ISI NKE ABỤỌ
Olee Otú Ị Ga-esi Na-enwe Ezi Akọnuche?
‘Nweenụ ezi akọnuche.’—1 PITA 3:16.
1, 2. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ebe ị na-agatụbeghị, gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka i gee onye na-ezi gị ụzọ ntị, oleekwa otú a ga-esi jiri onye ahụ tụnyere akọnuche?
OTU ọkwọ ụgbọ mmiri kwọọrọ ụgbọ mmiri ya gafee ebe e nwere ebili mmiri n’oké osimiri; otu onye ji ụkwụ gafee ala ịkpa nke na-enweghị ihe dị ya; otu ọkwọ ụgbọelu kwọọrọ ụgbọelu ya gafee urukpuru nke dị na mbara igwe. Ị̀ ma ihe jikọrọ mmadụ atọ a? Onye ọ bụla n’ime ha nwere ike inwe nnukwu nsogbu ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ga-eduzi ya ma ọ bụ onye ga-ezi ya ụzọ.
2 Ka e were ya na ị chọrọ ịga ebe ị na-agatụbeghị. Gị akpọrọ onye ị tụkwasịrị obi nke gatụrụla ebe ahụ. Ọ bụrụ na ụzọ ebe ahụ doro ya anya nke ọma, ọ ga-ezi gị ụzọ. Ị gaghịkwa efu ụzọ ma ọ bụrụ na i gee ya ntị. E nwere ike iji onye ahụ tụnyere ezigbo onyinye Chineke nyere anyị, ya bụ, akọnuche. (Jems 1:17) Anyị ga-efu ụzọ kpamkpam ma ọ bụrụ na anyị enweghị akọnuche. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ọ na-edu anyị, o nwere ike ime ka anyị chọta ụzọ dị mma ná ndụ ma nọsie ike na ya. Ya mere, ka anyị tụlee ihe akọnuche bụ, na otú o si arụ ọrụ. Anyị tụlechaa ya, anyị ga-atụle: (1) Otú anyị ga-esi zụọ akọnuche anyị, (2) ihe mere anyị kwesịrị iji na-echeta akọnuche ndị ọzọ, nakwa (3) otú ezi akọnuche si eweta ngọzi.
IHE AKỌNUCHE BỤ, NA OTÚ O SI ARỤ ỌRỤ
3. Olee otú e si dee okwu e si sụgharịta “akọnuche” n’asụsụ Grik, oleekwa ihe pụrụ iche mmadụ nwere nke ahụ na-akọwa?
3 Na Baịbụl, otú e si dee okwu e si sụgharịta “akọnuche” n’asụsụ Grik bụ “mmadụ ịma ihe o mere.” Anyị adịghị ka ihe ndị ọzọ Chineke kere eke nọ n’ụwa n’ihi na Chineke kenyere anyị ihe na-eme ka anyị mara onwe anyị. Anyị nwere ike ịkwụsị leruo onwe anyị anya, mara ma ànyị na-eme ihe ziri ezi. Akọnuche anyị na-arụ ọrụ dị ka ihe na-agba àmà, ma ọ bụ ihe na-ekpe ikpe, nke dị n’ime anyị. Ọ na-enyocha ihe ndị anyị na-eme, àgwà anyị, na ihe ndị anyị kpebiri ime. O nwere ike ime ka anyị mee mkpebi dị mma ma ọ bụ dọọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ime mkpebi na-adịghị mma. Anyị mechaa, o nwere ike ịja anyị mma maka ime mkpebi dị mma ma ọ bụ pịa anyị ụtarị maka ime mkpebi na-adịghị mma.
4, 5. (a) Olee otú anyị si mara na Adam na Iv nwere akọnuche, gịnịkwa mere mgbe ha leghaara iwu Chineke anya? (b) Olee ihe atụ ndị na-egosi na ndị kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge Ndị Kraịst ji akọnuche ha rụọ ọrụ?
