gakwuuru maka nduzi?
20 Maịka kwusikwara okwu ike banyere iso Chineke na-eje ije, na-adabere n’ebe ọ nọ dị ka ezi Chineke ma na-achọ nduzi ya. (Ilu 3:5, 6; Hosia 7:10) Mgbe ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta, ụfọdụ n’ime ha tụgharịrị gakwuru ndị na-agba afa ma fee chi ụgha dị iche iche, ma eleghị anya, ka ha nyere ha aka n’oge ụkọ mmiri ozuzo. N’ezie, ha kpọkuru ndị mmụọ ọjọọ ka ha nyere ha aka, n’agbanyeghị na Jehova katọrọ ụdị omume ahụ niile n’ezoghị ọnụ. (Diuterọnọmi 18:9-14; Maịka 3:6, 11; 5:12; Hagaị 1:10, 11; Zekaraya 10:1, 2) Ndị Juu ahụ na ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị na-emegide ezi Chineke, na-emekọrịta ihe!
21, 22. (a) Olee ụdị mgbaasị ndị a na-emekarị n’ógbè unu? (b) Gịnị mere ezi ndị ohu Jehova na-ejighị etinye aka n’anwansi?
21 Taa, ụfọdụ ndị na-eche na ndị mmụọ ọjọọ e kwuru okwu ha n’Akwụkwọ Nsọ bụ naanị ihe atụ e ji akọwa ihe ọjọọ. Otú ọ dị, Baịbụl na-egosi na ndị mmụọ ọjọọ dị adị n’ezie na ọ bụkwa ha na-akpata ịgụ kpakpando, ịta amoosu, na ụdị anwansi ụfọdụ. (Ọrụ 16:16-18; 2 Pita 2:4; Jud 6) E nwekwara n’ezie ihe ize ndụ ndị dị n’itinye aka ná mgbaasị. N’ọtụtụ ebe, ndị mmadụ na-agakwuru ndị dibịa afa, ndị na-ekwu na ha nwere ike karịrị ike mmadụ, na-agakwurukwa ndị dibịa anwansi. Ndị ọzọ na-achọ inweta nduzi site n’ịkọwa akara eluigwe, ma ọ bụ, ha na-eji kaadị e ji amata ọdịnihu, mkpara e ji achọpụta ihe dị n’ime ala, bọọdụ e ji agba afa, ma ọ bụ obere nkume pụrụ iche ndị na-eweta chi ọma, na-eme ihe. Ọtụtụ ndị mmadụ na-eme mgbalị ka ha na ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu. A na-ekwu na ụfọdụ ndị ọchịchị na-agakwuru ndị na-agụ kpakpando na ndị na-ajụ ndị mmụọ ase ka ha nyere ha aka n’ime mkpebi. Ihe ndị a niile megidere nnọọ ndụmọdụ Maịka nyere nke bụ́ ka anyị soro ezi Chineke na-eje ije, na-agbaso nduzi ya.
22 N’ezie, gị onwe gị, bụ́ ezigbo ohu Jehova, aghaghị izere ụdị omume ndị ahụ. Jide n’aka na Chineke adịghị ekpughe uche ya ma ọ bụ egosipụta ike ya site n’anwansi. Kama nke ahụ, dị ka Emọs 3:7 na-emesi anyị obi ike, Jehova ‘na-ekpughere ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma, ihe nzuzo ya.’ Ọzọkwa, itinye aka n’anwansi pụrụ ime ka mmadụ bụrụ onye onyeisi ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ Setan, na-eduzi ma na-achịkwa. Ọ bụ onye ụgha, atụmatụ ya bụkwa ịghọgbu ndị mmadụ. Ya na ndị nọ n’okpuru ya kpebisiri ike imerụ ndị mmadụ ahụ́ n’ihi na o nweghị mgbe ha na-adịghị obi ọjọọ, ọbụna na-egbu ndị mmadụ. (Job 1:7-19; 2:7; Mak 5:5) O kwere nghọta ihe mere Maịka ji katọọ ịgba afa na ime anwansi mgbe ọ gbara anyị ume iso ezi Chineke na-eje ije.
Ndị ohu Chineke aghaghị izere anwansi
23. Olee onye ọ bụ naanị ya pụrụ imere anyị ihe ndị dị mma anyị na-arịọ?
23 Ọ bụ naanị n’ebe Jehova nọ nakwa site n’ofufe ya dị ọcha ka a pụrụ inweta ezi nduzi. (Jọn 4:24) Zekaraya onye amụma dere, sị: “Rịọnụ Jehova.” (Zekaraya 10:1) Ọ bụrụgodị na ndị mmụọ ọjọọ na-enye gị nsogbu ma ọ bụ na-ewetara gị ọnwụnwa, cheta na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ.” (Joel 2:32) Okwu a nke na-emesi obi ike dị mkpa ka anyị na-eburu oké ụbọchị ya n’uche.
24. Olee ihe ị mụtara na Maịka 6:8?
24 N’ụzọ doro anya, ihe ndị e kwuru na Maịka 6:8 bụ ihe ndị anyị kwesịrị ichebara echiche. Ka anyị wee nọgidesie ike na-eme omume ọma, ọ dị mkpa ka anyị nwee ezigbo ebumnobi nakwa àgwà ndị yiri nke Chineke. Hosia gbara anyị, bụ́ ndị bi “n’oge ikpeazụ” a, ume. O kwuru na n’oge anyị, ndị na-atụ egwu Chineke ga-achọ ịdị mma Jehova. (Hosia 3:5) Emọs kwupụtaghachiri òkù Chineke na-akpọ anyị ka anyị mee nke ahụ kpọmkwem, sị: “Chọọnụ ezi ihe, . . . ka unu wee dịrị ndụ.” A gbakwara anyị ume, sị: “Hụkwanụ ezi ihe n’anya.” (Emọs 5:14, 15) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enweta ume site n’ime ihe Jehova gwara anyị ka anyị mee.
a Joseph Rotherham, bụ́ onye sụgharịrị Baịbụl, kwuru banyere mba ndị dị na Kenan, bụ́ ndị ụmụ Izrel ṅomiri omume ha, sị: “Ofufe ha jupụtara nnọọ n’agụụ mmekọahụ nakwa n’obi ọjọọ. Ụmụ nwaanyị na-ere ùgwù ha iji sọpụrụ arụsị ha. Ebe nsọ ha dị iche iche bụ ụlọ ndị akwụna. Ha mere ihe oyiyi ndị na-asọ oyi nke akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ ma debe ha ebe a ga na-ahụ ha. Ha nwere ndị akwụna dị nsọ (!), ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị.”
b Ndị Chineke kwakwara iko n’ụzọ ime mmụọ. Ha so mba ndị na-ekpere arụsị nwee mmekọahụ rụrụ arụ, ha jikọtakwara ofufe Bel na ezi ofufe.