4 E kenyere ihe a n’ime nwoke na nwaanyị ná mmalite. Adam na Iv gosiri na ha nwere akọnuche. Ihere nke mere ha mgbe ha mehiere gosiri na nke ahụ bụ eziokwu. (Jenesis 3:7, 8) Ọ dị mwute na akọnuche ha nke nyere ha nsogbu mgbe ahụ enweghịzi uru ọ baara ha. Ha kpachaara anya leghara iwu Chineke anya. Ha si otú a kpachara anya kpebie ịbụ ndị nnupụisi, ndị na-emegide Jehova Chineke. Ebe ha bụ ndị zuru okè, ha ma ihe ha na-eme. Ha enweghịkwa ike ịlaghachikwuru Chineke.
5 Ọtụtụ ndị mmadụ na-ezughị okè emeghị ka Adam na Iv. Ha na-ege akọnuche ha ntị. Dị ka ihe atụ, nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job sịrị: “Ejidesiwo m ezi omume m aka ike, agaghịkwa m ahapụ ya; ọ dịghị ụbọchị ndụ m ọ bụla obi m ga-ata m ụta maka ya.”a (Job 27:6) N’ezie, Job bụ nwoke na-akpachara anya n’ihe ọ na-eme. Ọ na-ege akọnuche ya ntị nke ọma. O kwere ka ọ na-eduzi ihe ndị ọ na-eme na mkpebi ndị ọ na-eme. Ọ bụ ya mere o ji jiri obi ya dum kwuo na akọnuche ya adịghị enye ya nsogbu, na ọ dịghịkwa apịa ya ụtarị. Ihere adịghịkwa eme ya n’ihi ihe o mere. Legodị ihe dị iche n’ebe Job na Devid nọ. Mgbe Devid na-akwanyereghị Sọl, bụ́ eze Jehova tere mmanụ, ùgwù, ‘obi Devid nọ na-apịa ya ụtarị mgbe e mesịrị.’ (1 Samuel 24:5) Akọnuche Devid nke mara ya ikpe baara ya uru, n’ihi na ọ kụziiri ya na o kwesịghị itinye aka n’ụdị mkparị dị otú ahụ ọzọ.
6. Gịnị na-egosi na akọnuche bụ onyinye e nyere mmadụ niile?
6 Ọ̀ bụ naanị ndị ohu Jehova ka e nyere akọnuche? Tụlee ihe Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ kwuo: ‘Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu, sitere n’ọmụmụ na-eme ihe ndị dị n’iwu, ndị a, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ha bụụrụ onwe ha iwu. Ọ bụ ha bụ ndị na-egosi na e dere isi ihe dị n’iwu ahụ n’obi ha, ebe akọnuche ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ.’ (Ndị Rom 2:14, 15) Ihe a dị n’ime anyị nke na-agbara anyị àmà nwere ike ime ka ọbụna ndị na-amatụdịghị iwu Jehova mee ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke mgbe ụfọdụ.
7. N’ihi gịnị ka akọnuche nwere ike iji hie ụzọ mgbe ụfọdụ?
7 Otú ọ dị, akọnuche nwere ike ihie ụzọ mgbe ụfọdụ. N’ihi gịnị? Chee echiche banyere ihe atụ ahụ anyị nyere na mbụ. Ọ bụrụ na o nwere otú ebe ahụ si gbagwojuo onye na-ezi gị ụzọ anya, o nwere ike idufu gị. Ọ bụrụkwa na ị na-arụ ya ụka, jụ iso ụzọ o ziri gị ma tinye isi n’ebe masịrị gị, i nwere ike ifu ụzọ. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị na-emekarị ihe akọnuche anyị na-achọghị n’ihi na anyị na-achọ naanị ọdịmma onwe anyị, akọnuche anyị nwere ike iduhie anyị. Ọ bụrụkwa na anyị ejighị Okwu Chineke na-eduzi onwe anyị, o nwere ike isiri anyị ike ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi mgbe anyị na-eme ọtụtụ ihe dị mkpa. N’ezie, ọ dị mkpa ka mmụọ nsọ Jehova na-eduzi anyị iji mee ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma. Pọl dere, sị: ‘Akọnuche m so m na-agba àmà n’ime mmụọ nsọ.’ (Ndị Rom 9:1) Otú ọ dị, olee otú anyị ga-esi jide n’aka na ọ bụ mmụọ nsọ Jehova na-eduzi akọnuche anyị? Ọ bụ site n’ịzụ ya azụ.
OTÚ A GA-ESI ZỤỌ AKỌNUCHE
8. (a) Olee otú obi nwere ike isi metụta akọnuche, gịnịkwa ka anyị ga-akacha lebara anya ná mkpebi ndị anyị na-eme? (b) N’ihi gịnị ka inwe ezi akọnuche na-ejighị bụrụ naanị ihe ga-ekpebi ma ihe Onye Kraịst mere ò ziri ezi? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)
8 Olee otú ị ga-esi mee mkpebi metụtara akọnuche? O yiri ka naanị ihe ụfọdụ ndị na-eme bụ, ha nyochaa onwe ha, ha atụlee otú ha si ele ihe anya, kpebizie ihe ha ga-eme. Ha mechaa, ha nwere ike ikwu, sị, “Akọnuche m adịghị ama m ikpe.” Ihe nwere ike ịgụsi obi anyị agụụ ike, ọbụna mee ka akọnuche anyị hie ụzọ. Baịbụl kwuru, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite. Ònye pụrụ ịmara ya?” (Jeremaya 17:9) N’ihi ya, ihe na-agụ obi anyị ekwesịghị ịbụ ihe kacha mkpa anyị ga-echebara echiche. Kama nke ahụ, ihe mbụ anyị ga-echebara echiche bụ ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ.b
9. Gịnị bụ ịtụ egwu Chineke, olee otú ịtụ egwu Chineke ga-esi metụta akọnuche anyị?
9 Ọ bụrụ na anyị ejiri akọnuche a zụrụ azụ mee mkpebi, mkpebi anyị ga-egosi na anyị na-atụ egwu Chineke, ọ bụghị ime ihe anyị chọrọ. Tụlee otu ezigbo ihe atụ. Gọvanọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Nehemaya nwere ikike ịna ndị bi na Jeruselem ego na ụtụ isi. Ma, o meghị otú ahụ. N’ihi gịnị? Ime ihe na-adịghị Jehova mma site n’imegbu ndị Chineke amasịtụdịghị ya. Ọ sịrị: “Mụ onwe m emeghị otú ahụ n’ihi egwu Chineke.” (Nehemaya 5:15) Ezi ịtụ egwu Chineke dị oké mkpa, ya bụ, mmadụ iji obi ya dum na-atụ egwu ka ya ghara ime ihe na-adịghị Nna anyị nke eluigwe mma. Isi otú ahụ na-asọpụrụ Chineke ma na-atụ egwu ya ga-eme ka anyị si n’Okwu ya nweta nduzi mgbe anyị chọrọ ime mkpebi.
10, 11. Olee ụkpụrụ Baịbụl ndị metụtara ịṅụ mmanya na-aba n’anya, oleekwa otú anyị ga-esi nweta nduzi Chineke iji mee ka anyị tinye ha n’ọrụ?
10 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere mmanya na-aba n’anya. Mkpebi ọtụtụ n’ime anyị ga-eme ma anyị gaa ebe e nwere nnọkọ oriri na ọṅụṅụ bụ: M̀ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya ka ọ̀ bụ na m gaghị aṅụ? Nke mbụ, anyị kwesịrị ịmụta ihe anyị ga-eme. Olee ụkpụrụ Baịbụl ndị metụtara okwu ahụ? Baịbụl adịghị akatọ ịṅụ mmanya otú o kwesịrị. Ọ na-eto Jehova maka mmanya o nyere ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 104:14, 15) Otú ọ dị, Baịbụl na-akatọ ịṅụbiga mmanya ókè na iri oriri oké mkpọtụ. (Luk 21:34; Ndị Rom 13:13) Ebe ọ gụnyere mmehie ndị ọzọ dị oké njọ, dị ka ụdị ịkwa iko niile, ka ọ gụnyekwara ịṅụbiga mmanya ókè.c—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.
11 Ụkpụrụ ndị dị otú ahụ na-azụ akọnuche Onye Kraịst ma na-eme ka ọ mara ihe o kwesịrị ime. Ya mere, mgbe anyị chọrọ ikpebi ma ànyị ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya n’ebe e nwere nnọkọ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee ụdị nnọkọ a ga-enwe? À ga-emebiga ihe ókè na ya, nke ga-eme ka ọ ghọọ oriri oké mkpọtụ? Olee ebe m nwere nsogbu? Mmanya na-aba n’anya ọ̀ na-agụ m agụụ? Ò riela m ahụ́? Èji m ya edi nsogbu m? Ọ̀ bụ ya na-enyere m aka ime ihe? Àna m enwe njide onwe onye ka m ghara ịṅụbiga ya ókè?’ Ka anyị na-atụgharị uche n’ụkpụrụ Baịbụl dị iche iche nakwa n’ajụjụ ndị ha na-akpali anyị ịjụ, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka nduzi Jehova. (Abụ Ọma 139:23, 24) Ọ bụrụ na anyị na-eme nke a, anyị na-akpọku Jehova ka o jiri mmụọ nsọ ya na-eduzi anyị. Anyị na-azụkwa akọnuche anyị ka ọ na-erube isi n’ụkpụrụ Chineke. Otú ọ dị, o nwere ihe ọzọ anyị kwesịrị ịtụle nke ọma mgbe anyị na-eme mkpebi.
GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ICHETA AKỌNUCHE NDỊ ỌZỌ?
Akọnuche e ji Baịbụl zụọ ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ̀ bụ na ị gaghị aṅụ
12, 13. Olee ihe ndị mere otú akọnuche Ndị Kraịst si arụ ọrụ ji dị iche iche, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime n’ihi ya?
12 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịtụ gị n’anya na e nwere ọdịiche dị ukwuu n’ụzọ dị iche iche akọnuche Ndị Kraịst si arụ ọrụ. Otu onye nwere ike ile otu omume ma ọ bụ otu omenala anya dị ka ihe na-ezighị ezi; ọ dị onye nke ọzọ mma. Ọ hụghịkwa ihe mere ọ ga-eji katọọ ya. Dị ka ihe atụ, n’ihe metụtara izukọ na-aṅụ mmanya, mmadụ na ndị enyi ya ole na ole ịnọ na-aṅụ mmanya ná mgbede nwere ike ịdị otu onye mma; ime otú ahụ nwere ike ịdị onye nke ọzọ njọ. N’ihi gịnị ka e ji nwee echiche dị iche iche otú ahụ, oleekwa otú ha kwesịrị isi metụta mkpebi anyị?
13 Ọ dị ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji eme ihe dị iche n’ihe ibe ha na-eme. Ihe ndị mere mgbe ndị mmadụ na-eto dị nnọọ iche iche. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ma nke ọma ihe ndị na-ezighị ezi ha gbasoro mgba n’oge gara aga—ikekwe, ọ rara ha ezigbo ahụ́. (1 Ndị Eze 8:38, 39) Ndị dị otú ahụ nwere ike ịkpachara nnọọ anya n’ihe banyere mmanya, ma ọ bụrụ na ọ bụ ya ka ha gbasoro mgba. Ọ bụrụ na onye dị otú ahụ abịa na nke gị, akọnuche ya nwere ike ime ka ọ jụ mmanya i nyere ya. Ọ̀ ga-ewe gị iwe? Ị̀ ga-enyewe ya nsogbu? Ee e. Ma ị̀ ma ihe mere o ji jụ ma ọ bụ na ị maghị, ịhụnanya ị hụrụ nwanna ahụ ga-eme ka ị ghara inye ya nsogbu. O nwere ike ịbụ na ọ chọghị ịgwa gị mgbe ahụ ihe mere o ji jụ.
14, 15. Na gịnị ka akọnuche ndị nọ n’ọgbakọ na narị afọ mbụ na-abụghị otu, gịnị ka Pọl tụrụ aro ka ha mee?
14 Pọl onyeozi ma na e nwere ụzọ dị iche iche akọnuche Ndị Kraịst si duzie ha na narị afọ mbụ. Ihe oriri e ji chụọrọ arụsị àjà n’oge ahụ na-enye ụfọdụ Ndị Kraịst nsogbu n’obi. (1 Ndị Kọrịnt 10:25) Akọnuche Pọl emeghị ka ọ jụ ihe oriri ndị dị otú ahụ e mechara na-ere n’ahịa. Pọl weere ya na ọ dịghị ihe arụsị bụ; o nweghị otú ọ ga-esi bụrụ arụsị nwe ihe oriri Jehova kere, nke o doro anya na ọ bụ Jehova nwe. Otú ọ dị, Pọl ghọtara na otú ndị ọzọ si lee okwu ahụ anya dị iche n’otú o si lee ya anya. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ kpeere arụsị nke ukwuu tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. Ha na-ewere na ihe ọ bụla nwere otú o si metụta arụsị, ọbụna n’oge gara aga, ezighị ezi. Olee otú Pọl si dozie okwu ahụ?
15 Pọl sịrị: “Ma anyị ndị siri ike kwesịrị iburu adịghị ike nke ndị na-esighị ike, ọ bụghịkwa ịdị na-eme ihe na-amasị anyị onwe anyị. N’ihi na ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya.” (Ndị Rom 15:1, 3) Pọl kwuru na anyị kwesịrị ibute ọdịmma nke ụmụnna anyị ụzọ, dị nnọọ ka Kraịst mere. Mgbe Pọl na-ekwu ihe yiri ya, ọ sịrị na ya agaghị eri anụ ma ọlị ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka atụrụ dị oké ọnụ ahịa, nke Kraịst nyere ndụ ya maka ya, sụọ ngọngọ.—1 Ndị Kọrịnt 8:13; 10:23, 24, 31-33.
16. Gịnị mere ndị akọnuche ha na-adịghị anabata ihe ụfọdụ ji kwesị ịghara ikpe ndị akọnuche ha dị iche na nke ha ikpe?
16 N’aka nke ọzọ, ndị akọnuche ha na-adịghị anabata ihe ụfọdụ ekwesịghị ịkatọ ndị ọzọ, na-ekwu ka mmadụ niile lewe ihe a ga-ahapụrụ akọnuche anya otú ha onwe ha si ele ya anya. (Ndị Rom 14:10) N’ezie, akọnuche anyị kwesịrị ịbụ ihe anyị ga-eji na-ekpe onwe anyị ikpe, ọ bụghị ihe anyị ga-eji na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Cheta ihe Jizọs kwuru: “Kwụsịnụ ikpe ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe.” (Matiu 7:1) Ndị niile nọ n’ọgbakọ ekwesịghị ise okwu n’ihi ihe a ga-ahapụrụ akọnuche mmadụ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịchọ otú anyị ga-esi mee ka e nwee ịhụnanya na ịdị n’otu, otú anyị ga-esi na-ewuli ibe anyị elu, ọ bụghị ime ihe ga-egbu mmụọ ha.—Ndị Rom 14:19.
OTÚ EZI AKỌNUCHE SI EWETA NGỌZI
Ezi akọnuche nwere ike iduzi anyị na njem nke ndụ, meekwa ka anyị nwee ọṅụ na obi iru ala
17. Gịnị mere akọnuche ọtụtụ ndị taa?
17 Pita onyeozi dere, sị: ‘Nweenụ ezi akọnuche.’ (1 Pita 3:16) Akọnuche nke dị ọcha n’anya Jehova Chineke bụ nnukwu ngọzi. Ọ dịghị ka akọnuche nke ọtụtụ ndị taa. Pọl kọwara ndị ‘akọnuche ha dị ka ihe a dara ígwè ọkụ.’ (1 Timoti 4:2) Ígwè e ji ada ihe ọkụ na-adasi ahụ́, meekwa ka ọ ghara inwe mmetụta. Ọtụtụ ndị nwere akọnuche nwụrụ anwụ, ya bụ, akọnuche e mebiri emebi. Akọnuche dị otú ahụ anakwaghị enwe mmetụta, ọ dịghịzi adọ onye nwe ya aka ná ntị. Ọ nakwaghị ama ya ikpe, ma ọ bụ mee ka ihere mee ya, ma ọ bụkwanụ mee ka ihe ọjọọ o mere wute ya. O yiri ka obi ọ̀ dị ọtụtụ ndị ụtọ taa n’ihi na akọnuche ha adịkwaghị ama ha ikpe.
18, 19. (a) Olee uru mmadụ inwe obi amamikpe na ihu ihere bara? (b) Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na akọnuche anyị ka na-apịa anyị ụtarị n’ihi mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga, ma chegharịa?
18 N’eziokwu, obi amamikpe nwere ike ịbụ ụzọ akọnuche anyị si agwa anyị na anyị emeela ihe na-ezighị ezi. Mgbe amamikpe dị otú ahụ mere ka onye mmehie chegharịa, e nwere ike ịgbaghara ọbụna mmehie kacha njọ. Dị ka ihe atụ, Eze Devid mere mmehie dị oké njọ, ma ihe kacha mee ka a gbaghara ya bụ ezigbo nchegharị o nwere. Asị ọ kpọrọ mmehie o mere na mkpebi o kpebisiri ike irube isi n’iwu Jehova malite n’oge ahụ gawa mere ka ọ hụ na Jehova “dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 51:1-19; 86:5) Otú ọ dị, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na obi anyị ka na-amasi anyị ikpe ike, ihere aka na-emekwa anyị mgbe anyị chegharịchara, mgbe a gbaghachaara anyị?
19 Mgbe ụfọdụ, akọnuche nwere ike inyebiga onye mere mmehie nsogbu ókè, na-apịa ya ụtarị mgbe ogologo oge gachara, mgbe nsogbu dị otú ahụ na-enweghịzi uru ọ bara. Mgbe ihe dị otú ahụ mere, anyị kwesịrị ịgwa obi ahụ nke na-ama anyị ikpe na Jehova karịrị ụzọ niile mmadụ si ele ihe anya. Anyị kwesịrị ikwere na ọ hụrụ anyị n’anya, nabatakwa mgbaghara ọ gbaghaara anyị, dị nnọọ ka anyị na-agba ndị ọzọ ume ime. (1 Jọn 3:19, 20) N’aka nke ọzọ, akọnuche dị ọcha na-eme ka mmadụ nwee udo nke obi, ahụ́ iru ala, na nnukwu ọṅụ nke dị ụkọ n’ụwa a. Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị mere mmehie dị oké njọ n’oge gara aga, enwetala ahụ́ iru ala dị otú ahụ. Ha nwekwara ezi akọnuche taa ka ha na-ejere Jehova ozi.—1 Ndị Kọrịnt 6:11.
20, 21. (a) Gịnị ka akwụkwọ a ga-enyere gị aka ime? (b) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, olee otú anyị si nwere onwe anyị, ma, olee otú anyị kwesịrị isi jiri ya na-eme ihe?
20 E bipụtara akwụkwọ a ka o nyere gị aka inweta ọṅụ ahụ, ka i nwee ezi akọnuche ruo mgbe oge ikpeazụ a nke usoro ihe Setan jupụtara ná nsogbu ga-agafe. Otú ọ dị, ọ gaghị akọwacha iwu niile na ụkpụrụ niile dị na Baịbụl bụ́ ndị i kwesịrị ichebara echiche ma tinye n’ọrụ n’ọnọdụ ndị a na-enwe kwa ụbọchị. Atụkwala anya na a ga-enwe iwu ga-asị gị mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ n’ihe ndị a ga-ahapụrụ akọnuche mmadụ. E bipụtara akwụkwọ a ka o nyere gị aka ịzụ akọnuche gị, meekwa ka ị mara ihe i kwesịrị ime site n’ịmụta otú ị ga-esi na-eme Okwu Chineke ná ndụ ị na-ebi kwa ụbọchị. “Iwu nke Kraịst” adịghị ka Iwu Mozis. Ọ na-agwa ndị nọ n’okpuru ya ka ha na-erubere akọnuche ha na ụkpụrụ Baịbụl isi karịa iwu e dere ede. (Ndị Galeshia 6:2) Ya mere, Jehova mere ka Ndị Kraịst nwere onwe ha n’ụzọ na-enweghị atụ. Otú ọ dị, Okwu ya na-echetara anyị ka anyị ghara inwere onwe anyị ruo n’ókè nke iji ya “na-ekpuchi ihe ọjọọ.” (1 Pita 2:16) Kama nke ahụ, nnwere onwe dị otú ahụ na-enye anyị ohere magburu onwe ya igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya.
21 Ọ bụrụ na ị tụlee otú kacha mma ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru ma kpee ekpere banyere ya, ọ bụrụkwa na ị na-eme ihe i kpebiri, ị ga-anọgide na-eme ihe dị mkpa ị malitere ime mgbe mbụ ị matara Jehova. Ị ga na-azụ “ikike nghọta” gị “site n’iji ya eme ihe.” (Ndị Hibru 5:14) Akọnuche gị nke e ji Baịbụl zụọ ga-abụrụ gị ngọzi n’ụbọchị niile nke ndụ gị. Dị ka onye na-ezi mmadụ ụzọ, akọnuche gị ga na-enyere gị aka ime mkpebi ndị ga-adị Nna gị nke eluigwe mma. Nke a bụ ụzọ e ji n’aka nke ga-eme ka ị nọrọ n’ịhụnanya Chineke.
a Okwu bụ́ “akọnuche” adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Otú ọ dị, ihe atụ ndị dị ka nke a na-egosi na o doro nnọọ anya na e kwuru banyere akọnuche na ya. Okwu bụ́ “obi” na-ekwukarị banyere ihe mmadụ bụ n’ime. O doro anya na ihe atụ ndị dị ka nke a na-ekwu kpọmkwem banyere ihe dị n’ime mmadụ, ya bụ, akọnuche ya. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu Grik a sụgharịrị “akọnuche” pụtara ihe dị ka ugboro iri atọ.
b Baịbụl na-egosi na inwe ezi akọnuche abụghị naanị ihe na-ekpebi ma ihe mmadụ mere ò ziri ezi. Dị ka ihe atụ, Pọl sịrị: “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla m maara m mere. Ma nke a adịghị egosi na m bụ onye ezi omume, kama, onye na-enyocha m bụ Jehova.” (1 Ndị Kọrịnt 4:4) Ọbụna ndị na-akpagbu Ndị Kraịst, dị ka Pọl mere na mbụ, nwere ike iji ezi akọnuche na-akpagbu ha n’ihi na ha chere na ihe ha na-eme dị Chineke mma. Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị nwee ezi akọnuche ma n’anya anyị ma n’anya Chineke.—Ọrụ 23:1; 2 Timoti 1:3.
c Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ ndị dọkịta na-ekwu na ọ naghị ekwecha ndị aṅụrụma omume ịṅụ naanị ntakịrị mmanya; ọ bụrụ na ha “achọghị ịṅụbiga mmanya okè,” ọ pụtara na ha agaghị aṅụtụdị ya aṅụ.